Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso

“Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso,” ka Jemes 4:8 na-ekwu. Iji gosipụta ókè Jehova Chineke chọruru ka ụmụ mmadụ soro ya na-enwe mmekọrịta chiri anya, o nyere Ọkpara ya n’ihi anyị.

N’IMEGHACHI omume nye ngosipụta ịhụnanya ahụ, Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị onwe anyị na-ahụ [Chineke] n’anya, n’ihi na Ya onwe ya buru ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Ma ka anyị onwe anyị wee bịaruo Chineke nso, anyị aghaghị iwere nzọụkwụ ụfọdụ. Ha yiri ụzọ anọ ahụ anyị si abịaru ụmụ mmadụ ibe anyị nso, dị ka e depụtara n’isiokwu bu ụzọ. Ka anyị tụlezie ha.

Chọpụta Àgwà Ndị Dị Ebube nke Chineke

Chineke nwere ọtụtụ àgwà ndị dị ebube, ụfọdụ n’ime ndị kasị pụta ìhè bụ ịhụnanya, amamihe, ikpe ziri ezi, na ike ya. O gosipụtara amamihe na ike ya n’ụba ma na mbara igwe dịpụrụ adịpụ ma n’ụwa gbara anyị gburugburu, site n’ụyọkọ kpakpando ndị buru ibu ruo n’akụkụ ndị kasị nta a na-apụghị ikewa ekewa nke ihe ndị dị adị. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi.”—Abụ Ọma 19:1; Ndị Rom 1:20.

Ihe ndị e kere eke na-egosipụtakwa ịhụnanya Chineke. Dị ka ihe atụ, otú e si kee anyị na-egosi na Chineke chọrọ ka anyị nụ ụtọ ndụ. O nyere anyị ikike ịhụ àgwà dị iche iche, ịnụ ụtọ ihe na ịnụ ísìsì, inwe mmasị n’egwú, ịchị ọchị, inwe mmasị n’ihe mara mma, o nyekwara anyị ọtụtụ ikike na àgwà ndị ọzọ bụ́ ndị na-adịchaghị mkpa iji dịrị ndụ. Ee, Chineke bụ n’ezie onye na-emesapụ aka, dị obiọma, ma na-ahụ n’anya—àgwà ndị obi abụọ na-adịghị ya na ha so mee ka ọ bụrụ “Chineke obi ụtọ.”—1 Timoti 1:11, NW; Ọrụ 20:35.

Jehova na-aṅụrị ọṅụ n’eziokwu ahụ bụ́ na otú o si eji ọbụbụeze ya eme ihe na nkwado ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi na-akwado ya dabeere n’ịhụnanya n’ụzọ bụ́ isi. (1 Jọn 4:8) N’eziokwu, Jehova bụ Eze Eluigwe na Ala, ma ọ na-emeso ụmụ mmadụ ihe, karịsịa ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe, dị ka nna na-ahụ n’anya si emeso ụmụ ya ihe. (Matiu 5:45) Ọ dịghị ejichi ihe ọma ọ bụla ga-abara ha uru. (Ndị Rom 8:38, 39) Dị ka e kwuru na mbụ, o nyere ọbụna ndụ nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ihi anyị. Ee, ọ bụ ịhụnanya Chineke mere anyị ji dịrị ma na-enwe atụmanya nke ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16.

Jisọs mere ka anyị nwee nghọta miri emi banyere ụdị onye Chineke bụ n’ihi na o ṅomiri Nna ya n’ụzọ zuru okè. (Jọn 14:9-11) Ọ dịtụghị achọ ọdịmma onwe ya nanị, ọ na-echebara ndị ọzọ na ihe echiche nke ọma. N’otu oge, a kpọtaara Jisọs otu nwoke ntị chiri nke na-asụkwa nsụ. Ị pụrụ iche n’echiche na ahụ nwere ike ghara iruwo nwoke ahụ ala n’etiti ìgwè mmadụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, Jisọs kpọọrọ nwoke a gaa n’ebe dị nzuzo ma gwọọ ya n’ebe ahụ. (Mak 7:32-35) Ị̀ na-enwe ekele n’ebe ndị na-aghọta mmetụta gị na ndị na-akwanyere gị ùgwù, nọ? Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ, ị ga-abịarukwu Jehova na Jisọs nso n’ezie ka ị na-amụtakwu ihe banyere ha.

