Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Dị Njọ n’Ịghọ Aghụghọ n’Ule?

Gịnị Dị Njọ n’Ịghọ Aghụghọ n’Ule?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Dị Njọ n’Ịghọ Aghụghọ n’Ule?

“Ọ dịghị onye na-amaghị na ịghọ aghụghọ ule dị njọ, ma ọ dị mfe.”—Jimmy, bụ́ onye dị afọ 17.

Ọ̀ DỊTỤWO mgbe a nwara gị inyorotụ ihe n’akwụkwọ azịza ule nke nwa klas gị? Ya bụrụ otú ahụ, ọ bụghị nanị gị. Jenna, bụ́ onye nọ na klas nke 6 n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, na-ekwu otú ọtụtụ n’ime ụmụ klas ya si aghọ aghụghọ ule n’emeghị ihere, sị: “Ha na-etu ọnụ banyere otú ha na-esi eme ya,” ka ọ na-ekwu. “Ọ bụrụ na ị dịghị aghọ aghụghọ ule ha ga-ele gị anya dị ka onye iberibe!”

N’otu nnyocha e mere na United States, pasent 80 nke ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị na-enweta akara ule kasị elu kwetara na ha na-aghọ aghụghọ ule, e jideghịkwa pasent 95 nke ndị a “na-etuta ugo.” Mgbe Òtù Josephson Na-ahụ Maka Ụkpụrụ Omume mesịrị nnyocha n’ebe ihe karịrị ụmụ kọleji 20,000 nọ, ha kwubiri, sị: “A bịa n’ihe banyere ịkwụwa aka ọtọ na ime ihe n’eziokwu, ihe na-akawanye njọ.” Ókè ịghọ aghụghọ ule si jupụta n’ebe nile na-eju ndị nkụzi anya! Onyeisi ụlọ akwụkwọ bụ́ Gary J. Niels ruru n’ókè nke ikwu, sị: “Ndị na-adịghị aghọ aghụghọ ule ka nta n’ọnụ ọgụgụ.”

Ihe ka ọtụtụ ná ndị nne na nna na-atụ anya ka ụmụ ha na-akpa àgwà n’ụzọ kwesịrị nsọpụrụ ma a bịa n’ihe banyere ọrụ ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị na-eto eto adịghịzi eme ihe n’eziokwu site n’ịghọ aghụghọ ule. Olee ụzọ ọhụrụ ndị ha na-eji eme ihe? N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ntorobịa ji amalite ịghọ aghụghọ n’ule? N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji zere omume ahụ?

Iji Ngwá Ndị Bụ́ Ọkpọka Aghọ Aghụghọ Ule

Ndị na-aghọ aghụghọ ule n’oge a nwere ọtụtụ ụzọ aghụghọ ha si eme otú ahụ. N’eziokwu, ịghọ aghụghọ ule site n’idere ihe site n’akwụkwọ e ji eme ihe omume n’ụlọ ma ọ bụ iji mpempe akwụkwọ e deturu azịza nke ajụjụ dị iche iche eme ihe enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ha tụnyere ụzọ ndị bụ́ ọkpọka a na-eji eme ihe taa. Ha na-agụnye ojiji a na-eji ígwè ozi pager bụ́ nke na-anata azịza nke ajụjụ ndị a jụrụ n’ule, bụ́ nke onye nọ ebe ọzọ zitere; ígwè mgbakọ ndị e buru ụzọ “tinyekwuo” ihe ọmụma na ha; kamera pere ezigbo mpe bụ́ ndị a na-ezo n’ime uwe, bụ́ ndị a na-eji ezigara onye enyemaka nọ n’ebe ọzọ ajụjụ dị iche iche; ngwá electronic ndị nwere ihe mgbaàmà na-adọta ozi nke mmadụ na-eji ezigara nwa klas ya nọdebere ya ozi; na ọbụna ógbè Intanet ndị nwere azịza nke ule taam n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ihe ọmụmụ ọ bụla!

