Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọnọdụ Ndị Na-emegide Ibe Ha n’Ihe Banyere Ihe Ndị Dịịrị Nanị Onwe Onye

Ọnọdụ Ndị Na-emegide Ibe Ha n’Ihe Banyere Ihe Ndị Dịịrị Nanị Onwe Onye

Ọnọdụ Ndị Na-emegide Ibe Ha n’Ihe Banyere Ihe Ndị Dịịrị Nanị Onwe Onye

“NWOKE KASỊ DAA OGBENYE PỤRỤ ỊSỊ EZE ABATALA N’OBERE ỤLỌ YA.”—WILLIAM PITT, ONYE NDỌRỌ NDỌRỌ ỌCHỊCHỊ BỤ́ ONYE BRITAIN, 1759-1806.

OKWU Pitt na-enye echiche bụ́ na mmadụ ọ bụla kwesịrị inwe ụfọdụ ihe ndị dịịrị nanị ya onwe ya, izochitụ akụkụ ụfọdụ nke ndụ ya bụ́ nke ga-egbochi nnyochagharị ọ na-achọghị.

Mmadụ ịnọrọ onwe ya pụrụ ịpụta ihe dịgasị iche iche nye ndị sitere n’ọdịbendị dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, n’àgwàetiti Samoa dị n’ógbè Pacific, ụlọ anaghị enwekebe mgbidi, a pụkwara ịnọ n’èzí na-ahụ n’ụzọ dị mfe ihe ka ukwuu n’ime ihe ndị ezinụlọ na-eme n’ime ụlọ. Ma, ọbụna n’ebe ahụ, a na-ele mmadụ ịbanye n’ụlọ n’abụghị onye a kpọrọ akpọ anya dị ka àgwà ọjọọ.

Ọ dịwo anya ndị mmadụ ghọtara mkpa ọ dị mmadụ inwetụ ihe ụfọdụ ndị dịịrị nanị ya onwe ya. Ọtụtụ puku afọ tupu William Pitt ekwuo okwu ahụ a ma ama, Bible gosiri mkpa ọ dị ịkwanyere oge ndị ọzọ chọrọ ịnọrọ onwe ha ùgwù. Eze Solomọn dere, sị: “Mee ka ụkwụ gị kọọ ụkọ n’ụlọ mmadụ ibe gị; ka ihe gị wee ghara iju ya afọ, o wee kpọọ gị asị.” (Ilu 25:17) Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: ‘Mee ka ọ bụrụ nzube unu ilekwasị anya n’ihe unu na-eme.’—1 Ndị Tesalonaịka 4:11.

Oruru o ruuru mmadụ inwe ihe ndị dịịrị nanị ya dị nnọọ oké mkpa nke na magazin bụ́ The UNESCO Courier kpọrọ ya “ebe ihe ndị ruuru mmadụ hiwere isi.” N’otu aka ahụ, otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ onye Latin America nke ọnụ na-eru n’okwu kwuru, sị: “N’otu echiche, ihe nile ruuru mmadụ bụ akụkụ nke oruru o ruuru mmadụ inwe ihe ndị dịịrị nanị ya.”

Otú ọ dị, n’oge a ime mpụ na-arị elu, bụ́kwa mgbe a na-eyi ọha egwu n’ụwa nile, gọọmenti dị iche iche na ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka idebe iwu na-eche nnọọ na iji chebe ụmụ amaala ha, ha aghaghị inyobawa anya n’ihe ndị dịịrị nanị onwe onye. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị na-eme mpụ n’etiti ọha na eze na-eji oruru o ruuru ha inwe ihe ndị dịịrị nanị ha eme ihe dị ka ihe mkpuchi maka ime ihe ọjọọ. Ya mere, a na-agbalị idebe ibu ọrụ gọọmenti nwere ichebe ụmụ amaala ya na oruru o ruuru mmadụ inwe ihe ndị dịịrị nanị ya n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị.

