Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 13. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Olee ebe Mozis na Erọn nọ n’oge ahụ ha na-edoghị Jehova nsọ, wee si otú ahụ tụfuo ihe ùgwù nke ịbanye n’Ala Nkwa ahụ? (Ọnụ Ọgụgụ 20:12, 13)

2. Ìgwè ahụ wakporo ma zuru ehi na nne ịnyịnya ibu Job ma gbuo ndị na-ejere ya ozi, hà bụ ole ndị? (Job 1:14, 15)

3. N’ime ndị enyi atọ Daniel, olee onye nke a kpọrọ aha ahụ bụ́ Mishak mgbe ha nọ na Babilọn? (Daniel 1:7)

4. Olee mkpụrụ nke mmụọ nsọ a kpọrọ aha ozugbo a kpọsịrị ịhụnanya? (Ndị Galeshia 5:22)

5. Olee ebe mmụọ ozi ahụ dị ike tụbara “nkume [ahụ] yiri nnukwu nkume igwe nri” iji gosi mbibi dị ngwa a ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ? (Mkpughe 18:21)

6. Onyinye ndị dị aṅaa ka Gihezi ji ụgha rịọ Neeman n’aha Ịlaịsha? (2 Ndị Eze 5:22)

7. Olee Eze Amọraịt nke na-ekweghị ka ụmụ Izrel si n’alaeze ya gafere, n’agbanyeghị na ha kwere nkwa na ha agaghị aṅụ ọbụna mmiri n’ebe ahụ? (Ọnụ Ọgụgụ 21:21-23)

8. Ònye resịrị Ebreham ọgba Makpila iji lie Sera? (Jenesis 23:8-10)

9. Dị ka Ilu 29:25 si kwuo, nsogbu dị aṅaa na-abịa site ‘n’ịtụ egwu mmadụ,’ oleekwa otú a pụrụ isi zere nke a?

10. Olee nke atọ a kpọpụtara n’ime mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke? (Ndị Galeshia 5:22)

11. Olee ihe Finehas mere nke tọrọ Jehova ụtọ, bụ́ nke mekwara ka ihe otiti ahụ gburu ụmụ Izrel 24,000 kwụsị? (Ọnụ Ọgụgụ 25:6-14)

12. Bath, kab, cor, ephah, hin, homer, log, omer, na mgbé hà bụcha gịnị? (Ọpụpụ 16:16)

13. Gịnị ka ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem gụnyere dị ka ‘ihe ndị dị mkpa’ n’oge ha na-edegara ụmụnna nọ n’Antiọk, Siria, na Silisia akwụkwọ? (Ọrụ 15:28, 29)

14. N’ihi gịnị ka eze nwanyị Sheba ji mee ogologo njem gaa Jeruselem? (1 Ndị Eze 10:4)

15. Gịnị bụ akụkụ pụrụ iche nke mkpọkọta nsọ nile ndị Jehova gwara mba Izrel ka ha na-enwe? (Levitikọs 23:7)

16. N’ime Oziọma anọ ahụ, olee nke kasị dị mkpirikpi?

17. Mgbe ìgwè mmadụ bịara ijide Jizọs, ònye ka Pita gburu mma agha, wee bepụ ntị aka nri ya? (Jọn 18:10)

18. Olee asụsụ atọ ndị e ji dee Bible ná mmalite? (Ezra 4:7; Mkpughe 9:11)

19. Olee ndị a maara n’ụzọ bụ́ isi dị ka ndị na-agagharị agagharị, na-ebi n’ụlọikwuu ma na-ebi ndụ nke ndị na-azụ atụrụ? (Jeremaịa 3:2)

20. N’ihi gịnị ka e ji gwa ụmụ Izrel ka ha ghara iwesị ihe ndị dị n’akụkụ ubi ha? (Levitikọs 19:9, 10)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Mmiri Meriba

2. Ndị Sheba

3. Mishael

4. Ọṅụ

5. N’oké osimiri

6. “Otu talent ọlaọcha, na uwe mgbanwe abụọ”

7. Saịhọn

8. Efrọn onye Het

9. Ọ na-eweta ọnyà. Site n’ịtụkwasị Jehova obi

10. Udo

11. O gburu onyeisi nke ndị Simiọn ahụ bụ́ Zimraị na nwanyị Midian ahụ Zimraị kpọbatara n’ụlọikwuu ya maka ịkwa iko

12. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀

13. “Ịnọgide na-ezere ihe ndị a chụrụ n’àjà nye arụsị, nakwa ọbara na anụ ndị a nyagburu anyagbu na ịkwa iko”

14. ‘Iji hụ amamihe nile nke Solomọn’

15. Ọ dịghị ozi ọ bụla nke ofufe ha ga-eje

16. Mak

17. Malkọs, bụ́ ohu nnukwu onye nchụàjà

18. Hibru, asụsụ Siria, na Grik

19. Ndị Arebia

20. Iji hapụrụ ‘ogbenye na ọbịa’ ọka ụfọdụ