Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ Otú Ọ Ga-adị n’Ime Paradaịs A Ga-eweghachi

Ndụ Otú Ọ Ga-adị n’Ime Paradaịs A Ga-eweghachi

Ndụ Otú Ọ Ga-adị n’Ime Paradaịs A Ga-eweghachi

OBI siri Jizọs ike mgbe o kwuru banyere ịdị ndụ ọzọ, ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụ ihe ga-eme eme. O kwuru, sị:“Mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ, [unu] ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.” Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru banyere “mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ”?—Matiu 19:25-29.

Ihe ndekọ yiri ya nke onye so dee Baịbụl bụ́ Luk dere kwuru na Jizọs sịrị na “n’ime usoro ihe na-abịanụ,” ndị na-eso ụzọ ya ga-enweta “ndụ ebighị ebi.” (Luk 18:28-30) Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na “usoro ihe na-abịanụ” na “mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ” bụ otu ihe?

Ihe àmà na-egosi na ọ bụ iji mesie ya ike na Jehova Chineke ga-ahụ na nzube mbụ ya maka ụmụ mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs mezuru. A ga-eme ka ụmụ mmadụ zuo okè dị nnọọ ka Adam na Iv zuru okè tupu ha emehie. Ya mere, “n’ime usoro ihe na-abịanụ,” “a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ” site n’iweghachi Paradaịs ahụ e nweburu n’ogige Iden.

Otú A Ga-esi Weghachi Paradaịs

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ kụziiri ụmụazụ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ihe Chineke ga-eji mee ka ụwa niile bụrụghachi Paradaịs. Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịdị na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Chineke họpụtara Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye Ọchịchị nke Alaeze a, bụ́ nke ga-emezu nzube Chineke bụ́ ka ụwa niile bụrụghachi Paradaịs.

Baịbụl kwuru banyere onye ahụ Chineke họpụtara ịbụ Onye Ọchịchị, sị: “A mụworo anyị otu nwa, e nyewokwa anyị otu nwa nwoke; ịchịisi ga-adị n’ubu ya. A ga-akpọ ya . . . Onyeisi Udo. Mgbasa ịchịisi ya na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ.” (Aịzaya 9:6, 7) Ma, olee otú ọchịchị a nke dị n’aka onye ọchịchị dị otú a ga-esi mezuo nzube Chineke?

Baịbụl zara, sị: “N’ụbọchị ndị eze ahụ, Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze [ịchịisi] nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

Ka anyị tụlee ọnọdụ ndị ga-adị n’ụwa mgbe a ga-eme ka ọ bụrụghachi Paradaịs, ee, “mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ,” bụ́ mgbe Ọkpara Chineke ga-akpa ike dị ka ‘Onyeisi’ n’Alaeze Nna ya.

Otú Ndụ Ga-adị na Paradaịs

Ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ

“Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.

“A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15.

Ọrịa, nká, ma ọ bụ ọnwụ agaghịzi adị

“Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, a ga-emeghekwa ntị nke ndị ntị chiri. Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịzaya 35:5, 6.

“Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Nri na-edozi ahụ́ ga-ejupụta ebe niile

“Ala ga-emepụta ihe nke ọma; Chineke bụ́ Chineke anyị ga-agọzi anyị.”—Abụ Ọma 67:6.

“Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”—Abụ Ọma 72:16.

Onye ọ bụla ga-enwe ezigbo ụlọ na ezigbo ọrụ

“Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya.”—Aịzaya 65:21, 22.

Mpụ, ime ihe ike, ma ọ bụ agha agaghịzi adị

“A ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa; a ga-efopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.”—Ilu 2:22.

“Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.”—Aịzaya 2:4.

Ụjọ agaghịzi adị, udo ga-adị ebe niile

“Ha ga-ebikwa n’obi iru ala. Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Ezikiel 34:28.

“Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum; n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.”—Aịzaya 11:9.

Ọ ga-abụ nnọọ ihe magburu onwe ya ịdị ndụ mgbe ọnọdụ ọma ndị dị otú ahụ ga-ezu ụwa ọnụ, bụ́ mgbe onye ọ bụla ga-ahụ Chineke n’anya, hụkwa ụmụ mmadụ ibe ya n’anya! (Matiu 22:37-39) Obi sie gị ike na nkwa niile Chineke kwere ga-emezu n’oge ahụ. Chineke kwuru, sị: “Ekwuwo m ya, . . . m ga-emekwa ya.”—Aịzaya 46:11.

O nwere ọtụtụ ihe ka nwere ike ịdị gị mkpa ịmata banyere Jehova Chineke na ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa. Dị ka ihe atụ, olee ihe na-egosi na ụwa ọhụrụ a ga-abịa n’isi nso? Olee otú Alaeze Chineke ga-esi nọchie ọchịchị niile nke ụwa? Oleekwa ihe ndị ga-eduga na nke a? Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmata azịza nke ajụjụ ndị a. Iji matakwuo otú ha ga-esi nyere gị aka, lee peeji nke 32 nke magazin a.

Ọ fọla obere ka ụmụ mmadụ nweta ụwa ọhụrụ ezi omume ahụ gụwara ha agụụ kemgbe ọtụtụ afọ. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ ka ga-adị ndụ ọzọ. Ịdị ndụ ọzọ abụghị naanị ihe nwere ike ime eme—ọ bụ uche Chineke. N’eziokwu, onye nwụrụ anwụ nwere ike ịdị ndụ ọzọ! Ee, ọ bụ ya bụ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ndụ “nke gaje ịbịa.”—1 Timoti 4:8; 6:19.

[Foto dị na peeji nke 7]

A ga-eweghachi Paradaịs ahụ di na nwunye mbụ ahụ tụfuru mgbe ha nupụrụ isi