Ọnụ Ọgụgụ 27:1-23
27 Ụmụ nwaanyị Zelofehad+ wee bịa. Zelofehad bụ nwa Hifa, nwa Gilied, nwa Mekia, nwa Manase, onye si n’ezinụlọ ndị si n’ebo Manase nwa Josef. Aha ụmụ nwaanyị ọ mụtara bụ Mala, Noa, Họgla, Milka, na Teza.
2 Ha bịara guzo n’ihu Mosis, Elieza onye nchụàjà, ndị isi,+ nakwa n’ihu nzukọ niile ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, sị:
3 “Nna anyị nwụrụ n’ala ịkpa, ma o soghị ná ndị kwadoro Kora,+ bụ́ ndị zukọtara maa Jehova aka. Kama ọ nwụrụ n’ihi mmehie nke ya. Ọ mụtaghị nwa nwoke.
4 Gịnị mere aha nna anyị ga-eji fuo n’ezinụlọ ya maka na ọ mụtaghị nwa nwoke? Kenye anyị ala otú e kenyere ụmụnne nna anyị.”
5 Mosis wee kọsara Jehova ihe ha kwuru.+
6 Jehova gwaziri Mosis, sị:
7 “Ihe ụmụ Zelofehad kwuru bụ eziokwu. Hụ na i kenyere ha ala otú e kenyere ụmụnne nna ha. Ị ga-enyefekwa ha ala nna ha kwesịrị iketa.+
8 Gwakwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na nwoke anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, unu ga-enyefe nwa ya nwaanyị ala o ketara.
9 Ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa nwaanyị, unu ga-enye ụmụnne ya ndị nwoke ala o ketara.
10 Ọ bụrụ na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, unu ga-enye ụmụnne nna ya ndị nwoke ala o ketara.
11 Ma ọ bụrụ na nna ya enweghị ụmụnne ndị nwoke, unu ga-enye onye ikwu ya, nke ya na ya kacha bụrụ otu ọbara n’ọnụmara ya, ala o ketara, ọ ga-ewerekwa ala ahụ. Ihe a m kpebiri ga-abụrụ ndị Izrel iwu ha ga na-edebe, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.’”
12 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Gbagoo n’ugwu a dị n’Abarim+ ka ị hụ ala m ga-enye ndị Izrel.+
13 Ị hụchaa ya, ị ga-anwụ otú Erọn nwanne gị nwụrụ,+ e liekwa gị otú e liri ndị nna nna gị,+
14 n’ihi na mgbe nzukọ a sesara m okwu n’ala ịkpa Zin, unu nupụrụ isi n’iwu m nyere unu, ghara ido m nsọ n’ihu ha mgbe m nyere ha mmiri.+ Ihe a mere ná mmiri Meriba+ nke dị na Kedesh,+ n’ala ịkpa Zin.”+
15 Mosis wee sị Jehova:
16 “Ka Jehova, bụ́ Chineke onye na-enye mmadụ niile ndụ,* họpụta nwoke ga na-edu nzukọ a,
17 onye ga na-apụ ma na-abata n’ihu ha, onye ga na-edu ha apụ ma na-edu ha abata, ka nzukọ Jehova ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.”
18 Jehova wee sị Mosis: “Kpọrọ Joshụa nwa Nọn, bụ́ nwoke ruru eru,* ma bikwasị ya aka n’isi.+
19 Mezie ka o guzo n’ihu Elieza onye nchụàjà nakwa n’ihu nzukọ a niile. Ị ga-anọkwa n’ihu ha mee ya onye ndú.+
20 Ị ga-enyetụ ya ikike* i nwere,+ ka nzukọ Izrel niile nwee ike ige ya ntị.+
21 Ọ ga-eguzo n’ihu Elieza onye nchụàjà, bụ́ onye ga-anọ n’ihu Jehova jiri Yurim+ jụtara ya ihe Chineke kpebiri. Ọ bụ ya ga-ekwu mgbe ha ga na-apụ na mgbe ha ga na-abata, ya na ndị Izrel niile na nzukọ a niile.”
22 Mosis wee mee nnọọ otú Jehova nyere ya n’iwu. Ọ kpọọrọ Joshụa mee ka o guzo n’ihu Elieza onye nchụàjà nakwa n’ihu nzukọ ahụ niile.
23 O wee bikwasị ya aka n’isi mee ya onye ndú,+ otú Jehova si n’ọnụ Mosis kwuo.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Chineke nke mmụọ anụ ahụ́ niile.”
^ Na Hibru, “nwoke mmụọ dị n’ime ya.”
^ Ma ọ bụ “ùgwù.”