Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ezigbo Nwaanyị”

“Ezigbo Nwaanyị”

Ṅomie Okwukwe Ha

“Ezigbo Nwaanyị”

RUT gbusara ikpere n’ala n’ebe ọ chịsara okporo ọka bali ndị ọ tụtụkọtara. Chi ejiwela na Betlehem, ọtụtụ ndị ọrụ alawakwala. Ọtụtụ n’ime ha eruwela n’ọnụ ụzọ ámá Betlehem. O doro anya na ahụ́ agwụla Rut n’ihi na ọ nọ na-arụ ọrụ kemgbe ụtụtụ. N’agbanyeghị ya, ọ ka na-arụ ọrụ. O ji obere osisi na-eticha okporo ọka ndị ahụ ka mkpụrụ ha dapụtasịa. Ọ bụ eziokwu na ọrụ a adịghị mfe, ọka ọ tụtụkọtara taa buru ibu karịa otú ọ tụrụ anya ya.

Ọ̀ ga-abụ na ihe adịwarala nwaanyị a di ya nwụrụ mma? O so nne di ya bụ́ Neomi lọta n’obodo a, o kpebisikwara ike na o nweghị ihe ga-eme ka ya hapụ nne di ya nakwa Chineke Neomi bụ́ Jehova. Ụmụ nwaanyị abụọ a na-eru uju si n’obodo Rut bụ́ Moab lọta Betlehem. Obere oge ha lọtara, Rut nụrụ na iwu Jehova nyere ụmụ Izrel kwuru otú a ga-esi na-enyere ndị ogbenye na ndị mbịarambịa bi n’Izrel aka. * Ugbu a ọ hụkwala na ụfọdụ ndị Izrel na-akpa àgwà ọma ma na-enyere ndị ọzọ aka. Nke a gosiri na ha ma iwu Chineke ma na-erubere Chineke isi. Ihe ndị a mere ka obi ruo Rut ala.

Otu onye n’ime ndị ahụ na-enyere ndị ọzọ aka bụ otu nwoke bara ọgaranya nke aha ya bụ Boaz. Ọ bụ n’ubi ya ka Rut tụtụrụ ọka taa. Boaz hụkwara Rut n’ubi ya. Rut mụmụrụ ọnụ ọchị mgbe o chetara otú Boaz si gwa ya okwu. Boaz jara ya mma maka otú o si na-elekọta nne di ya bụ́ agadi nwaanyị nakwa otú o si kpebie ife ezi Chineke bụ́ Jehova.—Rut 2:11-13.

Ma o nwere ike ịbụ na Rut ka na-eche otú ụwa ga-emecha dịrị ya n’obodo a. Ebe ọ bụ na ọ bụghị onye obodo a, o nwekwanụghị di ma ọ bụkwanụ nwa, ọ̀ ga na-akpa afọ ya na Neomi ruo ole mgbe? Ọ̀ bụ naanị ịtụtụ ọka ka ọ ga-eji na-akpa afọ ya na Neomi? Ònye ga-elekọtakwanụ yanwa ma ọ kaa nká? O doro anya na ihe ndị a ọ na-eche na-enye ya nsogbu n’obi. Ihe ndị ahụ Rut nọ na-eche na-echegbukwa ọtụtụ ndị n’oge a ihe siri ezigbo ike. Ma anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’aka Rut ma ọ bụrụ na anyị eleba anya n’otú okwukwe Rut si nyere ya aka imeri nsogbu ndị o nwere.

Gịnị Bụ Ezinụlọ?

Mgbe Rut tichasịrị ọka ndị ahụ ma chịkọta ha, ọ chọpuṭara na ọka o nwetara ga-eju ihe dị ka otu obere bezin. O nwere ike ịdị ihe dị ka kilogram iri na anọ n’ịdị arọ. O ji ákwà kechie ọka ahụ ma buru ya n’isi lawa Betlehem. N’oge ahụ, chi ejiwela.—Rut 2:17.

