Jenesis 8:1-22

  • Mmiri talatara n’ụwa (1-14)

    • Noa zipụrụ otu nduru (8-12)

  • Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ pụta (15-19)

  • Nkwa Chineke kwere banyere ụwa (20-22)

8  Ma Chineke chetara Noa na anụ ọhịa niile na anụ ụlọ niile ya na ha nọ n’ụgbọ ahụ.+ Chineke wee mee ka ifufe fee n’ụwa, mmiri ahụ amalite ịta. 2  Nnukwu mmiri niile dị na mbara igwe na ọnụ ụzọ mmiri niile dị n’eluigwe mechiri. Mmiri nke si n’eluigwe na-ezo wee kwụsị izo.+ 3  Mmiri wee jiri nwayọọ nwayọọ na-ata n’ụwa. Mgbe otu narị ụbọchị na iri ise (150) gachara, mmiri ahụ atalatala. 4  N’abalị iri na asaa n’ọnwa nke asaa, ụgbọ ahụ kwụsịrị n’ugwu dị n’Ararat. 5  Mmiri ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-atalata ruo n’ọnwa nke iri. N’abalị mbụ n’ọnwa nke iri, a hụwara elu ugwu dị iche iche.+ 6  Mgbe ụbọchị iri anọ gachara, Noa meghere windo+ ahụ ọ rụnyere n’ụgbọ ahụ 7  ma zipụ otu ugoloọma. Ugoloọma ahụ nọ na-efegharị n’èzí, na-efebatakwa, ruo mgbe mmiri tara n’ụwa. 8  Mgbe e mechara, Noa zipụrụ otu nduru ka o wee mata ma mmiri ọ̀ tawala n’ala. 9  Ma nduru ahụ ahụghị ebe ọ bụla ọ ga-ebere. N’ihi ya, o feere lọghachikwute ya n’ụgbọ ahụ maka na mmiri ka kpuchiri ụwa niile.+ O wee sepụta aka ya nwụrụ ya nwụbata n’ime ụgbọ ahụ. 10  O cheere ụbọchị asaa ọzọ ma si n’ụgbọ ahụ zipụ nduru ahụ ọzọ. 11  Mgbe nduru ahụ feere bịakwute ya ná mgbede, ọ hụrụ na ọ kpụ akwụkwọ oliv ọ tụbitara ọhụrụ n’ọnụ ya. Noa wee mara na mmiri ataala n’ụwa.+ 12  O cheere ụbọchị asaa ọzọ wee zipụ nduru ahụ. Ma ọ lọghachikwuteghị ya ọzọ. 13  N’abalị mbụ n’ọnwa nke mbụ n’afọ nke narị isii na otu (601),+ mmiri ataala n’ụwa. Noa wee wepụ ihe e ji kpuchie elu ụgbọ ahụ ma hụ na ala akọwala. 14  N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa nke abụọ, ụwa akọọla. 15  Chineke gwaziri Noa, sị: 16  “Si n’ụgbọ ahụ pụta, gị na nwunye gị na ụmụ gị na ndị nwunye ụmụ gị.+ 17  Chịrị ụdị anụ niile dị ndụ pụta,+ ma anụ ndị na-efe efe ma anụ ụlọ ma anụ ọhịa ma anụ niile na-arị arị, ka ha wee mụọ ọmụmụ n’ụwa, ka ha baa ụba ma dị ọtụtụ n’ụwa.”+ 18  Noa na ụmụ ya+ na nwunye ya na ndị nwunye ụmụ ya wee si n’ụgbọ ahụ pụta. 19  Ihe niile dị ndụ, anụ niile na-arị arị, anụ niile na-efe efe, na ihe niile na-agagharị agagharị n’ụwa si n’ụgbọ ahụ pụta. Ha pụtara n’ụdị ha dị iche iche.+ 20  Noa wee rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà+ ma were ụfọdụ n’anụ niile dị ọcha nakwa ụfọdụ n’anụ niile na-efe efe dị ọcha+ chụọ àjà a na-esu ọkụ n’ebe ịchụàjà ahụ.+ 21  Jehova wee malite ịnụrụ ísì ọma àjà ahụ na-esi. Jehova kwuziri n’obi ya, sị: “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ+ n’ihi mmadụ, n’ihi na ihe dị mmadụ n’obi malite n’oge ọ bụ nwata bụ ihe ọjọọ.+ E nweghịkwa mgbe m ga-ebibi ihe niile dị ndụ ọzọ otú m mere.+ 22  Malite ugbu a gawa, e nweghị mgbe a ga-akwụsị inwe oge ịgha mkpụrụ na oge iwe ihe ubi n’ụwa, nakwa oge oyi na oge okpomọkụ, oge ọkọchị na oge udu mmiri, nakwa ehihie na abalị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji