Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alaeze Chineke—Ịchịisi Ọhụrụ Nke Ụwa

Alaeze Chineke—Ịchịisi Ọhụrụ Nke Ụwa

 Alaeze Chineke—Ịchịisi Ọhụrụ Nke Ụwa

“Alaeze [ahụ] . . . ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—DANIEL 2:44.

1. Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe n’ebe Bible dị?

BIBLE bụ mkpughe Chineke nyere mmadụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe unu natara okwu nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, bụ́ okwu nke Chineke, ọ bụghị okwu mmadụ ka unu naara nke ọma, kama, otú ọ dị n’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) Bible bu ihe dị anyị mkpa ịmara banyere Chineke: ihe ọmụma banyere àgwà ya, nzube ya, na ihe ndị ọ chọrọ n’aka anyị. O nwere ndụmọdụ kasị mma banyere ndụ ezinụlọ na àgwà ndị a na-akpa kwa ụbọchị. Ọ kọrọ n’ụzọ zuru ezu banyere amụma ndị mezuru n’oge gara aga, ndị na-emezu ugbu a, na ndị ga-emezu n’ọdịnihu. Ee, “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.

2. Olee otú Jisọs si mee ka isiokwu Bible pụta ìhè?

2 Ihe dị mkpa karịsịa na Bible bụ isiokwu ya: iwepụ ọbụbụeze Chineke n’ụta (oruru ịchịisi ruuru ya) site n’Alaeze eluigwe ya. Jisọs mere ka nke ahụ bụrụ ebe ozi ya chewere ihu. “Jisọs malitere ikwusa, na ịsị, Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:17) O gosipụtara ọnọdụ o kwesịrị inwe ná ndụ anyị, na-agba ume, sị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Matiu 6:33) O gosipụtakwara mkpa ọ dị site n’ịkụziri ụmụazụ ya ikpeku Chineke ekpere, sị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:10.

 Ịchịisi Ọhụrụ nke Ụwa

3. N’ihi gịnị ka Alaeze Chineke ji dị anyị mkpa ngwa ngwa?

3 N’ihi gịnị ka Alaeze Chineke ji dị ụmụ mmadụ oké mkpa otú a? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-eme ihe n’isi nso bụ́ nke ga-agbanwe ịchịisi nke ụwa a ruo mgbe ebighị ebi. Amụma ahụ dị na Daniel 2:44 na-ekwu, sị: “Ma n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [na-achị ugbu a n’elu ala], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie [ọchịchị ga-adị n’eluigwe], nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [ọchịchị ndị dị n’ụwa] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe Alaeze eluigwe nke Chineke ga na-achị n’ụzọ zuru ezu, ụmụ mmadụ agaghị achịkwa ụwa ọzọ ma ọlị. Ịchịisi ụmụ mmadụ bụ́ nke na-akpata nkewa na nke na-adịghị eweta afọ ojuju, ga-apụ n’anya.

4, 5. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs ji bụrụ onye kasị ruo eru ịbụ Eze nke Alaeze ahụ? (b) Ọrụ dị aṅaa ka Jisọs ga-enwe n’ọdịnihu dị nso?

4 Onye Ọchịchị Bụ́ Isi n’Alaeze eluigwe, bụ́ nke Jehova na-eduzi kpọmkwem, bụ onye ahụ kasị ruo eru—Kraịst Jisọs. Tupu ọ bịa n’ụwa, ọ dịrị adị n’eluigwe dị ka “onye ọkà” nke Chineke, ebe ọ bụ onye mbụ n’ime ihe ndị Chineke kere. (Ilu 8:22-31) “Onye bụ́ onyinyo nke Chineke ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke; n’ihi na n’ime Ya ka e kere ihe nile, nke dị n’ime eluigwe na nke dị n’elu ụwa.” (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Mgbe Chineke zitekwara Jisọs n’ụwa, o mere uche Chineke n’oge nile. Ọ tachiiri ule ndị kasị taa akpụ obi ma nwụọ n’ikwesị ntụkwasị obi nye Nna ya.—Jọn 4:34; 15:10.

5 A kwụghachiri Jisọs ụgwọ n’ihi nguzosi ike n’ihe ya n’ebe Chineke nọ ọbụna ruo ọnwụ. Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ gaa n’eluigwe ma nye ya ikike ịbụ Eze nke Alaeze eluigwe. (Ọrụ 2:32-36) Dị ka Eze nke Alaeze ahụ, Kraịst Jisọs ga-enwe ọrụ dị egwu Chineke ga-enye ya bụ́ iduzi imerime ndị mmụọ e kere eke dị ike n’iwepụ ịchịisi ụmụ mmadụ n’ụwa na iwepụ ajọ omume nile n’ụwa anyị. (Ilu 2:21, 22; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9; Mkpughe 19:11-21; 20:1-3) Mgbe ahụ, Alaeze eluigwe Chineke nke dị n’okpuru Kraịst ga-abụ ike ọchịchị ọhụrụ, nanị ọchịchị ga na-achị ụwa nile.—Mkpughe 11:15.