Obi tọrọ Neomi ụtọ mgbe ọ hụrụ Rut bụ́ nwunye nwa ya ọ hụrụ n’anya. O nwere ike ịbụ na o juru ya anya mgbe ọ hụrụ nnukwu ibu Rut bu. Rut welatakwara ihe o rifọrọ ná nri Boaz nyere ndị ọrụ ya. Rut na Neomi rikwara ya. Neomi jụrụ ya, sị: “Olee ebe ị gara tụtụkọta ihe taa, oleekwa ebe ị rụrụ ọrụ? Ka onye anya ya ruru n’ebe ị nọ bụrụ onye a gọziri agọzi.” (Rut 2:19) Anya ruru Neomi ala. Nnukwu ọka ahụ Rut bu lọta gosiri ya na o nwere onye nyeere Rut aka.

Ha abụọ malitere ịkparịta ụka. Rut kọọrọ Neomi otú Boaz si nyere ya aka. Nke ahụ mere Neomi obi ụtọ, ya ekwuo, sị: “Ka Jehova, bụ́ onye na-ewepụghị obiọma ya n’ebe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ nọ, gọzie ya.” (Rut 2:19, 20) Neomi ghọtara na ọ bụ Jehova mere ka Boaz meere ha ihe ọma ahụ. Ọ bụ Jehova na-emetụ ndị ohu ya aka n’obi ka ha na-emesapụ aka, o kwekwara nkwa na ya ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha mere. *Ilu 19:17.

Neomi gwara Rut ka o mee ihe ahụ Boaz gwara ya, ya bụ, ka ọ na-atụtụ ọka n’ubi ya, nakwa ka ọ na-anọ ụmụ agbọghọ ya nso ka ụmụ nwoke na-aghọrọ Boaz ọka ghara inye ya nsogbu. Rut mere ihe ahụ nne di ya gwara ya. Rut na “nne di ya bikwa,” ọ hapụghị nne di ya. (Rut 2:22, 23) Nke a gosiri na Rut ahapụbeghị àgwà ọma ahụ o nwere, nke bụ́ ịhụnanya na-adịgide adịgide. Àgwà ọma a o nwere kwesịrị ime ka anyị jụọ onwe anyị ma ànyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya ma na-enyere ha aka mgbe niile. Jehova agaghị echefu anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ.

È kwesịrị ikwu na Rut na Neomi abụghị ezinụlọ? N’obodo ụfọdụ, a naghị ewere naanị mmadụ abụọ bi n’ụlọ ka ezinụlọ. Ọ bụ naanị mgbe e nwere di, nwunye, ụmụ, na nne na nna ochie ka e nwere ike ikwu na e nweela ezinụlọ. Ma akụkọ Neomi na Rut na-echetara anyị na mmadụ abụọ na-efe Jehova nwere ike ịbụ ezinụlọ, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ bụ naanị ha abụọ bi. Ha nwekwara ike ịhụ ibe ha n’anya ma na-enyere ibe ha aka. Ị̀ hụrụ ezinụlọ gị n’anya? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọgbakọ Ndị Kraịst ga-aghọrọ ndị niile nọ na ya ezinụlọ, ma ndị nwere ezinụlọ nke ha ma ndị na-enweghị.—Mak 10:29, 30.

“Ọ Bụ Otu n’Ime Ndị Ga-agbara Ihe Anyị”

Rut malitere ịtụtụ ọka n’ubi Boaz n’ọnwa Eprel, bụ́ mgbe a na-ewe ọka bali. Ọ tụtụrụ ya ruo n’ọnwa Jun, bụ́ mgbe a na-ewe ọka wit. Ugbu a izu ole na ole gaferela, o doro anya na Neomi echekwuola echiche banyere ihe o nwere ike imere nwunye nwa ya a ọ hụrụ n’anya. Mgbe ha ka nọ na Moab, Neomi kwuru na ya agaghị enweli ike ịchọtara Rut di. (Rut 1:11-13) Ma ugbu a, echiche ya agbanwewala. Neomi bịakwutere Rut ma gwa ya, sị: “Nwa m, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ịchọtara gị ebe izu ike?” (Rut 3:1) N’oge ahụ, ọ bụ ndị nne na nna na-achọtara ụmụ ha di ma ọ bụ nwunye. Rut aghọọrọla Neomi nwa. N’ihi ya, Neomi chọrọ ịchọtara Rut “ebe izu ike,” nke bụ́ na ọ chọrọ ịchọtara ya di n’ihi na ọ ma na ọ bụrụ na Rut alụọ di, ahụ́ ga-eru ya ala n’ụlọ di ya. Ma olee otú Neomi ga-esi achọtara ya di?