Chebara Àgwà Chineke Echiche

Mmadụ pụrụ inwe àgwà ndị dị ebube, ma ọ dị anyị mkpa iche echiche banyere onye ahụ iji nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe Jehova nọ. Ịtụgharị uche n’àgwà ya bụ nzọụkwụ nke abụọ dị mkpa n’ịbịaru ya nso. Eze Devid, bụ́ nwoke hụrụ Jehova n’anya n’ezie nke “dị ka obi [Jehova] si achọ,” kwuru, sị: “Echetawo m ụbọchị nile nke mgbe ochie; atụgharịwo m uche n’omume Gị nile: n’ọrụ aka Gị abụọ ka m tụgharịworo obi.”—Ọrụ 13:22; Abụ Ọma 143:5.

Mgbe ị na-ahụ ịdị ebube nke ihe e kere eke ma ọ bụ na-agụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, ị̀ na-atụgharị uche n’ihe ị na-ahụ ma na-agụ dị ka Devid mere? Cheedị banyere nwa nwoke nke ka nwetara akwụkwọ ozi sitere n’aka nna ya ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Ọ̀ ga-esi aṅaa ele akwụkwọ ozi ahụ anya? N’ezie, ọ gaghị agụ ya ọkụ ọkụ ma tụba ya n’ime drọwa. Kama nke ahụ, ọ ga-amụ ya, na-aghọta nkọwa nile na ihe ndị dịtụ mgbagwoju anya na ya. N’otu aka ahụ, Okwu Chineke kwesịrị ịdị oké ọnụ ahịa nye anyị, dị nnọọ ka ọ dị ọbụ abụ ahụ bụ́ onye bụrụ, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.”—Abụ Ọma 119:97.

Nọgide Na-enwe Ezi Nkwurịta Okwu

Ezi nkwurịta okwu bụ isi sekpụ ntị ná mmekọrịta ọ bụla. Ọ na-agụnye ikwu okwu na ige ntị—ọ bụghịkwa nanị iji uche na-eme ya kamakwa iji obi. Anyị na-agwa Onye Okike okwu site n’ekpere, nke bụ́ okwu ofufe a na-agwa Chineke. Jehova na-enwe mmasị n’ekpere nke ndị hụrụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi, na-anakwerekwa Jisọs Kraịst dị ka onye nnọchiteanya Ya bụ́ isi.—Abụ Ọma 65:2; Jọn 14:6, 14.

N’oge gara aga, Chineke gwara ụmụ mmadụ okwu n’ụzọ dịgasị iche, gụnyere n’ọhụụ, ná nrọ, nakwa site n’aka ndị mmụọ ozi. Otú ọ dị, n’ụbọchị ndị a, ọ na-eji Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible Nsọ, eme otú ahụ. (2 Timoti 3:16) Okwu ahụ e dere ede nwere ọtụtụ abamuru. A pụrụ iji ya mee ihe mgbe ọ bụla. Dị ka akwụkwọ ozi, a pụrụ ịgụ ya ugboro ugboro. Ọ bụghịkwa ihe a pụrụ itinye nnu na ose bụ́ ihe na-eme n’akụkọ ndị e ji ọnụ kọọ ugboro ugboro. Ya mere, were Bible dị ka nnukwu nkwakọba nke akwụkwọ ozi ndị sitere n’aka Nna gị nke eluigwe ị hụrụ n’anya, kwekwa ka o si n’akwụkwọ ozi ndị a na-agwa gị okwu kwa ụbọchị.—Matiu 4:4.

Dị ka ihe atụ, Bible na-akọwa echiche Jehova banyere ezi ihe na ihe ọjọọ. Ọ na-akọwa nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ nakwa maka ụwa. Ọ na-ekpughekwa otú o si mesoo ìgwè mmadụ na mba dị iche iche ihe, site ná ndị ji nguzosi ike n’ihe na-efe ya ruo n’ajọ ndị iro ya. Site n’ime ka e detuo mmekọrịta ya na ụmụ mmadụ n’ụzọ dị otú a, Jehova enyewo anyị nkọwa na-enweghị atụ banyere ụdị onye ọ bụ. Ọ na-ekpughe ịhụnanya, ọṅụ, iru újú, mmechuihu, iwe, ebere, nchegbu ya—ee, ọ̀tụ̀tụ̀ nke echiche na mmetụta ya, na ihe ndị mere o ji eme otú ahụ—ha nile, n’ụzọ ụmụ mmadụ pụrụ ịghọta ozugbo.—Abụ Ọma 78:3-7.

Mgbe ị gụsịrị otu akụkụ nke Okwu Chineke, ị̀ pụrụ isi aṅaa rite uru n’ihe ị gụrụ? Oleekwa kpọmkwem otú ị pụrụ isi bịarukwuo Chineke nso? Nke mbụ, chee echiche banyere ihe ị gụrụ ma mụta banyere Chineke dị ka onye, na-ekwe ka isi ihe ndị ahụ ruo gị n’obi. E mesịa, jiri ekpere gwa Jehova echiche gị na mmetụta miri emi i nwere banyere ihe ahụ ị tụleworo na otú ị ga-esi gbalịa irite uru na ya. Nke ahụ bụ nkwurịta okwu. N’ezie, ọ bụrụ na i bukwa ihe ndị ọzọ n’obi, ị pụrụ nnọọ itinye ha n’ekpere gị.

