Ozi Ọma Matiu Dere 21:1-46

  • Jizọs gbaara jakị banye Jeruselem ka eze (1-11)

  • Jizọs mere ka ụlọ nsọ dị ọcha (12-17)

  • Jizọs bụrụ osisi fig ọnụ (18-22)

  • A jụrụ Jizọs onye nyere ya ikike (23-27)

  • Ihe atụ gbasara ụmụ abụọ otu nwoke mụrụ (28-32)

  • Ihe atụ gbasara ndị ọrụ ubi gburu mmadụ (33-46)

    • Ndị mmadụ jụrụ nkume ji ụlọ (42)

21  Mgbe ha ruru Jeruselem nso, ha kwụsịrị na Betfeji, n’Ugwu Oliv. Jizọs wee zipụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya,+  sị ha: “Gaanụ n’obodo a unu na-ahụ. Ozugbo unu banyere n’ime ya, unu ga-ahụ jakị e liwere eliwe na nwa jakị ya na ya nọ. Tọpụnụ ha, kpụtara m ha.  Ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa unu ihe ọ bụla, sịnụ ya, ‘Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ha.’ Ọ ga-ahapụkwa ha ka unu kpụrụ ha.”  N’eziokwu, ihe a mere ka e wee mezuo ihe e si n’ọnụ onye amụma kwuo, sị:  “Sịnụ Zayọn*: ‘Eze gị na-abịakwute gị,+ onye dị nwayọọ n’obi.+ Ọ nọkwa n’elu jakị, bụ́ nwa jakị, nwa anụ na-ebu ibu.’”+  Ndị na-eso ụzọ ya ahụ wee gaa mee ihe Jizọs gwara ha.+  Ha kpụtara jakị ahụ na nwa ya, wụsa uwe elu ha n’elu ha, o wee nọrọ n’elu nwa jakị ahụ.+  Ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ gbasara uwe elu ha n’okporo ụzọ,+ ndị ọzọ egbute alaka osisi tụsa n’okporo ụzọ.  Ìgwè mmadụ ahụ, ma ndị na-aga ya n’ihu ma ndị na-eso ya n’azụ, nọ na-eti mkpu, sị: “Biko, zọpụta Nwa Devid!+ Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova* bụ onye a gọziri agọzi!+ Biko, zọpụta ya, gị onye nọ ebe kacha elu!”+ 10  Mgbe ọ banyere Jeruselem, obodo ahụ niile malitere ịgba aghara, ha ana-asị: “Ònye bụ onye a?” 11  Ìgwè mmadụ ahụ nọ na-asị, “Onye a bụ Jizọs onye amụma,+ onye Nazaret dị na Galili.” 12  Jizọs wee baa n’ụlọ nsọ chụpụ ndị niile na-ere ihe na ndị niile na-azụ ihe n’ụlọ nsọ ahụ. O kpuru tebụl ndị na-agbanwe ego na oche ndị na-ere nduru ihu n’ala.+ 13  O wee sị ha: “E dere, sị, ‘A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere,’+ ma unu na-eme ya ọgba ndị ohi.”+ 14  Ndị ìsì na ndị ngwọrọ bịakwutekwara ya n’ụlọ nsọ ahụ, ya agwọọ ha. 15  Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ hụrụ ihe ịtụnanya ndị o mere nakwa ụmụntakịrị ndị nwoke na-eti mkpu n’ụlọ nsọ, sị, “Chineke biko, zọpụta Nwa Devid!”+ iwe were ha.+ 16  Ha wee sị ya: “Ị̀ na-anụ ihe ndị a na-ekwu?” Jizọs asị ha: “Ee. Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe e dere, sị, ‘I meela ka ọnụ ụmụaka na ụmụ ọhụrụ too gị’?”+ 17  Mgbe ọ hapụrụ ha, ọ pụrụ n’obodo ahụ gaa Betani, rahụkwa ebe ahụ.+ 18  Mgbe ọ na-alaghachi n’obodo ahụ n’isi ụtụtụ, agụụ gụwara ya.+ 19  O wee hụ otu osisi fig n’akụkụ ụzọ wee jee na ya, ma e nweghị ihe ọ hụrụ n’elu ya ma e wezụga akwụkwọ ndụ.+ O wee sị osisi ahụ: “Amịla mkpụrụ ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.”+ Osisi fig ahụ wee kpọnwụọ ozugbo. 20  Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, o juru ha anya. Ha wee sị: “Olee otú osisi fig a si kpọnwụọ ozugbo?”+ 21  Jizọs asị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu nwere okwukwe ma ghara inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe m mere osisi fig a, kama, ọ bụrụ na unu asị ugwu a, ‘Si ebe a pụọ daba n’oké osimiri,’ ọ ga-eme.+ 22  Unu ga-enweta ihe niile unu ji okwukwe rịọ.”+ 23  Mgbe ọ banyere n’ime ụlọ nsọ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya ka ọ na-ezi ihe wee sị ya: “Ebee ka i si nweta ikike i ji eme ihe ndị a? Ònye nyekwara gị ikike ime ihe ndị a?”