Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 22:1-19
22 Devid wee sị: “Ebe a ka a ga-arụrụ Jehova bụ́ ezi Chineke ụlọ. Ọ ga-abụkwa ebe ịchụàjà ndị Izrel ga-anọ na-achụ àjà a na-esu ọkụ.”+
2 Devid kwukwara ka a kpọkọta ndị mbịarambịa+ bi n’Izrel. Mgbe a kpọkọtara ha, ya agwa ha ka ha na-awa nkume, na-awapụtakwa ndị nke ga-adị mma iji rụọrọ ezi Chineke ụlọ.+
3 Devid kwakọtakwara ọtụtụ ígwè a ga-eji mere ntu a ga-eji kụọ ibo ọnụ ụzọ ámá dị iche iche nakwa ihe a ga-eji akpagide otu ihe na ibe ya. Ọ kwakọtakwara ọtụtụ ọla kọpa nke na a tụlighị otú ọ hà atụ̀.+
4 Ndị Saịdọn+ na ndị Taya+ butekwaara Devid osisi sida+ karịrị akarị, nke na a gụtalighị osisi sida ndị ahụ ọnụ.
5 Devid sịkwara: “Solomọn nwa m bụ obere nwa, o nwebeghịkwa ihe ọ ma.*+ Ma ụlọ a ga-arụrụ Jehova ga-abụ akatamkpo ụlọ+ ga-ama mma na-enweghị atụ,+ nke na akụkọ ya ga-agbasaru ebe niile.+ N’ihi ya, m ga-akwakọtara ya ihe.” Ọ bụ ya mere tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ọtụtụ ihe a ga-eji rụọ ụlọ ahụ.
6 Devid kpọkwara Solomọn nwa ya, gwa ya ka ọ rụọrọ Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ.
7 Ọ gwara Solomọn nwa ya, sị: “Ọ dị m n’obi ịrụrụ Jehova bụ́ Chineke m ụlọ a ga-anọ na-eto aha ya.+
8 Ma, Jehova gwara m, sị, ‘I gbuola ọtụtụ mmadụ* n’ọtụtụ agha ị lụrụ. Ị gaghị arụrụ m ụlọ a ga-anọ na-eto aha m,+ n’ihi na i gbuola ọtụtụ mmadụ* n’ụwa.
9 Ị ga-amụ nwa+ ga-abụ onye udo.* M ga-emekwa ka o zuoro ndị iro niile gbara ya gburugburu ike,+ n’ihi na aha ya ga-abụ Solomọn.*+ Ya chịwa, m ga-eme ka ebe niile n’Izrel daa jụụ, udo adịrịkwa na ya.+
10 Ọ bụ ya ga-arụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha m.+ Ọ ga-abụ nwa m, mụnwa ga-abụkwa nna ya.+ M ga-eme ka ocheeze ya sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.’+
11 “Nwa m, ka Jehova nọnyere gị. Ka ị na-arụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị, ka ihe gaziere gị otú o kwuru banyere gị.+
12 Ka Jehova mee ka ị dị akọ, na-aghọtakwa ihe+ mgbe ọ ga-eme ka ị na-edu ndị Izrel, ka i nwee ike ịna-edebe iwu Jehova bụ́ Chineke gị.+
13 Ihe ga-agaziri gị ma i lezie anya na-eme ihe otú Jehova gwara Mosis ka ndị Izrel na-eme,+ na-emekwa ihe ndị o kpebiri.+ Nwee obi ike, dịkwa ike. Atụla egwu, atụkwala ụjọ.+
14 Agbaala m ezigbo mbọ kpakọta otu narị puku (100,000) talent* ọlaedo na otu nde (1,000,000) talent ọlaọcha maka ụlọ Jehova. E nweghịkwa ike ịtụ ọla kọpa na ígwè+ m kwakọtara atụ̀ n’ihi na ha karịrị akarị. M nwetakwala ọtụtụ osisi na nkume.+ Ma ị ga-etinyekwu ihe na ha.
15 I nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ, ma ndị na-awa nkume ma ndị na-edo nkume+ ma ndị ọkwá nkà ma ndị niile nwere nkà n’ụdị ọrụ ọ bụla.+
16 Ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, na ígwè dịnụ karịrị akarị.+ Gaa bido ọrụ, ka Jehova nọnyekwara gị.”+
17 Devid gwaziri ndị isi Izrel niile ka ha nyere Solomọn nwa ya aka. Ọ sịrị:
18 “Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu. O meekwala ka unu zuru ike n’ebe niile unu nọ. N’ihi na o nyefeela ndị bi n’ala a n’aka m. Ha nọzi n’okpuru Jehova na ndị ya.
19 Ugbu a, jirinụ obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile chọọ Jehova bụ́ Chineke unu.+ Rụọkwanụ ụlọ nsọ Jehova bụ́ ezi Chineke,+ ka e wee bubata igbe ọgbụgba ndụ Jehova na arịa ndị dị nsọ e ji ejere ezi Chineke ozi+ n’ụlọ a rụrụ maka ịnọ na-eto aha Jehova.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “isi akabeghịkwa ya.”
^ Na Hibru, “Ị wụfuola nnukwu ọbara.”
^ Na Hibru, “ị wụfuola nnukwu ọbara.”
^ Aha a bụ́ Solomọn si n’okwu Hibru pụtara “Udo.”
^ Na Hibru, “ga-enwe ezumike.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu.