Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Mmehie Na-enweghị Mgbaghara?

Gịnị Bụ Mmehie Na-enweghị Mgbaghara?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mmehie na-enweghị mgbaghara bụ ihe ọjọọ ọ bụla mmadụ na-eme ma na-ele ya anya otú ga-eme ka Chineke ghara ịgbaghara ya. Olee otú mmadụ nwere ike isi mee ụdị mmehie ahụ?

 Chineke na-agbaghara ndị chegharịrị ná mmehie ha, na-erube isi n’iwu ya ma nwee okwukwe na Jizọs Kraịst. (Ọrụ Ndịozi 3:​19, 20) Ma, mmadụ nwere ike imegide mmehie, mmehie erie ya isi nke na ọ gaghị agbanwelizi àgwà ya. Baịbụl kwuru na ndị dị́ otú ahụ nwere “ajọ obi” nke ‘ike dị aghụghọ nke mmehie mere ka ọ kpọchie.’ (Ndị Hibru 3:​12, 13) Obi onye ahụ adịghịzi ka ụrọ e nwere ike ịkpụgharị akpụgharị. Kama, ọ dịzi ka nkume. Onye ahụ jizi obi ya niile na-emegide Chineke. (Aịzaya 45:9) O nweghị ihe a ga-eji maka ya gbaghara onye ahụ. Mmehie onye dị́ otú ahụ bụ mmehie nke a na-agaghị agbagharali agbaghara.​—Ndị Hibru 10:26, 27.

 Ụfọdụ ndị ndú okpukpe ndị Juu n’oge Jizọs mere mmehie na-enweghị mgbaghara. Ha ma na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke ka Jizọs ji na-arụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, ma ha kwuru na ọ bụ ike Ekwensu ka Jizọs ji arụ ọrụ ebube ndị ahụ.​—Mak 3:​22, 28-​30.

Mmehie ndị e nwere ike ịgbaghara mmadụ

  •  Ikwulu mmadụ na-amaghị ama. E nwere mgbe Pọl onyeozi bụ onye nkwulu, ma o mechara kwuo, sị: “E meere m ebere, n’ihi na amaghị m ihe mgbe ahụ, emekwara m ya n’ihi enweghị okwukwe.”​—1 Timoti 1:​13.

  •  Ịkwa iko. Baịbụl kwuru banyere ụfọdụ ndị kwara iko ma mechaa gbanwee, Chineke agbagharakwa ha.​—1 Ndị Kọrịnt 6:​9-​11.

“È meela m mmehie na-enweghị mgbaghara?”

 Ọ bụrụ na ihe i mere n’oge gara aga wutere gị nke ukwuu, ya abụrụkwa na ị chọrọ ịgbanwe n’eziokwu, ọ pụtara na i mebeghị mmehie na-enweghị mgbaghara. Ọ bụrụhaala na obi mmadụ akpọchibeghị, Chineke ga-agbagharali ya mmehie ọ bụla o mere, ọ bụrụogdị na o mere ya ugboro ugboro.—Aịzaya 1:18.

 Ụfọdụ na-eche na ha emeela mmehie na-enweghị mgbaghara n’ihi na obi ha na-ama ha ikpe maka ihe ha mere. Ma, Baịbụl na-akụzi na anyị ekwesịghị ịna-atụkwasị obi anyị obi mgbe niile. (Jeremaya 17:9) Chineke enyeghị anyị ikike ikpe ma onwe anyị ma ndị ọzọ ikpe. (Ndị Rom 14:​4, 12) O nwere ike ịgbaghara anyị ọ bụrụgodị na obi anyị ka na-ama anyị ikpe.​—1 Jọn 3:​19, 20.

Judas Iskarịọt ò mere mmehie na-enweghị mgbaghara?

 Ee. Anyaukwu mere ka o zuru ego a tụkọtara maka ofufe Chineke. O medịrị ka à ga-asị na ọ na-eche banyere ndị ogbenye. Ma ihe bụ mkpa ya bụ inwetakwu ego ọ ga-ezu. (Jọn 12:​4-8) Ozugbo ime ihe ọjọọ riri Judas isi, ọ raara Jizọs nye maka mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ. Jizọs ma na Judas agaghị eji obi ya niile chegharịa, ọ bụ ya mere o ji kpọọ ya “nwa mbibi ahụ.” (Jọn 17:12) Ọ pụtara na mgbe Judas nwụrụ, o nweghị olileanya mbilite n’ọnwụ.​—Mak 14:21.

 Judas echegharịghị ná mmehie o mere. O kwupụtaghịrị Chineke mmehie ya, kama ọ bụ ndị ndú okpukpe ya na ha gbara izu ka o kwupụtaara ihe o mere.​—Matiu 27:​3-5; 2 Ndị Kọrịnt 7:​10.