Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmata Chineke nke Na-ahụ n’Anya

Ịmata Chineke nke Na-ahụ n’Anya

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ịmata Chineke nke Na-ahụ n’Anya

MGBE ọ dị afọ 16, onye Brazil aha ya bụ Antônio enweelarị nkụda mmụọ ná ndụ. Inwe mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe dugara ya n’iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nakwa n’aṅụrụma. Ugboro ugboro, o chere banyere igbu onwe ya. Ọ bụ n’oge a ka o chetara ihe nne ya gwaworo ya: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ma olee ebe Chineke a na-ahụ n’anya nọ?

Ná mgbalị inwere onwe ya pụọ n’iji ihe na-eri ahụ eme ihe, Antônio chọrọ enyemaka n’aka onye ụkọchukwu parish dị n’ógbè ahụ. N’agbanyeghị na Antônio ghọrọ onye na-anụ ọkụ n’obi na Chọọchị Katọlik, ọ ka nwere ọtụtụ ajụjụ. Dị ka ihe atụ, okwu Jisọs ndị bụ́, “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu” gbagwojuru ya anya. (Jọn 8:32) Ụdị ịpụ n’ohu dị aṅaa ka Jisọs kwere ná nkwa? Chọọchị ahụ apụghị inye azịza ọ bụla na-eju afọ nye ajụjụ ndị ọ jụrụ. N’ikpeazụ, Antônio kpafuru ma laghachi n’àgwà ochie ya. N’ezie, ọgwụ riri ya ahụ n’ụzọ ka njọ.

N’ihe dị ka n’otu oge ahụ, nwunye Antônio, bụ́ Maria, malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ọ bụ ezie na Antônio adịghị emegide ọmụmụ ihe ya, o weere Ndịàmà dị ka “okpukpe ndị America nke na-eje ozi maka ọdịmma nke mgbasa America na-agbasa ike ọchịchị ya ná mba ndị ọzọ.”

N’ịbụ onye a na-akụdaghị mmụọ, Maria hapụrụ magazin Ụlọ Nche na Teta! ụfọdụ bụ́ ndị nwere isiokwu ndị o chere nwere ike ịmasị Antônio, n’ebe dị iche iche n’ụlọ ha. Ebe ọ bụ na Antônio na-enwe mmasị ịgụ ihe, ọ na-agụtụ magazin ndị ahụ mgbe ụfọdụ nwunye ya na-anọghị ya. Na nke mbụ ya ná ndụ ya, ọ chọtara azịza nye ajụjụ ya ndị dabeere na Bible. “Amalitekwara m ịhụ ịhụnanya na obiọma ndị nwunye m na Ndịàmà na-egosi m,” ka ọ na-echeta.

Ka ọ na-erule n’etiti 1992, Antônio kpebiri na ya onwe ya kwa ga-enwe mmasị isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Otú ọ dị, ọ nọgidere na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na-aṅụkwa oké mmanya. N’ime ime otu abalị, ka ya na enyi ya si n’otu ime obodo na-alọta, ndị uwe ojii kwụsịrị ha. Mgbe ndị uwe ojii ahụ hụrụ cocaine n’ahụ Antônio, ha malitere ịkụ ya ihe. Otu onye uwe ojii kụturu ya n’apịtị ma tụdo ya egbe n’ihu. “Gbuo ya!” ka onye uwe ojii nke ọzọ tipụrụ.

Ka Antônio tọgbọ n’apịtị ahụ, o chetara ndụ ya. Nanị ezi ihe ndị ọ pụrụ icheta bụ ezinụlọ ya na Jehova. O kpere ekpere dị mkpirikpi, na-arịọ maka enyemaka Jehova. N’enweghị ihe ọ bụla doro anya kpatara ya, ndị uwe ojii ahụ hapụrụ ya. Ọ lara n’ebe obibi ya, na-ekwenyesi ike na Jehova echebewo ya.

Antônio ji ịdị uchu e mere ka ọ dị ọhụrụ malite ịmụ Bible. Nke nta nke nta, o mere mgbanwe iji na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ. (Ndị Efesọs 4:22-24) Site n’ịzụlite njide onwe onye, ọ malitere ime ihe banyere nsogbu ọgwụ ọjọọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, enyemaka ndị dọkịta dị ya mkpa. Ọnwa abụọ ọ nọrọ n’ụlọ ahụ ike na-akpụzigharị uche nyere ya ohere ịgụ mbipụta dị iche iche dabeere na Bible, gụnyere akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Antônio sozi ndị ọrịa ndị ọzọ kerịta ihe ọ mụtara n’akwụkwọ ndị a.

Mgbe Antônio hapụsịrị ụlọ ahụ ike ahụ, ọ nọgidere na-eso Ndịàmà amụ Bible. Taa, Antônio, Maria, ụmụ ha ndị inyom abụọ, na nne Antônio na-ejekọrọ Jehova ozi ọnụ dị ka otu ezinụlọ nwere obi ụtọ na nke dị n’otu. Antônio na-ekwu, sị: “Ugbu a ka m ghọtara ihe okwu ndị bụ́ ‘Chineke bụ ịhụnanya’ pụtara n’ezie.”

[Foto dị na peeji nke 8]

Ime nkwusa na Rio de Janeiro