Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

 Ikiri Ụwa

Àgwà Ndị Na-ajọwanye Njọ

“Àgwà ndị Japan ajọwanyela njọ.” Otú a ka ihe dị ka pasent 90 nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 2,000 si zaghachi ná nnyocha akwụkwọ akụkọ bụ́ The Yomiuri Shimbun mere n’oge na-adịbeghị anya. Olee àgwà ọjọọ na-akpasu ha iwe? Nye pasent 68 n’ime ha, ọ bụ “atụfughị siga, chịngọm na kom kom ihe ọṅụṅụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị.” Ihe karịrị ọkara n’ime ha sịrị na ọ bụ àgwà nke ndị nne na nna adọghị ụmụ ha aka ná ntị. Mkpesa ndị ọzọ gụnyere otú e si eji fon ndị na-enweghị eriri eme ihe n’ihu ọha, ehichaghị nsị anụ ndị e ji mere enyi nyụrụ, na ịdọba ụgbọala na ịnyịnya ígwè n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. Ọ bụ ndị na-eto eto ka a katọrọ karịsịa. “N’ime ndị zaghachirinụ bụ́ ndị nọ n’agbata afọ 20 ruo 40, pasent 66 n’ime ha kwupụtara nchegbu banyere àgwà ọjọọ nke ụmụ akwụkwọ sekọndrị.”

 Aghụ Mmiri Adịgboroja

Nnụnụ cormorant, ndị ihe àmà na-egosi na ha pụrụ iri ihe dị ka otu kilogram azụ̀ n’ụbọchị, “na-abụkarị ihe na-enye ndị na-eji ịkụ azụ̀ eme ihe ntụrụndụ nsogbu,” ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ Calgary Herald na-ekwu. Akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na iji na-achụ nnụnụ cormorant na nnụnụ ndị ọzọ na-eri azụ̀, ndị ọrụ ugbo na ndị isi ọrụ nke ụlọ ọrụ na-akụ azụ̀ n’Ebe Ugwu America na-eji ngwá ọrụ ọhụrụ eme ihe—aghụ mmiri e ji rọba mee. Aghụ mmiri ndị ahụ bụ́ ndị na-adị mita anọ n’ogologo “nwere ọkpụrụkpụ ihe abụọ ndị na-egbukepụ egbukepụ bụ́ ndị e ji mee anya ha, bụ́ nke na-eme ka o yie aghụ mmiri nọ na nche,” ka Herald na-akọ. Otu ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ chọpụtara na otu aghụ mmiri e ji rọba mee bụ́ nke na-ese n’elu mmiri chụrụ nnụnụ ruo ihe dị ka otu ọnwa. Mgbe nke ahụ gasịrị, nnụnụ ndị ahụ chọpụtara aghụghọ ahụ, ‘a hụrụ otu nnụnụ heron na-acha anụnụ anụnụ ka o bekwasịrị nnọọ n’elu aghụ mmiri adịgboroja ahụ.’ Ma mgbe e wegara aghụ mmiri adịgboroja ahụ ebe ọzọ, ọ chụwakwara nnụnụ ndị ahụ na-eri azụ̀.

“Mwakpo” n’Ebe Ọrụ

Isi ihe na-akpata mfu nke oge ọrụ na Spen bụ “mmaja n’ụzọ mmetụta uche,” ka magazin bụ́ El País Semanal na-akọ. Ihe karịrị nde ndị Spen abụọ na-abụ ndị a na-achọ okwu ruo ogologo oge n’ebe ọrụ, bụ́ nke a maara na Europe dị ka mwakpo. Dị ka Iñaki Piñuel, bụ́ ọkà mmụta n’akparamàgwà mmadụ, si kwuo, ndị a na-emeso ya na-abụkarị ndị ọrụ dị uchu bụ́ nke na-eme ka ndị ọzọ na-ekwoso ha ekworo. Ndị ọrụ ibe mmadụ pụrụ iwetu ya ala site n’ijichi ọrụ ya, ịghara ịdị na-akpanyere ya ụka, ime ka a ga-asị na ha ahụghị ya, ịdị na-akatọ ya mgbe nile, ma ọ bụ ịgba ya asịrị iji mebie ùgwù ya. “A na-eme ngụkọ na ọ bụ àgwà a na-akpata ọnwụ 1 onye n’ime mmadụ 5 ọ bụla gburu onwe ha na Europe,” ka akụkọ ahụ na-akọ. Gịnị ka a pụrụ ime? Magazin ahụ na-atụ aro, sị: “Ezochila ya. Chọọ ndị akaebe. Kọọrọ ya ndị isi ụlọ ọrụ gị. Atala onwe gị ụta. Ya dị njọ nke ukwuu, gbanwee ngalaba ị na-arụ ọrụ na ya [ma ọ bụkwanụ] ọrụ.”