Ihe Ndị Dịịrị Nanị Onwe Onye Ka Ọ̀ Bụ Ịnọ ná Nchebe

Mwakpo ndị na-eyi ọha egwu mere na September 11, 2001, bụ́ nke mere ka ụwa maa jijiji, mere ka ọtụtụ mmadụ gbanwee echiche ha banyere ikike gọọmenti nwere inyoba anya n’akụkụ ụfọdụ nke ihe ndị dịịrị nanị onwe onye. “September 11 gbanwere ọtụtụ ihe,” ka onye bụbu kọmishọna nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka azụmahịa ná mba United States gwara magazin bụ́ BusinessWeek. O kwuru, sị: “Ndị na-eyi ọha egwu na-arụ ọrụ ha n’ebe a na-adịghị enyoba anya n’ihe ndị dịịrị nanị ha. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa inyobatụ anya n’ihe ụfọdụ ndị dịịrị nanị onwe onye iji mee ka a gbaa ha n’anwụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ ga-asị ‘Ọ dị mma, gaa n’ihu.’” Magazin ahụ na-akọ, sị: “Njụta echiche e mere kemgbe September 11 na-egosi na pasent 86 nke ndị America kwadoro ka e jiri ngwá ọrụ ndị na-amata ihu mmadụ na-eme ihe n’ụzọ sara mbara karị; pasent 81 chọrọ ka a na-enyochakwu ọrụ ụlọ akụ̀ dị iche iche na usoro nke iji kaadị azụ ihe n’aka; pasent 68 kwadokwara ka e nwee kaadị nkọwa nke gọọmenti mba ahụ ga-ewepụta.”

Ụdị kaadị na-akọwa onye mmadụ bụ nke gọọmenti ụfọdụ nke mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-eme atụmatụ ya ga-enwe ike ichekwa akara mkpịsị aka onye nwe ya na onyinyo mkpụrụ anya ya ma nwee ihe ndekọ nke mpụ ndị o meworo nakwa ihe ndekọ nke otú onye nwe ya si akpata ma na-emefu ego. N’ụzọ nkà na ụzụ, a pụrụ iji ihe ọmụma dị na kaadị na-akọwa onye mmadụ bụ tụnyere ihe ọmụma dị na kaadị e ji azụ ihe n’aka ma jikọta ya na kamera ahụ a na-eji amata ihu mmadụ. N’ihi ya, a pụrụ ijide ndị omempụ mgbe ha zụtasịrị ihe ha ji eme mpụ ha.

Ọ bụrụ na ndị omempụ anwaa ime ka a ghara ịchọpụta ha site n’izo bọmbụ, égbè, ma ọ bụ mma n’ime uwe ha, ma ọ bụ ọbụna n’ime mgbidi siri ike nke ụlọ, a ka pụkwara ijide ha. Ngwá ọrụ ndị ụlọ ọrụ ụfọdụ na-ahụ maka nchebe nwere pụrụ igosi onyinyo nke ihe ọ bụla i tinyere n’ime uwe gị. Ngwá ọrụ radar e mepụtara ọhụrụ na-eme ka ndị uwe ojii nwee ike ịmata ndị mmadụ na-agagharị ma ọ bụ na-eku ume n’ọnụ ụlọ nke ọzọ. Ma inwekwu ike iledo ndị mmadụ ọ̀ na-ebelata mpụ?

Kamera Ọ̀ Na-egbochi Ndị Omempụ?

Mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ ime mpụ malitere ịrị elu na Bourke, bụ́ ime obodo dịpụrụ adịpụ n’Australia, a dọnyere kamera telivishọn anọ e ji ekesa ozi nanị n’ebe ụfọdụ. Ihe ọ rụpụtara bụ na mpụ belatara nke ukwuu. Otú ọ dị, ọ bụghị ebe nile ka e nwere akụkọ ihe ịga nke ọma dị otú a. Ná mgbalị iji belata mpụ na Glasgow, Scotland, a dọnyere kamera telivishọn 32 bụ́ nke e ji ekesa ozi nanị n’ebe ndị a kpaara ókè n’afọ 1994. Otu nnyocha nke Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Etiti nke Na-ahụ Maka Ime Nnyocha mere gosiri na n’afọ sochiri mgbe e tinyesịrị kamera telivishọn ndị ahụ, ọ̀tụ̀tụ̀ nke ụdị ụfọdụ nke mpụ belatara. Otú ọ dị, akụkọ ahụ kwuru, sị: “Mpụ ndị metụtara omume rụrụ arụ, gụnyere ịgba akwụna ji 120 rịa elu; mpụ nke akwụwaghị aka ọtọ ji 2185 rịa elu; mmebi iwu ndị ọzọ (gụnyere mmebi iwu ndị metụtara ọgwụ ọjọọ) ji 464 rịa elu.”

