Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọdịdị Na-agbanwe Agbanwe nke “Iso Ụzọ Kraịst”—Chineke Ọ̀ Na-anabata Ya?

Ọdịdị Na-agbanwe Agbanwe nke “Iso Ụzọ Kraịst”—Chineke Ọ̀ Na-anabata Ya?

 Ọdịdị Na-agbanwe Agbanwe nke “Iso Ụzọ Kraịst”—Chineke Ọ̀ Na-anabata Ya?

WERE ya na i nyere ọkà n’ise ihe ọrụ ise gị. Mgbe o sechara, o wee masị gị; ihe osise ahụ yiri gị nnọọ. I chee banyere ụmụ gị, ụmụ ụmụ gị, na ụmụ ụmụ ha ka ha ji oké nganga ekiri ihe osise ahụ.

Otú ọ dị, n’ọgbọ ndị bịara mgbe e mesịrị, otu n’ime ụmụ gị echee na agịrị isi nke ihe osise ahụ ejughị eju, n’ihi ya, o senyekwuo ya agịrị isi. Otú imi ya dị amasịghị onye nke ọzọ, n’ihi ya ọ gbanwee ya. “Mgbanwe” ndị ọzọ esochie ka ọgbọ ndị ọzọ na-apụta, nke na n’ikpeazụ ihe osise ahụ jizi obere ihe yie gị. Ọ bụrụ na ị maara na ihe a gaara eme, olee otú ọ ga-adị gị? Obi abụọ adịghị ya na iwe gaara ewe gị.

N’ụzọ dị mwute, akụkọ ihe osise ahụ yiri n’ụzọ bụ́ isi, akụkọ chọọchị nke ndị bụ́ ndị Kraịst n’ọnụ. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ozugbo ndị ozi Kraịst nwụsịrị, ihu e ji mara “Iso Ụzọ Kraịst” malitere ịgbanwe, dị nnọọ ka Bible buru n’amụma.—Matiu 13:24-30, 37-43; Ọrụ 20:30. *

N’ezie, o kwesịrị nnọọ ekwesị itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ọdịbendị na n’ọgbọ dị iche iche. Ọ bụ nnọọ ihe dị iche bụ́ ịgbanwe ozizi Bible iji kwekọọ n’echiche na-ewu ewu. Ma, nke ahụ bụ kpọmkwem ihe meworonụ. Dị ka ihe atụ, tụlee mgbanwe ndị e meworo n’ọtụtụ akụkụ dị mkpa.

Chọọchị na Ọchịchị Ejikọọ Aka

Jisọs kụziri na ọchịchị ya, ma ọ bụ Alaeze ya, bụ nke eluigwe, nke ga-ebibi ọchịchị nile nke mmadụ ma chịa elu ụwa nile mgbe oge ya ruru. (Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10) Ọ gaghị eji usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụmụ mmadụ chịa. “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a,” ka Jisọs sịrị. (Jọn 17:16; 18:36) N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ Jisọs, ọ bụ ezie na ha na-erube isi n’iwu, etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Otú ọ dị, n’oge Eze Ukwu Constantine nke Rom na narị afọ nke anọ, ọtụtụ ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst enweghịzi ndidi n’ichere nlọghachi Kraịst na nguzobe nke Alaeze Chineke. Nke nta nke nta, àgwà ha n’ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị gbanwere. “Tupu Constantine,” ka akwụkwọ bụ́ Europe—A History, na-ekwu, “ndị Kraịst enweghị ọchịchọ ịnọ n’ike [ọchịchị] dị ka ụzọ isi kwalite ihe ha kweere. Mgbe Constantine nwụsịrị, Iso Ụzọ Kraịst na oké ndọrọ ndọrọ ọchịchị gakọrọ ụkwụ na ụkwụ.” Iso Ụzọ Kraịst a gbanwegharịrị agbanwegharị ghọrọ okpukpe bụ́ isi “zuru ebe nile,” ma ọ bụ “katọlik,” nke Alaeze Ukwu Rom.

Akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ Great Ages of Man na-ekwu na n’ihi njikọ aka a nke Ọchịchị na Okpukpe, “ka ọ na-erule 385 A.D., bụ́ nanị afọ 80 mgbe usoro mkpagbu ikpeazụ kpụ ọkụ n’ọnụ megide ndị Kraịst gasịrị, Chọọchị  n’onwe ya malitere igbu ndị jụrụ okwukwe ha, ndị ụkọchukwu ya nwekwara ikike nke fọrọ nke nta ka ya na nke ndị eze ukwu hara nhata.” Ọgbọ ebe e ji mma agha na-eme ntọghata kama ịbụ ebe a na-eme ka mmadụ kwenye, ebe ndị ụkọchukwu nwere utu aha bụ́ ndị ikike na-agụ agụụ nọchikwara ndị nkwusa dị obi umeala nke narị afọ mbụ, si otú a malite. (Matiu 23:9, 10; 28:19, 20) Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ H. G. Wells dere banyere “oké ọdịiche dị n’etiti” Iso Ụzọ Kraịst nke narị afọ nke anọ “na ozizi nke Jisọs onye Nazaret.” “Oké ọdịiche” ndị a metụtara ọbụna ozizi ndị bụ́ isi banyere Chineke na Kraịst.

Ịgbanwegharị Chineke

Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya kụziri na nanị “otu Chineke dị, bụ́ Nna,” bụ́ onye aha aka ya, bụ́ Jehova na-eme ka ọ pụọ iche, pụtara ihe dị ka ugboro 7,000 n’ihe odide ndị mbụ nke Bible. (1 Ndị Kọrint 8:6; Abụ Ọma 83:18) Ọ bụ Chineke kere Jisọs; Jisọs bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ihe ọ bụla e kere eke,” ka Nsụgharị Bible Douay nke Katọlik na-ekwu ná Ndị Kọlọsi 1:15. N’ihi ya, dị ka onye e kere eke, Jisọs kwuru hoo haa, sị: “Nna m ka Mụ onwe m ukwuu.”—Jọn 14:28.

Ma ka ọ na-erule na narị afọ nke atọ, ndị ụkọchukwu ụfọdụ a ma ama, bụ́ ndị ozizi atọ n’ime otu nke onye Gris bụ́ ọkà ihe ọmụma na-ekpere arụsị bụ́ Plato masịrị, malitere ịgbanwegharị Chineke iji kwekọọ ná nkọwa Atọ n’Ime Otu. Na narị afọ ndị sochirinụ, n’ụzọ na-ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ, ozizi a buliri Jisọs elu ka ya na Jehova hara nhata ma kwuo na mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, bụ onye.

Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-ekwu banyere nnakwere chọọchị nakweere echiche Atọ n’Ime Otu, sị: “Ụkpụrụ okwukwe ahụ bụ́ ‘Ndị atọ n’otu Chineke’ abụghị nke e guzobere n’ụzọ siri ike, n’ezie ọ bụghị nke a nabatara nke ọma ná ndụ na ná nkwupụta nke okwukwe ndị Kraịst tupu ọgwụgwụ nke narị afọ nke anọ. Ma, ọ bụ n’ụkpụrụ okwukwe a kpọmkwem bụ ebe mbụ a hụrụ utu aha ahụ bụ́ ozizi Atọ n’Ime Otu. N’etiti Ndị Nna Chọọchị, ọ dịghị ihe ọ bụla yitetụdịrị ụdị echiche ma ọ bụ ụzọ ile ihe anya dị otú ahụ.”

N’otu aka ahụ, akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu, sị: “Ozizi Atọ n’Ime Otu nke narị afọ nke anọ egosipụtaghị nkụzi ndị Kraịst oge gboo banyere ọdịdị Chineke n’ụzọ ziri ezi; n’ụzọ megidere nke ahụ, ọ dị iche ná nkụzi nke a.” Akwụkwọ bụ́ The Oxford Companion to the Bible na-akpọ Atọ n’Ime Otu otu n’ime ọtụtụ “ụkpụrụ okwukwe ndị e nwetara mgbe e mesịrị.” Ma, ọ bụghị nanị Atọ n’Ime Otu bụ echiche ndị na-ekpere arụsị e webatara n’ime chọọchị.

Ịgbanwegharị Mkpụrụ Obi

E kweere n’ebe nile taa na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị eso anụ ahụ ha anwụ. Ma ị̀ maara na ozizi chọọchị a bụkwa nke a gbakwụnyere mgbe e mesịrị? Jisọs kwadoro eziokwu Bible ahụ bụ́ na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla,” na ha nọ n’ụra, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. (Eklisiastis 9:5; Jọn 11:11-13) A ga-eweghachi ndụ site ná mbilite n’ọnwụ—‘ibili ọtọ ọzọ’ site n’ụra ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, ọ bụrụ na ọ dị adị, agaghị enwe mkpa nke mbilite n’ọnwụ, ebe ọ bụ na anwụghị anwụ pụtara na ọnwụ agaghị adị.

Ọbụna Jisọs gosipụtara ịbụ eziokwu nke ozizi Bible nke mbilite n’ọnwụ site n’ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ. Were Lazarọs dị ka ihe atụ, bụ́ onye nwụrụ ruo ụbọchị anọ. Mgbe Jisọs kpọlitere ya n’ọnwụ, Lazarọs si n’ili pụta dị ka mmadụ dị ndụ nke na-eku ume. Ọ dịghị mkpụrụ obi ọ bụla na-adịghị anwụ anwụ nke si n’eluigwe banyeghachi n’ahụ Lazarọs mgbe o si n’ọnwụ teta. A sị na ọ dị, ọ gaghị abụworị ihe ọma ka Jisọs meere ya site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ!—Jọn 11:39, 43, 44.

Oleezinụ ebe nchepụta echiche nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ sitere? Akwụkwọ bụ́ The Westminster Dictionary of Christian Theology na-ekwu na nchepụta echiche ahụ “sitekarịrị na nkà ihe ọmụma ndị Gris karịa ná mkpughe nke Bible.” Akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia na-akọwa, sị: “Nkwenkwe bụ́ na mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe anụ  ahụ nwụsịrị bụ ịkọ nkọ nke nkà ihe ọmụma ma ọ bụ nke nkà mmụta okpukpe kama ịbụ okwukwe a na-agwagbughị agwagbu, ọ dịghịkwa ebe a kụziri ya n’ụzọ a kapịrị ọnụ n’Akwụkwọ Nsọ.”

Mgbe mgbe, otu ụgha na-eduga n’ọzọ, otú ahụ ka ọ dịkwa n’ozizi mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. O welitere echiche ndị na-ekpere arụsị bụ́ mmekpa ahụ ebighị ebi n’ime hel na-ere ọkụ. * Ma, Bible na-ekwu hoo haa na “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ”—ọ bụghị mmekpa ahụ ebighị ebi. (Ndị Rom 6:23) N’ihi ya, n’ịkọwa mbilite n’ọnwụ, King James Version na-ekwu, sị: “Oké osimiri hapụrụ ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya; ọnwụ na hel hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” N’otu aka ahụ, Bible Douay na-asị na “oké osimiri . . . na ọnwụ na hel hapụrụ ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” Ee, n’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ndị nọ na hel nwụrụ anwụ, ‘ha nọ n’ụra,’ dị ka Jisọs si kwuo.—Mkpughe 20:13.