Ka Gị na Chineke Na-emekọ Ihe Ọnụ

Bible na-ekwu banyere ụfọdụ ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie na ha na ezi Chineke yịkọrọ na-ejegharị ma ọ bụ na ha jegharịrị n’ihu ya. (Jenesis 6:9; 1 Ndị Eze 8:25) Gịnị ka nke ahụ pụtara? N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ na ha biri ndụ ha kwa ụbọchị dị ka a ga-asị na Chineke so ha nọrọ kpọmkwem n’ebe ahụ. N’ezie, ha na-emehie emehie. Ma ha nwere mmasị n’iwu na ụkpụrụ Chineke, ha bikwara ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke. Jehova na-abịaru ndị dị otú ahụ nso, ọ na-elekọtakwa ha, dị ka e gosipụtara n’Abụ Ọma 32:8: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ.”

Gị onwe gị kwa pụrụ inwe Jehova dị ka ezi enyi gị—onye gị na ya na-ayịkọ ejegharị, nke na-elekọta gị, ma na-enye gị ndụmọdụ nke nna. Aịsaịa onye amụma kọwara Jehova dị ka “Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17) Ka anyị na-erite uru ndị a, anyị na-enwe mmetụta na Jehova nọ “n’aka nri [anyị],” dị ka a pụrụ isi kwuo ya, dị nnọọ ka Devid nwere.—Abụ Ọma 16:8.

Aha Chineke—Ebe Àgwà Ya Hiwere Isi

Ọtụtụ okpukpe na ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke nsụgharị dị iche iche nke Bible na-ajụ iji aha aka Chineke eme ihe na ime ka a mara ya. (Abụ Ọma 83:18) Ma, n’ihe odide Hibru mbụ, aha ahụ—Jehova—pụtara ihe dị ka ugboro 7,000! (N’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ, ka ihe ka ọtụtụ ná ndị nsụgharị Bible wepụrụ aha Chineke, ha hapụrụ aha ọtụtụ chi ụgha a kpọtụrụ aha n’ihe odide mbụ ahụ, dị ka Beal, Bel, Merodak, na ọbụna Setan!)

Ụfọdụ ndị na-eche na mwepụ e wepụrụ aha Chineke adịghị oké ihe ọ bụ. Ma cheedị echiche: Ọ̀ na-aka esi ike ka ọ na-aka adị mfe inwe mmekọrịta chiri anya na nke doro anya n’ebe onye na-enweghị aha nọ? Utu aha ndị dị ka Chukwu na Onyenwe anyị (ndị e jikwa eme ihe n’ebe chi ụgha dị iche iche nọ) pụrụ ịdọrọ uche gaa n’ebe ike, ịbụisi, ma ọ bụ ọkwá Jehova dị, ma, ọ bụ nanị aha aka ya na-akọwa ya n’ụzọ doro anya. (Ọpụpụ 3:15; 1 Ndị Kọrint 8:5, 6) Aha aka nke ezi Chineke na-egosipụta àgwà na njimara ya. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Walter Lowrie kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “Onye na-amaghị aha Chineke amaghị ya n’ezie dị ka onye.”

Tụlee ihe atụ Maria, bụ́ onye bi n’Australia nke ji ezi obi na-ekpe chọọchị Katọlik. Oge mbụ Ndịàmà Jehova zutere ya, Maria kwere ka Ndịàmà ahụ gosi ya aha Chineke n’ime Bible. Olee otú o si meghachi omume? “Oge mbụ m hụrụ aha Chineke n’ime Bible, ebere m ákwá. Ịmara na m pụrụ n’ezie ịmata na iji aha aka Chineke na-eme ihe, kpaliri nnọọ mmasị m.” Maria nọgidere na-amụ Bible, na nke mbụ ya kwa ná ndụ ya, ọ matara Jehova dị ka onye ma soro ya malite inwe mmekọrịta na-adịgide adịgide.