Isi Mmebi nke Na-emetụta Ụmụaka

“Ihe ruru otu ụzọ n’ụzọ ise nke ụmụaka nọ n’ụwa na-enwe isi mmebi ma ọ bụ nsogbu akparamàgwà bụ́ ndị pụrụ ibibi ihe fọdụrụ ná ndụ ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent nke London na-ekwu. N’akụkọ Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu jikọrọ aka wepụta, ha dọrọ aka ná ntị na ọ̀tụ̀tụ̀ ịda mbà n’obi, igbu onwe onye, na imerụ onwe onye ahụ́ arịwo elu “n’ụzọ dị egwu” n’etiti ndị na-eto eto. Ndị ọ kasị emetụta bụ ndị bi n’ógbè ndị a na-alụ agha na ha nakwa ná mba ndị na-enwe mgbanwe dị ngwa n’ụzọ mmekọrịta ụmụ mmadụ nakwa n’ụzọ akụ̀ na ụba. Dị ka The Independent si kọọ, akụkọ ahụ kwuru na ụmụaka dara mbà n’obi “yikarịrị ka hà ga-arịa ọrịa ndị ọzọ ma na-akpa àgwà ndị dị ize ndụ bụ́ ndị pụrụ ibelata oge ndụ ha.” O kwukwara na “e jikọtara ihe dị ka pasent 70 nke nnwụchu ọnwụ nke ndị toworo eto na àgwà ha zụlitere n’oge uto, dị ka ise siga, aṅụrụma na iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.”

Okporo Ụzọ Awara Awara Ndị Dị n’Ime Mmiri

“Ọ bụ okporo ụzọ kasịnụ e nwere n’oké osimiri,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sunday Times nke London na-akọ. “N’okpuru mmiri nke Pacific, e nwere okporo ụzọ awara awara nke si n’ụsọ mmiri California nke anwụ na-acha gabiga Hawaii ruo n’ikperé mmiri Japan nke nkume jupụtara.” Na nso nso a, Jeff Polovina, bụ́ ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ n’ime mmiri bụ́ onye nọ na Hawaii, chọpụtara ma sepụta okporo ụzọ a site n’ịmapawa ihe n’azụ̀ whale, tuna, dolphin, shark, na mbe mmiri. Ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ jupụtara n’okporo ụzọ awara awara a, bụ́ ndị nshịkọ, azụ̀ jellyfish, na squid ji emere nri. Ihe ndị a, n’aka nke ha, na-aghọ nri n’ụba nye ndị nke na-eme ogologo njem. Nnukwu mbe mmiri, bụ́ nke akwụkwọ akụkọ ahụ kọwara dị ka “anụ na-eme oké njem site ná mba gaa ná mba n’ala ụmụ anụ ndị na-akpụ akpụ,” na-eyi àkwá ha na Japan, nọrọ ná mpụga ụsọ oké osimiri California too, ma na-eme njem n’agbata Japan gaa California. N’oge oyi, ụzọ a dị n’oké osimiri na-agbadata ihe dị ka 1,000 kilomita ruo n’ebe ndịda, si na ndịda California gaa na Ndịda Oké Osimiri China.

Ịnọgide Na-enwe Ahụ́ Ike

“Mmega ahụ́ na-enye aka ebelata oké ibu, na-echebe mmadụ pụọ ná nsogbu ahụ́ ike ndị dị ka ọrịa shuga na ọrịa ọkpụkpụ bụ́ osteoporosis, na-emekwa ka mmadụ nwee ọnọdụ uche dị mma karị, na-enyekwa aka eme ka mmadụ hie ụra nke ọma n’abalị karị,” ka obere akwụkwọ bụ́ Tufts University Health and Nutrition Letter na-ekwu. Ma, e wezụga ihe ndị ahụ nile, “ókè ahụ́ gbasiruru gị ike bụ isi ihe na-ekpebi ókè ị ga-adịru ndụ.” N’otu nnyocha e mere ruo afọ 13 n’ebe ihe karịrị ndị ikom 6,000 katatụrụ ahụ́ nọ, ndị nnyocha nọ na Mahadum Stanford nakwa Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nlekọta Ahụ́ Ike nke Ndị Kataworo Ahụ́ na United States chọpụtara na ókè mmadụ nwere ike imegaru ahụ́ n’enweghị oké ike ọgwụgwụ na-egosi onye ga-adị ogologo ndụ karị. Ọ bụ ezie na nnyocha ọzọ e mere na-egosi na mkpụrụ ndụ ihe nketa na-esokwa ekpebi ókè mmadụ nwere ike imegaru ahụ́, ọbụna “obere mmega ahụ́” a na-enwe kwa ụbọchị—dị ka ịgasi ije ike—na-enye aka eme ka mmadụ nọgide na-enwe ahụ́ ike.

