Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mpụ Obi Ọjọọ”

“Mpụ Obi Ọjọọ”

 “Mpụ Obi Ọjọọ”

MARIA * ghọrọ nwatakịrị akwụna mgbe ọ dị afọ 14. Ọ malitere ibi ụdị ndụ a rụrụ arụ n’ihi isi ọnwụ nke nne ya, bụ́ onye gwara ya na ọ mara mma nakwa na ụmụ nwoke ga-enwe nnọọ mmasị n’ebe ọ nọ. E wezụga nke ahụ, ọ ga-akpata nnukwu ego. N’uhuruchi, nne Maria na-akpọga ya n’ụlọ ndị ọbịa, bụ́ ebe ha na-ezute ụmụ nwoke. Nne ya na-anọ nso n’ebe ahụ iji nata ego a ga-akwụ ya. Kwa abalị, Maria na-esoro ụmụ nwoke atọ ma ọ bụ anọ enwe mmekọahụ.

Na nso ebe Maria bi, a manyekwara Carina, bụ́ onye dị afọ 13, ịgba akwụna. Dị nnọọ ka ọtụtụ ezinụlọ ndị ọzọ bi n’ógbè ha bụ́ ebe a na-arụ ọrụ n’ugbo okpete, ezinụlọ Carina, bụ́ ndị na-akpata obere ego, mere ndokwa ka ọ gbawa akwụna iji kpatakwuo ego. N’ebe ọzọ, Estela kwụsịrị ịga akwụkwọ na nwata, n’amaghịdị otú e si agụ na otú e si ede, ọ malitekwara ịrụ ọrụ dị ka onye akwụna nke na-anọ n’okporo ámá. Daisy kwa dị ihe dị ka afọ isii mgbe otu n’ime ụmụnne ya ndị nwoke metọrọ ya n’ụzọ mmekọahụ—nke mbụ n’ime ọtụtụ ugboro ụmụnne ya dinara ya n’ike. Ọ ghọrọ onye akwụna mgbe ọ dị afọ 14.

 N’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, nsogbu nke ụmụaka ịgba akwụna bụ ihe dị adị nke dị egwu. Ihe ndị na-esi na ya apụta dị mwute. Ụmụaka ndị na-agba akwụna, ma ọ̀ bụ ndị na-agba ya mgbe ụfọdụ ma ọ bụ oge nile, na-etinyekarị aka na mpụ nakwa n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ọtụtụ n’ime ha na-enwe nkụda mmụọ, na-enwekwa mmetụta nke abaghị uru, ha adịghị enwe atụmanya ọ bụla na ha pụrụ isi n’ụzọ ndụ ha rụrụ arụ nwere onwe ha.

Ndị a ma ama maara na ụmụaka ịgba akwụna na-enwe mmetụta na-emebi ihe. Fernando Henrique Cardoso, onye bụ́bu president Brazil kwuru n’ụzọ dabara adaba, sị: “Ụmụaka ịgba akwụna bụ mpụ obi ọjọọ.” Otu akwụkwọ akụkọ Brazil bipụtara ihe a na-akpali iche echiche e kwuru banyere ụmụaka ịgba akwụna, sị: “Mba ndị omume dị otú ahụ jupụtara na ha, bụ́ ebe ndị a na-adịghị eme ihe ọ bụla banyere ya, ebe a na-anakwere, na ọbụna na-achọsi ya ike n’ihi [ego] ọ na-eweta, na-ahụ mbibi ọ na-akpata kwa ụbọchị. Ọ dịghị ihe akụ̀ na ụba ọ bụla a pụrụ inweta na ya pụtara ma e were ya tụnyere ọdachi ndị omume dị otú ahụ na-ewetara ndị mmadụ, ezinụlọ, na ọha na eze.”

Ma, n’agbanyeghị ezi nzube nke ndị chọrọ ịkwụsị ụmụaka ịgba akwụna, nsogbu ahụ na-akawanye njọ. Gịnị na-akpata ọnọdụ a dị egwu? N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji anabata ma ọ bụ ọbụna na-akwado mpụ dị otú ahụ?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ụfọdụ dị n’usoro isiokwu a bu ụzọ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

“Ụmụaka ịgba akwụna bụ mpụ obi ọjọọ.”—FERNANDO HENRIQUE CARDOSO, ONYE BỤ́BU PRESIDENT BRAZIL

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

“Ụdị nile nke imegbu mmadụ n’ụzọ mmekọahụ na-emebi ùgwù mmadụ, n’ihi ya kwa, ọ na-emebi ihe ndị bụ́ isi ruuru mmadụ, n’agbanyeghị afọ ndụ, agbụrụ, ebo ma ọ bụ ọnọdụ nke onye ahụ a na-emegbu, n’agbanyeghịkwa ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.”—UNESCO SOURCES.