Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

 Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

OLEE otú otu nwoke nke nwere ọtụtụ nsogbu mgbe ọ bụ nwata si ghọọ ezigbo di na ezigbo nna ma na-enwe obi ụtọ ugbu a? Gịnị nyeere otu nwaanyị nke mere ọtụtụ ihe ọjọọ aka ịgbanwe ndụ ya? Gụọ ihe ha kwuru.

‘Ọ dị m ka ndụ m enweghị isi.’​—VÍCTOR HUGO HERRERA

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1974

ABỤ M ONYE: CHILI

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE AṄỤRỤMA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’Angol. Angol bụ obodo mara mma nke dị n’ebe ndịda mba Chili. Amaghị m papa m. Mgbe m dị afọ atọ, mama m kpọ mụ na nwanne m nwoke gaa biri na Santiego, bụ́ isi obodo Chili. Anyị bi n’otu mkpakara ụlọ e wuuru ndị na-enweghị ụlọ. Anyị na-aga mposi n’ebe mmadụ niile bi ná mkpakara ụlọ ndị ahụ na-aga mposi. Ebe anyị si enweta mmiri bụ n’ebe ụlọ ọrụ na-agbanyụ ọkụ si amịta mmiri ha ji agbanyụ ọkụ.

Mgbe afọ abụọ gachara, gọọmenti nyere anyị otu obere ụlọ. Ma ọ dị mwute na ọtụtụ ndị agbata obi anyị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, na-aṅụbiga mmanya okè, na-eme mpụ ma na-agba akwụna.

Otu ụbọchị, mama m hụrụ otu nwoke n’ebe ahụ. Ya na nwoke ahụ mechara lụọ. Nwoke ahụ bụ onye aṅụrụma. Ya ṅụchaa mmanya, ya akụọ mụ na mama m ihe. Ọtụtụ mgbe, m na-aga otu ebe nọrọ na-ebe ákwá, ya adị m ka ya bụrụ na m nwere papa ga-anapụta m n’aka nwoke a.

Anyị dara ogbenye n’agbanyeghị na mama m na-eme ihe niile o nwere ike ime ka ọ kpaa afọ anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị anaghị enwe ihe oriri, naanị ihe anyị na-eme bụ ịṅụ mmiri ara ehi na ịracha sụga. Mgbe ọ bụla mụ na nwanne m nwoke chọrọ ilegharị anya, anyị na-ezoro ezoro gaa na windo otu onye agbata obi anyị, kwụrụ ebe ahụ na-ele tiivi. Ma otu ụbọchị, onye agbata obi anyị ahụ jidere anyị, anyị akwụsịzie ịga ebe ahụ.

Mgbe nwoke ahụ lụrụ mama m na-aṅụghị mmanya, ọ na-azụtara mụ na nwanne m nwoke ihe anyị ga-eri. Otu ụbọchị, ọ zụtaara anyị obere tiivi. O so n’ihe ole na ole m nwere ike icheta metụrụ m obi ụtọ.

Mgbe m dị afọ iri na abụọ, m mụtara otú e si agụ ihe. Mgbe otu afọ gafere, m kwụsịrị ịga akwụkwọ ma malite ịrụ ọrụ. Ọ na-abụ anyị gbasaa ọrụ, m na-eso ndị torola eto mụ na ha na-arụkọ ọrụ aga oriri na nkwari. Anyị gaa ebe ahụ, anyị na-aṅụbiga mmanya okè, ṅụọkwa ọgwụ ike. Obere oge, ịṅụ mmanya na ọgwụ ike bịara rie m ahụ́.

Mgbe m dị afọ iri abụọ, mụ na otu nwa agbọghọ aha ya bụ Cati bidoro ịkpa. Anyị mechakwara lụọ. Mgbe anyị lụchara, anyị bi n’udo, ihe niile na-agazikwa agazi. Ma obere oge, m malitekwara ibi ndụ ọjọọ ahụ m na-ebibu. M bịaziri kpawa àgwà ọjọọ karịa ka m na-akpabu. Ọ bịara doo m anya na àgwà ọjọọ ahụ ga-ata isi m ma ọ bụkwanụ mee ka m gaa  mkpọrọ. Nke ka njọ bụ na àgwà ọjọọ ahụ m na-akpa na-akpatara nwa m nwoke bụ́ Víctor ụdị nsogbu ndị m nwere mgbe m bụ nwata. Ihe a mere ka obi na-ajọ m njọ, ya adịkwa m ka ndụ m enweghị isi.

