Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enwela Oké Ọchịchọ!

Enwela Oké Ọchịchọ!

Maka Ndị Na-eto Eto

Enwela Oké Ọchịchọ!

Ihe ị ga-eme: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na e nwere ebe ị nọ na-ekiri ka ihe ndị ị na-agụ na-eme. Werekwa ya na ị na-anụ ihe ndị ị na-agụ akụkọ ha na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị a kọrọ akụkọ ha: Devid, Absalọm, na Joab

Ihe a kọrọ: Absalọm chọrọ ịnara papa ya ọchịchị.

1 CHEBARA OTÚ IHE NDỊ A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ 2 SAMUEL 14:25-33; 15:1-17; 18:9-17, 30-33.

Kọwaa otú i chere Absalọm dị. (Gụgharịa 2 Samuel 14:25, 26.)

․․․․․

N’oge ahụ ndị mmadụ na-abịakwute papa Absalọm ka o kpeere ha ikpe, olee otú i chere Absalọm si na-akpaso ha àgwà na otú o si na-agwa ha okwu ka o nweta obi ha? (Gụgharịa 2 Samuel 15:2-6.)

․․․․․

Olee ụdị mmadụ i chere na Absalọm bụ n’ihi ihe a kọrọ na 2 Samuel 14:28-30?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Olee ihe Absalọm bu ụzọ mee ka o nwee ike ịnara papa ya ọchịchị? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ 2 Samuel 13:28, 29. Amnọn bụ diọkpara Devid, ọ bụkwa ya kwesịrị ịchị ma Devid nwụọ.)

․․․․․

Absalọm nwere oké ọchịchọ, chọọkwa ka a na-eto ya. Ma n’ihi otú e si lie ya, olee otú i chere ndị mmadụ si ele ya anya? (Gụgharịa 2 Samuel 18:17.)

․․․․․

Olee ihe i chere na ọ bụ ya so mee ka Absalọm nwewe oké ọchịchọ? (Ị chọọ ịmata, gụọ ihe e kwuru banyere Dayọtrefis na 3 Jọn 9, 10.) _______

․․․․․

Olee otú obi dị Devid mgbe Absalọm mere ihe ndị ahụ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Abụ Ọma nke 3. Devid dere ya n’oge ahụ Absalọm chọrọ ịnara ya ọchịchị.) _______

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE  . . .

Nsogbu inwe oké ọchịchọ nwere ike ịkpatara mmadụ.

․․․․․

Otú ihe mmadụ mere nwere ike isi mee ka obi gbawaa papa ya na mama ya nakwa ndị ọzọ.

․․․․․

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.

Gịnị nwere ike ime ka mmadụ malite inwe oké ọchịchọ? ․․․․․

Olee ihe i nwere ike ime ka onwe gị ghara ibuwe gị isi? ․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? GỊNỊKWA MERE O JI BAARA GỊ URU?

․․․․․

Aro anyị na-atụrụ gị: Weregodị ya na Absalọm emeghị ihe ọjọọ ndị ahụ o mere. Olee uru ọ gaara erite ma a sị na o nweghị oké ọchịchọ, ya bụ, ma a sị na ọ dị umeala n’obi?—Ilu 18:12.

Gaa na www.jw.org

Ka ị gụọ Baịbụl n’ịntanet

Nakwa ka i si n’ịntanet nweta isiokwu a ma ọ bụ bipụta ya