Ezikiel 8:1-18
8 N’abalị ise n’ọnwa isii, n’afọ nke isii,* mgbe m nọ ọdụ n’ụlọ m, ndị okenye Juda nọkwa ọdụ n’ihu m, mmụọ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova dakwasịrị m* ebe ahụ.
2 Ka m nọ na-ele anya, m hụrụ ihe dị ka mmadụ nke yikwara ọkụ. M hụkwara ọkụ malite n’ihe yiri úkwù ya gbadaa.+ Malitekwa n’úkwù ya gbagoo, e nwere ihe yiri ihe na-egbuke egbuke dị ka ọla na-egbu maramara.*+
3 Onye ahụ matịkwara ihe yiri aka jide ntutu isi m. N’ọhụụ Chineke gosiri m, otu mmụọ* buuru m bugoo n’agbata elu na ala bute m Jeruselem, n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ime+ nke chere ihu n’ebe ugwu, n’ebe arụsị na-akpasu Chineke iwe dị.+
4 Ebube Chineke Izrel dịkwa ebe ahụ.+ O yikwara ihe ahụ m hụrụ na ndagwurugwu.+
5 Ọ gwaziri m, sị: “Nwa nke mmadụ, biko, lee anya n’ebe ugwu.” M wee lee anya n’ebe ugwu ma hụ arụsị ahụ na-akpasu Chineke iwe n’ụzọ mbata dị n’ebe ugwu nke ọnụ ụzọ ámá ebe ịchụàjà.
6 Ọ gwakwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, ị̀ na-ahụ ezigbote arụ ndị Izrel na-akpa ebe a,+ nke mere m ji na-agbara ụlọ nsọ m ọsọ?+ Ị ka ga-ahụkwa arụ ndị ọzọ ka ndị a njọ.”
7 Ọ kpọkwaara m bịa n’ọnụ ụzọ ogige ahụ. Mgbe m lekwara anya, m hụrụ oghere dị ná mgbidi.
8 Ọ sịkwara m: “Nwa nke mmadụ, biko, mee ka oghere dị ná mgbidi a sakwuo mbara.” Mgbe m mere ka ọ sakwuo mbara, ahụrụ m otu ọnụ ụzọ.
9 Ọ gwara m ọzọ, sị: “Banye ka ị hụ ezigbote arụ ha na-akpa ebe a.”
10 M wee banye ma lee anya ná mgbidi ahụ gbaa gburugburu, hụ ebe a tụrụ ụdị ihe ọ bụla na-arị arị* na anụmanụ ndị na-asọ oyi+ nakwa arụsị niile na-asọ oyi* nke ndị Izrel.+
11 Ụmụ nwoke iri asaa n’ime ndị okenye Izrel guzo n’ihu ihe ndị ahụ, ha na Jeazanaya nwa Shefan.+ Onye nke ọ bụla jikwa ihe e ji etinye insens n’aka ya, insens nọkwa na-esi ísì ọma ka anwụrụ ọkụ ya na-akwụgo elu.+
12 Onye ahụ gwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, ị̀ hụla ihe ndị okenye Izrel na-eme n’ọchịchịrị, na onye ọ bụla n’ime ha nọ n’ime ime ụlọ ya ebe o dowere arụsị a pịrị apị? N’ihi na ha na-asị, ‘Jehova anaghị ahụ anyị. Jehova ahapụla ala a.’”+
13 Ọ gwakwara m, sị: “Ị ka ga-ahụ arụ ndị ọzọ ha na-akpa ka nke a njọ.”
14 Ọ kpọkwaara m bịa n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ Jehova, nke dị n’ebe ugwu. M hụrụ ụmụ nwaanyị nọ ọdụ ebe ahụ na-ebere chi bụ́ Tamọz ákwá.
15 Ọ gwakwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, ị̀ hụla ihe a? Ị ka ga-ahụ arụ ndị ọzọ ha na-akpa ka ndị a njọ.”+
16 Ọ kpọbatakwara m n’ogige dị n’ụlọ Jehova.+ N’ọnụ ụzọ ụlọ nsọ Jehova, n’agbata ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya na ebe ịchụàjà, e nwere ihe dị ka ụmụ nwoke iri abụọ na ise ndị gbanyere ụlọ nsọ Jehova azụ ma chee ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ha chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ na-akpọrọ anyanwụ isiala.+
17 Onye ahụ gwakwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, ị̀ hụla ihe a? Arụ niile ndị Juda kpara ọ̀ bụ ntakịrị ihe n’anya ha? Hà kwesịkwara ime ka tigbuo zọgbuo ju n’ala a,+ na-akpasu m iwe, si otú ahụ na-adụ m alaka osisi* n’imi?
18 M ga-eji iwe mee ha ihe. Agaghị m emere ha ebere.* Agaghịkwa m enwere ha ọmịiko.+ Ha na-etigodị mkpu na-akpọku m, agaghị m anụ olu ha.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọ ga-abụ afọ nke isii a dọọrọ Eze Jehoyakim, Ezikiel, na ndị Juu ndị ọzọ n’agha.
^ Na Hibru, “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova jidere m aka.”
^ Ọlaedo a gwara ọlaọcha, ya ana-egbu maramara.
^ N’asụsụ Hibru, mmụọ e dere ebe a nwere ike ịbụ mmụọ nsọ ma ọ bụkwanụ mmụọ ozi.
^ Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
^ Ma ọ bụ “na-akpụ akpụ.”
^ Ọ ga-abụ alaka osisi ha na-eji efe arụsị.
^ Na Hibru, “Anya m agaghị emere ha ebere.”