Ndị nkụzi na-agbalị ịkwụsị ụdị aghụghọ a dị egwu a na-aghọ n’ule, ma nke ahụ adịghị mfe. E kwuwerị, ọ bụghị ụmụ akwụkwọ nile—ma ọ bụ ndị nkụzi nile—na-ekweta na ihe e lere anya dị ka ịghọ aghụghọ ule bụ ya n’ezie. Dị ka ihe atụ, mgbe ìgwè ụmụ akwụkwọ na-emekọ otu ihe omume ọnụ, e nwere ike a gaghị amatacha ọdịiche dị n’etiti imekọ  ihe ọnụ n’ụzọ ịkwụwa aka ọtọ na imekọ ihe ọnụ n’ụzọ akwụwaghị aka ọtọ. Ọzọkwa, e nwere ndị pụrụ iji n’ihi na ha na-emekọ ihe n’ìgwè hapụrụ ndị ọzọ ihe omume ahụ nile ka ha mee. “Ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ndị a dị nnọọ umengwụ—ha adịghị eme ihe ọ bụla!” ka Yuji, bụ́ onye na-aga kọleji gọọmenti na-ahụ maka ya, na-ekwu. “E mesịa ha na-enwetakwa otu akara ule ahụ ndị ọzọ nwetara. Echere m na nke ahụ bụkwa ịghọ aghụghọ ule!”

N’ihi Gịnị Ka Ha Na-eji Aghọ Aghụghọ Ule?

N’otu nnyocha e mere, a chọpụtara na emeghị nkwadebe bụ isi ihe mere ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-eji ahọrọ ịghọ aghụghọ n’ule. Ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ, n’ịbụ ndị mmụọ ịma aka e nwere n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ihe dị ukwuu ndị mụrụ ha na-atụ anya n’aka ha, kwaliri, na-ekwubi na ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime ma ọ bụghị ịghọ aghụghọ n’ule. “Nanị ihe ndị mụrụ m na-ekwu okwu ya bụ akara ule,” ka Sam, bụ́ onye dị afọ 13, na-ekwu. “Ha na-ajụ m, sị: “Gịnị ka i nwetara n’ule unu lere ná mgbakọ na mwepụ? Gịnị ka i nwetara n’ule unu lere n’asụsụ Bekee?’ Adịtụdịghị m achọ iji ntị anụ ya!”

Nye ụfọdụ ndị, nrụgide a na-arụgide ha mgbe nile ka ha nweta akara ule dị elu na-eduga ha n’ịghọ aghụghọ n’ule. Akwụkwọ bụ́ The Private Life of the American Teenager na-ekwu, sị: “E nwere ihe na-adịzighị adịzi n’etiti ọha mmadụ ebe a na-enwe nrụgide nke ukwuu nke na a na-elekwasịkarịzi anya n’inweta akara ule dị elu karịa n’inweta afọ ojuju na-abịa site n’ịmụta ihe, mgbe ụfọdụ ọ na-akpata emeghịzi ihe n’eziokwu.” Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ kwetara na nke a bụ eziokwu. E kwuwerị, ọ dịghị onye chọrọ ịda ule, ma ya fọdụkwa ihe ọmụmụ ahụ dum. “Ụfọdụ ndị na-atụ nnọọ egwu na ha ga-ada,” ka Jimmy, bụ́ nwa akwụkwọ sekọndrị, na-ekwu. “Ọ bụrụgodị na ha maara azịza ya, ha ga-aghọ aghụghọ ule iji jide n’aka na ha maara ya.”

Ịdị elu nke ọnụ ọgụgụ ndị dị njikere ịhapụ ụkpụrụ nke ime ihe n’eziokwu pụrụ ime ka ịghọ aghụghọ ule yie ihe na-adịghị njọ. Mgbe ụfọdụkwa, ọ pụrụ iyi ihe bara nnọọ uru. “Ụnyaahụ, ahụrụ m otu nwatakịrị na-aghọ aghụghọ n’ule anyị nọ na-ele,” ka Greg, bụ́ onye dị afọ 17, na-ekwu. “Mgbe e nyere anyị akwụkwọ ule anyị taa, o nwetara akara ule dị elu karịa m.” Ọtụtụ ndị na-abụ ndị njupụta nke ịghọ aghụghọ ule nwere mmetụta n’ebe ha nọ. “Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na-eche na ‘ọ bụrụ na ndị ọzọ na-eme ya, aghaghị m ime ya,’” ka Yuji na-ekwu. Ma nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?

