Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onye Ochie ahụ Wee Nọdụ Ọdụ”

“Onye Ochie ahụ Wee Nọdụ Ọdụ”

 Bịaruo Chineke Nso

“Onye Ochie ahụ Wee Nọdụ Ọdụ”

BAỊBỤL kwuru na “ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Chineke dị nnọọ ebube nke na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịhụ ya ma dịrị ndụ. (Ọpụpụ 33:20) Ma Baịbụl kwuru na e nwere mgbe Jehova mere ka mmadụ ụfọdụ hụ otú eluigwe dị n’ọhụụ. Otu onye n’ime ha bụ Daniel onye amụma. Otú ihe ndị ọ hụrụ si dị ebube mere ka isi buo ya, o nwekwara ike ime anyị otú ahụ. Ka anyị leba anya n’otú Daniel si kọwaa ihe ndị ahụ ọ hụrụ. *Gụọ Daniel 7:9, 10.

“Onye Ochie ahụ.” Ọ bụ naanị Daniel kpọrọ Chineke “Onye Ochie ahụ.” Ihe a ọ kpọrọ Chineke gosiri na Chineke “anọọla ndụ ogologo oge.” (Daniel 7:9, 13, 22) Olee mgbe Jehova malitere ịdị ndụ? Ebe ọ bụ na Jehova bụ “Eze mgbe ebighị ebi,” o nweghị mmalite, o nweghịkwa ọgwụgwụ. (1 Timoti 1:17; Jud 25) Ebe ọ bụkwa na Chineke anaghị anwụ anwụ, obi kwesịrị isi anyị ike na amamihe ya enweghị nsọtụ n’ihi na Baịbụl na-ekwukarị na onye nọrọ ogologo ndụ nwere amamihe. (Job 12:12) N’eziokwu, mgbe ọ bụla e kwuru na Chineke enweghị mmalite ma ọ bụ ọgwụgwụ, ọ na-esiri anyị ike ịghọta ya. Ma mmadụ ò kwesịdịrị iche na ya ga-aghọta ihe niile banyere Chineke, bụ́ onye amamihe ya na-enweghị atụ?—Ndị Rom 11:33, 34.

Ị̀ hụrụ na Onye Ochie ahụ ‘nọdụrụ ọdụ’? Gịnị mere o ji nọrọ ọdụ? Ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị ọzọ tụpenyere anyị azụ̀ n’ihi na amaokwu ndị ahụ kwuru banyere “Ụlọikpe” na “ikpe.” (Daniel 7:10, 22, 26) Nke a gosiri na n’ọhụụ ahụ, Jehova bụ Onyeikpe nke nọdụrụ ọdụ ka o kpee ikpe. Ole ndị ka ọ ga-ekpe ikpe? Ọ bụ mba dị iche iche dị n’ụwa. N’ọhụụ e gosiburu Daniel, anụ ọhịa dị iche iche nọchiri anya mba ndị ahụ. * (Daniel 7:1-8) Olee ụdị Onyeikpe Jehova bụ?

“Uwe ya na-acha ezigbo ọcha, ntutu dị ya n’isi dị ka owú dị ọcha.” N’ebe ụfọdụ na Baịbụl, e kwuo na ihe dị ọcha, ọ pụtara na ihe ahụ arụghị arụ ma ọ bụ na o nweghị mmerụ. Owú a na-abajighị abaji na-adị ọcha. N’ihi ya, ntutu e kwuru na ọ dị ka owú ga na-acha ọcha. Weregodị ya na i so Daniel na-ahụ ọhụụ ahụ. Gịnị ka ị na-ahụ? Ị̀ na-ahụ Onyeikpe ahụ nke ntutu ya dị ọcha, nke yikwa uwe mwụda na-enwu gbaa? Ihe ahụ ọ hụrụ n’ọhụụ na-eme ka o doo anyị anya na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi, nakwa na ọ maara ihe. Ọ bụ Onyeikpe nke anyị kwesịrị ịtụkwasị obi ma na-akwanyere ezigbo ùgwù.

“E nwere puku kwuru puku ndị nọ na-ejere ya ozi, nakwa iri puku kwuru iri puku ndị guzo n’ihu ya.” Ole ndị bụ ndị a na-ejere Chineke ozi n’eluigwe? Baịbụl kpọrọ ndị mmụọ ozi ‘ndị na-ejere Chineke ozi.’ (Abụ Ọma 104:4) Ndị mmụọ ozi ahụ ‘na-eme ihe Chineke kwuru, na-emekwa uche ya.’ O nwere ike ịbụ na ha dị ọtụtụ narị nde. (Abụ Ọma 103:20, 21) Nke a bụ ihe ọzọ na-egosi anyị na amamihe Chineke enweghị nsọtụ. Ọ bụ naanị Jehova bụ onye nwere ike inwe ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi ma hazie ha ahazie ka ha na-ejere ya ozi kemgbe ogologo oge a na-amaghị ama.

Ihe Daniel hụrụ n’ọhụụ na-eme ka anyị tụkwasị Jehova, bụ́ Onye Ochie ahụ, obi. Ọ na-emekwa ka o doo anyị anya na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nakwa na amamihe ya enweghị atụ. Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo ihe ị ga-eme ka gị na Chineke, bụ́ onye amamihe ya na-enweghị nsọtụ, dịrịkwuo ná mma?

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Ọktoba:

Daniel 4-12Hosia 1-14

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 N’eziokwu, Daniel ahụghị Chineke. Ma Chineke mere ka ọ hụ ihe ụfọdụ ndị o nwere ike ịkọwali otú ha dị. Mgbe Daniel na-ekwu ihe ndị ọ hụrụ, o ji ihe ndị dị mmadụ n’ahụ́ kọwaa otú Chineke dị. Ihe ndị ahụ o ji kọwaa otú Chineke dị mere ka anyị nwee ike ịghọta ihe ndị o kwuru. Ma nke ahụ apụtaghị na ọ bụ otú ahụ ka Chineke dị kpọmkwem.

^ par. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara ọhụụ anụ ọhịa ndị ahụ Daniel hụrụ, gụọ isi nke 9 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]

Ọ bụ Onyeikpe nke anyị kwesịrị ịtụkwasị obi ma na-akwanyere ezigbo ùgwù