Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Mmadụ Agaghị Enwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụrụ na Ọ Lụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Mmadụ Agaghị Enwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụrụ na Ọ Lụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

 Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Mmadụ Agaghị Enwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụrụ na Ọ Lụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

▪ Baịbụl ò kwuru na mmadụ ga-alụrịrị di ma ọ bụ nwunye tupu ya enwee obi ụtọ ná ndụ? Ọ bụrụ na mmadụ elerughị ihe Baịbụl kwuru anya, o nwere ike iche na ọ bụ ihe Baịbụl na-ekwu. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Akwụkwọ Jenesis kọọrọ anyị na Chineke sịrị na ọ “dịghị mma” ka Adam nọrọ naanị ya. Ọ bụ ya mere o ji meere Adam “onye ga-eme ka o zuo ezu.” (Jenesis 2:18) Okwu ahụ bụ́ “onye ga-eme ka o zuo ezu” nwere ike ime ka anyị chee na ọ bụrụ na mmadụ alụghị di ma ọ bụ nwunye, onye ahụ ezughị ezu. Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ ebe na Baịbụl kọrọ otú ọtụtụ ndị si nwee obi ụtọ maka na ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Akụkọ Rut bụ otu n’ime ha.

Ma akụkọ ndị a hà na-akụziri anyị na ọ bụrụ na Onye Kraịst taa alụghị di ma ọ bụ nwunye ma mụta ụmụ na ọ gaghị enwe obi ụtọ, ndụ ya agaghịkwa enwe isi? Ọ bụghị ihe ha na-akụziri anyị. Onye kacha nwee obi ụtọ n’oge ọ nọ n’ụwa bụ Jizọs Kraịst. Ma Jizọs alụghị nwaanyị. Jizọs bụkwa onye kacha mara ihe nke bitụrụla n’ụwa. O nwekwara obi ụtọ ka nna ya bụ́ Jehova, bụ́ Chineke “onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11; Jọn 14:9) Jizọs mere ka anyị mata ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ nwee obi ụtọ n’ụwa a. (Matiu 5:1-12) O kwughị na mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye so na ha.

Nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ na-abụ Baịbụl kwuo otu ihe n’ebe a, n’ebe ọzọ ya ekwuo ihe ọzọ? Mbanụ. Anyị kwesịrị ileba anya n’ihe mere Jehova ji chọọ ka ndị mmadụ na-alụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ bụ eziokwu na Chineke chọrọ ka alụmdi na nwunye mee ka onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye nweta onye ya na ya ga-adị n’ezigbo mma ma na-enwe obi ụtọ, anyị ekwesịghịkwa ichefu na ọtụtụ mgbe, Chineke ji alụmdi na nwunye mezuo ihe o bu n’obi. Dị ka ihe atụ, Chineke bu n’obi ka Adam na Iv ‘mụọ ọmụmụ, baa ụba ma jupụta ụwa.’ (Jenesis 1:28) Naanị Adam enweghị ike imezu ihe ahụ Chineke bu n’obi, Iv enweghịkwa ike imezu ya naanị ya. Kama ọ bụ ha abụọ ga-emezu ya.

Otú ahụ ka ọ dịkwa n’oge Jehova na mba Izrel oge ochie na-emekọ ihe. O nwere ihe dị mkpa mere Jehova ji chọọ ka ụmụ Izrel na-alụ di na nwunye ma na-amụ ụmụ. Ọ chọrọ ka ndị Izrel mụọ ọmụmụ ma baa ụba ka ndị iro ha ghara imeri ha. O bukwa n’obi ka e si n’ebo Juda mụọ Mesaya ahụ, bụ́ onye ga-anapụta ndị niile na-efe Chineke n’aka mmehie na ọnwụ. (Jenesis 49:10) Ọ bụ ya mere ụmụ nwaanyị ndị Izrel ji ewere ịlụ di na ịmụ ụmụ ka oké ihe, ọ bụkwa ya mere nwaanyị na-alụghị di ma ọ bụ nke na-amụtaghị nwa ji anọ ná mwute, ihere ana-emekwa ya.

Oleekwanụ maka oge anyị a? Iwu ahụ Chineke nyere n’oge ochie, nke bụ́ ka ‘e jupụta ụwa,’ ọ̀ bụ maka Ndị Kraịst n’oge a? Ọ̀ bụ iwu na Ndị Kraịst ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma mụọ ụmụ n’ụwa a ụmụ mmadụ juru? Mba. (Matiu 19:10-12) Ebe ọ bụ na a mụọla Mesaya ahụ, ọ dịkwaghị agbụrụ ma ọ bụ mba Chineke na-echebe ka e nwee ike mụta Mesaya ahụ. Ebe ọ dị otú ahụ, olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi were okwu gbasara mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ mmadụ ịhapụ ịlụ alụ?

N’eziokwu, mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ mmadụ ịhapụ ịlụ alụ bụcha onyinye si n’aka Chineke. Dị ka ị maara, o nwere onye a ga-enye onyinye, ọ gaghị adị ya mma, ma e nye onye ọzọ onyinye ahụ, ya adị onye ahụ mma. Alụmdi na nwunye bụ ihe dị nsọ si n’aka Chineke. Ọ na-eme ka nwoke na nwaanyị hụ ibe ha n’anya, na-emekọ ihe ọnụ ma mụta ụmụ, ahụ́ eruokwa ụmụ ha ala. Ma Baịbụl kwukwara hoo haa na ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye n’ụwa ọjọọ a ga-enwe nsogbu ma ọ bụ “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” Jehova ewereghịkwanụ mmadụ ịhapụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ka ihe ihere ma ọ bụ ihe ga-eme ka mmadụ nwewe mwute. Kama nke ahụ, Baịbụl kwuru na o nwere ihe onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ji kara onye lụrụnụ mma.—1 Ndị Kọrịnt 7:28, 32-35.

N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye dị mma, kwuokwa na mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye dịkwa mma. Jehova, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye, chọrọ ka ndị niile na-efe ya, ma ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ndị na-alụghị, na-enwe obi ụtọ.