Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịrụ Ọrụ “n’Ubi” Ahụ Tupu Owuwe Ihe Ubi

Ịrụ Ọrụ “n’Ubi” Ahụ Tupu Owuwe Ihe Ubi

 Ịrụ Ọrụ “n’Ubi” Ahụ Tupu Owuwe Ihe Ubi

O NYEGHỊ ndị na-eso ụzọ Onye Ozizi Ukwu ahụ ọnụ okwu. Jisọs ka kọchara akụkọ dị mkpirikpi banyere ọka na ata. Ọ bụ otu n’ime ọtụtụ ilu ọ tụrụ n’ụbọchị ahụ. Mgbe ọ kọsịrị ya, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị gere ya ntị pụrụ. Ma ụmụazụ ya maara na a ga-enwerịrị kpọmkwem ihe ilu ndị ahụ—karịsịa nke ahụ metụtara ọka na ata—pụtara. Ha maara na Jisọs abụghị nanị onye akụkọ na-adị mma n’ọnụ.

Matiu na-akọ na ha jụrụ, sị: “Kọọrọ anyị isi ilu ata dị n’ubi ahụ.” Ná nzaghachi, Jisọs kọwara ilu ahụ, na-ebu amụma nke oké ndapụ n’ezi ofufe ga-ebilite n’etiti ndị sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 13:24-30, 36-38, 43) Nke a mezuru, ndapụ n’ezi ofufe gbasakwara ngwa ngwa mgbe Jọn onyeozi nwụsịrị. (Ọrụ 20:29, 30; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:6-12) Mmetụta ya ruru nnọọ ebe nile nke na ajụjụ ahụ Jisọs jụrụ, dị ka e dekọrọ ya na Luk  18:8, yiri nnọọ ihe dabara adaba: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?”

Ọbịbịa Jisọs ga-aka akara mmalite nke ‘iwe ndị Kraịst yiri ọka dị ka ihe ubi.’ Nke ahụ ga-aka “ọgwụgwụ oge,” bụ́ nke malitere na 1914, akara. Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na ụfọdụ malitere inwe mmasị n’eziokwu Bible n’oge bu mmalite owuwe ihe ubi ahụ ụzọ.—Matiu 13:39.

Ntụle nke ihe ndekọ mere eme na-eme ka ọ pụta ìhè na karịsịa malite na narị afọ nke 15 gawa, a nọ na-akpali uche ọtụtụ ndị, ọbụna n’etiti ìgwè mmadụ nọ na Krisendọm bụ́ ndị dị ka “ata,” ma ọ bụ ndị Kraịst adịgboroja. Ka Bible bịara bụrụ ihe onye ọ bụla pụrụ inweta, e mepụtakwa ndepụta nke okwu ndị dị na Bible, ndị nwere obi eziokwu malitere iji nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ.

Ìhè ahụ Egbukepụ

Henry Grew (1781-1862), bụ́ onye si Birmingham, England, so ná ndị ikom dị otú ahụ ná mmalite narị afọ nke 19. Mgbe ọ dị afọ 13, ya na ezinụlọ ya ji ụgbọ mmiri si osimiri Atlantic gaa United States, na-erute na July 8, 1795. Ha biri na Providence, n’Àgwàetiti Rhode. Nne na nna ya kụnyere ịhụnanya n’ebe Bible dị n’obi ya. Na 1807, bụ́ mgbe Grew dị afọ 25, a kpọrọ ya ije ozi dị ka pastọ nke Chọọchị Baptist dị na Hartford, Connecticut.

O ji ọrụ izi ihe ya kpọrọ ihe ma gbalịa inyere ndị ọ na-elekọta aka ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Otú ọ dị, o kweere n’idebe ọgbakọ ọcha pụọ n’onye ọ bụla nke ma ụma na-eme mmehie. Mgbe ụfọdụ, ya na ndị ikom ọzọ na-edu ndú na chọọchị ahụ aghaghị ịchụpụ ndị kwara iko ma ọ bụ tinye aka n’omume ndị ọzọ na-adịghị ọcha.

E nwere nsogbu ndị ọzọ e nwere na chọọchị ahụ bụ́ ndị nyere ya nsogbu n’obi. Ọ bụ ndị ikom na-esoghị na chọọchị ahụ na-ahụ maka ihe ndị metụtara achụmnta ego chọọchị ma na-eduzi abụ n’oge a na-aka ụka. Ndị ikom a pụkwara ịtụli aka n’okwu ndị metụtara ọgbakọ ahụ ma si otú a na-achịkwa ihe omume  ya n’ụzọ ụfọdụ. N’ịdabere n’ụkpụrụ nke ịnọpụ iche n’ụwa, Grew kwenyesiri ike na ọ bụ nanị ndị ikom na-ekwesị ntụkwasị obi kwesịrị ịrụ ọrụ ndị a. (2 Ndị Kọrint 6:14-18; Jemes 1:27) N’echiche ya, ikwe ka ndị na-ekweghị ekwe na-abụku Chineke abụ otuto bụ ikwulu Chineke. N’ihi nguzo a Henry Grew weere, na 1811, chọọchị ahụ jụrụ ya. Ndị ọzọ so na chọọchị ahụ bụ́ ndị nwere echiche yiri nke ahụ pụkwara n’otu oge ahụ.

Isi na Krisendọm Kewapụ Onwe Ha

Ìgwè a, gụnyere Henry Grew, malitere ịmụ Bible na-eburu n’obi ime ka ndụ na ihe omume ha kwekọọ na ndụmọdụ ya. Ihe ọmụmụ ha dugara ha ngwa ngwa n’ịghọtakwu eziokwu Bible ma mee ka ha kpughee ihie ụzọ nke Krisendọm. Dị ka ihe atụ, na 1824, Grew dere ihe ezi uche dị na ya nke o ji gbaghaa ozizi Atọ n’Ime Otu. Rịba ama arụmụka o ji mee ihe n’akụkụ ihe odide a sitere n’ihe odide ya: “‘Ọ dịghị mmadụ ọ bụla maara ụbọchị ahụ, na oge awa ahụ, ee e ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ NNA m maara.’ [Mark 13:32] Rịba ama usoro e ji mee ihe n’ebe a n’ọkwá nke ndị a. Mmadụ, Ndị Mmụọ Ozi, Ọkpara, Nna. . . . Onyenwe anyị na-akụziri anyị na ọ bụ nanị Nna ya maara ụbọchị ahụ. Ma nke a abụghị eziokwu, ma ọ bụrụ na, dị ka ụfọdụ na-eche, na Nna ahụ, Okwu ahụ, na Mmụọ Nsọ bụ ndị atọ n’ime otu Chineke; n’ihi na, dị ka [ozizi a, ozizi Atọ n’Ime Otu,] si dị, . . . Ọkpara sokwa Nna ya mara ya.”

Grew kpughere ihu abụọ nke ndị ụkọchukwu na ndị ọchịagha bụ́ ndị na-eme ka a ga-asị na ha na-ejere Kraịst ozi. Na 1828, o kwupụtara, sị: “Ànyị pụrụ ichetụ n’echiche ihe na-ekwesịghị ekwesị karịrị onye Kraịst isi n’ọnụ ụlọ nta ya pụta, bụ́ ebe ọ nọworo na-ekpe ekpere n’isi ndị iro ya, ma mesịa nye usuu ndị agha ya iwu iji obi ọjọọ jiri ngwá agha ndị e ji egbu mmadụ mapuo obi nke otu ndị iro ahụ? N’otu akụkụ, ọ bụ ihe obi ụtọ na o yiri Nna ya Ukwu na-anwụ anwụ; ma ònye ka o yiri n’akụkụ nke ọzọ? Jisọs kpere ekpere n’isi ndị gburu ya. Ndị Kraịst na-egbu ndị ha na-ekpe ekpere n’isi ha.”

