Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Inyocha Okpukpe Ndị Ọzọ?

Ì Kwesịrị Inyocha Okpukpe Ndị Ọzọ?

 Ì Kwesịrị Inyocha Okpukpe Ndị Ọzọ?

“AGAWO m nzụkọ ndị Kraịst ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ, ọ na-atọkwa m ụtọ ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke,” ka Miguel, onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova ugbu a nke nọ n’Ebe Ndịda America, na-ekwu. “E mesịa, amalitere m ige usoro ihe omume okpukpe ndị a na-eme na redio ma na-ekiri ndị ụkọchukwu okpukpe na telivishọn. Echere m na usoro ihe omume ndị dị otú ahụ pụrụ inyere m aka ịghọta ndị na-ekpe okpukpe ọzọ n’ụzọ ka mma. Achọpụtara m na ozizi ha ekwekọghị na Bible, ma enwere m ọchịchọ ịmatakwu.”

N’otu ala ahụ, Jorge nọ na-anụ ọkụ n’obi n’ịkụziri ndị ọzọ banyere ezi ofufe. Ma, n’otu oge, ya onwe ya kwa malitere ige usoro ihe omume okpukpe ndị a na-eme na redio nakwa na telivishọn. “Ọ dị gị mkpa ịmata ihe ndị ọzọ na-eche,” ka ọ na-ekwubu. Mgbe a jụrụ ya banyere ihe ize ndụ a pụrụ inweta site n’ikpughepụ onwe ya nye ozizi ụgha n’ụzọ dị otú ahụ, ọ na-aza, sị: “Ọ dịghị ihe pụrụ imebi okwukwe nke onye maara eziokwu Bible.” Ahụmahụ ndị a na-ewelite otu ajụjụ dị mkpa, Ọ̀ bụ ihe amamihe ige ntị n’ihe ndị ọzọ kweere?

Ịmata Ezi Iso Ụzọ Kraịst

Mgbe ndị ozi nwụsịrị, e ji ọtụtụ ụdị Iso Ụzọ Kraịst adịgboroja bụ́ ndị ji nke nta nke nta pụta, merụọ ezi ofufe. Mgbe Jisọs bu ụzọ hụ nke a, o kpughere otu ụzọ isi mata ọdịiche dị n’etiti ụdị Iso Ụzọ Kraịst adịgboroja a na ezi Iso Ụzọ Kraịst. Nke mbụ, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Na-ezenụ ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, ma n’ime ha bụ agụ na-apụnara atụrụ.” Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.” (Matiu 7:15-23) Ezi ụmụazụ Jisọs na-eme ihe ọ kụziri, a na-ejikwa ezi mkpụrụ ha amata ha n’ụzọ dị mfe. Dị nnọọ ka Jisọs n’onwe ya mere, ha na-eleta ndị mmadụ iji kọwaara  ha banyere Alaeze Chineke site n’Akwụkwọ Nsọ. N’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs, ha na-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na esemokwu ọha na eze ndị a na-enwe n’ụwa. Ha na-anakwere Bible dị ka Okwu Chineke ma na-akwanyere ya ùgwù dị ka eziokwu ahụ. Ha na-eme ka a mara aha Chineke. Ebe ọ bụkwa na ha na-agbalịsi ike igosipụta ịhụnanya ahụ Chineke na-akụzi, ha adịghị ekere òkè n’agha. Kama nke ahụ, ha na-emeso ibe ha ihe dị ka ụmụnna.—Luk 4:43; 10:1-9; Jọn 13:34, 35; 17:16, 17, 26.

Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, o kwere omume ‘ịhụ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.’ (Malakaị 3:18) Ndị na-efe ezi ofufe taa dị n’otu n’echiche nakwa n’omume, dị nnọọ ka ndị Kraịst narị afọ mbụ dị. (Ndị Efesọs 4:4-6) Ozugbo ị matara ìgwè nke ezi ndị Kraịst dị otú ahụ, gịnị mere ị ga-eji na-enwe mmasị ma ọ bụ ọchịchọ ịmata ihe ndị ọzọ kweere?

