Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ị Ga-esi Rite Uru N’otú Jehova Si Agbaghara Mmehie?

Olee Otú Ị Ga-esi Rite Uru N’otú Jehova Si Agbaghara Mmehie?

Olee Otú Ị Ga-esi Rite Uru N’otú Jehova Si Agbaghara Mmehie?

“Jehova [bụ] Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye . . . na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie.”​—ỌPỤ. 34:6, 7.

CHỌỌ AZỊZA AJỤJỤ NDỊ A

Gịnị ka Jehova mere mgbe Devid na Manase mehiere, gịnịkwa mere o ji mee otú ahụ?

Gịnị mere na Jehova agbagharaghị mba Izrel?

Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova gbaghara anyị?

1, 2. (a) Olee ụdị Chineke Jehova bụụrụ mba Izrel? (b) Olee ajụjụ anyị ga-atụle n’isiokwu a?

N’OGE Nehemaya, e nwere ndị Livaị nọ n’ihu ọha kpee ekpere ma kwuo na ndị nna nna ha jụrụ ugboro ugboro “ige ntị” n’iwu Jehova. Ma, Jehova gbaghaara ha ugboro ugboro n’ihi na ọ bụ “Chineke nke na-agbaghara mmehie, onye na-eme amara, na-emekwa ebere, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ na onye obiọma ya dị ukwuu.” Jehova meere ndị Juu ahụ si Babịlọn lọta n’oge Nehemaya obiọma.—Nehe. 9:16, 17.

2 Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịjụ onwe ya, sị, ‘Olee otú m ga-esi rite uru n’otú Chineke si agbaghara mmehie?’ Iji nyere anyị aka ịza ajụjụ a dị mkpa, ka anyị tụlee otú Chineke si gbaghara eze abụọ, ya bụ, Devid na Manase.

MMEHIE NDỊ DỊ OKÉ NJỌ DEVID MERE

3-5. Olee otú Devid si mee mmehie ndị dị oké njọ?

3 N’agbanyeghị na Devid bụ nwoke na-atụ egwu Chineke, o mere mmehie ndị dị oké njọ. Mmehie abụọ n’ime ha gbasara Yuraya na nwunye ya, bụ́ Bat-shiba. Mmehie abụọ ahụ kpataara Devid, Yuraya, na Bat-shiba ezigbo nsogbu. Ma, otú Chineke si gbazie Devid na-akụziri anyị otú Jehova si agbaghara ndị mmadụ. Ka anyị tụlee ihe merenụ.

4 Devid zigara ndị agha Izrel ka ha gaa lụso Raba, bụ́ isi obodo ndị Amọn, agha. Obodo ahụ dị ihe dị ka iri kilomita asatọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeruselem, ma a gafee Osimiri Jọdan. Ma, Devid nọ n’ụlọ elu ya dị na Jeruselem hụ ka Bat-shiba, bụ́ nwunye Yuraya, na-asa ahụ́. Di ya so gaa agha. Anya Devid lere Bat-shiba mere ka nwaanyị ahụ gụsie ya agụụ ike. N’ihi ya, o dunyere ndị ozi ka a kpọta nwaanyị ahụ n’obí ya, ha abụọ akwaa iko.—2 Sam. 11:1-4.

5 Mgbe Devid chọpụtara na Bat-shiba adịla ime, o ziri onyeisi ndị agha ya ozi ka ọ gwa Yuraya ka ọ lọta Jeruselem. Devid bu n’obi na Yuraya na nwunye ya ga-enwe mmekọahụ. N’ihi ya, ọ gwara Yuraya ugboro ugboro ka ọ laa n’ụlọ ya. Ma Yuraya ekweghị ala n’ụlọ ya. N’ihi ya, Devid deere onyeisi ndị agha ya akwụkwọ ozi, gwa ya ka o tinye Yuraya “n’ebe agha kpụ ọkụ n’ọnụ,” gwakwa ndị agha ka ha hapụ ya laa azụ. Ebe Yuraya nọzi naanị ya, ndị iro gburu ya otú ahụ Devid bu n’obi. (2 Sam. 11:12-17) Otú ahụ ka eze si kwaa iko, nọrọkwa n’elu ya mee ka e gbuo onye ọ na-enweghị ihe o mere.