Oge mbụ Rut kọọrọ Neomi banyere Boaz, Neomi gwara ya, sị: “Nwoke ahụ bụ onye ikwu anyị. Ọ bụ otu n’ime ndị ga-agbara ihe anyị.” (Rut 2:20) Gịnị ka ihe a Neomi kwuru pụtara? Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru na Chineke chọrọ ka a na-enyere ezinụlọ ndị ihe siiri ike aka, bụ́ ndị ihe siiri ike maka na ha dara ogbenye ma ọ bụ maka na onye na-akpa afọ ha anwụọla. Ọ bụrụ na nwaanyị amụtabeghị nwa di ya anwụọ, obi ga na-ajọ ya njọ, nke ka nke, maka na aha di ya ga-efu, ámá di ya echiekwa. Ma Iwu ahụ kwuru ihe a ga-eme. O kwuru na ọ bụrụ na nwoke anwụọ n’amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye ya ka ọ mụta nwa nwoke ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ ka aha ya ghara ifu. Ọ bụkwa nwa ahụ a mụrụ ga-eketa ala nna ya. *Diuterọnọmi 25:5-7.

Neomi gwara Rut ihe ọ chọrọ ka o mee. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Rut na-ele Neomi anya ka ọ na-akọrọ ya ihe ahụ ọ chọrọ ka o mee. Rut amatachabeghị iwu Chineke nyere mba Izrel nakwa omenala ndị Izrel. O doro anya na ihe niile ka na-aga ya aka ekpe aka ekpe. Ma, ebe ọ na-ejighị Neomi egwu egwu, o gere ya ntị nke ọma. Rut kwetara ime ihe Neomi gwara ya n’agbanyeghị na ihe ahụ ọ gwara ya mee nwere ike ime ya ihere ma ọ bụ butere ya mkparị. O ji nwayọọ gwa Neomi, sị: “M ga-eme ihe niile ị gwara m.”—Rut 3:5.

Mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri ụmụ agbọghọ na ụmụ okorobịa ike ime ihe ndị okenye na ndị ka ha mara ihe gwara ha. Ọ na-adịrị ha mfe iche na ndị okenye anaghị aghọta ụdị nsogbu ndị ha na-enwe. Ihe Rut mere na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ige ndị okenye ntị bụ́ ndị hụrụ anyị n’anya ma na-achọ ka ihe dịrị anyị ná mma. Ige ha ntị ga-abara anyị uru. Ma gịnị bụ ihe Neomi gwara Rut ka o mee, oleekwa otú o si baara Rut uru mgbe o mere ya?

Rut Gara n’Ebe A Na-azọcha Mkpụrụ

Ná mgbede ụbọchị ahụ, Rut gara n’ebe a na-azọcha mkpụrụ. Ebe a na-azọcha mkpụrụ na-adị larịị ma sie ezigbo ike. Ọtụtụ ndị ọrụ ugbo na-ebute ọka ha n’ebe ahụ ma nọrọ na ya zọchaa ya ma fụchaa ya. Ọ na-abụkarị n’elu ugwu ka a na-anọ azọcha ọka n’ihi na ikiku na-ekusi ike n’ebe ahụ ná mgbede. Ọ na-abụ ndị ọrụ ugbo chọọ ịfụcha ọka ha zọchara azọcha, ihe ha na-eme bụ iji fọk ma ọ bụ shọvel na-ekuli ọka ha elu. Ha kulie ya, ifufe na-eburu igbogbo ọka ha, ebe ọka ha na-ada n’ala.

Rut zooro ezoro gaa otu ebe na-ekiri ka ndị ọrụ na-afụchara Boaz ọka. Ọ nọ ebe ahụ ruo mgbe ha mechiri ọrụ. Boaz nọkwa ebe ahụ na-ahụ ka ọrụ ahụ si na-aga. Ọka a fụchaara ya ebuola ezigbo ibu. Mgbe Boaz richara nri, obi atọọ ya ụtọ, o dinaara ala n’akụkụ ebe e kpokọtara ọka ya. O yiri ka ọ̀ bụ ihe ndị mmadụ na-emekarị n’oge ahụ. Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji eme ya bụ ka ndị ohi ma ọ bụ ndị ọ lụọ ọ gbalaga ghara ịbịa kporo ọka a zọchara azọcha. Rut hụrụ ka Boaz na-edinara ala n’abalị ahụ. Ọ bụ ugbu a ka ọ ga-eme ihe Neomi gwara ya mee.

Rut heere ehere gaa nso n’ebe ahụ Boaz dina, obi na-akụkwa ya kpum kpum. Ọ chọpụtara na Boaz nọ n’ezigbo ụra. N’ihi ya, o mere ihe Neomi gwara ya. Ọ gara n’ebe Boaz nọ na-ehi ụra kpughee ákwà Boaz ji kpuchie ụkwụ ya, jiri ya dinara ala ma chere ihe ga-emenụ. Ka Rut nọ na-eche, ọ dị ya ka oge anaghị aga aga. N’etiti abalị, Boaz malitere imegharị ahụ́. Ahụ́ nọ na-ama ya jijiji n’ihi oyi, ya ebilie ka o were ákwà kpuchie ụkwụ. Ma ọ chọpụtara na o nwere onye dina n’akụkụ ya. Baịbụl kwuru sị: “Lee! otu nwaanyị dina n’akụkụ ụkwụ ya!”—Rut 3:8.

Boaz juru nwaanyị ahụ, sị, “Ònye ka ị bụ?” Rut ejiri ụjọ gwa ya, sị: “Abụ m Rut ohu gị nwaanyị, gbasaa uwe mwụda gị kpuchie ohu gị nwaanyị, n’ihi na ọ bụ gị ga-agbara m.” (Rut 3:9) Ụfọdụ ndị na-akọwa Baịbụl n’oge anyị a na-ekwu na ihe ahụ Rut mere na ihe ahụ ọ gwara Boaz gosiri na ọ chọrọ ka ya na Boaz nwee mmekọahụ. Ma, o nwere ụzọ ihe abụọ ha na-aghọtaghị. Nke mbụ bụ na ihe ahụ Rut mere bụ omenala ndị Izrel. O so n’omenala ndị a na-anaghị emekwa n’oge a. N’ihi ya, mmadụ ekwesịghị ikwo na omume rụrụ arụ juru ebe niile ugbu a kwuo na ihe ahụ Rut mere adịghị mma. Nke abụọ abụrụ na ihe Boaz mere mgbe Rut gwachara ya okwu gosiri na o doro ya anya na Rut ebughị ihe ọjọọ n’obi, kama na Rut mere ihe o kwesịrị ime.

Boaz gwara Rut okwu. Otú o si jiri olu ọma gwa ya okwu mere ka obi ruo Rut ala. Boaz gwara ya, sị: “Ka Jehova gọzie gị, nwa m. I gosiwo obiọma gị n’ụzọ dị mma n’ihe a i mere ugbu a karịa nke mbụ i mere, ebe ị na-achụrụghị ụmụ okorobịa gawa, ma hà bụ ogbenye ma hà bụ ọgaranya.” (Rut 3:10) Ihe Boaz bu n’obi mgbe ọ sịrị ‘ihe mbụ Rut mere’ bụ otú Rut si hụ Neomi n’anya ma soro ya lọta n’Izrel ma na-elekọtakwa ya. Mgbe ọ gwara Rut “ihe a i mere ugbu a,” ihe ọ na-ekwu bụ ọbịbịa a Rut bịara ka ọ gbara ya. Boaz ma na ebe ọ bụ na Rut ka bụ nwa agbọghọ, ọ gaara adịrị ya mfe ịga chọrọ nwa okorobịa ga-alụ ya, ma onye ahụ ọ̀ bụ ogbenye ma ọ̀ bụ ọgaranya. Kama ime otú ahụ, o kpebiri imere ma Neomi ma di Neomi nwụrụ anwụ ihe ọma, ya bụ na ọ chọghị ka aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ fuo. Ka a sịkwa ihe mere ihe a Rut mere ji masị Boaz.

Boaz kwukwara, sị: “Nwa m, atụla egwu. M ga-emere gị ihe niile i kwuru, n’ihi na mmadụ niile nọ n’ọnụ ụzọ ámá nke ndị m maara na ị bụ ezigbo nwaanyị.” (Rut 3:11) Ọ ga-abụ na o jughị Boaz anya mgbe Rut gwara ya ka ọ gbara ya n’ihi na o nwere mmasị ịlụ Rut. Ma ebe Boaz bụ ezigbo mmadụ, ọ chọghị ịlụ Rut naanị n’ihi na o nwere mmasị ịlụ ya. Ọ gwara Rut na e nwere onye ọzọ ga-agbara ya nke bụ́ onye ikwu ndị ezinụlọ di Neomi nwụrụ anwụ karịa yanwa. Boaz kwuru na ya ga-agwa nwoke ahụ okwu ka ọ mara ma nwoke ahụ ọ̀ ga-alụ Rut.

Boaz gwara Rut ka o dinakwara ala hitụ ụra ruo mgbe chi bọwara, chi bọwa, ya alawa ka ndị mmadụ ghara ịma na ọ bịara ebe ahụ. Ọ chọghị ka ndị mmadụ lewe ya na Rut anya ọjọọ ebe ọ bụ na ụfọdụ ndị nwere ike iche na o nwe ihe ha mere. Rut dinaara n’akụkụ ụkwụ Boaz. Ugbu a, obi eruola ya ala n’ihi otú Boaz si gwa ya okwu. Mgbe chi na-abọchabeghị, Boaz kpojuru ọka bali n’ákwà Rut. Rut eburu ya lawa Betlehem.

Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ Rut ụtọ mgbe o chetara ihe Boaz gwara ya, nke bụ́ na mmadụ niile ma na ọ bụ “ezigbo nwaanyị.” O doro anya na ihe mere o ji nwee aha ọma otú a bụ maka na ọ na-enu ya enu n’obi ịmata Jehova na ife ya. Ihe ọzọkwa bụ na Rut na-enyere Neomi aka ma na-akwanyere ya na ndị obodo ya ùgwù, o jikwa obi ya niile na-erubere iwu ndị Izrel isi, ọ bụ eziokwu na iwu ha na omenala ha edochabeghị ya anya. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe ka Rut, anyị ga na-akwanyere ndị mmadụ na omenala ha ùgwù. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-enwekwa aha ọma ka Rut.

Otú Rut Si Nweta Ebe Izu Ike

Mgbe Rut lọtara, Neomi jụrụ ya, sị: “Ònye ka ị bụ, nwa m?” Ọ ga-abụ otú ahụ chi na-abọchabeghị mere Neomi ji jụọ Rut ajụjụ a, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na Neomi chọrọ ịma ma Rut ò nwetala onye ga-alụ ya ka ọ̀ bụ na o nwetabeghị. Ozugbo ahụ, Rut gwara nne di ya otú ya na Boaz si jee. O bunyekwara ya ọka bali ahụ Boaz gwara ya ka o bunye ya. *Rut 3:16, 17.

Ebe ọ bụ na Neomi ma ihe, ọ gwara Rut ka ọ nọrọ n’ụlọ ma hapụ ịga ịtụtụ ọka n’ụbọchị ahụ. Ọ gwara Rut, sị: “Nwoke ahụ agaghị ezu ike ọ̀ gwụla ma ò mere ka okwu a bie taa.”—Rut 3:18.

Ihe Neomi kwuru banyere Boaz bụ eziokwu. Boaz gara n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, bụ́ ebe ndị okenye obodo ahụ na-ezukọtakarị. Ọ nọ ebe ahụ na-eche mgbe onye ahụ kacha bụrụ onye ikwu ndị ezinụlọ di Neomi ga-agafewa. Boaz gwara nwoke ahụ n’ihu ndị akaebe nọ n’ebe ahụ ka ọ gbara Rut, ya bụ, ka ọ lụọ ya. Ma nwoke ahụ jụrụ. Ọ sịrị na ịgbara Rut ga-emebiri ya ihe nketa ya. Boaz nọzi n’ihu ndị akaebe ahụ nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ kwuo na ya ga-agbara Rut, nke bụ́ na ya ga-azụrụ ala di Neomi nwụrụ anwụ, bụ́ Elimelek, ma lụọ Rut bụ́ nwunye Malọn, nwa Elimelek. Boaz kwuru na ihe a ya chọrọ ime ga-eme ka “aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ dịgide n’ihe nketa ya.” (Rut 4:1-10) N’eziokwu, Boaz bụ ezigbo mmadụ, ọ naghịkwa achọ ihe ga-abara naanị ya uru.