Ihe Na-eri Mmadụ Ahụ́ Bụ́ nke Dị Aghụghọ

Jiri ịghọ aghụghọ n’ule tụnyere izu ohi. Eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ ndị na-amalite izu ohi ọ̀ na-eme ka ọ bụrụ ihe ziri ezi? ‘Ọ dịghị ma ọlị,’ ka ị pụrụ ikwu—karịsịa ma ọ bụrụ na ọ bụ ego gị ka e zuuru! Site n’ịghọ aghụghọ ule, anyị na-anara otuto maka ihe na-ekwesịghịrị anyị—ikekwe ọbụna na-aghọgbu ndị mere ihe n’ụzọ ziri ezi. (Ndị Efesọs 4:28) “O zitụdịghị ezi,” ka Tommy, bụ́ onye gụsịrị ụlọ akwụkwọ sekọndrị na nso nso a, na-ekwu. “Ị na-ekwu, sị, ‘Amaara m ihe a,’ mgbe ị na-amaghịkwanụ ya. N’ihi ya, ị na-agha ụgha.” E gosipụtara echiche Bible banyere nke a n’ụzọ doro anya ná Ndị Kọlọsi 3:9: “Unu adịla na-aghara ibe unu ụgha.”

Ịghọ aghụghọ n’ule pụrụ ịghọ ihe riri mmadụ ahụ́ nke siri ike nkwụsị. “Ndị na-aghọ aghụghọ n’ule na-achọpụta na ọ dịghịdị mkpa na ha ga-amụ ihe iji gafee n’ule,” ka Jenna na-ekwu, “n’ihi ya ha na-adabere nnọọ n’ịghọ aghụghọ ule. Mgbe ahụkwa, ọ bụrụ na ha anọrọ nke ha, ha agaghị ama otú ha ga-esi ebi ndụ nwere ihe ịga nke ọma.”

Ụkpụrụ dị ná Ndị Galeshia 6:7 na-akpali iche echiche: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.” Ihe ndị na-esi n’ịghọ aghụghọ ule apụta pụrụ ịgụnye ịbụ onye akọ na uche ya na-enye nsogbu, ịbụ onye ndị enyi ya na-enwekwaghị ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ, na ịbụ onye na-enwechaghị ikike ịmụta ihe ngwa ngwa n’ihi agbasoghị usoro ọmụmụ ihe. Dị ka ọrịa cancer nke bịara dị oké njọ, ụdị aghụghọ a pụrụ ịgbasa ma metụta akụkụ ndị ọzọ nke ndụ, ọ pụkwara imebi mmekọrịta ị kasị jiri kpọrọ ihe. N’ezie, ọ ga-emetụta nnọọ mmekọrịta gị na Chineke, bụ́ onye omume aghụghọ na-adịghị amasị.—Ilu 11:1.

Ndị na-adabere n’ịghọ aghụghọ ule na-aghọgbu  onwe ha. (Ilu 12:19) Site n’omume ha, ha na-eme ihe yiri nke ndị ọchịchị rụrụ arụ nke obodo ochie bụ́ Jeruselem mere: “Anyị emewo ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị, ọ bụkwa n’okwu ụgha ka anyị zobeworo onwe anyị.” (Aịsaịa 28:15) Otú ọ dị, n’ikwu eziokwu, onye na-aghọ aghụghọ n’ule apụghị izochi omume ya n’anya Chineke.—Ndị Hibru 4:13.

Aghọla Aghụghọ n’Ule!

N’ọtụtụ ọnọdụ, ndị ntorobịa na-etinye mgbalị dị ukwuu ma jiri nnọọ ọgụgụ isi mee ihe n’ịghọ aghụghọ ule—bụ́ nke ga-abara ha uru ma ọ bụrụ na ha etinye ha n’inweta agụmakwụkwọ n’ụzọ ziri ezi. Dị ka Abby, bụ́ onye dị afọ 18, si kwuo ya, “ọ bụrụ na ha etinye onwe ha n’ịmụta ihe otú ha na-esi etinye onwe ha n’ịghọ aghụghọ ule, ikekwe ha ga-eme nnọọ nke ọma.”