+ 24  Jizọs asị ha: “M ga-ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa m ya, m ga-agwazi unu ebe ikike m ji na-eme ihe ndị a si. 25  Baptizim Jọn mere ndị mmadụ, ebee ka o si? Ò si n’eluigwe, ka ò si n’aka mmadụ?” Ma ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnịzi mere na unu ekwetaghị ihe o kwuru?’+ 26  Ma, ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’aka mmadụ,’ anyị na-atụ egwu ihe ìgwè mmadụ a ga-eme anyị, n’ihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.” 27  Ha gwaziri Jizọs, sị: “Anyị amaghị.” Ya asị ha: “M gaghịkwa agwa unu ebe ikike m ji eme ihe ndị a si. 28  “Gịnị ka unu chere? Otu nwoke mụtara ụmụ abụọ. Mgbe ọ gakwuuru onye nke mbụ, ọ sịrị ya, ‘Nwa m, gaa rụọ ọrụ taa n’ubi vaịn m.’ 29  Onye nke a asị, ‘Agaghị m aga,’ ma o mechara kwaa ụta gaa. 30  Ọ bịakwutere onye nke abụọ, gwa ya otu ihe ahụ. Onye nke a asị, ‘Nna m, m ga-aga,’ ma ọ gaghị. 31  Ònye n’ime ha abụọ mere uche nna ya?” Ha wee sị ya: “Onye nke mbụ.” Jizọs asị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na ndị ọnaụtụ na ndị akwụna bu unu ụzọ na-abanye n’Alaeze Chineke. 32  N’ihi na Jọn bịakwutere unu, na-egosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekwereghị ya. Ma, ndị ọnaụtụ na ndị akwụna kweere ya.+ Ọ bụ eziokwu na unu hụrụ ihe a, unu akwaghị ụta n’ikpeazụ ka unu wee kwere ya. 33  “Nụrụnụ ihe atụ ọzọ: E nwere otu nwoke nwere ala, kọọ ubi vaịn na ya,+ gbaakwa ya ogige ma gwuo ebe a na-azọchapụta mmanya na ya, rụọkwa ụlọ elu na ya.+ O nyefeziri ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gaa mba ọzọ.+ 34  Mgbe oge e ji aghọ mkpụrụ vaịn ruru, o ziri ndị ohu ya ka ha gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ weta mkpụrụ ya. 35  Ma, ndị ọrụ ubi ahụ jidere ndị ohu ya, tikasịa otu ahụ́, gbuo onye nke ọzọ, tụọkwa onye nke ọzọ nkume.+ 36  O zikwara ndị ohu ọzọ, ndị dị ọtụtụ karịa ndị nke mbụ, ka ha gakwuru ha. Ma, ha mere ha otu ihe ahụ.+ 37  N’ikpeazụ, o zigaara ha ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’ 38  Mgbe ndị ọrụ ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gwara ibe ha, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-eketa ubi a.+ Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe ọ ga-eketa bụrụzie nke anyị.’ 39  Ha wee jide ya, kpọpụ ya n’ubi vaịn ahụ, gbuo ya.+ 40  N’ihi ya, mgbe onye nwe ubi vaịn ahụ bịara, gịnị ka ọ ga-eme ndị ọrụ ubi ahụ?” 41  Ha asị ya: “Ebe ọ bụ na ha bụ ndị ọjọọ, ọ ga-abịa laa ha n’iyi, nyefeekwa ubi vaịn ahụ n’aka ndị ọrụ ubi ọzọ, ndị ga-enye ya mkpụrụ ya mgbe oge ya ruru.” 42  Jizọs wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị, ‘Nkume ndị na-arụ ụlọ jụrụ aghọọla nkume ji ụlọ.+ Ihe a si n’aka Jehova,* ọ dịkwa ebube n’anya anyị’?+ 43  Ọ bụ ya mere m ji asị unu, a ga-anapụ unu Alaeze Chineke, werekwa ya nye ndị na-eme uche Chineke.* 44  Onye dakwara n’elu nkume a ga-akụri.+ Nkume a ga-egwerikwa onye ọ bụla ọ dakwasịrị.”+ 45  Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị Farisii nụrụ ihe atụ a o mere, ha matara na ọ na-ekwu banyere ha.+ 46  Ọ bụ eziokwu na ha chọrọ ijide ya, ha tụrụ egwu ihe ìgwè mmadụ ahụ ga-eme ha, n’ihi na ha kweere na ọ bụ onye amụma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ada bụ́ Zayọn.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “mba nke na-amị mkpụrụ ya.”