Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mmehie Na-enweghị Mgbaghara?

Ọ̀ Dị Mmehie Na-enweghị Mgbaghara?

 Echiche nke Bible

Ọ̀ Dị Mmehie Na-enweghị Mgbaghara?

Ọ̀ DỊ ntaramahụhụ ka ọnwụ njọ? Ee, ịnwụ n’enweghị olileanya nke mbilite n’ọnwụ n’ihi na onye ahụ emewo mmehie a na-apụghị ịgbaghara agbaghara. Jizọs kwuru na e nwere mmehie a ‘na-agaghị agbaghara.’—Matiu 12:31.

Otú ọ dị, Bible na-akọwa Chineke dị ka onye na-agbaghara mmehie. Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ pụrụ ịdị na-ebu iwe n’obi ma ghara ịdị na-agbaghara mmehie, Chineke ‘na-agbaghara mmehie n’ụba.’ (Aịsaịa 55:7-9) N’eziokwu, ọ bụ ezie na o furu ya oké ihe, Chineke zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya nke ukwuu n’ụwa ka ọ bụrụ àjà ime udo, ma ọ bụ nke mkpuchi mmehie, nke bara oké uru nke na ọ pụrụ ihichapụ mmehie anyị.—Jọn 3:16, 17; Ọrụ 3:19; 1 Jọn 2:1, 2.

Mgbe oge ya ruru, Chineke ga-akpọlite ọtụtụ ndị, bụ́ ndị ikpe mmehie dị oké njọ mara, bụ́ ndị na-agakwaghị aza ajụjụ n’ihi ihe ndị ha mere n’oge gara aga, n’ọnwụ. (Ọrụ 24:15; Ndị Rom 6:23) N’eziokwu, Jizọs kwuru na e wezụga mmehie a na-agaghị agbaghara agbaghara, na “a ga-agbaghara . . . ụdị mmehie na nkwulu ọ bụla.” (Matiu 12:31) Ya mere ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee ihe pụrụ ịdị oké njọ nke na Chineke agaghị agbaghara ya?’

Mgbe A Na-apụkwaghị Inwe Nchegharị

Ịdọ aka ná ntị Jizọs zoro aka n’ebe ilezi anya na ịkpachara anya ‘kwuluo mmụọ nsọ’ dị. A pụghị ịtọhapụ mmadụ n’ụdị mmehie a. “Ee e, ọ bụghị n’usoro ihe nke a ma ọ bụkwanụ na nke gaje ịbịa,” ka o kwukwasịrị. (Matiu 12:31, 32) A gaghị akpọlite ndị ikpe mmehie dị otú ahụ mara n’ọnwụ.

Gịnị bụ nkwulu megide mmụọ nsọ? Ọ na-esite n’obi, na-ekpughe omume na nzube ọjọọ. Ịma ụma chọọ imegide mmụọ nsọ Chineke na-eme ka mmehie a ka njọ. Iji maa atụ: N’ala ụfọdụ, iwu na-akpa ókè n’etiti igbu ọchụ nke e leziri anya kpaa nkata ya na igbu ọchụ a na-ebughị ụzọ kpaa nkata ya, ma na-enye ntaramahụhụ nke bụ́ ọnwụ nanị maka igbu ọchụ a kpachaara anya mee ma ọ bụ kpaa nkata ya.

Pọl onyeozi bụbu onye nkwulu ma ọ sịrị: “E meere m ebere, n’ihi na amaghị m nke a na-akọ.” (1 Timoti 1:13) Imehie megide mmụọ nsọ bụ ilezi anya na-emegide ya. Ọ na-agụnye inwe obi ọjọọ ruo n’ókè nke na a pụkwaghị ịlaghachi azụ.