6. Ụdị ịchịisi dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ya n’aka Eze nke Alaeze ahụ?

6 Okwu Chineke na-ekwu banyere Onye Ọchịchị ọhụrụ nke ụwa, sị: “Ọ bụkwa ya ka e nyere ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.” (Daniel 7:14) Ebe ọ bụ na Jisọs ga-eṅomi ịhụnanya Chineke, udo na obi ụtọ a ga-enwe n’ịchịisi ya ga-adị ukwuu. (Matiu 5:5; Jọn 3:16; 1 Jọn 4:7-10) “Ịba ụba nke ọchịchị ya na nke udo agaghị enwe nsọtụ, . . . iji ikpe ziri ezi na ezi omume kwadoo ya.” (Aịsaịa 9:7, Revised Standard Version) Lee ngọzi ọ ga-abụ inwe Onye Ọchịchị nke ji ịhụnanya, ikpe ziri ezi, na ezi omume na-achị! N’ihi ya, 2 Pita 3:13 na-ebu amụma, sị: “Dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ [Alaeze eluigwe nke Chineke] na ụwa ọhụrụ [ọha mmadụ ọhụrụ], nke ezi omume bi n’ime ha.”

7. Olee otú e si emezu Matiu 24:14 taa?

7 N’ezie, ozi banyere Alaeze Chineke bụ nnọọ ozi ọma kasịnụ nye ndị nile ihe ziri ezi na-amasị. Ọ bụ ya mere na dị ka akụkụ nke ihe ịrịba àmà na-egosi na anyị na-ebi ugbu a na “mgbe ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe a, Jisọs buru n’amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:14) A na-emezu amụma ahụ ugbu a, ka ihe dị ka nde isii nke Ndịàmà Jehova nọ n’ala 234 na-etinye ihe karịrị otu ijeri awa kwa afọ n’ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. N’ụzọ dabara adaba, a na-akpọ nke ọ bụla n’ime ebe ofufe ha nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgbakọ 90,000 gburugburu ụwa ji eme ihe, Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị mmadụ na-abịa n’ebe ahụ amụ banyere ọchịchị ọhụrụ ahụ na-abịanụ.

Ndị Ha na Ya So Achị

8, 9. (a) N’ole ebe ka ndị ha na Kraịst ga-eso na-achị ga-esi bịa? (b) Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe n’ịchịisi nke Eze ahụ na ndị ha na ya so achị?

8 A ga-enwe ndị ha na Kraịst Jisọs ga-eso na-achị  n’Alaeze eluigwe nke Chineke. Mkpughe 14:1-4 buru n’amụma na a ‘ga-agbata mmadụ 144,000 n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ’ ma kpọlite ha n’ọnwụ gaa n’ịdị ndụ n’eluigwe. Ndị a na-agụnye ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị, kama ịbụ ndị a na-ejere ozi, ji obi umeala jeere Chineke na mmadụ ibe ha ozi. “Ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa Ya bụrụ eze [otu puku afọ].” (Mkpughe 20:6) Ọnụ ọgụgụ ha dị nnọọ nta karịa “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta” bụ́ ndị ga-alanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe a. Ndị a kwa ‘na-efe Chineke ofufe ehihie na abalị,’ ma a kpọghị ha ịga eluigwe. (Mkpughe 7:9, 15) Ha ga-aghọ ntọala nke ụwa ọhụrụ ahụ dị ka ndị Alaeze eluigwe nke Chineke ga-achị.—Abụ Ọma 37:29; Jọn 10:16.

9 N’ịhọrọ ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe, Jehova họpụtara ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nweworo ahụmahụ nke nsogbu ndị dị ná ndụ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ndị mmadụ hụworo nke ndị eze a bụkwa ndị nchụàjà na-enwebeghị ahụmahụ ya. Ya mere, ndụ ha dịrị n’ụwa ga-eme ka ike ịchịisi ha n’ebe ụmụ mmadụ nọ ka mma. Ọbụna Jisọs n’onwe ya “mụtara ịṅa ntị Ya site n’ahụhụ nile Ọ hụrụ.” (Ndị Hibru 5:8) Pọl onyeozi kwuru banyere ya, sị: “Anyị enweghị onyeisi nchụàjà onye na-apụghị iji obi soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị; kama anyị nwere Onye a nwaworo n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, ma O mehieghị.” (Ndị Hibru 4:15) Lee ka o si bụrụ ihe na-enye nkasi obi ịmara na n’ụwa ọhụrụ ezi omume Chineke, ụmụ mmadụ ga-abụ ndị ndị eze na ndị nchụàjà na-ahụ n’anya ma nwee obi ọmịiko ga na-achị!