Ì ji ezi obi kwere na ozizi nke ntaramahụhụ ebighị ebi n’ime hel na-adọta ndị mmadụ n’ebe Chineke nọ? Ọ dịghị ma ọlị. N’echiche ndị nwere obi eziokwu na nke ndị na-ahụ n’anya, ọ bụ echiche na-asọ oyi! N’aka nke ọzọ, Bible na-akụzi na “Chineke bụ ịhụnanya” nakwa na ọ kpọrọ ịrụsa ọbụna ụmụ anụmanụ arụrụala, asị.—1 Jọn 4:8; Ilu 12:10; Jeremaịa 7:31; Jona 4:11.

Ịgbanwe “Ihe Osise” ahụ n’Oge A

Mgbanwe a na-agbanwe Chineke na Iso Ụzọ Kraịst ka na-aga n’ihu taa. Na nso nso a otu prọfesọ nke okpukpe kọwara na esemokwu e nwere na chọọchị Protestant ya bụ “ma à ga-agbaso ikike nke Akwụkwọ Nsọ na ụkpụrụ okwukwe ka ọ̀ bụ ikike nke echiche ụmụ mmadụ bụ́ ndị dị nnọọ iche, nakwa ma chọọchị ọ̀ ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Kraịst dị ka onyenwenụ ka ọ̀ ga-anabata ma gbanwegharịa Iso Ụzọ Kraịst ikwekọ n’àgwà nke ọgbọ a nọ na ya. Ihe na-ese okwu bụ nke a: Ònye na-ekpebi ụzọ chọọchị ga-agbaso . . . Ọ̀ bụ Akwụkwọ Nsọ ka ọ̀ bụ echiche zuru ebe nile e nwere n’oge a?”

N’ụzọ dị mwute, “echiche zuru ebe nile n’oge a” ka na-emeri. Dị ka ihe atụ, ọ bụghị ihe nzuzo na ọtụtụ chọọchị agbanwewo ụzọ ha si ele ọtụtụ okwu anya iji yie ndị na-aga n’ihu na ndị nwere obi na-anabata ihe. Karịsịa n’okwu ndị metụtara omume, chọọchị dị iche iche na-emezi otú masịrị ha, dị ka e kwuru n’isiokwu mmeghe. Ma, Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na ịkwa iko, ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, na ndina ụdị onwe bụ mmehie ndị jọgburu onwe ha n’anya Chineke nakwa na ndị na-eme mmehie ndị dị otú ahụ “agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Matiu 5:27-32; Ndị Rom 1:26, 27.

Mgbe Pọl onyeozi dere okwu ndị ahụ e hotara n’elu, ógbè ndị Gris na Rom bụ́ ndị gbara ya gburugburu jupụtara n’ụdị nile nke ajọ omume. Pọl pụrụ icheworị, sị: ‘Ee, Chineke gbara Sọdọm na Gọmọra ọkụ n’ihi mmehie mmekọahụ ndị jọgburu onwe ha, ma nke ahụ bụ afọ 2,000 gara aga! N’ezie o metụtaghị oge a meperela anya.’ Otú ọ dị, o cheghị otú ahụ; ọ jụrụ ịgwagbu eziokwu Bible.—Ndị Galetia 5:19-23.

Legara “Ihe Osise” Mbụ ahụ Anya

N’ịgwa ndị ndú okpukpe ndị Juu nke oge ya okwu, Jisọs kwuru na ofufe ha bụ ‘n’efu n’ihi na ha na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.’ (Matiu 15:9) Ihe ndị ndú okpukpe ahụ mere n’ebe Iwu Jehova nyere site n’aka Mosis dị bụ kpọmkwem otu ihe ahụ ndị ụkọchukwu Krisendọm mere, ka na-emekwa, n’ebe ozizi Kraịst dị—ha ji “ágbá” ọdịnala wụọ eziokwu Chineke. Ma Jisọs hichapụrụ ụgha nile maka abamuru nke ndị nwere obi eziokwu. (Mak 7:7-13) Jisọs kwuru eziokwu, ma ọ̀ dị ndị mmadụ mma ná ntị ma ọ bụ na ọ dịghị ha. Ikike ya bụ okwu Chineke mgbe nile.—Jọn 17:17.