Boaz lụrụ Rut. Baịbụl mechara kwuo, sị: “Jehova wee mee ka ọ tụrụ ime, o wee mụọ nwa nwoke.” Ụmụ nwaanyị Betlehem gọziri Neomi ma jaa Rut mma, kwuo na o meere Neomi ihe ụmụ nwoke asaa na-agaghị emeliri ya. Baịbụl mechara gwa anyị na nwa ahụ Rut mụrụ mechara bụrụ nna ochie Eze Devid. (Rut 4:11-22) Devid mechakwara bụrụ nna ochie Jizọs Kraịst.—Matiu 1:1. *

N’eziokwu, Chineke gọziri Rut, gọziekwa Neomi. Neomi nyeere Rut aka zụọ nwa ahụ ka à ga-asị na ọ bụ nwa yanwa mụrụ. Ihe mere ụmụ nwaanyị abụọ a na-akụziri anyị na Jehova Chineke na-ahụ ndị niile ji obi ha niile na-agbalị ka ha kpaa afọ ezinụlọ ha ma soro ndị hụrụ Chineke n’anya na-efe ya mgbe niile. O doro anya na Chineke ga-agọzi ndị ji obi ha niile na-efe ya ma meere onwe ha aha ọma n’ebe ọ nọ otú Rut mere.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ Gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha—‘Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga.’” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2012.

^ Dị ka Neomi kwuru, Jehova na-enwe obiọma ma n’ebe ndị dị ndụ nọ ma n’ebe ndị nwụrụ anwụ nọ. Di Neomi na ụmụ ya abụọ anwụọla. Di Rut anwụọkwala. O doro anya na Rut na Neomi hụrụ ndị ikom atọ ahụ nwụrụ anwụ n’anya nke ukwuu. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ihe ọma ọ bụla mmadụ meere Neomi na Rut, onye ahụ meere ya ndị ikom atọ ahụ nwụrụ anwụ n’ihi na ha ga-achọ ka a na-elekọta Neomi na Rut.

^ Iwu ahụ kwuru na ọ bụ nwoke nne ji ya na onye ahụ nwụrụ anwụ ga-alụrụ nwunye ya. Ọ bụrụ na o nweghị nwoke nne ji ya na ya, ọ bụ onye kacha bụrụ nwanne ya n’ezinụlọ ya ga-alụrụ nwunye ya, ọ bụkwa ya ga-eketa ihe o nwere.—Ọnụ Ọgụgụ 27:5-11.

^ Boaz bunyere Rut ọka bali dị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia isii. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji dịrị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ isii bụ iji gosi na ebe ọ bụ na a na-arụ ọrụ ụbọchị isii ma zuo ike n’ụbọchị nke asaa, oge Rut dọgburu onwe ya n’ọrụ agwụwala, nakwa na oge ọ ‘ga-ezu ike’ n’ụlọ di ya eruwela. O nwekwara ike ịbụ na ọ bụ naanị ọka dị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ isii, ya bụ, ihe dị ka shọvel isii, ka Rut nwere ike ibuli.

^ Rut so n’ụmụ nwaanyị ise Baịbụl kpọrọ aha mgbe a na-ekwu agbụrụ ma ọ bụ ezinụlọ Jizọs si. Nwaanyị ọzọ ọ kpọrọ aha bụ Rehab, bụ́ nne Boaz. (Matiu 1:3, 5, 6) Rehab abụghị onye Izrel, otú ahụ Rut na-abụghịkwa onye Izrel.

[Foto dị na peeji nke 19]

Rut rụsiri ọrụ ike ka o nwee ike ịkpa afọ ya na Neomi

[Foto dị na peeji nke 21]

Rut na Neomi nyeere ibe ha aka ma gbaa ibe ha ume

[Foto dị na peeji nke 23]

Rut ebughị ihe ọjọọ n’obi gakwuuru Boaz

[Foto dị na peeji nke 24]

Jehova gọziri Rut nke mere o ji bụrụ nne ochie Mesaya ahụ