Job 40:1-24
40 Jehova gwakwara Job, sị:
2 “Mmadụ ò kwesịrị ikwu na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na-eme ihe ọjọọ ma sesawa ya okwu?+
Ka onye chọrọ ịbara Chineke mba zaa ajụjụ a.”+
3 Job zara Jehova, sị:
4 “Lee, erughị m eru.+
Gịnị ka m ga-aza gị?
Ekpuchiela m aka n’ọnụ m.+
5 M kwuola okwu ọtụtụ ugboro,* ma agaghị m ekwu ọzọ.
E nweghị ihe ọzọ m ga-ekwu.”
6 Jehova sizi n’oké ifufe gwa Job,+ sị:
7 “Biko, jikere ka dimkpa.
M ga-ajụ gị ajụjụ, ị ga-azakwa m.+
8 Ị̀ ga-asị na anaghị m ekpe ikpe ziri ezi?
Ị̀ ga-ekwu na m bụ onye ọjọọ ka i wee bụrụ onye ezi omume?+
9 Aka gị ò siri ike ka nke ezi Chineke?+
Ka olu gị ò nwere ike ịdasi ụda ike ka nke ya?+
10 Biko, jiri ebube na ike chọọ onwe gị mma.
Yiri ùgwù na ịma mma ka uwe.
11 Gosi na oké iwe na-ewe gị.
Lebara onye ọ bụla dị mpako anya ma weda ya ala.
12 Lebara onye ọ bụla dị mpako anya ma wetuo ya ala,Zọpịakwa ndị ajọ omume n’ebe ha guzo.
13 Zoo ha niile n’ájá.
Kpọchie ha* n’ebe zoro ezo.
14 M ga-ekwetazi*
Na ị ga-ejili ike* gị zọpụta onwe gị.
15 Chebaragodị Enyí Mmiri* echiche, bụ́ nke m kere otú m kere gị.
Ọ na-ata ahịhịa otú ehi na-ata.
16 Legodị otú úkwù ya si sie ikeNakwa otú afọ ya si sie ike.
17 Ọ na-eme ka ọdụ ya dị ka osisi sida.
Akwara apata ụkwụ ya dị ka ihe a kpara akpa.
18 Ọkpụkpụ ya dị ka ihe e ji ọla kọpa mee.
Aka ya na ụkwụ ya dị ka ígwè a kpara akpa.
19 Ọ bụ ya bụ nke mbụ nakwa nke kachanụ n’anụ ndị dị ka ya Chineke kere.
Ọ bụ naanị Onye kere ya nwere ike iji mma agha gaa ya nso.
20 N’ihi na ugwu dị iche iche, bụ́ ebe anụ ọhịa niile na-egwuri egwu,Na-emepụtara ya nri.
21 Ọ na-edina ala n’okpuru osisi lotọs,N’ebe e nwere ahịhịa amị n’ebe mmiri na-adọ.
22 Ndò osisi lotọs na-ekpuchi ya.
Osisi pọpla nke na-adị na ndagwurugwu na-agba ya gburugburu.
23 Ọ bụrụ na e nwee ebili mmiri n’osimiri, ọ naghị atụ ụjọ.
Ọ bụrụgodị na Osimiri Jọdan+ asọrọ n’ike n’ike na-abịa n’ihu ya, obi na-esi ya ike.
24 È nwere onye nwere ike ịnwụde ya mgbe ọ na-ele onye ahụ anyaMa ọ bụ jiri nko* dụpuo ya imi?
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “otu ugboro, ugboro abụọ.”
^ Na Hibru, “Kechie ihu ha.”
^ Ma ọ bụ “ga-aja gị mma.”
^ Na Hibru, “aka nri.”
^ Na Hibru, “Behimọt.”
^ Na Hibru, “ọnyà.”