Lee otú Jisọs si dị iche n’ebe ihe ka ọtụtụ n’ime ndị sịrị na ha bụ́ ndị Kraịst nọ! N’ezie, Bible buru n’amụma, sị: “Ndị mmadụ ga-enwe ọchịchọ ịnụ ihe ọhụrụ, kpọtakwara onwe ha  . . . ndị nkụzi dị ka agụụ nke aka ha si dị; mgbe ahụkwa, kama ịṅa ntị n’eziokwu ahụ, ha ga-aṅa ntị n’akụkọ ifo.” (2 Timoti 4:3, 4, The Jerusalem Bible) “Akụkọ ifo” ndị a, bụ́ ndị anyị tụleworo ole na ole n’ime ha, na-emerụ ahụ n’ụzọ ime mmụọ, ebe eziokwu nke Okwu Chineke na-ewuli elu, ọ na-edugakwa ná ndụ ebighị ebi. Ọ bụ eziokwu a ka Ndịàmà Jehova na-agba gị ume inyocha.—Jọn 4:24; 8:32; 17:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Dị ka Jisọs kpughere n’ilu ọka na ata nakwa n’ihe atụ ya nke ụzọ ahụ dị obosara na nke dị warara (Matiu 7:13, 14), mmadụ ole na ole ga-anọgide na-agbaso ezi Iso Ụzọ Kraịst ruo ọgbọ nile. Otú ọ dị, ndị ka ọtụtụ bụ́ ndị yiri ata, bụ́ ndị ga-akwalite onwe ha na ozizi ha dị ka ihu ziri ezi nke Iso Ụzọ Kraịst, ga-ekpuchi ha. Ọ bụ ihu a ka isiokwu anyị na-ezo aka na ya.

^ par. 19 “Hel” bụ nsụgharị nke okwu Hibru bụ́ Sheol na okwu Grik bụ́ Hedis, ha abụọ pụtara nnọọ “ili.” Ya mere, ka ndị nsụgharị Bekee nke King James Version sụgharịrị Sheol ugboro 31 dị ka “hel,” ha sụgharịkwara ya ugboro 31 dị ka “ili” na ugboro 3 dị ka “olulu,” si otú ahụ na-egosi na okwu ndị a pụtara otu ihe n’ụzọ bụ́ isi.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Mmalite nke Aha ahụ Bụ́ Onye Kraịst

Ruo ma ọ dịkarịa ala afọ iri mgbe Jisọs nwụsịrị, a maara ụmụazụ ya dị ka ndị na-agbaso ‘Ụzọ a.’ (Ọrụ 9:2; 19:9, 23; 22:4) N’ihi gịnị? N’ihi na ụzọ ndụ ha dabeere n’okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ, onye bụ́ “ụzọ, na eziokwu, na ndụ.” (Jọn 14:6) E mesịa, n’otu oge mgbe 44 O.A. gasịrị, na Siria Antiọk, ‘a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jisọs ndị Kraịst.’ (Ọrụ 11:26) A nabatara aha a ngwa ngwa, ọbụna n’etiti ndị ọchịchị. (Ọrụ 26:28) Aha ọhụrụ ahụ agbanweghị ụzọ ndụ ndị Kraịst, bụ́ nke a nọgidere na-eme ka o yie nke Kraịst.—1 Pita 2:21.

[Foto dị na peeji nke 7]

Site n’ozi ihu ọha ha, Ndịàmà Jehova na-eduzi ndị mmadụ gaa n’Okwu Chineke, bụ́ Bible

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]

Nke atọ site n’aka ekpe: Òtù UN/Foto nke Saw Lwin sere