Ilu 25:1-28
25 Ilu ndị a sokwa n’ilu Solomọn tụrụ.+ Ọ bụ ndị na-ejere Hezekaya+ eze Juda ozi dere ha:
2 A na-eto Chineke n’ihi ihe ọ ma ndị mmadụ na-amaghị.+
A na-akwanyekwara ndị eze ùgwù maka na ha na-esi imi n’ala achọpụta ihe.
3 Otú ahụ eluigwe si dị elu, ụwa emiekwa emie,Ka a na-enweghịkwa ike ịchọpụta ihe dị ndị eze n’obi.
4 Nụchaa ọlaọcha ma wepụsịa irighiri ihe na-adịghị mma na ya,Ọlaọcha ahụ ga-aghọ ezigbo ọlaọcha.+
5 Chụpụ onye ajọ omume n’ihu eze,Ezi omume ga-eme ka ọchịchị* eze kwụsie ike.+
6 Ebulila onwe gị elu n’ihu eze,+Agakwala nọrọ n’ebe ndị ukwu nọ,+
7 N’ihi na ọ ka mma na ọ sịrị gị: “Gbagote ebe a,”Kama imechu gị ihu n’ihu onye a ma ama.+
8 Ya adịla gị ọsọ ọsọ ịgba onye agbata obi gị akwụkwọ.
Gịnịzi ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o menye gị ihere?+
9 Rịọ onye agbata obi gị arịrịọ ka gị na ya kpezie,+Ma akọsala ihe a gwara gị nke a na-achọghị ka ndị ọzọ nụ,+
10 Ka onye nụrụ ihe i kwuru wee ghara imenye gị ihere,Ya abụrụ na ị kọsaala akụkọ ọjọọ nke ị na-enweghịzi ike ime ka ndị ọzọ ghara ịnụ.
11 Otú apụl ndị e ji ọlaedo kpụọ si ama mma ma e tinye ha n’efere e ji ọlaọcha kpụọKa okwu e kwuru n’oge kwesịrị ekwesị si adị mma.+
12 Otú ahụ e si eji ọla ntị e ji ọlaedo rụọ nakwa ihe e ji achọ mma e ji ezigbo ọlaedo rụọ akpọrọ iheKa onye na-anabata aka ná ntị onye ma ihe na-adọ ya na-eji onye ahụ na-adọ ya aka ná ntị akpọrọ ihe.+
13 Otú ahụ snoo si eme ka ahụ́ jụọ mmadụ oyi n’oge okpomọkụ mgbe a na-ewe ihe ubiKa onye ozi a tụkwasịrị obi na-eme ka obi ruo ndị dunyere ya ozi ala,N’ihi na ọ na-eme ka obi dị nna ya ukwu mma.+
14 Onye ji onyinye ọ na-enyebeghị enye na-etu ọnụDị ka ebe mmiri rujuru n’elu, ifufe efeekwa, ma mmiri ezoghị.+
15 Ọ bụ ndidi ka e ji enweta obi onyeisi,Okwu ọma na-emekwa ka obi jụrụ mmadụ.*+
16 Ị hụ mmanụ aṅụ, rachaa naanị nke ga-ezuru gị,N’ihi na ị rachaa ya gafee ókè, i nwere ike ịgbọ ya.+
17 Adịla na-aga n’ụlọ onye agbata obi gị mgbe niile,Ka ihe gị ghara ịgbụ ya, ya akpọọ gị asị.
18 Onye na-agbagide onye agbata obi ya akaebeDị ka okpiri e ji alụ agha na mma agha nakwa akụ́ ọnụ ya pịrị apị.+
19 Mmadụ ịtụkwasị onye a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi* obi n’oge nsogbuDị ka ebe mmadụ ji ezé gbajiri agbaji na-ata ihe ma ọ bụ ebe mmadụ ji ụkwụ ya nke na-ama jijiji na-aga ije.
20 Onye na-abụrụ onye obi na-adịghị mma abụDị ka onye yipụrụ uwe ya n’ụbọchị oyi na-atụ,Ọ dịkwa ka ịwụsa mmanya gbara ụka n’elu akanwụ.*+
21 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị,* nye ya nri ka o rie.
Ọ bụrụ na mmiri na-agụ ya, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ,+
22 N’ihi na i mee otú ahụ, ị na-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya,*+Jehova ga-akwụkwa gị ụgwọ.
23 Ifufe nke si n’ebe ugwu na-eme ka nnukwu mmiri zoo,Ire onye na-agba asịrị na-akpasukwa mmadụ iwe.+
24 Ọ ka mma na mmadụ gara biri n’otu akụkụ elu ụlọKama ya na nwaanyị na-esekarị okwu ibi n’otu ụlọ.+
25 Akụkọ ọma nke si n’ala dị anyaDị ka mmiri jụrụ oyi nke na-eme ka onye* ike gwụrụ nweta ume.+
26 Onye ezi omume nke kwere ka onye ajọ omume mebie yaDị ka isi iyi a gbarụrụ agbarụ na olulu mmiri e metọrọ emetọ.
27 Ịracha mmanụ aṅụ gafee ókè adịghị mma,+Mmadụ ịchọ ka a na-eto ya adịghịkwa mma.+
28 Onye na-anaghị ejide onwe ya ma a kpasuo ya iweDị ka obodo a kwaturu mgbidi ya akwatu.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ocheeze.”
^ Na Hibru, “Ire ọma na-agbajikwa ọkpụkpụ.”
^ O nwere ike ịbụ, “onye aghụghọ.”
^ Akanwụ e kwuru okwu ya n’ebe a bụ ihe a na-egwute n’ala. E tinye ya ná mmanya gbara ụka, ọ na-eji ike gbọpụtasịa ụfụfụ.
^ Na Hibru, “onye kpọrọ gị asị.”
^ Ya bụ, ime ka obi onye ahụ jụrụ.
^ Na Hibru, “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

