Gịnị Ka Ịgbaghara Mmadụ Pụtara?
Ihe Baịbụl kwuru
Ịgbaghara mmadụ pụtara ịkwụsị iwesa onye ahụ iwe maka ihe ọjọọ o mere. Na Baịbụl, okwu Grik e sị sụgharịta “mgbaghara” pụtara “ịhapụ ihe,” dị ka ebe mmadụ hapụụrụ onye ọzọ ụgwọ o ji ya. Mgbe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, o ji ụgwọ mmadụ ji tụnyere mmehie. Ọ sịrị: “Gbaghara anyị mmehie anyị, n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke mehiere anyị.” (Luk 11:4; ihe dị́ n’ala peeji) N’ilu banyere ohu ahụ nke na-anaghị eme ebere, Jizọs jikwa ịgbaghara mmadụ tụnyere ịkagbu ụgwọ mmadụ ji ibe ya.—Matiu 18:23-35.
Ọ bụrụ na anyị akwụsị iwere onye mejọrọ anyị iwe, gharakwa ịna-agba ya ụgwọ ka o mezie ihe o mebiri, ọ pụtara na anyị agbagharala ya. Baịbụl kwuru na ọ bụ ezigbo ịhụnanya na-eme ka mmadụ gbaghara ibe ya kpamkpam n’ihi na ịhụnanya ‘adịghị agụkọ ihe ọjọọ.’—1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.
Ihe ịgbaghara mmadụ na-apụtaghị:
Ịnabata ihe onye ahụ mere. Baịbụl katọrọ ndị na-ewere na ime ihe ọjọọ dị mma ma ọ bụkwanụ na e nweghị ihe o mere.—Aịzaya 5:20.
Ime ka à ga-asị na o nweghị ihe onye ahụ mejọrọ. Chineke gbaghaara Eze Devid mgbe o mere mmehie dị́ oké njọ, ma o meghị ka ọ ghara ịta ahụhụ ihe o mere. Chineke medịrị ka e dee ihe ahụ Devid mejọrọ ka e nwee ike icheta ya ruo taa.—2 Samuel 12:9-13.
Ikwe ka ndị ọzọ na-emegbu gị. Ka e were ya na i binyere mmadụ ego, onye ahụ emefusịa ya, o nweghịzikwa ike ịkwụghachi gị ego ahụ otú ahụ o kwuru. Ihe o mere ewute ya, ya arịọ gị ka i meere ya ebere. I nwere ike kpebie ịgbaghara ya, ghara iburu ya iwe n’obi, gharakwa ịna-echetara ya onye ahụ. I nwedịrị ike ịhapụrụ ya ụgwọ ahụ o ji gị. Ma, i nwekwara ike ikpebi na ị gaghị ebinye ya ego mgbe ọzọ.—Abụ Ọma 37:21; Ilu 14:15; 22:3; Ndị Galeshia 6:7.
Ịgbaghara mmadụ n’enweghị ezigbo ihe mere ị ga-eji gbaghara ya. Chineke anaghị agbaghara ndị kpachaara anya na-eme ihe ọjọọ, jụ ikweta na ihe ha na-eme adịghị mma, jụ ịgbanwe, jụkwa ịrịọ ndị ha mejọrọ mgbaghara. (Ilu 28:13; Ọrụ Ndịozi 26:20; Ndị Hibru 10:26) Ụdị ndị ahụ na-achọghị ichegharị bụ ndị iro Chineke, ọ chọghịkwa ka anyị gbaghara ndị ahụ yanwa na-agbagharaghị.—Abụ Ọma 139:21, 22.
Gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ mejọọ gị ma jụ ịrịọ gị mgbaghara ma ọ bụ jụ ikweta na ihe o mere dị njọ? Baịbụl kwuru, sị: “Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma.” (Abụ Ọma 37:8) Ọ bụ eziokwu na ị naghị ekwu na ihe ahụ o mere gị dị́ gị mma, ma i nwere ike ikpebi na ị gaghị eburu onye ahụ iwe n’obi. Tụkwasị Chineke obi na ọ ga-ekpe onye ahụ ikpe. (Ndị Hibru 10:30, 31) Ihe ọzọ ga-akasikwa gị obi bụ ịmata na oge na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka a ghara inwe ihe ga na-ewetu anyị.—Aịzaya 65:17; Mkpughe 21:4.
“Ịgbaghara” ihe ọ bụla i chere na e mejọrọ gị. Mgbe ụfọdụ, kama ịgbagharawa onye mejọrọ anyị, anyị kwesịrị ikweta na e nweghị ezigbo ihe mere anyị ga-eji lewe ihe onye ahụ mere anya ka mmejọ. Baịbụl kwuru, sị: “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe, n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.”—Ekliziastis 7:9.
Otú ị ga-esi agbaghara mmadụ
Cheta ihe ịgbaghara mmadụ pụtara. Ọ pụtaghị na ị na-anabata ihe ọjọọ onye ahụ mere gị ma ọ bụ na-eme ka à ga-asị na e nweghị ihe o mere gị. Kama, ọ pụtara ịhapụ ihe ahụ o mere gị.
Ghọta na ịgbaghara mmadụ bara uru. Ọ bụrụ na ị naghị ewesa mmadụ iwe ma ọ bụ na-eburu mmadụ iwe n’obi, ọ ga-eme ka obi na-eru gị ala, ahụ́ ana-adị gị mma, obi ana-adịkwa gị ụtọ. (Ilu 14:30; Matiu 5:9) Ihe ọzọ kacha mkpa bụ na ịgbaghara ndị ọzọ na-eme ka Chineke gbaghara anyị mmehie nke anyị.—Matiu 6:14, 15.
Na-emetere ndị ọzọ ebere. Anyị niile ezughị okè. (Jems 3:2) Ebe ọ bụ na obi na-adị anyị mma ma ndị ọzọ gbaghara anyị, anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ.—Matiu 7:12.
Na-echebara ndị ọzọ echiche. Ọ bụrụ na ihe mmadụ mere anyị bụ obere ihe, anyị nwere ike ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: ‘Na-edirinụ ibe unu ihe.’—Ndị Kọlọsi 3:13.
Mee ihe ngwa ngwa. Gbalịa ka ị gbaghara onye mejọrọ gị ngwa ngwa kama ịnọ na-ewe iwe.—Ndị Efesọs 4:26, 27.