Ihe àmà na-egosi na Pọl na-ezo aka n’ụdị mmehie  a mgbe o dere, sị: “Ọ bụ ihe na-apụghị ikwe omume nye ndị e meworo ka ha nwee nghọta nanị otu ugboro, na ndị detụworo onyinye eluigwe e nyere n’efu ire, na ndị ghọworo ndị so na-eketa mmụọ nsọ, na ndị detụworo okwu ahụ dị mma nke Chineke na ike nke usoro ihe na-abịa abịa ire, ma bụrụ ndị dapụworonụ, ịbụ ndị a tụteghachiri gaa ná nchegharị.” (Ndị Hibru 6:4-6) Pọl onyeozi kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na anyị elezie anya nọgide na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịworo ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ maka mmehie.”—Ndị Hibru 10:26.

Ọ bụ àgwà nke ụfọdụ ndị ndú okpukpe nke oge ya kpaliri Jizọs ịdọ aka ná ntị megide mmehie a na-apụghị ịgbaghara agbaghara. Ma ha aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị ya. N’eziokwu, ha mere ka e gbuo ya. Ka oge na-aga ha nụrụ ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha na mmụọ nsọ arụwo ọrụ ebube. A gwara ha na e mewo ka Jizọs si n’ọnwụ bilie! O doro anya na Jizọs bụ Kraịst ahụ! N’agbanyeghị nke ahụ, ha mere omume jọgburu onwe ya megide mmụọ nsọ site n’ịkwụ ndị agha Rom ụgwọ ka ha ghaa ụgha banyere mbilite n’ọnwu Jizọs.—Matiu 28:11-15.

Ihe Ịdọ Aka ná Ntị Nye Ezi Ndị Kraịst

N’ihi gịnị ka ezi Ndị Kraịst ji eji ịdọ aka ná ntị banyere mmehie a na-apụghị ịgbaghara agbaghara akpọrọ ihe nke ukwuu? N’ihi na, ọ bụ ezie na anyị nwere ezi ihe ọmụma banyere Chineke nakwa otú mmụọ ya si arụ ọrụ, ajọ obi pụrụ ibilite. (Ndị Hibru 3:12) Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara iche na nke a apụghị ime anyị. Tụlee ihe banyere Judas Iskarịọt. O nwere mgbe ọ bụ onye na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Jizọs. A họọrọ ya dị ka otu n’ime ndịozi 12 ahụ, n’ihi ya ọ ghaghị inweworịị àgwà ọma. Ma n’otu oge, ọ malitere ikwe ka echiche na ọchịchọ na-ezighị ezi tolite, ha mesịkwara merie ya. N’oge ọ nọ na-ahụ ọrụ ebube ndị na-enweghị atụ nke Jizọs, ọ nọ na-ezu ego. E mesịakwa, n’ihi ego, ọ ma nnọọ ụma rara Ọkpara Chineke nye.

Ụfọdụ ndị, ndị bụbu Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi esiwo n’ebe Chineke nọ wezụga onwe ha, ikekwe n’ihi iwe, nganga, ma ọ bụ anyaukwu, ugbu a kwa ha bụ ndị si n’ezi ofufe dapụ, ndị na-alụso mmụọ Chineke ọgụ. Ha leziri anya na-emegide ihe o doro anya na ọ bụ mmụọ nsọ na-arụzu ya. Ndị dị otú a, hà emewo mmehie a na-apụghị ịgbaghara agbaghara? Jehova bụ onyeikpe kasịnụ.—Ndị Rom 14:12.

Kama ịdị na-ekpe ndị ọzọ ikpe, anyị kwesịrị ịnọ na nche n’onwe anyị ka anyị ghara ime mmehie nzuzo ndị pụrụ iji nke nta nke nta mee ka obi anyị sie ike. (Ndị Efesọs 4:30) Anyị na-enwetakwa nkasi obi n’eziokwu ahụ bụ́ na Jehova ga-agbaghara anyị mmehie anyị n’ụba, ọbụna mmehie ndị dị oké njọ anyị mere, ma ọ bụrụ na anyị echegharịa.—Aịsaịa 1:18, 19.

[Foto dị na peeji nke 12, 13]

Ụfọdụ ndị Farisii mere mmehie a na-apụghị ịgbaghara agbaghara