N’eziokwu, ọnwụnwa nke ịghọ aghụghọ n’ule pụrụ isi ike. Ma ị ghaghị izere omume ọjọọ a! (Ilu 2:10-15) Olee otú ị pụrụ isi mee nke ahụ? Nke mbụ, cheta ihe mere i ji aga akwụkwọ—iji mụta ihe. N’eziokwu, ọ pụrụ iyi ka ọ baghị uru inweta ọtụtụ ihe ọmụma ndị ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị eji mee ihe. Ma site n’ịmafere usoro a site n’ịghọ aghụghọ ule, onye ahụ na-ebelata ikike o nwere ịmụta ihe ọhụrụ nakwa iji ihe ọmụma mee ihe bara uru. A dịghị enweta ezi nghọta n’emeghị mgbalị ọ bụla; ọ na-efu ihe. Bible na-ekwu, sị: “Zụta eziokwu, erekwala ya; ee, amamihe, na ịdọ aka ná ntị, na nghọta.” (Ilu 23:23) Ee, ọ dị gị mkpa iji ịmụ ihe na ime nkwadebe kpọrọ ihe. “Ị ghaghị ịmụsi ihe ike,” ka Jimmy na-atụ aro ya. “Ọ ga-eme ka i nwee obi ike na ị maara azịza ya.”

N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, e nwere ike ị gaghị ama azịza nke ajụjụ nile, nke a pụkwara ime ka i nwee akara ule dịtụ ala. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ị dịghị eme ihe megidere ụkpụrụ gị, ị pụrụ ịhụ ihe ọ dị mkpa ka i mee ka ihe kawanye mma.—Ilu 21:5.

Yuji, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ na-akọwa ihe ọ na-eme mgbe ụmụ klas ya ndị ọzọ rụgidere ya ka o nyere ha aka n’ule: “Nke mbụ—ana m eme ka ha mara na abụ m Onyeàmà,” ka ọ na-ekwu. “Nke ahụ enyeworo m aka nke ukwuu n’ihi na ha maara na Ndịàmà Jehova bụ ndị na-eme ihe n’eziokwu. Ọ bụrụ na mmadụ agwa m ka m gwa ya azịza nke otu ajụjụ mgbe a na-ele ule, nanị ihe m na-asị ya bụ ee e. Mgbe e mesịrị, aga m akọwara ya ihe mere na adịghị m eme ya.”

Yuji kwenyere n’ihe Pọl onyeozi gwara ndị Hibru: “Anyị na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Gị ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ dị elu nke ime ihe n’eziokwu na ịjụ imebi ụkpụrụ gị site n’ịghọ aghụghọ ule na-eme ka akara ule i nwetara baa uru n’ezie. Ị na-ewelata otu n’ime onyinye ndị kasị mma ị pụrụ inye ndị mụrụ gị—ihe àmà nke iguzosi ike n’ezi ihe nke Ndị Kraịst. (3 Jọn 4) Ọzọkwa, ị na-anọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha ma nwee ọṅụ nke ịmata na ị na-eme ka obi Jehova Chineke ṅụrịa.—Ilu 27:11.

Ya mere, n’agbanyeghị otú ọ bụruru ihe zuru ebe nile, zere ịghọ aghụghọ n’ule! Site n’ime otú ahụ, ị ga-ejigide ezi mmekọrịta gị na ndị ọzọ nakwa, nke kasị mkpa, nke gị na Chineke nke eziokwu, bụ́ Jehova.—Abụ Ọma 11:7; 31:5.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]

Onye na-aghọ aghụghọ ule adịchaghị achọpụta na ọ na-ezu ohi n’ezie

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]

Ịghọ aghụghọ ule na-edubakarị n’omume ndị ka njọ nke emeghị ihe n’eziokwu

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Onye na-aghọ aghụghọ ule apụghị izochi omume ya n’anya Chineke

[Foto dị na peeji nke 27]

Ịmụ ihe nke ọma tupu i lee ule ga-eme ka i nwee obi ike