Grew dere ọbụna n’ụzọ ka sie ike, sị: “Ole mgbe ka anyị ga-amalite ikwenyere Onye Pụrụ Ime Ihe Nile bụ́ onye na-emesi anyị obi ike na ya ‘abụghị onye a na-elelị?’ Ole mgbe ka anyị ga-aghọta ọdịdị, na ihe njimara, nke okpukpe ahụ dị nsọ bụ́ nke na-achọ ka anyị hapụ ọbụna ‘ọdịdị nke ihe ọjọọ?’ . . . Ọ́ bụghị mkparị nye Ọkpara nke onye ahụ a gọziri agọzi, bụ́ iche na okpukpe ya na-achọ ka mmadụ na-eme omume dị ka mmụọ ozi n’otu akụkụ, ma na-ekwe ka ọ na-eme omume dị ka mmụọ ọjọọ n’akụkụ nke ọzọ?”

Ndụ Ebighị Ebi Abụghị Ihe E Bu Pụta Ụwa

N’afọ ndị ahụ tupu e nwee redio na telivishọn, otu ụzọ na-ewu ewu mmadụ si ekwu echiche ya bụ site n’ide ma kesaa akwụkwọ nta. N’ihe dị ka 1835, Grew dere otu akwụkwọ nta dị mkpa bụ́ nke kpughere ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na ọkụ ala mmụọ dị ka ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. O chere na ozizi ndị a na-ekwulu Chineke.

Akwụkwọ nta a gaje inwe mmetụta dị ukwuu. Na 1837, George Storrs, bụ́ onye dị afọ 40, hụrụ otu n’ụgbọ okporo ígwè. Storrs bụ nwa afọ Lebanon, New Hampshire, nke bi na Utica, New York, n’oge ahụ.

Ọ bụ ụkọchukwu a na-akwanyere nnọọ ùgwù na Chọọchị Metọdist nke Episcopal. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ nta ahụ, o nwere mmetụta n’ebe ọ nọ na a pụrụ inwe arụmụka siri ike otú ahụ megide ozizi ndị a bụ́ isi nke Krisendọm, bụ́ ndị ọ na-adịtụbeghị mgbe o nwere obi abụọ banyere ha. Ọ maghị onye dere ya, ọ bụkwa mgbe afọ ụfọdụ gasịrị, ọ dịkarịa ala ka ọ na-erule 1844, ka o zutere Henry Grew mgbe ha abụọ bi na Philadelphia, Pennsylvania. Otú ọ dị, Storrs ji afọ atọ tụlee okwu ahụ n’onwe ya, na-agwa nanị ndị ụkọchukwu ndị ọzọ banyere ya.

N’ikpeazụ, ebe ọ bụ na ọ dịghị onye pụrụ ịgbagha ihe George Storrs na-amụta, o kpebiri na ya apụghị ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke  ma ọ bụrụ na ya anọgide na Chọọchị Metọdist. O tinyere akwụkwọ ekpekwaghịm na 1840 ma kwaga Albany, New York.

Ná mmalite oge opupu ihe ubi nke 1842, Storrs kwuru usoro okwu ihu ọha isii n’ime izu isii n’isiokwu bụ́ “Nchọpụta—Ndị Ajọ Omume Hà Adịghị Anwụ Anwụ?” Mmasị e nwere na ya dị nnọọ ukwuu nke na o degharịrị ya maka mbipụta, n’ime ihe karịkwara afọ 40 sochirinụ, e kesara 200,000 na United States nakwa na Great Britain. Storrs na Grew jikọrọ aka n’arụmụka megide ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Grew nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eme nkwusa ruo ọnwụ ya n’August 8, 1862, na Philadelphia.