N’ihe dị ka afọ 2001, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ anyị, ha na nwunye m bidokwara ịmụ Baịbụl. Ọ kọọrọ m ihe ndị ọ na-amụta. Ọ bịara na-agụ m agụụ ịmụta ihe ndị ahụ a na-akụziri ya. N’ihi ya, m bidokwara ịmụ Baịbụl. N’afọ 2003, e mere nwunye m baptizim, ya aghọọ Onyeàmà Jehova.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Otu ụbọchị, m gụrụ Rut 2:12. Ebe ahụ kwuru na Jehova na-akwụ ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ na ndị na-efe ya ezigbo ụgwọ ọrụ. M bịara ghọta na ọ bụrụ na mụ ahapụ ndụ ọjọọ m na-ebi ma mewe ihe dị Chineke mma, ọ ga-akwụkwa m ezigbo ụgwọ ọrụ. M chọpụtara na Baịbụl kwuru ọtụtụ ugboro na ịṅụbiga mmanya okè adịghị mma. Ihe e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 7:1 metụkwara m n’ahụ́. Ebe ahụ kwuru “ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile.” Nke a mere ka m malite ịhapụ àgwà ọjọọ ndị m na-akpa. Ozugbo m malitere ịhapụ ha, m bịaziri na-ewe iwe ọkụ karịa otú m na-ewebu. N’oge niile ahụ, nwunye m nyeere m ezigbo aka.

M mechara kwụsị ọrụ m na-arụ n’ihi na ndị mụ na ha na-arụ ọrụ na-eme ka o siere m ike ịkwụsị ịṅụ sịga na ịṅụbiga mmanya okè. Ọ bụ eziokwu na ọrụ ahụ m kwụsịrị mere ka anyị ghara ịna-akpata ego otú anyị sibu akpata, ma o mere ka m nwekwuo ohere ịmụ Baịbụl. Ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere iji ife Chineke kpọrọ ihe. Nwunye m anaghị ana m ego karịa otú m nwere, ọ naghịkwa akparị m maka na anyị enwekwaghị ego. Obi dị m ụtọ na o nyeere m ezigbo aka.

Mụ na Ndịàmà Jehova ji nke nta nke nta kpachiwe anya. Ha mere ka m ghọta na n’agbanyeghị na mụ agụchaghị akwụkwọ, obi dị Jehova ụtọ na m ji obi m niile chọọ ife ya. Otú ahụ Ndịàmà Jehova si hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu baara ezinụlọ anyị ezigbo uru. O nwetụbeghị ndị anyị hụrụ dị n’otu ka Ndịàmà Jehova. N’ọnwa Disemba n’afọ 2004, e mekwara m baptizim.

URU NDỊ M RITERELA: Ahụla m na ihe Jehova kwuru n’Aịzaya 48:17 bụ eziokwu. Ebe ahụ kwuru, sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.” Otú ndụ m si gbanwee mere mama m na nwanne m nwoke obi ụtọ nke na ha amalitela ịmụ Baịbụl ugbu a. Obi tọdịrị ndị agbata obi anyị ụtọ mgbe ha hụrụ na mụ agbanweela, hụkwa na anyị na-enwe obi ụtọ ugbu a n’ezinụlọ anyị.

Obi dị m ụtọ na nwunye m hụrụ Chineke n’anya. Mụ na ya bụ nnụ na mmanụ, ọ tụkwasịkwara m obi. N’agbanyeghị na amaghị m nna m, Baịbụl akụzierela m otú m ga-esi zụọ ụmụ nwoke atọ m mụrụ. Ha na-akwanyere m ùgwù. Nke ka nke bụ na ha amatala onye Jehova bụ, ha hụkwara ya n’anya.

M na-ekele Jehova na n’agbanyeghị nsogbu ndị m nwere mgbe m bụ nwata, o meela ka obi na-atọ m ụtọ ugbu a.

 ‘M na-ewe iwe ọkụ ma na-esekarị okwu.’—NABIHALAZAROVA

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1974

ABỤ M ONYE: BỌLGERIA

NDỤ M BIRI: M NA-ERE ỌGWỤ IKE

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’otu obodo a na-akpọ Sofia, nke dị na Bọlgeria. Ezinụlọ anyị nwetụrụ ego. Mgbe m dị afọ isii, papa m hapụrụ ezinụlọ anyị rie mbọmbọ. Ihe a wutere anyị, o mekwara ka obi gbawaa m. Ọ bịara dị m ka m̀ bụ onye a jụrụ ajụ, dịkwa m ka o nweghị onye nwere ike ịhụ m n’anya. Otú ahụ obi na-adị m mere ka m mewe isi ike mgbe m na-eto. M bịaziri na-ewe iwe ọkụ ma na-esekarị okwu.

Mgbe m dị afọ iri na anọ, m gbapụrụ n’ụlọ anyị. Nke a bụ nke mbụ m na-eme otú ahụ. Ọtụtụ mgbe, m na-ezuru ego mama m nakwa ego nne na nna m ochie. Iwe ọkụ m na-ewe na-akpatara m nsogbu mgbe niile n’ụlọ akwụkwọ. Nke a mere ka a gbanweere m ụlọ akwụkwọ ugboro ise naanị n’ime afọ ole na ole. Mgbe ọ fọrọ afọ atọ ka m gụchaa, m kwụsịrị ịga akwụkwọ. M bikwara ndụ rụrụ arụ. Ịṅụ sịga na ịṅụ wii wii bịara rie m ahụ́. M na-aṅụ oké mmanya, na-agakwa oriri na nkwari mgbe niile. M malitekwara ire ọgwụ ike. Echere m na ọ dịghị uru ọ baara mmadụ ịdị ndụ n’ụwa a ndị mmadụ na-atagbu onwe ha n’ahụhụ ma na-anwụ anwụ. N’ihi ya, naanị ihe na-adị m mkpa n’ụbọchị bụ ikpori ndụ, mgbe ọ bụla ọnwụ bịara mụ anwụọ.

N’afọ 1998, mgbe m dị afọ iri abụọ na anọ, e jidere m n’ọdụ ụgbọelu dị na Saụ Paụlo, nke dị na Brazil, n’oge m gara ire ọgwụ ike. Nke ahụ mere ka a tụọ m mkpọrọ afọ anọ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’afọ 2000, Ndịàmà Jehova bidoro ịbịa na-ezi ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ebe a tụrụ m mkpọrọ ozi ọma. Ha na-abịa otu ugboro n’izu. Otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Marines nyeere m ezigbo aka. O mere ka m nwee mmasị ịmụ Baịbụl. Ebe ọ bụ na anụtụbeghị m banyere Ndịàmà Jehova, m jụrụ ndị mkpọrọ ibe m ka ha kọọrọ m ihe ha ma banyere Ndịàmà Jehova. O juru m anya na ọtụtụ n’ime ndị m jụrụ kwuru ihe na-adịghị mma banyere ha. Otu onye n’ime ha gwadịrị m na ọ kaara m mma ịga chọọchị ọ bụla ọzọ kama ịga Àmà Jehova. Ihe ahụ ọ gwara m medịrị ka m chọkwuo ịmata Ndịàmà Jehova. M chọrọ ịmata ihe mere ndị mmadụ ji kpọọ ha asị. M bịara chọpụta na ihe mere ndị mmadụ ji kpọọ ha asị bụ na ha bụ ezigbo Ndị Kraịst. A sị ka e kwuwe, Baịbụl kwuru na a ga-akpagbu ndị niile ji obi ha na-eme ihe Jizọs kwuru.—2 Timoti 3:12.

N’oge ahụ, ebe e kenyere m ịga na-arụ ọrụ bụ n’ọfịs ebe ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ na-arụ ọrụ. Otu ụbọchị, m hụrụ ụfọdụ katọn ndị dị n’ebe a na-akwasa ngwongwo. Ihe juru n’ime ha bụ Ụlọ Nche na Teta! * ochie. M weere Ụlọ Nche na Teta! ndị ahụ gaa n’ọnụ ụlọ mkpọrọ m ma bido ịgụ ha. Mgbe m malitere ịgụ ha, ahụ́ bịara dị m ka onye akpịrị kpọrọ nkụ nke e nyere mmiri jụrụ oyi, ya aṅụọ. Ebe ọ bụ na m na-enwe ezigbo ohere, m na-agụ Baịbụl ọtụtụ awa n’ụbọchị.

 Otu ụbọchị, ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara m bịa n’ọfịs ha. M chere na ha ga-asị m lawa. N’ihi ya, m weere ihe ole na ole m nwere, feere ndị mkpọrọ ibe m aka ma were ọsọ gawa n’ọfịs ahụ. Ma mgbe m ruru ebe ahụ, ha gwara m na m ga-anọkwu afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na o nwere akwụkwọ adịgboroja a chọpụtara na m nwere.

