Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Irigbu Ụmụaka Ga-akwụsị n’Oge Na-adịghị Anya!

Irigbu Ụmụaka Ga-akwụsị n’Oge Na-adịghị Anya!

 Irigbu Ụmụaka Ga-akwụsị n’Oge Na-adịghị Anya!

“NÁ NKWUPỤTA Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, Òtù Mba Ndị Dị n’Otu kwupụtara na ọ bụ ihe ruuru mmadụ ịbụ onye e lekọtara na onye e nyeere aka nke ukwuu mgbe ọ dị na nwata,” ka okwu mmalite nke Nkwekọrịta Maka Ihe Ndị Ruuru Nwatakịrị kwuru. N’ikwu banyere mkpa ezinụlọ dị, ọ na-agbakwụnye, sị: “Ka e wee zụlite àgwà nwatakịrị n’ụzọ zuru ezu ma kwekọọ ekwekọọ, o kwesịrị ka o tolite n’ime ezinụlọ, n’ebe e nwere obi ụtọ, ịhụnanya na nghọta.” Ma, a dịghị nnọọ emezu nke a.

O zughị nanị ikwu banyere ụwa ka mma maka ụmụaka. Nretọ nke omume zuru ebe nile, ọtụtụ ndị na-elekwa ọnọdụ ahụ anya dị ka nke dị otú o kwesịrị. Ndị na-ahụ na e debere iwu apụghị ịchịkwa nretọ omume na anyaukwu juru ebe nile. Ọbụna ndị nne na nna na-esokarị eme ka ụmụ ha na-eme otú masịrị ha kama igosi ha ịhụnanya na ichebe ha. Mgbe ahụ, olileanya dị aṅaa ka anyị nwere na ụmụaka ịgba akwụna ga-akwụsị?

Ọ bụ ezie na usoro ihe a rụrụ arụ enwelighị ike ịhụ na ụmụaka nile nwere ezinụlọ na-ahụ n’anya nakwa ọdịnihu dị nchebe, n’oge na-adịghị anya, Onye Okike anyị ga-ekpochapụ ụdị nile nke omume rụrụ arụ na inwe mmekọahụ aghara aghara, gụnyere ụmụaka ịgba akwụna. N’oge na-adịghị anya, site n’Alaeze ya, Jehova Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ n’ụzọ  ga-eju ụwa anya. Ndị na-emerụ ma na-erigbu ndị mmadụ agaghị alanarị ikpe Chineke. Ọ bụ nanị ndị hụrụ mmadụ ibe ha n’anya ga-alanarị iji biri n’ụwa ọhụrụ Chineke. “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—Ilu 2:21, 22.

Cheedị banyere ahụ́ iru ala a ga-enwe mgbe ma ụmụaka ma ndị toworo eto ga-enwe ike ibi ndụ n’abụghị ndị e wedara n’ala na ndị e metọrọ n’ụzọ mmekọahụ! Ọbụna mkpasasị uche na mmerụ ahụ́ nke nrigbu na ime ihe ike kpatara ga-abụ ihe gara aga. Ndị bụbu ndị e megburu n’ụzọ mmekọahụ ga-enwe ike ibi ndụ n’echetaghị ahụmahụ ndị na-akpasasị uche ha nwere ma ọ bụ n’abụghị ndị ọ nọgidere na-emetụta. “A gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.”—Aịsaịa 65:17.

Mgbe ahụ, ọ dịghị nwatakịrị a ga-amụ n’ọnọdụ ga-eme ka a na-emejọ ya ma ọ bụ ka a na-emetọ ya n’ụzọ mmekọahụ. Obi ụtọ, ịhụnanya, na nghọta agaghị abụ nanị nrọ. Aịsaịa 11:9 na-ekwu banyere ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa [ihe].”

N’ezie, lee ụdị ọṅụ a ga-enwe mgbe ndị mmadụ na-agaghịzi ada ogbenye, a na-agaghịzi eji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe, mgbe a na-agaghịzi enwe ezinụlọ ndị na-enweghị obi ụtọ, na mgbe a na-agaghịzi enwe omume rụrụ arụ! Udo na ezi omume ga-ejupụta ebe nile, ndị mmadụ ga-anọkwa ná nchebe. “Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.”—Aịsaịa 32:18.

