Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka O Ji Bụrụ Nsogbu Na-arịwanye Elu?

N’ihi Gịnị Ka O Ji Bụrụ Nsogbu Na-arịwanye Elu?

 N’ihi Gịnị Ka O Ji Bụrụ Nsogbu Na-arịwanye Elu?

Ị̀ MAARA na iji mmadụ agba mgbere bụ nke atọ n’ime mpụ ndị kasị ukwuu n’ụwa, bụrụ nke nanị ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ na ngwá agha karịrị? Dị ka Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, e nwere mmụba na-aga n’ihu nke ụdị nile nke ịgba akwụna.

N’otu mba dị na Latin America, otu Kọmitii Nzukọ Ezumezu Na-eme Nchọpụta Banyere Nsogbu Ahụ kọrọ na e nwere ihe karịrị ụmụntakịrị nwanyị 500,000 na-agba akwụna, n’agbanyeghị na ịgba akwụna megidere iwu.

Ná mba ọzọ, e nwere ihe dị ka ụmụaka 300,000 na-agba akwụna bụ́ ndị na-anọ n’okporo ámá, karịsịa n’ebe ndị a na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ.

 Ná mba ndị dị n’Eshia, a kọrọ na e ji ihe dị ka otu nde ụmụntakịrị nwanyị eme ihe dị ka ndị akwụna n’ọnọdụ ndị yiri ịgba ohu. A maara ụfọdụ ala dị ka ebe ụmụaka na-aga agba akwụna nakwa ebe a na-aga maka inwe mmekọahụ.

N’ihi ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, ndị dị ka AIDS, ndị ahịa na-adị njikere ịkwụ ego ka nnọọ ukwuu maka ụmụaka bụ́ ndị a na-ele anya dị ka ndị pụrụ ịbụ ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke wee si otú ahụ bụrụ ndị ọ na-eyikebeghị ka hà ga-ebu ọrịa. “Egwu ụmụ nwoke na-atụ ọrịa AIDS emewo ka ha na-achọ ụmụaka nwanyị na ụmụaka nwoke, bụ́ nke na-eme ka nsogbu ahụ na-akawanye njọ,” ka Luíza Nagib Eluf nke Ministrị Okwu Ikpe nke Brazil kwuru. O kwuru, sị: “Mmegbu nke ụmụaka nwanyị na ndị nọ n’afọ iri na ụma n’ụzọ mmekọahụ bụ nke kasị njọ n’ime nsogbu ndị ụmụ nwanyị dara ogbenye na-enwe na Brazil.”

Ịda Ogbenye na Ụmụaka Ịgba Akwụna

Ụmụaka ịgba akwụna na-aka njọ n’ebe e nwere nhụjuanya na ịda ogbenye. Dị ka otu onye ọchịchị si kwuo, irigbu ụmụaka na ụmụaka ịgba akwụna ná mba ya bụ “ihe ndị e jikọtara ha na ntisa nke ezinụlọ n’ụzọ doro anya, bụrụkwa ndị nhụjuanya na agụụ na-akpata.” Ụfọdụ ndị nne na nna na-azọrọ na ọ bụ ịda ogbenye dubara ha n’irenye ụmụ ha n’ịgba akwụna. Ụmụaka ndị bi n’okporo ámá na-amalite ịgba akwụna n’ihi na ha na-ele ya anya dị ka nanị ụzọ ha ga-esi na-akpa afọ ha.

Akwụkwọ akụkọ bụ́ O Estado de S. Paulo na-akọwa na nwatakịrị nwanyị pụrụ imesị gbawa akwụna site n’isonye n’ajọ òtù okporo ámá. Iji hụ ihe ọ ga-eri, ọ pụrụ ịdị na-ezu ohi, mgbe ụfọdụkwa jiri ahụ́ ya na-akpa ego. E mesịa, ọ na-aghọ onye ji ịgba akwụna mere aka ọrụ.

Mgbe ụfọdụ, a na-akpọga ndị nọ n’afọ iri na ụma ná mba ọzọ ka ha rụọ ọrụ dị ka ndị akwụna. “Ego ndị akwụna bi ná mba ọzọ na-ezilatara ezinụlọ ha na-aghọkarị nnukwu ego n’ihi ịda ogbenye nke mba ụfọdụ ndị dị n’Eshia na Africa,” ka magazin bụ́ UNESCO Sources na-akọ. “A na-akwalitekwa ịgba akwụna n’ime mba ndị a, a na-enwe ndị njem nleta bụ́ ndị na-esite ná mba ndị bara ọgaranya aga iji soro ndị na-eto eto na ụmụaka ‘nwee mmekọahụ.’”

