Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 33:1-25
33 Manase+ dị afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri ise na ise na Jeruselem.+
2 Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova, na-akpa ụdị arụ mba ndị ahụ Jehova chụpụrụ n’ihi ndị Izrel nọ na-akpa.+
3 Ọ rụghachiri ebe ndị dị elu Hezekaya nna ya kwaturu.+ Ọ rụụrụ Bel ebe ịchụàjà, rụọkwa ogwe osisi arụsị* dị iche iche. Ọ nọ na-akpọrọ ihe niile dị n’eluigwe isiala, na-efekwa ha.+
4 Ọ rụkwara ebe ịchụàjà dị iche iche n’ụlọ Jehova.+ Ụlọ a bụ ụlọ Jehova kwuru gbasara ya, sị: “A ga-anọ na Jeruselem na-eto aha m ruo mgbe ebighị ebi.”+
5 Ọ rụkwaara ihe niile dị n’eluigwe ebe ịchụàjà dị iche iche n’ogige abụọ ndị dị n’ụlọ Jehova.+
6 Ọ kpọkwara ụmụ ya ọkụ na Ndagwurugwu Nwa Hinọm+ iji chụọ àjà.+ O mere anwansi,*+ gbaa afa, mee mgbaasị. Ọ họpụtakwara ndị ga na-agba afa na ndị ga na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Ihe ọjọọ o mere, nke kpasuru Jehova iwe, karịrị akarị.
7 O dowere arụsị ọ pịrị apị n’ụlọ ezi Chineke.+ Ụlọ a bụ ụlọ Chineke gwara Devid nakwa Solomọn nwa ya gbasara ya, sị: “N’ụlọ a nakwa na Jeruselem, bụ́ ebe m họọrọ n’ime ebo niile dị n’Izrel, ka a ga-anọ na-eto aha m mgbe niile.+
8 Ọ bụrụhaala na ndị Izrel elezie anya na-eme ihe niile m si n’ọnụ Mosis gwa ha ka ha na-eme, ya bụ, na-edebe Iwu m niile, na-eso ntụziaka m dị iche iche, na-emekwa ihe ndị m kpebiri, o nweghị ihe ga-eme ka m chụpụ ha n’ala m nyere ndị nna nna ha.”
9 Manase nọ na-eduhie ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, na-eme ka ha na-eme ihe ọjọọ karịa mba ndị ahụ Jehova lara n’iyi mgbe ndị Izrel weghaara ala ha.+
10 Jehova nọkwa na-agwa Manase na ndị ya okwu, ma ha aṅaghị ya ntị.+
11 N’ihi ya, Jehova mere ka ndị isi agha eze Asiria bịa lụso ha agha. Ha jidekwara Manase, ganye nko n’ahụ́ ya,* tụọkwa ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụga ya Babịlọn.
12 Ma ka ọ nọ n’ahụhụ, ọ rịọrọ Jehova bụ́ Chineke ya ka o meere ya amara.* Ọ nọkwa na-eweda nnọọ onwe ya ala n’ihu Chineke nna nna ya hà.
13 Ọ nọkwa na-ekpe ekpere, na-arịọ Chineke ka o meere ya amara, ya anabata arịrịọ ya, mee ka ọ laghachi Jeruselem, chịwakwa.+ Oge ahụ ka Manase matara na Jehova bụ ezi Chineke.+
14 Mgbe ihe a mechara, ọ rụrụ mgbidi n’ihu mgbidi Obodo Devid,+ n’ebe ọdịda anyanwụ Gaịhọn+ nke dị na ndagwurugwu. Ọ rụrụ ya ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀,+ rụọkwa ya gburugburu ruo Ofel.+ Ọ rụlikwara ya ezigbo elu. O dowekwara ndị ọchịagha n’obodo niile a rụsiri ike na Juda.
15 Ọ gakwara n’ụlọ Jehova wepụ chi ndị mba ọzọ na arụsị ahụ ọ pịrị apị.+ O wepụkwara ebe ịchụàjà niile ọ rụrụ n’ugwu ụlọ Jehova dị n’elu ya+ nakwa na Jeruselem. O kpofukwara ha n’azụ obodo.
16 Ọ rụzikwara ebe ịchụàjà Jehova,+ malite ịnọ na ya na-achụ àjà udo+ na àjà ekele.+ Ọ gwakwara ndị Juda ka ha na-efe Jehova bụ́ Chineke Izrel.
17 Ma, ndị mmadụ ka nọkwa na-achụ àjà n’ebe ndị dị elu, n’agbanyeghị na ọ bụ naanị Jehova bụ́ Chineke ha ka ha na-achụrụ ya.
18 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Manase, arịrịọ ọ rịọrọ Chineke ya, na okwu ndị na-ahụ ọhụụ nọ na-agwa ya n’aha Jehova bụ́ Chineke Izrel, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel.
19 N’akwụkwọ e dere ihe ndị na-ahụ ọhụụ kwuru, e dekwara ekpere Manase kpere,+ otú e si meere ya ihe ọ rịọrọ, mmehie ya niile, otú o si hapụ Chineke,+ ebe ndị ọ rụrụ ebe ndị dị elu, ogwe osisi arụsị* ndị ọ kwụwara,+ nakwa arụsị a pịrị apị ndị o dowere tupu ya eweda onwe ya ala.
20 Manase mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, ha elie ya n’ụlọ ya. Emọn nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+
21 Emọn+ dị afọ iri abụọ na abụọ mgbe o bidoro ịchị. Ọ chịrị afọ abụọ na Jeruselem.+
22 Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova otú Manase nna ya mere.+ Emọn chụkwaara arụsị dị iche iche Manase nna ya pịrị apị àjà.+ Ọ nọkwa na-efe ha ofufe.
23 O wedaghịkwa onwe ya ala n’ihu Jehova+ otú Manase nna ya wedara onwe ya ala.+ Kama, Emọn nọ na-eme mmehie n’akwụsịghị akwụsị.
24 N’ikpeazụ, ndị na-ejere ya ozi gbaara ya izu+ ma gbuo ya n’ụlọ ya.
25 Ma, ndị obodo ya gburu ndị niile ahụ gbaara Eze Emọn izu.+ Ha chikwara Josaya nwa ya+ eze, ya anọchie ya.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu
^ Ma ọ bụ “majik.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ha jidekwara Manase n’ọgba.”
^ Ma ọ bụ “o mere ka obi Jehova bụ́ Chineke ya jụrụ.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu