Ọpụpụ 31:1-18

  • Mmụọ nsọ Chineke jupụtara n’ime ndị nwere nkà (1-11)

  • Ụbọchị Izu Ike bụ ihe àmà dị n’etiti Chineke na Izrel (12-17)

  • Mbadamba nkume abụọ (18)

31  Jehova gwakwara Mosis, sị:  “Lee, ahọrọla m Bezalel,*+ onye ebo Juda. Ọ bụ nwa Yuraị, nwa nwa Họọ.+  M ga-eme ka mmụọ Chineke jupụta n’ime ya, ka o wee nwee amamihe na nghọta ma mara otú e si arụ ọrụ ọ bụla e ji nkà arụ,  ka o nwee ike ise otú ihe dị iche iche a ga-arụ arụ ga-adị, ka o nwee ike iji ọlaedo, ọlaọcha, na ọla kọpa arụ ọrụ,  ka o nwee ike ịwa nkume+ na ịkwụnye nkume n’ebe ha ga-adị, na ịrụ ụdị ihe ọ bụla e ji osisi arụ.+  Ahọpụtakwala m Oholiab,+ nwa Ahisamak, onye ebo Dan ka o nyere ya aka. M ga-emekwa ka ndị niile nwere nkà* nwee amamihe, ka ha wee rụọ ihe niile m nyere gị n’iwu:+  ụlọikwuu nzute,+ igbe ọgbụgba ndụ*+ na okwuchi ya+ nke ga-adị n’elu ya, arịa niile ga-adị n’ụlọikwuu ahụ,  tebụl+ na arịa ya, ihe e ji adọsa ọkụ* e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee na arịa ya niile,+ ebe ịchụàjà insens,+  ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ+ na arịa ya niile, nnukwu ite na ihe a ga-eji adọkwasị ya,+ 10  uwe ndị a kpara nke ọma, uwe nsọ Erọn onye nchụàjà, uwe ụmụ ya ndị nwoke ga-eyi na-arụ ọrụ nchụàjà,+ 11  mmanụ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ, na insens na-esi ísì ọma maka ụlọikwuu ahụ.+ Ha ga-eme ihe niile m nyere gị n’iwu.” 12  Jehova gwakwuru Mosis, sị: 13  “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Hụnụ na unu na-edebe ụbọchị izu ike m,+ n’ihi na ọ bụ ihe na-egosi na mụ na unu agbaala ndụ n’ọgbọ unu niile, ka unu wee mara na ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, na-eme ka unu dị nsọ. 14  Unu ga na-edebe Ụbọchị Izu Ike n’ihi na ọ bụụrụ unu ihe dị nsọ.+ A ga-egbu onye ọ bụla merụrụ ya. Onye* ọ bụla rụrụ ọrụ n’ụbọchị ahụ, a ga-egbu ya.*+ 15  E nwere ike ịrụ ọrụ ụbọchị isii, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike, nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Ọ bụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. Onye ọ bụla rụrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, a ga-egbu ya. 16  Ndị Izrel ga-edebe Ụbọchị Izu Ike. Ha ga-edebe Ụbọchị Izu Ike n’ọgbọ ha niile. Ọ bụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka. 17  Ọ bụ ihe àmà ga-adịgide adịgide nke na-egosi na mụ na ndị Izrel agbaala ndụ,+ n’ihi na Jehova ji ụbọchị isii kee eluigwe na ụwa, ma ọ rụghị ọrụ n’ụbọchị nke asaa, kama o zuru ike.’”+ 18  Ozugbo ọ gwachara Mosis okwu n’Ugwu Saịnaị, o bunyere ya mbadamba nkume abụọ e dere Ihe Àmà ahụ.+ Ọ bụ mkpịsị aka Chineke dere ihe ná mbadamba nkume ndị ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “akpọọla m Bezalel aha.”
Na Hibru, “ndị niile obi ha ma ihe.”
Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”