N’oge na-adịghị anya mgbe Storrs kwusịrị okwu ihu ọha isii ahụ a ka kpọtụrụ aha, ọ bịara nwee mmasị ná nkwusa William Miller, bụ́ onye nọ na-atụ anya nlọghachi a ga-ahụ anya nke Kraịst na 1843. Ruo ihe dị ka afọ abụọ, Storrs rụsiri ọrụ ike n’ikwusa ozi a na gburugburu ebe ugwu ọwụwa anyanwụ United States. Mgbe 1844 gasịrị, ọ kwụsịziri ikwu akara ụbọchị maka nlọghachi Kraịst, ma ọ dịghị ajụ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ achọọ ime nchọpụta banyere oge. Storrs kweere na nlọghachi Kraịst dị nso nakwa na ọ dị ndị Kraịst mkpa ịmụrụ anya ma nọrọ na nche n’ụzọ ime mmụọ, dị njikere maka ụbọchị nnyocha ahụ. Ma o kewapụrụ onwe ya n’òtù Miller n’ihi na ha nakweere ozizi ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ịkpọ ụwa ọkụ, na enweghị olileanya ọ bụla maka ndụ ebighị ebi nye ndị nwụrụ n’amaghị ihe.

Na Gịnị Ka Ịhụnanya Chineke Ga-eduga?

Echiche Ndị Adventist bụ́ na Chineke ga-akpọlite ndị ajọ omume n’ọnwụ n’ihi nzube nke igbu ha ọzọ sọrọ Storrs oyi. Ọ pụghị ịhụ ihe akaebe ọ bụla n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Chineke ga-eme omume na-enweghị isi na nke ịbọ ọ́bọ̀ dị otú ahụ. Storrs na ndị òtù ya gaziri n’akụkụ nke ọzọ ma kwubie na a gaghị akpọlite ndị ajọ omume n’ọnwụ ma ọlị. Ọ bụ ezie na o siiri ha ike ịkọwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ na-ezo aka ná mbilite n’ọnwụ nke ndị ajọ omume, nkwubi okwu ha yiri ha ka ọ ka kwekọọ n’ịhụnanya Chineke. A ka na-aga ịghọtakwu nzube Chineke n’oge na-adịghị anya.

Na 1870, Storrs dara ajọ ọrịa, ọ pụghịkwa ịrụ ọrụ ruo ọnwa ụfọdụ. N’oge a, ọ tụleghachiri ihe nile ọ mụtaworo n’ime afọ 74 ya. O kwubiri na ya ahapụwo otu akụkụ dị mkpa nke nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ dị ka e gosipụtara n’ọgbụgba ndụ Abraham—na ‘ezinụlọ nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha n’ihi  na Abraham gere ntị n’olu Chineke.’—Jenesis 22:18; Ọrụ 3:25.

Nke a mere ka o cheta ihe ọhụrụ. Ọ bụrụ na a gaje ịgọzi “ezinụlọ nile,” ọ̀ bụ na ha nile agajeghị ịnụ ozi ọma ahụ? Hà ga-esi aṅaa nụ ya? Ọ̀ bụ na nde kwuru nde mmadụ anwụbeghịrịị? Ka o nyochakwuru Akwụkwọ Nsọ, o kwubiri na e nwere òtù abụọ nke ndị “ajọ omume” nwụrụ anwụ: ndị kpebiworo ịjụ ịhụnanya Chineke na ndị nwụworo n’amaghị ihe.