Ọ bụrụgodị na iledo ndị mmadụ ebelata mpụ n’otu ebe, o nwere ike ọ gaghị ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ ime mpụ n’ozuzu ya. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sydney Morning Herald na-akọwapụta otu ihe ndị uwe ojii na ndị ọkachamara n’ihe banyere mpụ na-akpọ “ngafe.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “Mgbe ndị omempụ hụrụ na a pụrụ ịhụ ha na kamera ma ọ bụ na ndị uwe ojii na-eme ngagharị n’ebe ụfọdụ pụrụ ijide ha, ha na-aga n’ebe ọzọ iji mee mpụ.” Ikekwe nke ahụ na-eme ka i cheta ihe Bible kwuru ogologo oge gara aga: “Onye na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghịkwa abịa n’ìhè ahụ, ka e wee ghara ịkatọ ọrụ ya.”—Jọn 3:20.

Ihe ịma aka na-eche ndị ọrụ ndebe iwu ihu bụ na ọbụna ngwá ọrụ nledo radar ma ọ bụ X-ray kasị bụrụ ọkpọka apụghị ịchọpụta ihe mmadụ bu n’uche, ma ọ bụ n’ebe ahụ ka a na-aghaghị ịlụ nke bụ́ ezigbo ọgụ iji belata mpụ, ịkpọasị, na ime ihe ike.

Otú ọ dị, e nwere ụdị nnyocha nke na-aga n’ihu ugbu a, bụ́ nke na-enyobakwu anya karịa nkà na ụzụ ọ bụla mmadụ mepụtaworo ka ọ dị ugbu a. A ga-atụle ụdị nnyocha a nakwa mmetụta ọma ọ pụrụ inwe n’akparamàgwà ụmụ mmadụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]

“Ndị na-eyi ọha egwu na-arụ ọrụ ha n’ebe a na-adịghị enyoba anya n’ihe ndị dịịrị nanị ha”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ihe Ndekọ Ahụ́ Ike Gị Dịịrị Nanị Gị?

Ọtụtụ ndị pụrụ iche na ihe ndekọ ahụ́ ike ha—nkọwa nke mmekọrịta ha na dọkịta ha na ụlọ ọgwụ ha na-enwe—bụ nke e ji n’aka na a gaghị agba n’anwụ. Ma, dị ka Òtù Na-enye Ihe Ọmụma Banyere Oruru O Ruuru Mmadụ Inwe Ihe Ndị Dịịrị Nanị Ya na-adọ aka ná ntị, “ị pụrụ inwe echiche na-ezighị ezi nke ịnọ ná nchebe.” N’akwụkwọ ya bụ́ Database Nation—The Death of Privacy in the 21st Century, Simson Garfinkel na-ekwu, sị: “Taa, a na-eji ihe ndekọ ahụ́ ike eme ihe karịa ka e ji ha eme na mbụ . . . Ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na ụlọ ọrụ ịnshọransị na-eji ha eme ihe iji kpebie onye ha ga-ewe n’ọrụ ma ọ bụ onye ha ga-enye akwụkwọ ịnshọransị. Ụlọ ọgwụ na òtù okpukpe dị iche iche na-eji ha eme ihe iji rịọ arịrịọ maka onyinye ego. Ọbụna ndị na-ere ahịa na-azụkọrọ ihe ndekọ ahụ́ ike ndị pụrụ iru ha aka n’ọchịchọ ha na-achọ inweta ihe ọmụma bara uru banyere ndị nwere ike ịzụ ngwá ahịa ha.”

Garfinkel na-ekwukwa, sị: “Ihe na-eme ka izere ịgba ihe ndekọ n’anwụ sie ike bụ eziokwu ahụ bụ́ na agbata mmadụ 50 na 75 na-enwe mkpa nke ịhụ ihe ndekọ nke onye ọrịa n’oge ha gara ụlọ ọgwu.” N’ebe ụfọdụ, ndị ọrịa n’onwe ha nwere ike ịgbahapụ, n’amaghị ama, oruru o ruuru ha ịhọrọ ka a ghara ịgba ya n’anwụ site n’ịbịanye aka na fọm mgbahapụ ma ọ bụ nke na-enye nkwado maka ihe nile n’oge a na-anabata ha n’ụlọ ọgwụ. Site n’ịbịanye aka na fọm ndị a, “ị na-enye onye nlekọta ahụ́ ike ikike inye ụlọ ọrụ ịnshọransị, ụlọ ọrụ gọọmenti dị iche iche na ndị ọzọ ihe ndekọ ahụ́ ike gị,” ka Òtù Na-enye Ihe Ọmụma Banyere Oruru O Ruuru Mmadụ Inwe Ihe Ndị Dịịrị Nanị Ya na-ekwu.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ihe Ndị Dịịrị Nanị Onwe Onye Na Uru Ahịa

