Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Echiche Ziri Ezi Banyere Ihe Ndị Dịịrị Nanị Onwe Onye

Echiche Ziri Ezi Banyere Ihe Ndị Dịịrị Nanị Onwe Onye

 Echiche Ziri Ezi Banyere Ihe Ndị Dịịrị Nanị Onwe Onye

“N’EBE NILE Ọ BỤLA KA ANYA ABỤỌ NKE JEHOVA DỊ, NA-ECHE NDỊ ỌJỌỌ NA NDỊ BỤ́ EZI MMADỤ NCHE.”—Ilu 15:3.

Ọ BỤ nanị mmadụ ole na ole ga-enwe ahụ́ iru ala banyere echiche nke mmadụ ọzọ inyocha ihe ọ bụla ha na-eme, na-enyocha ihe ndị ha bu n’uche, na-enyochapụta ọchịchọ dị n’ala ala obi ha. Ka o sina dị, nke a bụ kpọmkwem ihe Bible na-ekwu na Chineke pụrụ ime. Ná Ndị Hibru 4:13, Bible na-ekwu, sị: “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya, ma ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” Nke a ọ́ bụghị inyoba anya n’ihe dịịrị onye ọzọ? Ọ dịghị ma ọlị. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

 Iji maa atụ: Ka ị na-egwu mmiri n’ụsọ osimiri, onye na-agụpụta ndị mmiri na-eri pụrụ ịnọgide na-eledo gị anya. Ị dịghị ele nke a anya dị ka inyoba anya n’ihe dịịrị onye ọzọ. N’eziokwu, ọnụnọ ọ nọ ya na-eme ka i nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe. Ị na-amara na ọ bụrụ na ị baa ná nsogbu, ọ ga-agbatara gị ọsọ enyemaka ngwa ngwa. N’otu aka ahụ, nne na-eledo nwa ya anya mgbe nile. Ọ bụrụ na o meghị otú ahụ, a pụrụ ile ya anya dị ka onye na-eleghara ihe anya.

N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova Chineke na-enyocha echiche na omume anyị n’ihi na o bu ọdịmma anyị kasịnụ n’obi. Otu onye amụma a kpọtụrụ aha na Bible kwuru, sị: “Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Ma ókè hà aṅaa nke echiche na omume anyị na-eme mgbe nanị anyị nọ ka Jehova na-ahụ n’ezie? Ihe omume ụfọdụ metụtara Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke, na-enye ihe ọmụma ụfọdụ.

Ikike nke Ịma Ihe E Bu n’Uche

Mgbe Jizọs nọ na-eri nri n’ụlọ otu onye Farisii, otu nwanyị a maara dị ka onye mmehie bịara ma gbusa ikpere n’ala n’akụkụ ụkwụ Jizọs. Ọ malitere ibe ákwá ma jiri ntutu ya hichapụ anya mmiri ya tasasịrị n’ụkwụ Jizọs. Akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Mgbe ọ hụrụ nke a, onye Farisii ahụ kpọrọ ya òkù kwuru n’ime onwe ya, sị: ‘Nwoke a, a sị na ọ bụ onye amụma, gaara ama onye na-ebitụ ya aka.’” Nzaghachi Jizọs na-egosi na ọ bụghị nanị na ọ maara ọnọdụ nwanyị ahụ, kamakwa, ọ maara ihe onye Farisii ahụ ka kwusịrị nnọọ “n’ime onwe ya.”—Luk 7:36-50.

N’oge ọzọ, otu ìgwè ndị na-akwadoghị ọrụ ebube Jizọs na-arụ bịakwutere ya. Akụkọ ahụ e dekọrọ na Matiu 9:4 na-ekwu, sị: “Jizọs, ebe ọ maara ihe ha na-eche, sịrị: “Gịnị mere unu ji eche ihe dị njọ n’obi unu?’” Ikike Jizọs nwere ịmara ihe ndị ọzọ bu n’uche karịrị nnọọ ịkọ nkọ e ji ọgụgụ isi mee.