DEVID CHEGHARỊRỊ

6. Gịnị ka Chineke mere n’ihi mmehie Devid mere, gịnịkwa ka ihe ahụ na-akụziri anyị banyere Jehova?

6 N’eziokwu, Jehova na-ahụ ihe niile. N’ihi ya, ọ hụrụ ihe niile Devid mere. (Ilu 15:3) Ọ bụ eziokwu na Eze Devid mechara lụọ Bat-shiba, ‘ihe o mere dị njọ n’anya Jehova.’ (2 Sam. 11:27) Gịnị ka Chineke mere Devid n’ihi mmehie ndị ahụ? Ọ gwara Netan, bụ́ onye amụma ya, ka ọ gakwuru Devid. Ebe Jehova bụ Chineke na-agbaghara mmehie, ọ dị ka ọ̀ chọrọ ịmata ma Devid ò chegharịala ka o meere ya ebere. Otú Jehova si dị njikere ịgbaghara Devid ọ́ naghị agba gị ume? Ọ manyeghị Devid ikwupụta mmehie ya, kama ọ gwara Netan ka ọ gaa kọọrọ Eze Devid otu akụkọ nke gosiri na mmehie ya jọgburu onwe ya. (Gụọ 2 Samuel 12:1-4.) Otú ahụ Jehova si mee ka a mata ihe dị Devid n’obi magburu onwe ya!

7. Gịnị ka Devid mere mgbe Netan kọchaara ya akụkọ ahụ?

7 Akụkọ ahụ Netan kọrọ mere ka Eze Devid chee echiche banyere ikpe ziri ezi. Devid wesoro ọgaranya ahụ Netan kọrọ akụkọ ya iwe, o wee gwa Netan, sị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, nwoke nke mere ihe a kwesịrị ịnwụ!” Devid kwukwara na ọgaranya ahụ kwesịrị ịkwụ ogbenye ahụ ụgwọ atụrụ ya ahụ o weere. Ma, Netan gwara Devid ihe mere ka ọ kụja. Ọ gwara Devid, sị: “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ!” Netan gwaziri Devid na n’ihi ihe ahụ o mere, “mma agha” agaghị apụ apụ n’ụlọ ya nakwa na ọdachi ga-adakwasị ụlọ ya. A ga-emenyekwa ya ihere n’ihu ọha n’ihi mmehie ya. Devid ghọtara na ihe o mere jọgburu onwe ya. O wutere ya nke ukwuu, o wee sị: “Emehiewo m Jehova.”—2 Sam. 12:5-14.

DEVID KPERE EKPERE, CHINEKE AGBAGHARA YA

8, 9. Olee otú Abụ Ọma nke 51 si gosi otú obi dị Devid n’ihi mmehie ya, gịnịkwa ka ọ na-akụziri anyị banyere Jehova?

8 Abụ Devid mechara dee n’Abụ Ọma nke 51 gosiri na o ji obi ya niile chegharịa. Devid rịọrọ Jehova ezigbo arịrịọ, gosikwa na ọ bụghị naanị na o kwetara na o mere ihe ọjọọ, kama na o chegharịrị ná mmehie ya. Ihe kacha Devid mkpa bụ adịm ná mma ya na Chineke. O kwuru, sị: “Ọ bụ gị, naanị gị, ka m mehieworo.” Ọ rịọrọ Jehova, sị: “Chineke, biko, mee ka m nwee obi dị ọcha, tinyekwa mmụọ ọhụrụ, nke iguzosi ike, n’ime m. . . . Mee ka m nwetaghachi ọṅụ nke nzọpụta si n’aka gị, kwadokwa m site n’ime ka m nwee mmụọ ime ihe.” (Ọma 51:1-4, 7-12) Mgbe ị na-agwa Jehova banyere mmehie gị, ị̀ na-agwa ya otú ihe niile si mee?

9 Jehova emeghị ka Devid ghara ịta ahụhụ maka mmehie ya. Mmehie ahụ ga na-akpatara Devid nsogbu ruo mgbe ọ ga-anwụ. Ma, Jehova gbaghaara ya n’ihi na o chegharịrị ma nwee “obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute.” (Gụọ Abụ Ọma 32:5; Ọma 51:17) Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ghọtara otú obi dị mmadụ na ihe mere mmadụ ji emehie. Kama ịhapụ ka ndị ikpe jiri Iwu Mozis maa Devid na Bat-shiba ikpe ọnwụ, Jehova ji aka ya kpee ha ikpe ma meere ha ebere. (Lev. 20:10) Chineke mere ka nwa ha bụ́ Sọlọmọn bụrụ eze chịrị Izrel mgbe Devid chịchara.—1 Ihe 22:9, 10.

10. (a) Olee ihe ọzọ nwere ike ịbụ ihe mere Jehova ji gbaghara Devid? (b) Gịnị ka mmadụ kwesịrị ime ka Jehova gbaghara ya?

