Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Mmehie Ahụ Adam na Iv Mere?

Gịnị Bụ Mmehie Ahụ Adam na Iv Mere?

Ihe Baịbụl kwuru

Adam na Iv bụ mmadụ mbụ mere mmehie. Mgbe ha nupụụrụ Chineke isi wee rie “mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ,” ha mere ihe ọtụtụ ndị na-akpọ mmehie mbụ. * (Jenesis 2:16, 17; 3:6; Ndị Rom 5:19) Chineke gwara Adam na Iv ka ha ghara imetụ osisi ahụ aka n’ihi na Chineke ji osisi ahụ gosi na ọ bụ ya nwere ikike, ma ọ bụ ruru eru ịgwa ụmụ mmadụ ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Mgbe ha riri mkpụrụ si n’osisi ahụ, ihe ọ pụtara bụ na Adam na Iv chọrọ iji aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ihe a ha mere gosiri na ha chọrọ ka ha na-atụrụ onwe ha ihe ha ga-eme, ha achọghị ka Chineke na-agwa ha ihe ha ga-eme.

 Olee ihe mmehie ahụ Adam na Iv mere kpataara ha?

N’ihi mmehie ahụ Adam na Iv mere, ha mechara kaa nká, mechakwaa nwụọ. Ha na Chineke kwụsịrị ịbụ enyi, ha tufukwara ohere ha nwere ịdị ndụ ebighị ebi na inwe ezigbo ahụ́ ike.—Jenesis 3:⁠19.

 Olee otú mmehie ahụ si emetụta anyị?

Adam na Iv bufeere ụmụ ha niile mmehie. Nke a yiri otú nne na nna na-esi ebufere ụmụ ha ọrịa. (Ndị Rom 5:12) N’ihi ya, a mụrụ anyị niile bụ́ mmadụ ná “mmehie,” * nke pụtara na anyị ezughị okè, ọ na-adịkwara anyị mfe ime ihe ọjọọ.​—⁠Abụ Ọma 51:5; Ndị Efesọs 2:⁠3.

Ọ bụ n’ihi mmehie ma ọ bụ ezughị okè anyị ketara n’aka nne na nna anyị mbụ mere anyị ji na-arịa ọrịa, na-aka nká ma na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 6:23) Anyị na-atakwa ahụhụ n’ihi ihe ndị anyị na-emetaghị ma ọ bụ n’ihi njehie nke ndị ọzọ.​—⁠Ekliziastis 8:9; Jems 3:⁠2.

 Ò nwere ihe a ga-eme ka nsogbu mmehie ahụ kpatara kwụsị?

Ee. Baịbụl kwuru na Jizọs nwụrụ “ka ọ bụrụ àjà ime udo maka mmehie anyị.” (1 Jọn 4:10) Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ nwere ike ime ka anyị nwere onwe anyị pụọ ná mmehie anyị ketara n’aka Adam na Iv ma nyekwara anyị aka inwetaghachi ihe ahụ ha tufuru, ya bụ, ndụ ebighị ebi na inwe ahụ́ ike zuru ezu.​—⁠Jọn 3:16. *

 Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere mmehie ahụ Adam na Iv mere

Ụgha: Anyị na Chineke emekataghị dị ná mma ọzọ n’ihi mmehie ahụ Adam na Iv bufeere anyị.

Eziokwu: Chineke anaghị ata anyị ụta maka mmehie ahụ Adam na Iv mere. Ọ ghọtara na anyị ezughị okè, ọ naghịkwa atụ anya ka anyị mee ihe ọ maara na anyị agaghị emeli. (Abụ Ọma 103:14) Ọ bụ eziokwu na anyị na-eme ihe ọjọọ n’ihi mmehie anyị ketara, anyị na Chineke ka nwekwara ike ịdị n’ezigbo mma.​—⁠Ilu 3:⁠32.

Ụgha: Baptizim na-asachapụ mmadụ mmehie ahụ Adam na Iv kpatara, n’ihi ya e kwesịrị ime ụmụ ọhụrụ baptizim.

Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na baptizim bụ otu ihe dị mkpa anyị ga-eme tupu anyị enweta nzọpụta, ma ọ bụ naanị inwe okwukwe na àjà mgbapụta Jizọs ga-asachapụ mmadụ mmehie. (1 Pita 3:21; 1 Jọn 1:⁠7) Ọ bụ ihe mmadụ mụtara na Baịbụl ga-eme ka onye ahụ nwee ezigbo okwukwe. Ihe a abụghịkwanụ ihe nwa e ku n’aka ga-emeli. N’ihi nke a, Baịbụl ekwughị na a ga na-eme ụmụ ọhụrụ baptizim. Ndị Kraịst oge mbụ mere ka nke a doo anya. Ha emeghị ụmụ ọhụrụ baptizim, kama ọ bụ ‘ndị ikom na ndị inyom,’ ndị nabatara Okwu Chineke ka ha mere baptizim.​—⁠Ọrụ Ndịozi 2:41; 8:⁠12.

Ụgha: Chineke bụrụ ụmụ nwaanyị ọnụ n’ihi na ọ bụ Iv bụ onye mbụ riri mkpụrụ osisi ahụ a sị ha erila.

Eziokwu: Ọ bụghị ụmụ nwaanyị ka Chineke bụrụ ọnụ, kama ọ bụ “agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan,” onye mere ka Iv mee mmehie. (Mkpughe 12:9; Jenesis 3:14) Nke ka nke bụ na ọ bụ Adam ka Chineke kacha taa ụta maka mmehie ahụ, ọ bụghị nwunye ya.​—⁠Ndị Rom 5:⁠12.

Gịnịzi mere Chineke ji kwuo na Adam ga-achị nwunye ya? (Jenesis 3:16) Mgbe Chineke kwuru ihe a, ọ pụtaghị na Chineke nabatara nwoke imegbu nwunye ya. Ihe Chineke mere bụ ikwu nsogbu mmehie ga-akpata n’etiti di na nwunye. Chineke chọrọ ka nwoke hụ nwunye ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù nakwa ka ndị nwoke na-asọpụrụ ụmụ nwaanyị niile.​—⁠Ndị Efesọs 5:25; 1 Pita 3:⁠7.

Ụgha: Mmehie ahụ Adam na Iv mere bụ inwe mmekọahụ.

Eziokwu: O nweghị otú mmehie ahụ ga-esi bụrụ inwe mmekọahụ. Lee ihe ndị mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Mgbe Chineke nyere Adam iwu ahụ ka ọ ghara iri mkpụrụ si n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, e kebeghị Iv mgbe ahụ, ọ bụ naanị Adam nọ.​—⁠Jenesis 2:​17, 18.

  • Chineke gwara Adam na Iv ka ha ‘mụọ ọmụmụ, baa ụba,’ nke pụtara na ha ga-amụ ụmụ. (Jenesis 1:28) Ọ ga-abụ ịrụsa di na nwaanyị mbụ ahụ arụrụala ma ọ bụrụ na Chineke ataa ha ahụhụ n’ihi na ha mere ihe o nyere ha iwu mee.

  • Adam na Iv emeghị mmehie ahụ otu oge. Iv bu ụzọ rie ya, emechaa di ya esoro ya.​—⁠Jenesis 3:⁠6.

  • Baịbụl kwadoro ka ndị bụ́ di na nwunye na-enwe mmekọahụ.​—⁠Ilu 5:​18, 19; 1 Ndị Kọrịnt 7:⁠3.

^ par. 1 Okwu ahụ bụ́ “mmehie mbụ” adịghị na Baịbụl. Nke bụ eziokwu bụ na mmehie mbụ e dere na Baịbụl bụ okwu ahụ Setan gwara Iv o ji ghọgbuo ya, na okpookpo asị ahụ ọ tụụrụ ya.​—⁠Jenesis 3:​4, 5; Jọn 8:⁠44.

^ par. 3 Na Baịbụl, okwu ahụ bụ́ “mmehie” apụtaghị naanị ime ihe ọjọọ, kamakwa e ji ya akọwa ezughị okè, ma ọ bụ mmehie anyị ketara n’aka nne na nna anyị mbụ.

^ par. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere àjà Jizọs na otú anyị ga-esi rite uru na ya, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Jizọs Si Azọpụta Anyị?