Ịtụgharị uche n’ihe ndekọ mbilite n’ọnwụ Lazarọs na-ekpughe na ọ gụnyere ihe dị nnọọ ukwuu. Ezigbo enyi Jizọs bụ́ Lazarọs anwụwo kemgbe ụbọchị anọ. Echiche ya alawo n’iyi, ọ malitewokwa ire ure. (Abụ Ọma 146:3, 4) Mgbe Jizọs nyere ntụziaka ka e meghee ụzọ e si abanye n’ili Lazarọs, nwanne nwanyị Lazarọs bụ́ Mata akwadoghị nke ahụ: “Onyenwe anyị, ka ọ dị ugbu a ọ ghaghị ịbụ na o siwela ísì.” N’agbanyeghị nke ahụ, site n’ike Chineke, Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ, gụnyere ikike ncheta ya nile bụ́ nke dị mkpa iji mee ka Lazarọs bụrụ onye ọ bụ na mbụ.—Jọn 11:38-44; 12:1, 2.

 Ihe Jizọs kwuru banyere ekpere na-egosi na Jehova Chineke nwere ikike nke ịmara ihe dị n’ala ala obi anyị. Tupu ọ kụziere ndị na-eso ụzọ ya ekpere ihe atụ ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Chineke bụ́ Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu tupurị unu arịọ ya.” Jizọs kwukwara, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ nke aka gị, mgbe i mechisịkwara ọnụ ụzọ gị, kpegara Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere; Nna gị bụ́ onye na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụghachi gị.”—Matiu 6:6, 8.

Abamuru nke Ịmara na Chineke Na-ele Anyị

Ịmara na Chineke na-enyocha obi nile ma na-aghọta “nchepụta nile ọ bụla nke echiche” ọ̀ na-eme ka anyị gharazie imegharị ahụ́ ma ọ bụ na-ebelata nnwere onwe anyị? (1 Ihe E Mere 28:9) N’ụzọ megidere nke ahụ, ịmara na ọ dịghị ihe ọ bụla a pụrụ izo ezo n’anya Chineke pụrụ ịkwali anyị ime ihe ndị ziri ezi.

Elizabeth, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu mbụ, na-ekwu na isi ihe mere ya ji na-akwụwa aka ọtọ abụghị n’ihi na a na-eji kamera ndị e ji eledo mmadụ enyo ya n’ebe ọrụ. Kama nke ahụ, ọ na-ekwu, sị: “Eziokwu ahụ bụ́ na m maara na Jehova na-ahụ ihe m na-eme, na-akpali m ịdị na-akwụwa aka ọtọ n’ihe nile m na-eme, ọbụna mgbe m na-anọghị n’ọrụ.”

Jim kwuru ihe yiri nke ahụ. Ọ na-arụ ọrụ n’otu ụlọ mmepụta ihe bụ́ ebe a na-enwekarị nsogbu nke ndị ọrụ izuru ihe na ya. Otú ọ dị, Jim jụrụ izu onye were ya n’ọrụ ohi. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ eziokwu na m pụrụ ịlanahụ ya ma ọ bụrụ na mụ ezuo ohi n’ụlọ ọrụ m, ma eji m mmekọrịta mụ na Chineke kpọrọ ihe, na-amarakwa na ọ na-ahụ ihe nile m na-eme.”

Ịmara na Chineke maara ihe nile anyị na-eme, tinyere ọchịchọ nke iso ya na-enwe ezi mmekọrịta, pụrụ ịkpali mmadụ ime mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ya. Dị ka ihe atụ, a zụlitere Doug n’ezinụlọ Ndị Kraịst, ma o jighị eziokwu ahụ bụ́ na Chineke pụrụ n’ezie ịhụ ihe ndị ọ na-eme kpọrọ ihe. N’ihi ya, o biri ụdị ndụ abụọ. O so ndị ezinụlọ ya na-aga nzukọ Ndị Kraịst ma nke ahụ gasịa, ò soro ndị enyi ya jiri ọgwụ ọjọọ na-eme ihe. Mmasị o nwere n’ebe ọgba tum tum dị dugara ya n’isonyere otu òtù ndị ọgba tum tum a maara dị ka ndị na-eme ihe ike. Iji bụrụ onye ha nabatara, Doug mere mpụ ndị dị oké njọ.

