Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MMADỤ Ò NWERE IKE Ịkwụwa Aka Ọtọ N’ỤWA A NRỤRỤ AKA JURU?

MMADỤ Ò NWERE IKE Ịkwụwa Aka Ọtọ N’ỤWA A NRỤRỤ AKA JURU?

 MMADỤ Ò NWERE IKE Ịkwụwa Aka Ọtọ N’ỤWA A NRỤRỤ AKA JURU?

“Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”​—NDỊ HIBRU 13:18.

N’AGBANYEGHỊ na Ekwensu na mmehie anyị bu pụta ụwa nakwa ụwa anyị bi n’ime ya anaghị ekwe anyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko, anyị nwere ike ịkwụwa aka ọtọ. Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị na-akwụwa aka ọtọ? Ihe ga-enyere anyị aka bụ ịgba mbọ ka anyị na Chineke dịrị ná mma na ime ihe Okwu ya, bụ́ Baịbụl, kwuru. Ime ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru abaarala ọtụtụ ndị uru ma n’oge gara aga ma n’oge a. Ka anyị hụ ihe atụ abụọ ndị gosiri na nke a bụ eziokwu.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Kwụsịnụ ibi ndụ n’ụzọ na-atọ ụwa ụtọ.”—Ndị Rom 12:2, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Akụkọ mere eme: E nwere otu nwoke na Brazil nke aha ya bụ Guilherme. Nwoke a bụ ezigbo onye ọchụnta ego. O kwuru na mmadụ ịkwụwa aka ya ọtọ n’azụmahịa anaghị adị mfe. Guilherme kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye na-achụ nta ego akpacharaghị anya, o nwere ike iso ndị ọzọ gwuwe wayo ka ụlọ ọrụ ya ma ọ bụ ahịa ya ghara ịda.  Ọtụtụ ndị chere na mmadụ inye ma ọ bụ ịnara ego aka azụ abụghị ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ụlọ ọrụ gị ma ọ bụ ahịa gị ka bidoro ebido, o nwere ike isiri gị ike ịkwụwa aka ọtọ n’ihi nnukwu ego ị na-emefu.”

N’agbanyeghị nke a, Guilherme ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ ghọwa aghụghọ n’ahịa ya. O kwuru, sị: “Onye chọrọ ịkwụwa aka ọtọ n’azụmahịa ga-akwụwa aka ọtọ n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị anaghị eme otú ahụ. Ihe ga-enyere onye ahụ aka bụ ikpebisi ike na mee elu mee ala, na ya ga-eme ihe dị mma. Ịmụ Baịbụl emeela ka m chọpụta na mmadụ ịkwụwa aka ya ọtọ bara uru. Obi na-eru onye na-akwụwa aka ya ọtọ ala, ndị mmadụ na-akwanyekwara ya ùgwù. O nwekwara ike ime ka ndị ọzọ mụta àgwà ọma ya.”

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Ndị na-achọ ka ha bụrụ ọgaranya na-adaba n’ime ọnwụnwa, ịma n’ọnyà, n’ọchịchọ na-enweghị isi nke na-emerụ mmadụ, nke na-edubakwa mmadụ na mbibi na ịla n’iyi. Ịhụ ego n’anya bụ isi ihe ọjọọ niile.’—1 Timoti 6:9, 10, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Akụkọ mere eme: Otu nwoke aha ya bụ André nwere ụlọ ọrụ nke na-etinyere ndị mmadụ ngwá ọrụ e ji eche nche. Otu n’ime ndị ọ na-etinyere ngwá ọrụ ndị ahụ e ji eche nche bụ otu nnukwu òtù egwuregwu bọl. Otu ụbọchị, mgbe òtù egwuregwu bọl ahụ gbachara bọl ọtụtụ ndị bịara kirie, André gara n’ọfịs ha ka ha kwụọ ya ụgwọ ọrụ ọ rụụrụ ha. N’oge ahụ, ndị na-arụ ọrụ n’ọfịs ahụ ka nọ na-agụ ego ndị ha retere na tiketi. Ebe ọ bụ na chi ejiwela mgbe ahụ, onyeisi ha kwụrụ André na ndị ọzọ rụụrụ ha ọrụ ụgwọ ọsọ ọsọ.

André kwuru, sị: “Mgbe m na-ala, achọpụtara m na onyeisi ahụ kwụfere m ụgwọ. Ama m na o nwere ike ọ gaghị amata onye ọ kwụfere ụgwọ ahụ. M makwa na ọ bụ onyeisi ahụ ga-esi n’akpa ya kwụchie ego ahụ ọ kwụfere. N’ihi ya, ekpebiri m na m ga-agaghachi nye ya ego ahụ. M jisiri ike si n’etiti ndị na-apụta n’ámá egwuregwu ahụ banye n’ọfịs ahụ ma nyeghachi ya ego ahụ. Obi tọrọ nwoke ahụ ụtọ. O nwetụbeghị onye ọ kwụfere ụgwọ weghachitụụrụla ya ego ọ kwụfere ya.”

André kwukwara, sị: “Ego ahụ m weghachiri mere ka nwoke ahụ na-akwanyere m ùgwù. Ọtụtụ afọ agafeela ihe ahụ mere, ma n’ime ndị niile mụ na ha na-arụrụ òtù egwuregwu ahụ ọrụ n’oge ahụ, ọ bụ naanị m fọrọ. Obi dị m ụtọ na ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka m nwee aha ọma.”

N’eziokwu, Chineke nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara itinye aka ná nrụrụ aka juru ebe niile. Ma, ihe ọ sọkwara anyị mee n’ike aka anyị, anyị agaghị emeli ka nrụrụ aka kwụsị kpamkpam. Mmadụ na-ezughị okè agaghị akwụsịli ya n’ihi na ọ karịrị anyị. Ma nke a ọ̀ pụtara na nrụrụ aka agaghị akwụsị akwụsị? Ihe Baịbụl zara n’isiokwu na-esonụ ga-eme gị obi ụtọ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Obi dị m ụtọ na ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka m nwee aha ọma.”​—ANDRÉ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Ịmụ Baịbụl emeela ka m chọpụta na mmadụ ịkwụwa aka ya ọtọ bara uru.”​—GUILHERME