Storrs kwubiri na a ga-akpọlite ndị nwụrụ n’amaghị ihe iji nye ha ohere irite uru n’àjà mgbapụta nke Kraịst Jisọs. Ndị nakweere ya ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. A ga-ebibi ndị jụrụ ya. Ee, Storrs kweere na ọ dịghị onye Chineke ga-akpọlite n’ọnwụ nke na-agaghị enwe olileanya. N’ikpeazụ, ọ dịghị onye ga-anwụ n’ihi mmehie Adam ma e wezụga Adam! Ma gịnị banyere ndị bi n’oge nlọghachi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst? Storrs bịara hụ n’ikpeazụ na a ghaghị ime nkwusa zuru ụwa ọnụ iji rute ha. O nwetụghị echiche ọ bụla banyere otú a pụrụ isi mee ihe dị otú ahụ, ma o ji okwukwe dee, sị: “Ma ọtụtụ mmadụ, ọ bụrụ na ha apụghị ịhụ nnọọ otú a pụrụ isi mee ihe, ha na-ajụ ya, dị ka a ga-asị na Chineke apụghị ime ya n’ihi na ha apụghị ịhụ ụzọ ọ ga-esi eme ya.”

George Storrs nwụrụ na December 1879, n’ebe obibi ya dị na Brooklyn, New York, bụ́ ebe na-adịtụghị anya site n’ebe ga-emesị ghọọ ebe ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ bụ́ nke o jiworo oké mmasị tụọ anya ya, ga-ehiwe isi.

A Chọkwuru Ìhè

Ndị ikom dị ka Henry Grew na George Storrs hà ghọtara eziokwu ahụ nke ọma otú anyị si ghọta ya taa? Ee e. Ha maara banyere ndọga ha, dị ka Storrs kwuru na 1847: “Anyị ga-eme nke ọma icheta na anyị ka si nnọọ n’oge chọọchị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ pụta; ọ gatụghịkwa abụ ihe ijuanya ma ọ bụrụ na anyị ahụ ka anyị ka yi ụfọdụ ‘uwe Babilọn’ dị ka eziokwu ahụ.” Dị ka ihe atụ, Grew nwere ekele maka ihe mgbapụta ahụ Jisọs wetara, ma ọ ghọtaghị na ọ bụ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ,” ya bụ, ndụ zuru okè nke Jisọs bụ́ nke e nyere iji dochie anya ndụ zuru okè nke Adam tụfuru. (1 Timoti 2:6, NW) Henry Grew jikwa ihie ụzọ kwere na Jisọs ga-alọghachi ma chịa n’ụwa n’ụzọ a na-ahụ anya. Otú ọ dị, Grew nwere nchegbu maka ido aha Jehova nsọ, nke bụworo isiokwu na-akpali mmasị nye nnọọ mmadụ ole na ole kemgbe narị afọ nke abụọ O.A.

N’otu aka ahụ, George Storrs enweghị nghọta ziri ezi banyere isi ihe ụfọdụ dị mkpa. Ọ hụrụ ụgha ndị ụkọchukwu na-akụzi, ma mgbe ụfọdụ, ọ na-emebiga ihe ókè n’akụkụ nke ọzọ. Dị ka ihe atụ, ihe àmà na-egosi na ka Storrs na-emeghachi omume gabiga ókè nye echiche ndị ụkọchukwu ọtọdọks nwere banyere Setan, ọ jụrụ echiche bụ́ na Ekwensu bụ onye dị adị n’ezie. Ọ jụrụ ozizi Atọ n’Ime Otu; ma, ruo oge na-adịghị anya tupu ya anwụọ, o nwere obi abụọ ma mmụọ nsọ ọ̀ bụ onye. Ọ bụ ezie na  George Storrs tụrụ anya na nlọghachi Kraịst ga-abụ nke anya na-agaghị ahụ na mbụ, o chere na e mesịa, ọ ga-apụta n’ụzọ anya ga-ahụ ya. Ka o sina dị, o yiri ka ndị ikom abụọ ahụ hà bụ́ ndị nwere obi eziokwu na ezi obi, ha ghọtatụkwara eziokwu ahụ karịa ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ.