10 O nwere ike ịbụ na ihe ọzọ mere Jehova ji gbaghara Devid bụ otú Devid si meere Sọl ebere. (1 Sam. 24:4-7) Jizọs kwuru na Jehova na-emeso anyị otú anyị si emeso ndị ọzọ. O kwuru, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe; n’ihi na otú unu si ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe; ihe unu jikwa atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.” (Mat. 7:1, 2) Obi dị anyị ụtọ na Jehova nwere ike ịgbaghara anyị mmehie anyị, ọ bụrụgodị mmehie dị oké njọ, dị ka ịkwa iko ma ọ bụ igbu ọchụ! Ọ ga-agbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị ọzọ, kwupụtara ya mmehie anyị, chegharịakwa ma lee mmehie anyị anya otú Jehova si ele ya. Ọ bụrụ na ndị mmehie ejiri obi ha niile chegharịa, Jehova ga-eme ka ha nweta “ume,” ya bụ, mee ka ha nwee akọnuche dị ọcha.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 3:19.

MANASE MERE MMEHIE NDỊ DỊ OKÉ NJỌ MA MECHAA CHEGHARỊA

11. Olee ihe arụ Eze Manase mere?

11 Chegodị banyere akụkọ ọzọ dị na Baịbụl nke gosiri na Jehova dị njikere ịgbaghara mmehie, ma ndị dị oké njọ. Mgbe Devid chịchara, ihe dị ka narị afọ atọ na iri abụọ agaakwa, Manase ghọrọ eze Juda ma chịa afọ iri ise na ise. Jehova mara ya ikpe n’ihi ihe arụ niile o mere n’oge ahụ ọ chịrị. Dị ka ihe atụ, Manase wuuru Bel ebe ịchụàjà, fee “ìgwè ihe niile dị n’eluigwe,” suree ụmụ ya n’ọkụ, meekwa ka e nwee ndị na-eme mgbaasị. N’eziokwu, “o mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu.”—2 Ihe 33:1-6.

12. Olee otú Manase si laghachikwute Jehova?

12 E mechara dọrọ Manase n’agha laa Babịlọn ma tụọ ya mkpọrọ. Ọ ga-abụ na ọ nọ ebe ahụ cheta na Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Mgbe ị nọ n’oké ihe isi ike, okwu a niile ewee mezuo n’isi gị mgbe ụbọchị ndị ahụ gwụwara, mgbe ahụ, ị ga-alaghachikwute Jehova bụ́ Chineke gị wee gee ntị n’olu ya.” (Diut. 4:30) Manase laghachikwutere Jehova. Olee otú o si mee ya? O ‘wedara onwe ya ala nke ukwuu, na-ekpekukwa Chineke ekpere’ (dị ka e sere na peeji nke 21). (2 Ihe 33:12, 13) Baịbụl agwaghị anyị ihe Manase kwuru n’ekpere ya, ma o nwere ike ịbụ na o kwuru ụdị ihe ahụ Eze Devid kwuru n’Abụ Ọma nke 51. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, Manase ji obi ya niile chegharịa.

13. Gịnị mere Jehova ji gbaghara Manase?

13 Gịnị ka Jehova mere mgbe Manase kpere ekpere? ‘Ọ nabatara arịrịọ Manase, nụkwa arịrịọ ọ rịọrọ ka e meere ya amara.’ Dị ka Devid, Manase ghọtara na ihe o mere jọgburu onwe ya, o wee jiri obi ya niile chegharịa. Ọ bụ ya mere Chineke ji gbaghara ya ma mee ka ọ lọghachi Jeruselem, bụrụkwa eze. “Manase wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.” (2 Ihe 33:13) Ihe banyere Manase na-emekwa ka obi sie anyị ike na Jehova dị ebere nakwa na ọ na-agbaghara ndị ji obi ha niile chegharịa!

JEHOVA Ọ̀ NA-AGBAGHARA MMEHIE MGBE NIILE?

14. Gịnị ga-eme ka Jehova kpebie ịgbaghara ndị mere mmehie?

14 Ọtụtụ n’ime anyị agaghị eme ụdị mmehie ahụ Devid na Manase mere. N’ihi ya, e nwere ike anyị agaghị arịọ Chineke ụdị mgbaghara ahụ. Ma, otú Jehova si gbaghara eze abụọ ahụ na-enyere anyị aka ịghọta na Chineke anyị dị njikere ịgbaghara mmehie, ma ndị dị oké njọ, ma ọ bụrụ na onye mere ya ji obi ya niile chegharịa.