Mgbe afọ ụfọdụ gasịrị, Doug maliteghachiri ịmụ Bible. Ọ malitere ịhụ Jehova dị ka onye dị adị n’ezie nke maara banyere omume ndị mmadụ ma bụrụ onye ọ na-emetụta. A kpaliri Doug ịmalite ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Chineke. N’agbanyeghị na òtù ahụ na-etikarị onye ọ bụla nke hapụrụ òtù ahụ ihe nke ukwuu, Doug gara nzukọ òtù ahụ ma gwa ha n’ihu ha nile na ya esoghịzi n’òtù ha. Ọ  na-echeta, sị: “Mgbe m biliri ọtọ ikwu okwu, obi nọ na-akụ m kpum kpum. Ọ bịara dị m ka ebe Daniel nọ n’olulu ọdụm. Ma ekpegaara m Jehova ekpere n’ime obi m ma jirizie obi umeala kọwaara ha ihe mere m ji ahapụ ha. Mgbe m si n’ebe ahụ pụọ, ha nile, e wezụga otu onye, kwere m n’aka ma sị m ya gazie. Ahụrụ m eziokwu dị n’Aịsaịa 41:13: ‘Mụ onwe m, Jehova, Chineke gị, na-ejidesi aka nri gị ike, bụ́ Onye na-asị gị, Atụla egwu, Mụ onwe m [ga-enyere] gị aka.’” Ọ dị Doug ka Jehova ò nyere ya ume dị ya mkpa iji gbanwee ndụ ya.

Echiche Ezi Uche Dị na Ya

Ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya iche na anyị pụrụ izoro Chineke ihe ezoro. Bible na-ekwu hoo haa, sị: “Onye nzuzu asịwo n’obi ya, Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” (Abụ Ọma 14:1) Dị ka isiokwu ndị bu ụzọ mere ka ọ pụta ìhè, ụmụ mmadụ emepụtawo kamera ndị a na-eji eledo mmadụ bụ́ ndị nwere ike ịmata otu ihu kpọmkwem n’etiti ìgwè mmadụ. Ha emepụtawo ígwè ọrụ ndị na-egeta ihe ndị mmadụ na-ekwurịta, bụ́ nke pụrụ iwepụta otu ụda olu kpọmkwem n’etiti ọtụtụ puku ụda olu ndị na-akpọ telifon. Otú ọ dị, n’ezie, Onye Okike nke ụbụrụ mmadụ nwere ikike nke inyocha echiche nke mmadụ ọ bụla, mgbe ọ bụla O chere na o kwesịrị ekwesị.

Ọ bụ ezie na Onye Okike anyị nwere ikike nke ịmara ihe nile mmadụ na-eme mgbe ọ nọ nanị ya, ụmụ mmadụ enweghị ikike dị otú ahụ. Pita onyeozi na-adụ ndị nile nwere mmasị inweta ihu ọma Chineke ọdụ, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịta ahụhụ dị ka . . . onye ajọ omume ma ọ bụ dị ka onye na-enyonye anya n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ.” (1 Pita 4:15) Pọl onyeozi na-adọkwa aka ná ntị megide itinye ọnụ “n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ.”—1 Timoti 5:13.

Ihe atụ nke ‘inyonye anya’ na itinye ọnụ “n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ” n’ụzọ gabigara ókè bụ omume na-akawanye njọ ná mba ụfọdụ bụ́ nke ndị nkịtị iji teepu ma ọ bụ vidio ndị pere mpe nke ukwuu na-ege ihe ndị ọzọ na-ekwu ma ọ bụ na-enyo ha. Dị ka ihe atụ, na Japan, onye na-agba ọsọ marathon bụ́ Naoko Takahashi, bụ́ onye ritere ọlaedo n’Egwuregwu Olympic e nwere na Sydney, chọpụtara na nso nso a na e zoro otu kamera pere ezigbo mpe n’ọnụ ụlọ ịsa ahụ́ ya, nakwa na ọ nọwo na-ese ya ma ya onwe ya amaghị. E ji ya mepụta ihe nkiri vidio, e rekwara ọtụtụ puku n’ime ha n’ụzọ megidere iwu.

Ihe ọzọ gbasawokwara ebe nile bụ izu ihe e ji amata mmadụ n’ohi, bụ́ omume nke iji nkà na ụzụ bụ́ ọkpọka ezuru ihe ndekọ zuru ezu banyere ndị mmadụ. Ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya ichebe ihe ndị dịịrị nanị gị pụọ ná nnyocha nke ndị na-ekwesịghị ịma ya. * Bible na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.”—Ilu 22:3.