N’ịkọwa ihe ize ndụ ndị ụmụaka na-agba akwụna  bụ́ ndị na-anọ n’okporo ámá na-eche ihu n’otu obodo ukwu dị na Latin America, magazin bụ́ Time na-akọ, sị: “Ụfọdụ n’ime ndị akwụna ndị ahụ na-adị nanị afọ 12. Ọtụtụ n’ime ha na-esite n’ezinụlọ ndị tisara etisa, ha na-ehi ụra n’ebe ọ bụla ohere dị n’ehihie, ma na-aga n’ebe ndị a na-eti egwú disko, bụ́ ebe ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-abịa ekpori ndụ n’abalị.”

Ọ bụrụ na nwatakịrị na-agba akwụna aṅụọ ọgwụ ọjọọ, a pụrụ ịrụsa ya arụrụala ọ na-agaraghị anabata ma a sị na anya doro ya. Dị ka ihe atụ, dị ka magazin bụ́ Veja si kwuo, ndị uwe ojii chọtara teepu vidio 92, ndị otu dọkịta sejuru arụrụala ọjọọ ndị ọ rụsara ihe karịrị ndị inyom 50 n’ụzọ mmekọahụ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-etorubeghị inwe mmekọahụ.

 N’agbanyeghị ihe a na-awụ akpata oyi na-emenụ, otu onye akwụna na-eto eto kwuru, sị: “Ọ bụrụ na m achọwa ọrụ, agaghị m enwe ike ịkpa afọ m n’ihi na enweghị m aka ọrụ. Ezinụlọ m maara ihe m na-arụ, achọghịkwa m ịkwụsị ụdị ndụ a. Ahụ́ bụ ahụ́ m, ihe ọ masịrị m ejiri m ya mee.”

Ma, ọ dịghị mgbe ụmụ agbọghọ ndị a setịpụrụ ịgba akwụna dị ka ihe mgbaru ọsọ ha. Dị ka otu onye ọrụ ebere si kwuo, ọtụtụ ndị akwụna na-eto eto “na-achọ ịlụ di,” ha na-achọkwa ka alụmdi na nwunye ha tọgbuo onwe ya n’ụtọ. Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ọnọdụ ndị na-eduga ha n’ịgba akwụna, otu onye nnyocha na-ekwu, sị: “Nke kasị awụ akpata oyi n’ahụ́ bụ na e dinara ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha n’ike n’ụlọ ha.”

Ụmụaka Ịgba Akwụna Ọ̀ Ga-akwụsị?

Otú ọ dị, olileanya dịịrị ụmụaka ndị a nwere ihe ndabara ọjọọ. Ndị akwụna ụfọdụ nọ n’afọ ndụ dị iche iche agbanwewo ụzọ ndụ ha. (Lee igbe bụ́ “Ndị Mmadụ Pụrụ Ịgbanwe,” bụ́ nke dị na peeji nke 7.) Okwu Chineke, bụ́ Bible, enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka n’ụwa nile ịghọ ezi ndị agbata obi na ndị òtù ezinụlọ na-ekwesị ntụkwasị obi. Banyere ndị bụbu ndị na-akwa iko, ndị ohi, ndị anyaukwu, ndị aṅụrụma, anyị na-agụ, sị: “Nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu. Ma a sachawo unu, ma e dowo unu nsọ, ma a kpọwo unu ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

Taa, dị ka ọ dị n’oge Bible, e nwere ndị na-agbanwe ụzọ ha, ọ na-arụpụtakwara ha ihe ọma. Ma, ọ ka dị mkpa imekwu ihe iji kwụsị imegbu ndị mmadụ n’ụzọ mmekọahụ. Ụfọdụ gọọmenti na òtù ndị ọzọ na-alụso njem nleta maka inwe mmekọahụ na ụmụaka ịgba akwụna ọgụ. Ma, n’eziokwu, ọ dịghị oké ihe ụmụ mmadụ pụrụ ime iji kwụsị nhụsianya na ịda ogbenye. Ndị omeiwu apụghị igbochi echiche na àgwà ndị na-akpata omume rụrụ arụ.

Otú ọ dị, kama ịgwọta nsogbu ndị a nile site ná mgbalị ndị mmadụ, e nwere ụzọ ọzọ a ga-esi gwọta ha—Alaeze Chineke. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ịda ogbenye na-esokarị akpata ụmụaka ịgba akwụna

[Igbe dị na peeji nke 6]

Oké Ihe Ọ Na-efu

Mgbe Daisy dị nanị afọ isii, otu n’ime ụmụnne ya ndị nwoke metọrọ ya n’ụzọ mmekọahụ. N’ihi ya, o sooro nwanne ya nwoke nke okenye biri ruo mgbe ọ gbara afọ 14 bụ́ mgbe ọ malitere ịrụ ọrụ n’ụlọ oriri na nkwari abalị. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Daisy dara ọrịa. Mgbe ọ gbakere, ndị nwe ụlọ oriri na nkwari abalị ahụ gwara ya na o ji ha ụgwọ, ha manyere ya ịrụ ọrụ dị ka onye akwụna. Mgbe ihe dị ka otu afọ gasịrị, ọ ka jikwa ụgwọ, ya eyiekwa ka ọ̀ bụ na ọ gaghị akwụchali ụgwọ ahụ. Otú ọ dị, otu onye ọrụ ụgbọ mmiri kwụtọpụrụ ụgwọ ahụ, wee kpọrọ ya gaa n’obodo ukwu ọzọ, bụ́ ebe o mesoro ya ihe dị ka ohu. Ọ gbahapụrụ nwoke ahụ, mesịakwa soro nwoke ọzọ biri ruo afọ atọ, mgbe e mesịrị, ha lụrụ di na nwunye. N’ihi ọtụtụ nsogbu alụmdi na nwunye ha nwere, ọ nwara igbu onwe ya ugboro atọ.