Alaeze ahụ Ò So ná Nzube Chineke?

10. Gịnị mere na Alaeze eluigwe esoghị ná nzube mbụ nke Chineke?

10 Alaeze eluigwe ahụ ò so ná nzube mbụ nke Chineke mgbe o kere Adam na Iv? N’ihe ndekọ Jenesis banyere okike, a kpọtụghị Alaeze aha bụ́ nke ga-achị ihe a kpọrọ mmadụ. Jehova n’onwe ya bụ Onye Ọchịchị ha, ọ bụrụhaala na ha erubere ya isi, ịchịisi ọzọ adịghị mkpa. Jenesis isi 1 na-egosi na Jehova, ma eleghị anya site n’aka Ọkpara ya nke eluigwe, mesoro Adam na Iv ihe. Ihe ndekọ ahụ na-eji okwu ndị dị ka “Chineke wee sị ha” mee ihe.—Jenesis 1:28, 29; Jọn 1:1.

11. Mmalite dị aṅaa zuru okè ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere?

11 Bible na-ekwu, sị: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Ihe nile dị n’ogige Iden ahụ mara nnọọ mma. Adam na Iv biri na paradaịs. Ha nwere obi zuru okè na ahụ zuru okè. Ha pụrụ isoro Onye Mere ha kwurịta okwu, ya onwe ya kwa pụrụ isoro ha kwurịta. Sitekwa n’ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ha ga-amụ ụmụ zuru okè. A garaghị enwe mkpa maka ọchịchị eluigwe ọhụrụ.

12, 13. Ka ihe a kpọrọ mmadụ zuru okè na-amụba, n’ihi gịnị ka Chineke gaara ejiwo ka nwee ike iso ha na-ekwurịta okwu?

12 Ka ezinụlọ ụmụ mmadụ na-amụba, olee  otú Chineke ga-esi soro ha nile na-ekwurịta okwu? Tụlee ihe banyere kpakpando nke eluigwe. A chịkọtara ha n’ìgwè mbara igwe ndị dị ka àgwàetiti bụ́ ndị a na-akpọ ụyọkọ kpakpando. Ụyọkọ kpakpando ụfọdụ nwere otu ijeri kpakpando. Ndị ọzọ nwere ihe dị ka otu puku ijeri. Ndị ọkà mmụta sayensị na-emekwa atụmatụ na e nwere ihe dị ka 100 ijeri ụyọkọ kpakpando na mbara igwe a na-ahụ anya! Ma, Onye Okike na-ekwu, sị: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.”—Aịsaịa 40:26.

13 Ebe ọ bụ na Chineke pụrụ ịma banyere ihe ndị a nile dị n’eluigwe, n’ezie, ọ gaghị abụrụ ya nsogbu ịma banyere ụmụ mmadụ bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha ka nnọọ nta. Ọbụna ugbu a, ọtụtụ nde n’ime ndị ohu ya na-ekpeku ya ekpere kwa ụbọchị. Chineke na-anụ ekpere ndị ahụ n’otu ntabi anya. Ya mere isoro ndị nile zuru okè na-ekwurịta okwu agaraghị abụ nsogbu nye ya. Ọ garaghị achọwo Alaeze eluigwe iji mara banyere ha. Lee ndokwa dị egwu ọ bụ—inwe Jehova dị ka Onye Ọchịchị, iso ya na-enwe mmekọrịta kpọmkwem, na inwe atụmanya nke anwụghị anwụ ma ọlị, na-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs!

‘Ọ Dịghị n’Aka Mmadụ’

14. N’ihi gịnị ka ịchịisi Jehova ga-eji adị ụmụ mmadụ mkpa ruo mgbe ebighị ebi?

14 Otú ọ dị, ịchịisi Jehova ga-adị ụmụ mmadụ—ọbụna ndị zuru okè—mkpa ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova ekenyeghị ha ikike nke inwe ihe ịga nke ọma n’adabeghịrị n’ịchịisi ya. Nke ahụ bụ ụzọ e si kee ihe a kpọrọ mmadụ, dị ka Jeremaịa onye amụma kwetara, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike. Dọọ m aka ná ntị, Jehova.” (Jeremaịa 10:23, 24) Ọ ga-abụ nzuzu bụ́ ụmụ mmadụ iche na ha pụrụ ịchịkwa ọha mmadụ n’ụzọ na-aga nke ọma ma Jehova achịkwaghị ha. Ọ ga-abụ ihe megidere ụzọ e si kee ha. Inwere onwe pụọ n’ịchịisi Jehova aghaghị ịkpata ịchọ ọdịmma onwe nanị, ịkpọasị, obi ọjọọ, ime ihe ike, agha, na ọnwụ. ‘Mmadụ ga-enwe ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.’—Eklisiastis 8:9.

15. Olee ihe ndị si ná nhọrọ ọjọọ nne na nna anyị mbụ mere pụta?

15 N’ụzọ dị mwute, nne na nna anyị mbụ kpebiri na ha achọghị ka Chineke bụrụ Onye Ọchịchị ha, ha họkwaara ịdị ndụ n’adabereghị n’ebe ọ nọ. N’ihi ya, Chineke emeghịzi ka ha nọgide n’izu okè. Ha dịzi ka ngwá ọrụ eletrik a kwụpụrụ n’ọkụ. Ya mere ka oge na-aga, ike ga-agwụ ha, ha akwụsịkwa ịrụ ọrụ—n’ọnwụ. Ha yiri ihe e ji akpụpụta ihe bụ́ nke nwere ntụpọ, ọ bụkwa nanị ọnọdụ ahụ ka ha bufeere ụmụ ha. (Ndị Rom 5:12) “Oké nkume ahụ [Jehova], ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi . . . Ha ebibiwo onwe ha, ọ bụghị nke ụmụ Ya ka ọrụ nke dị ha n’ahụ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4, 5) N’eziokwu, ọ bụ mmụọ ahụ e kere eke na-enupụ isi bụ́ onye ghọrọ Setan, rafuru Adam na Iv, ma ha nwere uche zuru okè, ha pụkwara ịjụwo aro ya ndị na-ezighị ezi.—Jenesis 3:1-19; Jemes 4:7.

16. Olee otú akụkọ ihe mere eme si agba akaebe banyere ihe na-esi na mmadụ adabereghị n’ebe Chineke nọ apụta?

16 Akụkọ ihe mere eme na-agba akaebe n’ụba banyere ihe na-esi na mmadụ adabereghị n’ebe Chineke nọ apụta. Ruo ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ anwalewo ụdị ọ bụla nke ọchịchị mmadụ, usoro nile nke akụ̀ na ụba na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ma, ajọ omume ka nọgidere “na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ.” (2 Timoti 3:13) Narị afọ nke 20 gosipụtara nke ahụ. Ịkpọasị, ime ihe ike kasịnụ, agha, agụụ, ịda ogbenye, na nhụjuanya e nwetụrụla mgbe ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme, jupụtara na ya. N’agbanyeghịkwa ọganihu ndị e nweworo n’ịgwọ ọrịa, ka oge na-aga, onye ọ bụla ga-anwụ. (Eklisiastis 9:5, 10) Site n’ịnwa ime ka nzọụkwụ ha guzozie, ụmụ mmadụ ekwewo ka ha ghọọ anụ oriri nye Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, ruo nnọọ n’ókè nke na Bible na-akpọ Setan “chi nke oge a.”—2 Ndị Kọrint 4:4.

 Onyinye nke Nnwere Onwe Ime Nhọrọ

17. Olee otú a ga-esi jiri onyinye nnwere onwe ime nhọrọ nke Chineke nyere na-eme ihe?

17 N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji kwe ka ụmụ mmadụ mewara onwe ha mkpebi? Ọ bụ n’ihi na o kenyere ha onyinye magburu onwe ya bụ́ nnwere onwe ime nhọrọ. “Ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha,” ka Pọl onyeozi kwuru. (2 Ndị Kọrint 3:17) Ọ dịghị onye chọrọ ịbụ ígwè ọrụ e ji kọmputa achịkwa, na-abụ onye onye ọzọ na-ekpebiri mgbe nile ihe ọ ga-ekwu ma ọ bụ mee. Ma Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ jiri onyinye nke nnwere onwe ime nhọrọ ahụ mee ihe n’ụzọ iji ihe akpọrọ ihe, iji hụ amamihe dị n’ime uche ya na ịnọgide n’okpuru ya. (Ndị Galetia 5:13) Ya mere nnwere onwe agaghị abụ nke a na-akparaghị ókè, ebe ọ bụ na nke ahụ ga-akpata ọnọdụ nke enweghị nchịkwa. A ga na-achịkwa ya ruo n’ókè iwu ọma Chineke nabataruru.