Ndị na-eji Intanet eme ihe kasị nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị ndị ha na-achọghị nyochara. Òtù Na-enye Ihe Ọmụma Banyere Oruru O Ruuru Mmadụ Inwe Ihe Ndị Dịịrị Nanị Ya, na-ekwu, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ọ bụla a na-eme n’Intanet nke a ga-eji n’aka na a gaghị agba ihe ndị dịịrị nanị onwe onye n’anwụ na ya ma ọlị. . . . Ndị na-eji Intanet eme ihe pụrụ inweta ihe ọmụma ma ọ bụ ihe ndekọ n’ebe e debere ha . . . , ma ọ bụkwanụ ndị na-eji Intanet eme ihe pụrụ nanị ịgụ ihe ndị a n’emeghị ihe ọ bụla ọzọ. Ọtụtụ ndị na-eji Intanet eme ihe na-eche na a dịghị amata aha ndị gara n’Intanet. A na-amata ha. O kwere omume idekọ ọtụtụ ihe ndị e mere n’Intanet, gụnyere ógbè akụkọ ma ọ bụ ihe ndekọ nke onye na-eji Intanet eme ihe mepere nakwa ógbè ndebe ihe nke ọ gara na ya. . . . Ihe ndekọ nke ‘usoro onye na-eji Intanet eme ihe si achọ ihe n’Intanet’ . . . pụrụ ịbụ ihe bara uru nke a na-esi na ya enweta ego . . . Ihe ọmụma a bara uru iji duzie ndị na-ere ahịa inweta ndepụta nke ha ga-eji lekwasị nnọọ ndị ụfọdụ na-eji Intanet eme ihe anya kpọmkwem bụ́ ndị nwere otu ụdị ihe na-amasị ha nakwa otu ụdị àgwà.”

Olee ụzọ ọzọ aha gị pụrụ isi banye ná ndepụta aha nke ụlọ ọrụ mere banyere ndị ahịa ha? A pụrụ idebanye aha gị mgbe i mere nke ọ bụla n’ime ihe ndị na-esonụ:

▪ I dejupụtara kaadị nke na-ekwe nkwa na ngwá ahịa dị n’ọnọdụ dị mma nakwa na ọ bụrụ na o mebie n’oge a kara aka, a ga-edochi ya, ma ọ bụ kaadị e ji edepụta aha na nọmba ngwá ahịa ahụ.

▪ I sonyere klọb, òtù, ma ọ bụ òtù ọrụ ebere ma ọ bụkwanụ nye ha onyinye ego.

▪ Ị tụrụ ụtụ magazin, akwụkwọ, ma ọ bụ egwú.

▪ I denyere aha gị na adres gị n’akwụkwọ ịkpọ fon.

▪ I keere òkè na lọtrị ma ọ bụ n’asọmpi ndị ọzọ.

Tụkwasị na nke a, mgbe i ji kaadị e ji akwụ ụgwọ, nke e ji azụrụ ihe n’aka, ma ọ bụ nke na-eme ka e jiri akwụkwọ ndọrọ ego kwụọ ụgwọ ngwá ahịa, ụlọ ọrụ ahụ pụrụ ijikọ aha gị, adres gị na ndepụta nke ihe ndị ị zụrụ n’oge ígwè na-achọpụta ọnụ ahịa ngwá ahịa na-agafe ha. N’ụzọ dị otú ahụ, a pụrụ inwe ihe ndekọ zuru ezu nke otú i si azụ ihe, ikekwe, jiri ha mee ihe maka ire ahịa. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 32 Ihe ọmụma e nwetara n’Ógbè Ndebe Ihe Ọmụma nke Privacu Rights Clearinghouse.

[Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Iledo mmadụ ọ̀ na-ebelata mpụ?