E mesịa, ma ya ma di ya malitere ịmụ Bible. Ma Daisy chere na ya erughị eru ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mgbe e gosiri ya na Bible na Jehova Chineke na-anabata ndị mere mgbanwe ndị dị mkpa, ọ raara ndụ ya nye ya. Daisy tinyere mgbalị dị ukwuu ime ihe ziri ezi, ma ọ dịghị ya ka ọ na-etinye mgbalị zuru ezu, n’ihi ya kwa, ọ na-enwe ịda mbà n’obi ọtụtụ mgbe. Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ na ọ nabatawo enyemaka iji merie mkpasasị uche ndị mmetọ e metọrọ ya n’ụzọ mmekọahụ́ na ndụ o biri dị ka nwatakịrị akwụna kpatara nakwa iji nwee obi iru ala.

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ndị Mmadụ Pụrụ Ịgbanwe

Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị nọ n’ahụhụ, bụ́ ndị na-emehie emehie. Ọ ghọtara na ndị akwụna pụrụ ịgbanwe ụzọ ndụ ha n’agbanyeghị afọ ndụ ha. Ọbụna Jizọs gwara ndị ndú okpukpe, sị: “N’ezie asị m unu na ndị ọnaụtụ na ụmụ nwanyị akwụna bu unu ụzọ na-abanye n’alaeze Chineke.” (Matiu 21:31) Ọ bụ ezie na a na-eleda ha anya n’ihi ụzọ ndụ ha, a gbaghaara ndị dị otú ahụ obi ha ziri ezi mmehie ha n’ihi okwukwe ha nwere n’ebe Ọkpara Chineke nọ. Ndị mmehie nwere nchegharị dị njikere ịhapụ ụzọ ndụ ha nke ịgba akwụna iji nweta ngọzi dị iche iche nke Alaeze Chineke. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume nke Chineke. Taakwa, ụdị mmadụ nile na-anabata eziokwu nke Okwu Chineke ma gbanwee ụzọ ndụ ha.

Tụlee ihe mere Maria, Carina, na Estela, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha n’isiokwu mbụ. E wezụga iguzogide nrụgide nne ya na-arụgide ya ka ọ nọgide na-agba akwụna, Maria tinyere mgbalị siri ike iji kwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ọ na-akọwa, sị: “Ejiri m ọgwụ ọjọọ mee ihe iji belata mmetụta nke abaghị uru m na-enwe n’ihi ibi ndụ dị ka onye akwụna.” Maria na-akọ otú ọgbakọ Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova si nabata ya: “Ịhụnanya ndị òtù nke ọgbakọ gosiri m bụ ihe mkpali nye m. Mmadụ nile—ma ụmụaka ma ndị toworo eto—mesoro m n’ụzọ nkwanye ùgwù. Achọpụtara m na ndị ikom lụrụ nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi nye nwunye ha. Obi dị m nnọọ ụtọ ịbụ onye ha nabatara dị ka enyi ha.”

Mgbe Carina gbara afọ 17, Ndịàmà Jehova letara ya. Ọ malitere ịmụ Bible, ọ bụ ezie na ruo oge ụfọdụ ọ nọgidere na-arụ ọrụ dị ka onye akwụna. Nke nta nke nta, ọ malitere ịghọta eziokwu Bible. N’ihi ya, o kpebiri ịkwaga n’obodo dị anya, ọ nọkwa ebe ahụ ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Estela, bụ́ onye malitere na nwata na-agba akwụna, na-eso n’oriri oké mkpọtụ, na-aṅụbigakwa mmanya ókè, bịara nwee mmasị na Bible. Otú ọ dị, o kwubiri na ọ dịghị ihe ga-eme ka Chineke gbaghara ya. Ma, ka oge na-aga, ọ bịara ghọta na Jehova Chineke na-agbaghara ndị nwere nchegharị. Estela, onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, nke lụworo di, ma na-azụlite ụmụ atọ ugbu a, na-ekwu, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ, ana m ekelekwa Jehova n’ihi na ọ gụpụtara m n’apịtị ma nabata m n’ọgbakọ ya dị ọcha.”

Ihe ndekọ ndị a na-akwado okwu Bible bụ́ na uche Chineke bụ ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ụmụaka na-agba akwụna na-ejikarị ọgwụ ọjọọ eme ihe

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]

© Jan Banning/Panos Pictures, 1997