15. Olee otú anyị si mara na Jehova anaghị agbaghara mmehie mgbe niile?

15 N’eziokwu, anyị ekwesịghị iche na Jehova na-agbaghara mmehie mgbe niile. Ihe Devid na Manase mere dị iche n’ihe ndị nnupụisi e nwere n’Izrel nakwa na Juda mere. Chineke dunyere Netan ka ọ gaa gwa Devid ihe kwesịrị ime ka o chegharịa. Devid eweghị iwe maka ihe Netan gwara ya, kama o chegharịrị. Mgbe Manase chọpụtara na ihe esielara ya ezigbo ike, o ji obi ya niile chegharịa. Ma, ndị Izrel na ndị Juda echegharịghị. N’ihi ya, Jehova agbagharaghị ha. Kama, o zigara ndị amụma ya ugboro ugboro ka ha gwa ndị ya otú obi dị ya n’ihi mmehie ha. (Gụọ Nehemaya 9:30.) Mgbe ndị Izrel si Babịlọn lọta ala ha, Jehova nọkwa na-ezigara ha ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Ezra onye nchụàjà na Malakaị onye amụma. Mgbe ndị Izrel mere uche Jehova, ha na-aṅụrị ezigbo ọṅụ.—Nehe. 12:43-47.

16. (a) Gịnị mere mba Izrel n’ihi na ha echegharịghị ná mmehie ha? (b) Gịnị ka Jehova nwere ike imere ndị si n’agbụrụ Izrel?

16 Jehova anaghịzi anabata àjà ọ gwara ndị Izrel ka ha jiri anụmanụ na-achụrụ ya. Kama, o zitere Jizọs n’ụwa ka ọ bụrụ àjà zuru okè maka mmadụ niile. (1 Jọn 4:9, 10) Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, otú o si kwuo banyere Jeruselem gosiri otú Nna ya si ele obodo ahụ anya. O kwuru, sị: “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume,—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya! Ma unu achọghị ya.” N’ihi ya, Jizọs kwuru, sị: “Lee! A hapụworo unu ụlọ unu.” (Mat. 23:37, 38) E si otú ahụ were “Izrel nke Chineke” dochie mba Izrel ahụ na-ekweghị echegharị. (Mat. 21:43; Gal. 6:16) Ma è nwere ike ịgbaghara ndị si n’agbụrụ Izrel mmehie ha? Ee. Jehova dị njikere ịgbaghara ha ma meere ha ebere ma ọ bụrụ na ha enwee okwukwe na Chineke nakwa n’àjà Jizọs Kraịst chụrụ. Mgbe a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ụwa ọhụrụ, Jehova ga-adịkwa njikere ịgbaghara ndị a kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ ndị na-echegharịghị ná mmehie ha tupu ha anwụọ.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.

RITE URU N’OTÚ JEHOVA SI AGBAGHARA MMEHIE

17, 18. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova gbaghara anyị?

17 Ebe ọ bụ na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ime? N’eziokwu, anyị kwesịrị ime otú ahụ Devid na Manase mere. Anyị kwesịrị ịghọta na anyị bụ ndị mmehie, chegharịa ná mmehie anyị, rịọ Jehova ka ọ gbaghara anyị, rịọkwa ya ka o mee ka anyị nwee obi dị ọcha. (Ọma 51:10) Ọ bụrụ na anyị emeela mmehie dị oké njọ, anyị kwesịkwara ịgwa ndị okenye ihe anyị mere ka ha nyere anyị aka. (Jems 5:14, 15) N’agbanyeghị ụdị mmehie anyị mere, obi kwesịrị iru anyị ala ma anyị cheta na Jehova gwara Mozis na ya bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-eme ka obiọma ya ruoro ọtụtụ puku ọgbọ, na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie.” Jehova agbanwebeghị.—Ọpụ. 34:6, 7.

18 Jehova kwere ndị Izrel chegharịrị echegharị nkwa na ya ga-agbaghara ha mmehie ha kpamkpam. O kwuru na ọ ga-eme ka mmehie ha nke “na-acha uhie uhie” na-achazi “ezigbo ọcha.” (Gụọ Aịzaya 1:18.) N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi rite uru n’otú Jehova si agbaghara mmehie? Jehova ga-agbaghara anyị mmehie anyị na njehie anyị kpamkpam ma ọ bụrụhaala na anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka otú o si agbaghara mmehie, jirikwa obi anyị niile chegharịa.

19. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ebe ọ bụ na Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị, olee otú anyị ga-esi ṅomie ya mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe? Olee otú anyị ga-esi na-agbaghara ndị mere mmehie dị oké njọ ma jiri obi ha niile chegharịa? Isiokwu na-esonụ ga-enyere anyị aka inyocha obi anyị ka anyị nwee ike imekwu ka Nna anyị bụ́ Jehova, bụ́ onye “dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.”—Ọma 86:5.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 24]

Jehova gbaghaara Manase ma mee ka ọ lọghachi Jeruselem, bụrụkwa eze