E Mee Ihe na Nzuzo—A Zaa Ajụjụ n’Ihu Ọha

Ka mpụ, ime ihe ike, na iyi ọha egwu na-arị elu, o yikarịrị ka gọọmenti dị iche iche hà ga na-enyochakwu ụmụ amaala ha. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, a gaghịzi enwe mkpa maka kamera ndị a na-eji eledo mmadụ na ihe ndị a na-eji ege nkwurịta okwu ndị mmadụ. Bible na-ekwe nkwa na n’ọdịnihu dị nso, ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova Chineke n’ihi ihe ndị ha mere, ma nke ha mere n’ihu ọha ma nke ha mere mgbe ha nọ nanị ha.—Job 34:21, 22.

Site n’oge ahụ gaa n’ihu, ime ihe ike, ịkpọasị, na mpụ bụ́ ndị mekpaworo ihe a kpọrọ mmadụ ahụ́ eri ogologo oge, agaghịzi adị n’elu ala. Olee otú nke a ga-esi kwe omume? Ọ bụ n’ihi na n’oge ahụ, ọ bụghị nanị na Jehova ga-amara ndị nile dị ndụ nke ọma, kamakwa, ndị nile dị ndụ ga-amara Jehova nke ọma. Okwu onye amụma bụ́ Aịzaịa ga-abụ eziokwu: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 21 Lee igbe bụ́ “Mara!”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

Ịmara na ọ dịghị ihe ọ bụla a pụrụ izo ezo n’anya Chineke pụrụ ịkwali anyị ime ihe ndị ziri ezi

[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]

Mara!

IHE NDỊ DỊỊRỊ NANỊ ONWE ONYE NA EBE NDỊ A NA-ACHỌ ỌRỤ N’INTANET: Ndị na-achọ ọrụ bụ́ ndị na-edepụta iru eru ha n’Intanet na-eche ihe ize ndụ dị ukwuu ihu nke ịbụ ndị a gbara ihe ndị dịịrị nanị ha n’anwụ. A pụrụ idepụta iru eru mmadụ n’ebe a na-achọ ọrụ n’Intanet ruo ọtụtụ afọ, ọ pụkwara ọbụna ịghọ ebe ndị na-ezu ohi ihe e ji amata mmadụ ga-enweta ihe ọmụma. Ụfọdụ ebe a na-achọ ọrụ n’Intanet na-ekwu ka ndị na-achọ ọrụ depụta ihe ọmụma banyere onwe ha, ndị dị ka aha, adres, afọ ndụ, na ọrụ ndị ha rụtụworo, e mesịa ha ezigara ya ndị na-enyere ha aka achụ nta ọrụ, dị ka ndị na-akpọsa ngwá ahịa.

IHE NDỊ DỊỊRỊ NANỊ ONWE ONYE NA IJI FON A NA-EJI AGAGHARỊ AGAGHARỊ EKWURỊTA OKWU: Ka ọ dị ugbu a, e nweghị ụzọ na-adịghị oké ọnụ a pụrụ isi hụ na onye ọzọ egeghị ihe gị na mmadụ na-ekwurịta na fon na-enweghị eriri. Ọ bụrụ na unu na-akparịta ihe dịịrị nanị onwe unu, e nwere ike onye ọzọ agachaghị ama ma i jiri telifon nkịtị nke nwere eriri mee ihe. Jide n’aka na ma gị ma onye ị na-agwa okwu jicha fon nkịtị. Ihe ndị na-eme ka redio nweta ozi pụrụ ịdọrọ nkwurịta okwu a na-enwe n’ọtụtụ fon ndị na-enweghị eriri, ọbụna fon ndị ọzọ na-enweghị eriri ma ọ bụ ígwè ọrụ ndị e ji elekọta ọ̀tụ̀tụ̀ iku ume nwa a mụrụ ọhụrụ pụrụ ịdọrọ ya. Ọ bụrụ na ị zụọ ihe site na fon ma kwuo nọmba kaadị i ji azụrụ ihe n’aka na ụbọchị ọ ga-akwụsị ịdị irè, a pụrụ inyocha nkwurịta okwu ahụ i ji fon na-enweghị eriri mee, ị pụkwara ịghọ onye a ga-egwu wayo. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 32 Ihe ọmụma e nwetara n’Ógbè Ndebe Ihe Ọmụma nke Privacy Rights Clearinghouse.

[Foto dị na peeji nke 21]

A dịghị ele nledo nke onye na-agụpụta onye mmiri na-eri anya dị ka inyoba anya n’ihe dịịrị onye ọzọ

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ịmara na Chineke maara ihe ndị anyị na-eme kpaliri Doug ime mgbanwe ná ndụ ya