Ee, anyị pụrụ ‘ịbịaru Chineke nso,’ n’agbanyeghị na anyị apụghị iji anya nkịtị anyị hụ ya. Anyị pụrụ “ịhụ” àgwà ya ndị magburu onwe ha n’uche na n’obi anyị, ma si otú ahụ na-eto eto n’ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ. Ịhụnanya dị otú ahụ “[bụ] ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:14.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Jehova Na-emeghachi Omume Nye Ịhụnanya I Nwere n’Ebe Ọ Nọ

Mmekọrịta na-achọ ihe n’aka mmadụ abụọ ma ọ bụ ìgwè abụọ ahụ na-enwe ya. Ka anyị na-abịaru Chineke nso, ọ na-emeghachi omume site n’ịbịarukwu anyị nso. Tụlee mmetụta o nwere n’ebe ndị agadi bụ́ Simeọn na Ana nọ, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha n’ụzọ pụrụ iche n’ime Bible. Onye so dee Oziọma ndị ahụ bụ́ Luk na-agwa anyị na Simeọn bụ “onye ezi omume na onye na-atụ egwu Chineke,” nke na-echere Mesaịa ahụ. Jehova hụrụ àgwà ọma ndị a n’ebe Simeọn nọ ma gosipụta ịhụnanya n’ebe agadi nwoke a ọ hụrụ n’anya nọ site n’ikpughere ya na “ọ gaghị ahụ ọnwụ, ruo mgbe ọ ga-ahụ Kraịst.” Jehova mezuru nkwa ya ma duru Simeọn gaa n’ebe nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs nọ, bụ́ onye nne na nna Ya kutere n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem. N’ịbụ onye nwere mkpali na ekele miri emi, Simeọn kuuru nwa ọhụrụ ahụ ma kpee ekpere, sị: “Onyenwe m, ugbu a ka Ị na-ahapụ ohu Gị ka ọ laa n’udo, dị ka okwu Gị si dị; n’ihi na anya m ahụwo nzọpụta Gị.”—Luk 2:25-35.

“N’otu oge awa ahụ,” Jehova gosipụtakwara ịhụnanya ya n’ebe Ana dị afọ 84 nọ site n’idurukwa ya gaa n’ebe Jisọs nọ. Bible na-agwa anyị na nwanyị a a hụrụ n’anya nke ukwuu nke di ya nwụrụ na-anọ n’ụlọ nsọ ahụ mgbe nile “na-ekpere” Jehova. N’ịbụ onye jupụtara n’ekele, ya onwe ya kwa, dị ka Simeọn, kelere Jehova maka obiọma ya pụrụ iche, mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gwara “ndị nile na-eche mgbapụta nke Jerusalem” okwu banyere nwa ahụ.—Luk 2:36-38.

Ee, Jehova hụrụ otú ịhụnanya Simeọn na Ana nwere n’ebe ọ nọ si mie emie nakwa otú ha nweruru mmasị ná mmezu nke nzube ya. Ọ̀ bụ na ihe ndekọ Bible ndị dị otú ahụ adịghị adọta gị n’ebe Jehova nọ?

Dị ka Nna ya, Jisọs chọpụtakwara ihe mmadụ bụ n’ime n’ezie. Mgbe ọ na-ezi ihe n’ụlọ nsọ ahụ, ọ hụrụ “otu nwanyị, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ” ka ọ tụnyere ụtụ “ego nta abụọ.” Nye ndị ọzọ kiriri ihe merenụ, onyinye ya ga-abụworị ihe dị nta, ma ọ dịghị otú ahụ n’ebe Jisọs nọ. Ọ jara nwanyị a mma n’ihi na o nyere ihe nile o nwere. (Luk 21:1-4) N’ihi ya, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova na Jisọs na-enwe ekele n’ebe anyị nọ ma ọ bụrụ na anyị enye ha ihe kasị mma anyị nwere, ma onyinye anyị ò hiri nne ma ò pere mpe.

Ọ bụ ezie na Chineke na-aṅụrị ọṅụ n’ebe ndị hụrụ ya n’anya nọ, ọ na-ewute ya mgbe ụmụ mmadụ na-agbakụta ya azụ ma gbasoo ụzọ nke ime ihe ọjọọ. Jenesis 6:6 na-agwa anyị na ihe ọjọọ nke ihe a kpọrọ mmadụ tupu Iju Mmiri nke oge Noa ‘wutere Jehova n’obi Ya.’ Mgbe e mesịrị, ụmụ Israel na-enupụ isi ‘nwara Chineke ugboro ugboro, ọ bụkwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe,’ ka Abụ Ọma 78:41 na-ekwu. Ee, Chineke abụghị “Ihe Mbụ Kpatara Ihe” nke nọ n’ebe dị anya, nke na-adịghịkwa enwe mmetụta. Ọ bụ onye n’ezie, ọ bụghị onye mmetụta ya na-adịghị agazi agazi ma ọ bụ nke ezughị okè na-eme ka ọ ghara ịdị nkọ, dị ka nke anyị.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ịtụgharị uche n’ihe ndị Jehova kere eke bụ otu ụzọ isi bịaruo ya nso