Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Onye Na-ele Gị?

Ọ̀ Dị Onye Na-ele Gị?

 Ọ̀ Dị Onye Na-ele Gị?

KWA ụbọchị, Elizabeth bịa ọrụ, a na-eji otu kamera na-enyo ihe nile ọ na-eme. Ka ọ na-abanye n’ụlọ ọrụ ahụ, otu kamera na-amalite inyo ya. N’ụbọchị, a na-anọgide na-eji ọtụtụ kamera ndị ọzọ enyo ihe ọ na-eme. Ọ̀tụ̀tụ̀ nnyochagharị a kwere nghọta n’ihi na Elizabeth na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-agụ ọtụtụ nde dollar kwa ụbọchị.

Elizabeth maara na a ga na-eledo ya nnọọ n’ebe ọrụ; a kọwaara ya nke a nke ọma mgbe ọ naara ọrụ ahụ. Otú ọ dị, nye ọtụtụ nde ndị ọzọ, ọ̀tụ̀tụ̀ nnyocha a na-enyocha ha nwere ike ghara ịbụ nke a kọwapụtara n’ụzọ doro anya otú a.

 Ibi n’Ọgbọ Nledo

À na-eledo gị n’ebe ọrụ? N’ụwa nile, a na-enyochakarị otú ọtụtụ nde ndị e were n’ọrụ si eji Intanet na ozi E-mail eme ihe mgbe ha na-arụ ọrụ. Nnyocha kwa afọ nke Òtù America Na-ahụ Maka Ụlọ Ọrụ mere na 2001 gosiri na “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ (73.5%) nke ụlọ ọrụ ndị bụ́ isi dị na United States . . . na-edekọ, na-atụle nkwurịta okwu ma na-enyocha ihe omume nke ndị ọrụ ha n’oge ọrụ, gụnyere ịkpọ fon, izipụ ozi e-mail, ịga n’Intanet na ebe ndị e chekwara ihe na kọmputa.”

Gọọmenti na-emefu nnukwu ego ná ngwá ọrụ ndị e ji eledo mmadụ. Akụkọ e nyere Nzukọ Ndị Isi Europe na July 11, 2001, kwubiri na “e nweela usoro zuru ụwa ọnụ nke isi na-ege ntị ná nkwurịta okwu ndị mmadụ, bụ́ nke na-arụ ọrụ site ná njikọ aka . . . nke USA, United Kingdom, Canada, Australia na New Zealand.” Site ná ngwá ọrụ ndị na-eji ígwè ọrụ satellite anata ozi gburugburu ụwa, bụ́ ngwá ọrụ a maara dị ka ECHELON, a sịrị na gọọmenti ndị a nwere ike inweta ma nyochaa ozi telifon, fax, Intanet, na nke E-mail bụ́ ndị sitere n’ígwè ọrụ satellite. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Australian na-azọrọ na mgbe gọọmenti dị iche iche ji ígwè ọrụ a na-eme ihe, “a pụrụ ịhọpụta ozi fax na e-mail ndị a chọrọ kpọmkwem, nakwa na ọ bụrụ na a rụrụ ígwè ọrụ ahụ ịmata otu ụda olu kpọmkwem, a pụkwara ịchọpụta fon ndị ndị nwe ụda olu ahụ kpọrọ.”

Ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka idebe iwu na-adaberekwa n’ụzọ ọgbara ọhụrụ ndị e si eledo mmadụ. Na United States, magazin bụ́ BusinessWeek na-akọ na ndị FBI nwere ngwá ọrụ a na-akpọ Carnivore, nakwa na ha na-eji ya “enyocha ozi e-mail, ozi ndị na-apụta na kọmputa n’egbughị oge, nakwa fon ndị na-egosipụta nọmba onye kpọrọnụ.” Ka ọ dịgodị, na Britain, iwu ọhụrụ e mere ga-enye ndị na-ahụ maka idebe iwu ikike “iledo ọtụtụ ndị na-akpọ fon, na ndị na-eji ígwè ozi fax na Intanet eme ihe,” ka Akụkọ Ụwa BBC na-ekwu.

Kamera Ndị E Zoro Ezo na Ihe Ndekọ Zuru Ezu

Ọbụna mgbe mmadụ na-adịghị eji fon, ozi fax, ma ọ bụ ozi E-mail ezi ma ọ bụ na-anata ozi, a ka pụkwara ịdị na-eledo ya. Na steeti Australia bụ́ New South Wales, a na-eji ihe karịrị kamera 5,500 enyo ndị na-eji ụgbọ okporo ígwè eme njem. N’otu steeti ahụ, ihe dị ka bọs 1,900 ndị gọọmenti nwe buchakwa kamera ndị e ji eledo mmadụ.

A kọrọ na n’ụwa nile, Britain bụ mba kasị nwee kamera ndị ha na-eji eledo ụmụ amaala ha—1 kamera maka mmadụ 55, dị ka otu nnyocha e mere gosiri. N’afọ 1996, e nwere nanị obodo ukwu 74 na United Kingdom bụ́ ebe ndị a na-eji kamera na-eledo ebe ndị ọha na eze na-anọ. Ka ọ na-erule 1999, obodo ukwu 500 etinyewo ngwá ọrụ ndị dị otú ahụ. A na-ejikọ ihe omume kọmputa ndị ọhụrụ na kamera ndị a na-eji eledo mmadụ iji mee ka kamera ndị ahụ nwee ike ịmata otu ihu kpọmkwem, ọ sọkwa onye ahụ ya nọrọ n’etiti ìgwè mmadụ n’ọdụ ụgbọelu ma ọ bụ n’ebe ọha na eze na-agbakọ.

Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, a pụrụ inyocha ihe ndị dịịrị nanị gị na ndụ gị ma ị gaghịdị ama. Simon Davies, onye ntụzi ọrụ nke ìgwè na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ bụ́ Privacy International na-ekwu, sị: “Ma eleghị anya, ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme bụ́ mgbe e nwetaworo ihe ọmụma dị nnọọ ukwuu banyere ụmụ mmadụ n’ozuzu ha. Ná mba ndị mepere emepe, e nwere ihe ọmụma zuru ezu banyere onye ọ bụla toworo eto nke kpatatụwarala ego, n’ihe dị ka ebe nchịkọta ihe ọmụma 400 dị na kọmputa—ihe ọmụma ndị e tinyere na kọmputa bụ́ ndị pụrụ izu iji bipụta otu akwụkwọ ihe ọmụma maka onye nke ọ bụla.”

Olee ihe ndị ị pụrụ ime iji ghara ịbụ onye a gbara ihe ndị dịịrị nanị ya n’anwụ?