Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Mgbe Obi Na-ama M Ikpe?

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Mgbe Obi Na-ama M Ikpe?

Ihe Baịbụl Kwuru

Ee. Baịbụl ga-enyereli anyị aka ka obi kwụsị ịma anyị ikpe. (Abụ Ọma 32:​1-5) Ọ bụrụ na e nwere ihe na-adịghị mma anyị mere ma mechaa chegharịa, Chineke ga-agbaghara anyị ma nyere anyị aka ka obi ghara ịna-ama anyị ikpe. (Abụ Ọma 86:5) Baịbụl gosiri na obi ịma mmadụ ikpe na-aba uru mgbe ụfọdụ. O nwere ike ime ka mmadụ kwụsị ime ihe na-adịghị mma, ma gbalịsie ike ka ọ ghara ime ya n’oge ọzọ. (Abụ Ọma 51:17; Ilu 14:9) Mana, Baịbụl dọrọ aka ná ntị ka anyị ghara ikwe ka obi anyị maa anyị ikpe gabiga ókè, ikekwe ruo nke ilewe onwe anyị anya ka ndị na-abaghị uru n’anya Chineke. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, o nwere ike ime ka anyị ‘daa mbà.’​—2 Ndị Kọrịnt 2:7.

 Gịnị nwere ike ime ka obi mawa mmadụ ikpe?

E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka obi na-ama anyị ikpe. Obi anyị nwere ike ịgwa anyị na anyị emejọọla onye anyị hụrụ n’anya ma ọ bụ na anyị emeghị ihe anyị ma na anyị kwesịrị ịna-eme. Mgbe ụfọdụ, obi nwere ike ịna-ama anyị ikpe mgbe anyị na-emeghị ihe obi kwesịrị iji mawa anyị ikpe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ekpebie ime ihe anyị na-agaghị emeli, obi nwere ike ịna-ama anyị ikpe mgbe ọ bụla anyị na-emelighị ihe ahụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji na-agba anyị ume ka anyị na-atụ anya ime ihe ndị anyị ga-emeli.​—Ekliziastis 7:16.

 Olee ihe m nwere ike ime ka obi kwụsị ịna-ama m ikpe?

Kama ikwe ka obi amamikpe mee ka ike ụwa gwụ gị, mee ihe ị ga-emeli iji mezie ihe ị na-emetaghị. Olee otú ị ga-esi eme ya?

  • Kweta na i mejọrọ ihe. Rịọ Jehova * Chineke n’ekpere ka ọ gbaghara gị. (Abụ Ọma 38:18; Luk 11:4) Chineke ga-aza ekpere gị ma ọ bụrụ na i chegharịala, gosi na ihe i mere wutere gị, ma na-agbalịsi ike ka ị ghara ime ya ọzọ. (2 Ihe E Mere 33:13; Abụ Ọma 34:18) Ọ na-ahụ ihe dị mmadụ n’obi, nke mmadụ ọ bụla na-anaghị ahụ. Mgbe Chineke hụrụ na anyị na-agbalị ịkwụsị ihe na-adịghị mma anyị na-eme, ọ na-egosi anyị na ọ bụ onye “kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume, nke mere na ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị.”​—1 Jọn 1:9; Ilu 28:13.

    N’eziokwu, ọ bụrụ na e nwere onye i mejọrọ, ọ ga-adị mma ma i kweta na i mejọrọ ma si n’ala ala obi gị rịọ onye ahụ mgbaghara. Ime ihe a nwere ike ọ gaghị adịcha mfe. Ma ka i nwee ike ime ya, ị ga-adị umeala n’obi ma nwee obi ike. Mmadụ iji obi ya niile rịọ mgbaghara nwere uru abụọ dị mkpa ọ bara: Ọ na-eme ka obi ruo gị ala, meekwa ka gị na onye ahụ dịwakwa ná mma.​—Matiu 3:8; 5:​23, 24.

  • Tụgharịa uche n’amaokwu Baịbụl ndị kwuru banyere ebere Chineke. Dị ka ihe atụ, ka anyị lebagodị anya na 1 Jọn 3:​19, 20. N’ebe a, Baịbụl kwuru na “obi anyị nwere ike ịma anyị ikpe” nke pụtara na anyị nwere ike ịna-akatọ onwe anyị, ikekwe anyị echewe na anyị erughịzi eru Chineke ịhụ anyị n’anya. Ma, amaokwu Baịbụl ahụ kwukwara na “Chineke karịrị obi anyị.” Olee otú o si karịa ya? Chineke maara ihe niile gbasara anyị, ọ ghọtakwara nnọọ otú anyị si eche echiche na ihe ndị anyị na-anaghị emetecha. Ọ makwa na anyị bụ ndị na-ezughị okè, nakwa na anyị nwere ike ime mmehie. * (Abụ Ọma 51:5) N’ihi ya, ọ na-agbaghara onye ọ bụla gosiri n’eziokwu na ihe ọjọọ o mere wutere ya.​—Abụ Ọma 32:5.

  • Anọla na-eche banyere ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga. Baịbụl kọrọ akụkọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị mere ihe ndị na-adịghị mma ma mechaa gbanwee. Otu n’ime ha bụ Sọl, onye Tasọs, onye e mechara kpọwa Pọl onyeozi. Mgbe ọ bụ onye Farisii, ọ kpagburu ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. (Ọrụ Ndịozi 8:3; 9:​1, 2, 11) Ma mgbe o mechara mata na ọ bụ Chineke na Mezaya ahụ, ma ọ bụ Kraịst, ka ya na-emegide, o chegharịrị, gbanwee ndụ ya, ma ghọzie Onye Kraịst e ji ama atụ. O doro anya na ihe ndị ahụ Pọl meburu na-ewute ya, ma ọ nọghị na-eche banyere ha. Pọl maara na Chineke meere ya ebere, n’ihi ya, o ji obi ya niile kwusaa ozi ọma, o chefughịkwa nkwa ndụ ebighị ebi Chineke kwere ya.​—Ndị Filipaị 3:​13, 14.

 Amaokwu Baịbụl ndị kwuru maka obi amamikpe na mgbaghara

Abụ Ọma 51:17: “Chineke, ị gaghị eleghara obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute, anya.”

Ihe ọ pụtara: Chineke ga-agbaghara gị ihe ndị i mejọrọ ma ọ bụrụ na ihe i mere wutere gị n’eziokwu. Ọ na-eme ebere.

Ilu 28:13: “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.”

Ihe ọ pụtara: Ọ bụrụ na anyị ekwupụtara Chineke mmehie anyị ma kwụsị ihe ọjọọ ahụ, Chineke ga-agbaghara anyị.

Jeremaya 31:34: “M ga-agbaghara ha njehie ha, agakwaghị m echeta mmehie ha.”

Ihe ọ pụtara: Chineke gbagharahaala anyị, ọ naghị echetara anyị mmehie ahụ ọzọ. Ọ na-agbaghara kpamkpam.

^ par. 4 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.​—Ọpụpụ 6:3.

^ par. 6 Ọ bụ mmehie anyị butere n’aka nwoke mbụ, bụ́ Adam, mere anyị ji achọkarị ime ihe ọjọọ. Adam na Iv, nwunye ya, mere mmehie megide Chineke, si otú ahụ ghọzie ndị na-ezughị okè nakwa ndị na-agaghị adịli ndụ ebighị ebi. Ha bufekwaara ụmụ ha nsogbu ndị a.​—Jenesis 3:​17-19; Ndị Rom 5:12.