Ná mmalite, ihe a wutere m nke ukwuu. Ma ụbọchị ole na ole ihe a mechara, m bịara ghọtawa na ihe a merenụ badịịrị m uru. Ọ bụ eziokwu na mụ amụtala ọtụtụ ihe na Baịbụl, obi m ka dị ná ndụ ọjọọ ahụ m na-ebibu, m ka chọkwara ibido ebe m kwụsịrị ma m pụta n’ụlọ mkpọrọ. N’eziokwu, ịhapụcha ndụ ọjọọ ahụ ka ga-ewe m oge.

Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka ọ̀ bụ na Chineke agaghị ekwe ka m fewe ya. Ma m chebaara ihe e dere ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11 nakwa n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl echiche. Ebe ndị ahụ gosiri na ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge ochie bụ ndị ohi, ndị aṅụrụma, na ndị na-apụnara mmadụ ihe tupu ha ebido ife Jehova. Ma Jehova nyeere ha aka, ha agbanwee ndụ ha. M ji ha kasie onwe m obi.

O sirighị m ike ịkwụsị ụfọdụ ihe ọjọọ ndị m na-emebu. Dị ka ihe atụ, o sirighị m ike ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ike. Ma, o siiri m ezigbo ike ịkwụsị ịṅụ sịga. O were m ihe karịrị otu afọ tupu mụ akwụsị ya. Otu ihe nyeere m aka bụ na m na-echetara onwe m nsogbu ndị ịṅụ sịga na-akpatara mmadụ. Ma ihe kacha nyere m aka ịkwụsị ya bụ na m na-ekpegara Jehova ekpere mgbe niile ka o nyere m aka.

Mgbe mụ na Jehova bịara na-adịkwu ná mma, otú ahụ obi na-adị m ka m̀ bụ onye a jụrụ ajụ ji nwayọọ nwayọọ kwụsị. Ihe e kwuru n’Abụ Ọma 27:10 ruru m n’obi. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.” M bịara ghọta na enwetala m ezigbo Nna nke na-enweghị mgbe ọ ga-ahapụ m! Ndụ m enweela isi ugbu a. Ọnwa isii m pụtachara n’ụlọ mkpọrọ, ya bụ, n’Eprel afọ 2004, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA: M na-enwe obi ụtọ ugbu a. Ugbu a m kwụsịrịla ịṅụ sịga na ọgwụ ọjọọ, ahụ́ siri m ike karịa mgbe mbụ, obi rukwara m ala karịa mgbe ahụ. Alụọla m di, mụ na di m bikwa n’udo. Mụ na Nna m nke eluigwe, bụ́ Jehova, dịkwa n’ezigbo mma. E nwekwara ọtụtụ ndị m ji mere nne, nna, na ụmụnne n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. (Mak 10:29, 30) Obi dị m ụtọ na ha matara na m nwere ike ịgbanwe àgwà ọjọọ m tupu mụnwa achọpụta na m nwere ike ime otú ahụ.

Mgbe ụfọdụ, obi m na-ama m ikpe maka ihe ọjọọ ndị m mere n’oge gara aga. Ma ihe na-akasi m obi bụ na m maara na mgbe ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa ga-abịa, ihe ndị ahụ na-enye m nsogbu n’obi ma m cheta ha ‘agaghị abatakwa m n’obi.’ (Aịzaya 65:17) Ka ọ dị ugbu a, ụdị ndụ ahụ m biri emeela ka m na-emetara ndị na-ebi ụdị ndụ ahụ ebere. N’ihi ya, m nwere ike ikwu na ndụ ọjọọ ahụ m biri na-enyere m aka ugbu a. Dị ka ihe atụ, ọ na-abụ m kwusawa ozi ọma, ọ na-adịtụrụ m mfe izi ndị omempụ, ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ ma ọ bụ ndị na-aṅụ oké mmanya ozi ọma. Anaghị m agbara ha ọsọ. Obi siri m ike na ebe ọ bụ na m gbanwere àgwà ọjọọ m ma mewe ihe dị Jehova mma, o nweghị onye na-enweghị ike ịgbanwe àgwà ọjọọ nke ya!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 29 Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebipụta ha.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

“N’agbanyeghị na amaghị m nna m, Baịbụl akụzierela m otú m ga-esi zụọ ụmụ nwoke atọ m mụrụ”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

‘Enwetala m ezigbo Nna nke na-enweghị mgbe ọ ga-ahapụ m!’