18. Gịnị ka Chineke gosipụtaworo site n’ikwe ka mmadụ nwere onwe ya ime nhọrọ?

18 Site n’ikwe ka ọha mmadụ mewara onwe ha mkpebi, Chineke egosipụtawo kpam kpam na ịchịisi ya dị anyị mkpa. Ụzọ ịchịisi ya, ọbụbụeze ya, bụ nanị ụzọ ziri ezi. Ọ na-eweta obi ụtọ, afọ ojuju, na ọganihu kasịnụ. Nke a bụ n’ihi na Jehova mere obi na ahụ anyị ịrụ ọrụ n’ụzọ kasị mma mgbe ha na-ekwekọ n’iwu ya. “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17) Inwere onwe onye ime nhọrọ ruo n’ókè iwu Chineke nabataruru agaghị abụ ibu arọ kama ọ ga-eme ka e nwee nri, ebe obibi, nkà, na egwú dịgasị iche bụ́ ndị na-enye obi ụtọ. Ọ bụrụ na e ji nnwere onwe ime nhọrọ mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ gaara emewo ka e nwee ndụ dị mma, nke na-akpali akpali mgbe nile na paradaịs elu ala.

19. Ngwá ọrụ dị aṅaa ka Chineke ji eme ka ya na ụmụ mmadụ dịghachi ná mma?

19 Ma n’ihi nhọrọ na-ezighị ezi ha mere, ụmụ mmadụ kewapụrụ onwe ha n’ebe Jehova nọ, ghọọ ndị na-ezughị okè, na-aka nká, na-anwụkwa anwụ. Ya mere, ọ ga-adị ha mkpa ịbụ ndị a gbapụtara n’ọnọdụ ahụ dị mwute  ma weghachite n’iso Chineke na-enwe mmekọrịta kwesịrị ekwesị dị ka ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom. Ngwá ọrụ Chineke chọrọ iji mezuo nke a bụ Alaeze ahụ, Onye Mgbapụta bụkwa Jisọs Kraịst. (Jọn 3:16) Site ná ndokwa a, ndị nwere nchegharị n’ezie—dị ka nwa mmefu ahụ nọ n’ilu Jisọs—na Chineke ga-adịghachi ná mma, ọ ga-anabataghachikwa ha dị ka ụmụ ya.—Luk 15:11-24; Ndị Rom 8:21; 2 Ndị Kọrint 6:18.

20. Olee otú Alaeze ahụ ga-esi emezu nzube Chineke?

20 Uche Jehova aghaghị imezu n’ụwa. (Aịsaịa 14:24, 27; 55:11) Site n’Alaeze ya nke dị n’aka Kraịst, Chineke ga-ewepụ n’ụta (nwapụta ma ọ bụ gosipụta) kpam kpam oruru o ruuru ya ịbụ Ọkaaka anyị. Alaeze ahụ ga-eweta ịchịisi ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ n’ụwa ná njedebe, ya onwe ya ga-achịkwa site n’eluigwe ruo otu puku afọ. (Ndị Rom 16:20; Mkpughe 20:1-6) Ma n’oge ahụ, olee otú a ga-esi gosipụta ịka mma nke ụzọ Jehova si achị isi? Mgbe otu puku afọ ahụ gasịkwara, ọrụ dị aṅaa ka Alaeze ahụ ga na-arụ? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

Isi Ihe Ndị A Ga-atụleghachi

• Gịnị bụ isiokwu Bible?

• Ole ndị ga-eso n’ịchịisi ọhụrụ nke ụwa?

• N’ihi gịnị ka ọchịchị ụmụ mmadụ n’adabereghị n’ebe Chineke nọ na-agaghị eji enwe ihe ịga nke ọma?

• Olee otú a na-aghaghị isi jiri nnwere onwe ime nhọrọ na-eme ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Ozizi Jisọs mere ka ịchịisi Chineke site n’Alaeze ahụ pụta ìhè

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

N’ala ọ bụla, Ndịàmà Jehova na-eme ka Alaeze ahụ bụrụ ozizi ha bụ́ isi

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Akụkọ ihe mere eme na-agba akaebe banyere ihe ọjọọ ndị na-esi na mmadụ adabereghị n’ebe Chineke nọ apụta

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ndị soja WWI: foto U.S. National Archives; ogige ịta ahụhụ: Oświęcim Museum; nwatakịrị: UN PHOTO 186156/J. Isaac