‘Ubi’ ahụ Jisọs kọwara n’ilu ọka na ata ahụ erubeghị nnọọ mgbe a ga-ewe ihe dị na ya. (Matiu 13:38) Grew, Storrs, na ndị ọzọ nọ na-arụ ọrụ “n’ubi” ahụ iji kwadebe ya maka owuwe ihe ubi.

Charles Taze Russell, bụ́ onye malitere ibipụta magazin a na 1879, dere banyere afọ ndị mbụ ya, sị: “Onyenwe anyị nyere anyị ọtụtụ ndị enyemaka n’ịmụ okwu Ya, nke nwanna anyị meworo agadi anyị hụrụ n’anya nke ukwuu, bụ́ George Storrs, so ná ndị kasị pụta ìhè n’ime ha, bụ́ onye ji ma okwu ọnụ ma ihe e dere ede nyere anyị aka nke ukwuu; ma anyị adịtụghị achọ ịbụ ndị na-eso ụzọ mmadụ, n’agbanyeghị otú ha pụrụ isi bụrụ ndị ziri ezi na ndị maara ihe, kama anyị na-achọ ịbụ ‘Ndị na-eso ụzọ Chineke dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.’” Ee, ndị mmụta Bible nwere ezi obi pụrụ irite uru site ná mgbalị nke ndị ikom dị ka Grew na Storrs, ma ọ ka dị mkpa inyocha Okwu Chineke, bụ́ Bible, dị ka isi iyi bụ́ ezie nke eziokwu ahụ.—Jọn 17:17.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]

Ihe Henry Grew Kweere

A kọchawo aha Jehova, ọ dịkwa mkpa ka e doo ya nsọ.

Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na ọkụ ala mmụọ bụcha ozizi ụgha.

Ọgbakọ ndị Kraịst aghaghị ịnọpụ iche site n’ụwa.

Ndị Kraịst ekwesịghị ikere òkè n’agha nke mba dị iche iche.

Ndị Kraịst anọghị n’okpuru iwu Ụbọchị Izu Ike nke Saturday ma ọ bụ Sunday.

Ndị Kraịst ekwesịghị iso n’òtù nzuzo dị iche iche, dị ka Freemason.

E kwesịghị inwe òtù ndị ụkọchukwu na òtù ndị nkịtị n’etiti ndị Kraịst.

Utu aha okpukpe sitere n’aka ndị na-emegide Kraịst.

Ọgbakọ nile ga-enwe òtù ndị okenye.

Ndị okenye aghaghị ịdị nsọ n’omume ha nile, ndị a na-adịghị akọcha.

Ndị Kraịst nile aghaghị ikwusa ozi ọma ahụ.

A ga-enwe ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala.

Abụ ndị Kraịst kwesịrị ịbụ nke otuto nye Jehova na Kraịst.

[Credit Line

Foto: Ihe ndị The New-York Historical Society/69288, chịkọtara

[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]

Ihe George Storrs Kweere

Jisọs ji ndụ ya kwụọ ụgwọ dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ.

E kwusabeghị ozi ọma ahụ (na 1871).

N’ihi nke ahụ, ọgwụgwụ apụghị ịdị nso n’oge ahụ (na 1871). A ga-enwerịrị ọgbọ na-abịa n’ihu nke a ga-eme nkwusa ahụ na ya.

A ga-enwe ndị ga-eketa ndụ ebighị ebi n’ụwa.

A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ n’amaghị ihe. Ndị na-anakwere àjà mgbapụta Kraịst ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ụwa. A ga-ebibi ndị na-ajụ ya.

Anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na ọkụ ala mmụọ bụcha ozizi ụgha ndị na-adịghị enye Chineke nsọpụrụ.

Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe anyị bụ ememe a na-eme kwa afọ na Nisan 14.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto: SIX SERMONS, nke George Storrs dere (1855)

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Na 1909, C. T. Russell, bụ́ editọ nke “Zion’s Watch Tower,” kwagara na Brooklyn, New York, U.S.A.