Ịkpọsara Ndị Ntorobịa Mmanya Na-aba n’Anya

“Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu onye n’ime ndị Australia 10 na-eto eto bụ ndị aṅụrụma,” ka akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ Sunday Telegraph na-ekwu. Prọfesọ Ian Webster, bụ́ onyeisi oche nke Kansụl Na-ahụ Maka Mmanya Na-aba n’Anya na Ọgwụ Ọjọọ Ndị Ọzọ n’Australia, na-ekwu na ndị na-eto eto azụlitewo àgwà nke bụ́ na ihe ha na-ewere dị ka ngwụsị izu tọrọ ụtọ bụ nke ha nọ “ṅụgide mmanya ṅụrọọ anya.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sydney Morning Herald na-akọ na ndị ọkachamara ụfọdụ na-enwe nchegbu maka “achụmnta ego na-ebuwanye ibu” nke ịkpọsara ndị na-eto eto mmanya na-aba n’anya. Ndị nnyocha chọpụtara na ihe ka ukwuu ná ndị na-ere mmanya na-aba n’anya nwere ebe ndị ha na-edebe ihe ọmụma n’Intanet bụ́ ndị na-elekwasị anya ná ndị na-eto eto. “Ebe ndị a na-eme mkpọsa maka tiketi ndị e ji aga ekiri egwú otiti, ma na-egosi ihe ụfọdụ a ga-eme n’ihe nkiri nakwa, n’ezie, ihe ọmụma banyere mmanya na-aba n’anya ndị ụlọ ọrụ ha mepụtara.” Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-enwe nchegbu na mkpọsa a nile “bụ iji hụ na e mere ka mmanya na-aba n’anya ghọọ ihe dị oké mkpa ná ndụ ndị na-eto eto.”

Ịnọrọ Onwe Onye

Na Japan, otu ihe o doro anya na ọ bụ ihe ọhụrụ amalitewo ime karịsịa n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma na ndị na-akatabeghị ahụ́. A na-akpọ ya hikikomori (oké nnọpụiche), a chọpụtara ya n’oge a na-eme nnyocha banyere ọtụtụ ajọ mpụ ndị na-eto eto na-anọrọ onwe ha na-eme. “Nnyocha e mere n’ụzọ ndụ nke ndị omempụ a gosiri na ụzọ ndụ ha nke ịnọpụrụ onwe ha iche—ịnọgide na-akpọchibido onwe ha ụzọ n’ọnụ ụlọ ha ruo ọtụtụ ọnwa, na-enwe nanị ihe egwuregwu kọmputa ma ọ bụ vidio—amarala ha ahụ́,” ka akwụkwọ ahụ́ ike bụ́ The Lancet na-ekwu. Ihe àmà ndị ọzọ na-egosi na a na-ejikarị enweghị ume amata onye nwere nsogbu hikikomori karịa ka e ji ime ihe ike amata ya. N’agbanyeghị nke ahụ, “mmadụ nile kwekọrịtara na ọ bụ akụ̀ na ụba, nkà na ụzụ, na ọnọdụ ndụ dị mma e nwere na Japan nke oge a kpatara nrịanrịa a,” ka The Lancet na-ekwu. “Ọtụtụ ndị nwere nsogbu hikikomori na-eji oge nile ha mụ anya eme ihe n’Intanet ma ọ bụ n’igwu egwuregwu vidio, ka ha na-eri nri ratụ ratụ ndị e wetara n’ebe obibi ha.” Ụfọdụ atụmatụ e mere na-egosi na ọnụ ọgụgụ ndị na-eto eto na-anọpụrụ onwe ha iche na Japan ruru otu nde.