 [Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]

Nlekọta Ndị Mụrụ Ụmụ Pụrụ Igbochi Ndakpọ Ezinụlọ

● “Ndị mụrụ m gbara m ume ịmụta aka ọrụ n’oge m na-aga akwụkwọ. Ha anwaghị ịmanye m ime ihe na-amasị ha, kama ha nyeere m aka ịhọrọ ụlọ akwụkwọ ndị na-akụzi ihe ọmụmụ dị m mkpa.”—Tais.

● “Mgbe mụ na nwanne m nwanyị na-aga ahịa, mama anyị na-esoro anyị aga. E wezụga inyere anyị aka ịghara imefusị ego, o nyekwaara anyị aka ịghara ịzụ uwe ndị a chọbigara mma ókè ma ọ bụ ndị na-ahụ ụzọ.”—Bianca.

● “Mgbe anyị na-aga nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, ndị mụrụ m na-ajụkarị m ndị ga-abịa nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ahụ, ụdị egwú a ga-akpọ, na mgbe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ahụ ga-amalite ma mechie. N’ihe ka ọtụtụ ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, anyị nile na-aga dị ka ezinụlọ.”—Priscila.

● “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ nakwa mgbe m nọ n’oge uto, mụ na ndị mụrụ m na-enwe nkwurịta okwu n’ezoghị ọnụ. Otu nwa akwụkwọ ibe m chọpụtara ya ma kwuo, sị: ‘Otú ị na-esi agwa ndị mụrụ gị okwu banyere ihe ọ bụla n’emeghị ihere na-amasịkwanụ m. Adịghịdị m enwe ahụ́ iru ala ma m na-agwa mama m okwu, ọtụtụ mgbekwa, ọ bụ n’aka ndị ọzọ ka m na-agbalị ịmata ihe ndị m chọrọ ịmata.’”—Samara.

● “Enwere m obi ụtọ mgbe m nọ n’oge uto. Ahụghị m ihe ọ bụla dị njọ n’ahụ́ ndị mmadụ, ana m achịkarịkwa ọchị. Ana m enwe ahụ́ iru ala ma mụ na ndị enyi m nọrọ, ana m enwekwa obi ụtọ isoro ha na-ekwurịta ihe ndị na-atọ ọchị. Ndị mụrụ m ghọtara na nke ahụ bụ àgwà m, ha anwaghịkwa ime ka m gbanwee ya. Ma ha ji obiọma nyere m aka ịghọta na m kwesịrị ịkpachara anya ma na-akpa ezi àgwà mgbe mụ na ndị na-abụghị nwanyị ibe m na-emekọrịta ihe.”—Tais.

● “Dị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa ndị ọzọ na-eme, amalitere m inwe mmasị n’ebe ndị na-abụghị nwanyị ibe m nọ. Nna m gwara m afọ ndụ m ga-eru tupu mụ enwee ike ịmalite ime mbedo. Nke ahụ eweghị m iwe. Kama nke ahụ, aghọtara m na ndị mụrụ m na-enwe nchegbu banyere m nakwa na ha chọrọ ichebe m ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ime m n’ọdịnihu.”—Bianca.

● “Elere m alụmdi na nwunye anya dị ka ihe dị mma, karịsịa n’ihi ihe nlereanya nke ndị mụrụ m. Ha na-enwe ezi mmekọrịta mgbe nile ma nọgide na-enwe ezi nkwurịta okwu. Echetara m mgbe mụ na otu nwoke na-eyi oge mkpapụ, mama m nyere m ndụmọdụ banyere otú m ga-esi kpaa àgwà n’ọnọdụ ụfọdụ, ọ kọwakwaara m otú nke ahụ ga-esi metụta alụmdi na nwunye m.”—Priscila.

[Foto dị na peeji nke 10]

N’ụwa ọhụrụ Chineke, ọ dịghị nwatakịrị a ga-emegbu