Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

 Ị̀ Maara?

Ọ̀ bụ eziokwu na Ndị Kraịst si na Jeruselem gbapụ tupu e bibie ya n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst?

Jizọs maara na a ga-ebibi Jeruselem. N’ihi ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mgbe unu hụkwara Jeruselem ka ụsụụ ndị agha ndị mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso. Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya si na ya pụọ.” (Luk 21:20, 21) Ò nwere ihe gosiri na ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe ahụ Jizọs gwara ha?

Ihe dị ka afọ iri atọ Jizọs nwụrụ, otu ọchịagha ndị Rom aha ya bụ Sestiọs Galọs du ndị agha ya bịa na Jeruselem iji mee ka ndị Juu kwụsị inupụrụ ọchịchị Rom isi. Otu onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke aha ya bụ Josifọs kwuru na ihe a mere eme n’eziokwu. Josifọs nọ ndụ mgbe ihe a mere. Ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu, o yikwara ka ò doro ha anya na ha ga-emeri Jeruselem. Ma na mberede, Galọs nyere ndị agha ya iwu ka ha hapụ Jeruselem lawa. Otu ọkọ akụkụ ihe mere eme aha ya bụ Yusebiọs kwuru na Ndị Kraịst bi na Judia ji ohere a gbaga Pela. Pela bụ obodo bụ́ ugwu ugwu nke dị na Dikapọlis.

Mgbe afọ ole na ole gafere, ya bụ, n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst, ọchịagha ndị Rom ọzọ aha ya bụ Taịtọs kpọ ndị agha Rom bịaghachi Jeruselem ma gbaa ya gburugburu. N’ihi ya, ndị Juu tọrọ n’ime Jeruselem. Na nke ugbu a, ndị agha Rom ahụ mere ihe Galọs na-emeghị. Ha bibiri obobo ahụ, ọtụtụ narị puku ndị Juu nwụkwara.

Ole ndị bụ “ụmụ ndị amụma”?

Mgbe Baịbụl na-akọ banyere ndị amụma bụ́ Samuel, Ịlaịja, na Ịlaịsha, o kwuru banyere “ụmụ ndị amụma.” Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke chọrọ ka a họpụta Jihu ka ọ bụrụ eze Izrel, Ịlaịsha zigara “otu n’ime ụmụ ndị amụma” ka ọ gaa tee Jihu mmanụ.—2 Ndị Eze 9:1-4.

Ndị ọkà mmụta na-ekwu na okwu ahụ bụ́ “ụmụ ndị amụma” apụtaghị ndị ndị amụma mụrụ, kama ha bụ ndị bi n’otu ebe na-arụkọ ọrụ. Otu akwụkwọ aha ya bụ Journal of Biblical Literature kwuru na o nwere ike ịbụ na “ụmụ ndị amụma” bụ ndị “wepụtara onwe ha ijere Yahweh [Jehova] ozi, ma ha na-anọ n’okpuru ndị amụma, . . . bụ́ ndị ha ji mere nna.” (2 Ndị Eze 2:12) Mgbe Baịbụl na-akọ banyere otú e si tee Jihu mmanụ, ọ kpọrọ onye ahụ Ịlaịsha dunyere ka ọ gaa tee Jihu mmanụ onye “na-ejere onye amụma ozi.”—2 Ndị Eze 9:4.

Ọ dị ka “ụmụ ndị amụma” ahụ abaghị ọgaranaya. Baịbụl kwuru na “ụmụ ndị amụma” ndị nọ n’oge Ịlaịsha ji aka ha na-ewu ebe ha ga-ebi, ọ bụkwa anyụike ha natara anata ka ha ji na-egbutu osisi ha ji wuo ebe ha ga-ebi. (2 Ndị Eze 6:1-5) Ụfọdụ n’ime ha lụrụ nwaanyị. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na Baịbụl kọrọ banyere otu nwaanyị nke bụ́ otu n’ime ndị nwunye “ụmụ ndị amụma.” Ma, Baịbụl kwuru na di nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ. (2 Ndị Eze 4:1) O doro anya na ụmụ Izrel ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ejighị “ụmụ ndị amụma” gwurie egwu. Baịbụl kwudịrị na ụfọdụ ndị Izrel nyere ha ihe oriri.—2 Ndị Eze 4:38, 42.