Kpachara Anya Maka Ndị Ozizi Ụgha

Bible na-ekweta na ọbụna mgbe mmadụ mụtasịrị eziokwu Bible, o nwere ihe ize ndụ nke ịbụ onye e ji ozizi ụgha merụọ n’ụzọ ime mmụọ. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.” (Ndị Kọlọsi 2:8) Lee onyinyo mara mma akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ese! Dị ka anụ ọhịa ndị chọrọ iburu gị rie, ndị ozizi ụgha pụrụ ịdị ize ndụ n’ezie.

N’eziokwu, Pọl rịbara ihe ndị ọzọ kweere ama. N’otu oge, ọ malitere okwu site n’ịsị: “Ndị ikom nke Atens, n’ihe nile ahụwo m na unu na-asọpụrụ ndị mmụọ unu nke ukwuu. N’ihi na mgbe m na-agabiga, na-ekirikwa ihe dị iche iche unu na-asọpụrụ, m wee hụ otu ebe ịchụàjà nke e dekwasịrị ihe a n’elu ya, E nyere chi nke a na-amaghị ama.” (Ọrụ 17:22, 23) Otú ọ dị, Pọl etinyeghị uche ya mgbe nile na nkà ihe ọmụma nke ndị nkụzi Gris.

Ọ bụ otu ihe bụ́ ịmara banyere mmalite na nkwenkwe nke okpukpe ụgha, bụrụ nnọọ ihe ọzọ bụ́ itinye uche na ya. * Jehova ahọpụtawo “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ịkụzi ihe dabeere n’Okwu ya. (Matiu 4:4; 24:45) Pọl n’onwe ya dere, sị: “Unu apụghị iketa tebụl Onyenwe anyị na tebụl ndị mmụọ ọjọọ. Ma ọ bụ ànyị na-akpasu Onyenwe anyị ekworo?”—1 Ndị Kọrint 10:20-22.

Ụfọdụ ndị ozizi ụgha pụrụ ịbụwo ezi ndị Kraịst na mbụ, ma n’otu oge, ha ahapụ eziokwu ma hie ụzọ. (Jud 4, 11) Nke a ekwesịghị iju anyị anya. Mgbe Jisọs kwusịrị banyere “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” bụ́ nke na-anọchite anya ìgwè nke ndị Kraịst e tere mmanụ, o kwuru banyere “ohu ọjọọ ahụ,” bụ́ òtù nke na-eme mkpesa, sị, “Onyenwe m na-anọ ọdụ dị anya,” ma malite iti ndị ohu ibe ya aka. (Matiu 24:48, 49) Mgbe mgbe, mmadụ ndị a na ndị na-eso ụzọ ha adịghị enwe ozizi doro anya ha na-ezi; nanị ihe na-amasị ha bụ imebi okwukwe nke ndị ọzọ. Jọn onyeozi dere banyere ha, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu, ma o wetaghị ozizi a, unu akpọbatala ya n’ụlọ, unu asịkwala ya biri nke ọma.”—2 Jọn 10; 2 Ndị Kọrint 11:3, 4, 13-15.

Ndị nwere ezi obi bụ́ ndị na-achọ eziokwu ahụ na-eme nke ọma iji nlezianya nyochaa ihe ha na-anụ site n’okpukpe dị iche iche. Ka oge na-aga, Chineke ga-agọzi ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị na-achọ eziokwu ahụ. Bible na-ekwu banyere amamihe Chineke, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ . . . ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.” (Ilu 2:4, 5) Mgbe ezi ndị Kraịst nwetara ihe ọmụma Chineke a site na Bible na ọgbakọ ndị Kraịst ma hụ otú Jehova si agọzi ndị ihe ọmụma ahụ na-eduzi, ha adịghị anọgide na-ege ntị n’ozizi nke okpukpe ụgha.—2 Timoti 3:14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Akwụkwọ bụ́ Mankind’s Search for God, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, na-enye ihe ọmụma bụ́ isi banyere mmalite na ozizi nke ọtụtụ n’ime okpukpe ndị dị n’ụwa.