Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Ò Nwere Ike Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi?

Mmadụ Ò Nwere Ike Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi?

 Mụta Ihe N’okwu Chineke

Mmadụ Ò Nwere Ike Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị mere ndụ anyị ji adị mkpụmkpụ?

Ụfọdụ anụmanụ na ụfọdụ osisi na-adị ndụ karịa ụmụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, e nwere mbe ndị na-anọru otu narị afọ na iri ise, nweekwa osisi ndị na-anọru puku afọ atọ. Ma anyị anaghị anọru ndụ otú ahụ. N’agbanyeghị nke a, anyị na-eji ndụ anyị eme ihe bara uru karịa mbe ma ọ bụ osisi. Jehova Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha nwee ike ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ndụ na-atọ ha ụtọ, dị ka ịkụ egwú, igwu egwuregwu, iri nri, ịmụta ihe, na ime njem. O kekwara ha ka ha na ibe ha na-akpakọrịta. N’eziokwu, Chineke kere anyị ka ịdị ndụ na-agụ anyị agụụ mgbe niile.—Gụọ Ekliziastis 3:11.

2. Ọ̀ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

Jehova na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ naghị anwụ anwụ. Ọ bụ ya ka ndụ si n’aka. N’ihi ya, o nwere ike ime ka anyị dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 36:9; Habakọk 1:12) Ihe ọzọkwa bụ na o kwere nkwa na ya ga-enye ndị na-erubere ya isi ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, ọ ga-eme ka ụmụ mmadụ kwụsị ịka nká.—Gụọ Job 33:24, 25; Aịzaya 25:8; 33:24.

Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa gosiri na anyị kwesịrị inwe okwukwe na Chineke ga-emezu nkwa ahụ o kwere, nke bụ́ ime ka anyị ghara ịna-arịa ọrịa, gharakwa ịna-anwụ anwụ. Jizọs gwọrọ ọtụtụ ndị ụdị ọrịa dị iche iche, kpọlitekwa ndị mmadụ n’ọnwụ.—Gụọ Luk 7:11-15, 18, 19, 22.

  3. Olee mgbe anyị ga-amalite ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

Chineke chọrọ ka anyị dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs, ọ bụghị n’ụwa a mmegbu na tigbuo zọgbuo juru. Ọ chọrọ ka obi ruo anyị ala mgbe ahụ. (Abụ Ọma 37:9, 29; Aịzaya 65:21, 22) Mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs, Chineke ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ bụrụ na ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ erubere Chineke isi ma na-efe ya, ha ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Luk 23:42, 43; Jọn 5:28, 29.

4. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

Ọ bụ naanị Chineke nwere ike ime ka anyị dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmụta banyere ya ka anyị na ya dịrị ná mma. Baịbụl kwuru na mmadụ ịmụ banyere Chineke dị ka mmadụ iri nri. (Matiu 4:4) Iri nri na-atọ ụtọ, ma mmadụ ga-ebugodị ụzọ gbaa mbọ tupu ya enweta nri ahụ ma sie ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa mmadụ ịmụ banyere Chineke. Onye chọrọ ịmụ banyere Chineke ga-agbakwa mbọ. Ma mbọ ọ bụla anyị gbara iji mụta banyere Chineke efughị ọhịa n’ihi na o nweghị ihe a ga-eji tụnyere mmadụ na Chineke ịdị ná mma nakwa onye ahụ inweta ndụ ebighị ebi.—Gụọ Luk 13:23, 24; Jọn 6:27; 17:3.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 3 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 17]

Mbọ ọ bụla anyị gbara iji mụta banyere Chineke efughị ọhịa