Ozi Ọma Matiu Dere 15:1-39

  • Jizọs kwuru ihe dị njọ n’ọdịnala ndị Juu (1-9)

  • Ọ bụ ihe na-esi n’obi apụta na-emerụ mmadụ (10-20)

  • Nwaanyị Finishia nwere ezigbo okwukwe (21-28)

  • Jizọs gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa na ndị nwere nkwarụ (29-31)

  • Jizọs nyere puku ụmụ nwoke anọ nri (32-39)

15  Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ+ wee si Jeruselem bịakwute Jizọs, sị ya:  “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị ji emebi ọdịnala ndị oge gboo? Dị ka ihe atụ, ha anaghị akwọ aka* mgbe ha chọrọ iri nri.”+  Ọ sịrị ha: “Gịnị mere ununwa ji emebi iwu Chineke n’ihi ọdịnala unu?+  Dị ka ihe atụ, Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị.’+ Ọ sịkwara, ‘A ga-egbu onye kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi.’*+  Ma unu na-asị, ‘Onye ọ bụla nke na-asị nne ya ma ọ bụ nna ya: “Ihe ọ bụla m nwere nke m gaara eji nyere gị aka bụ onyinye m kwere Chineke ná nkwa,”+  iwu ejighịzi ya inyere nna ya aka.’ Unu ejirila ọdịnala unu mee ka okwu Chineke bụrụ ihe efu.+  Unu ndị ihu abụọ, ihe Aịzaya buru n’amụma banyere unu dabara adaba. Ọ sịrị:+  ‘Ndị a na-asị na ha na-asọpụrụ m, ma obi ha adịghị n’ebe m nọ.  Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m, n’ihi na ihe ha na-akụzi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.’”+ 10  Ọ gwaziri ìgwè mmadụ ahụ ka ha bịa nso. Mgbe ha bịara, ya asị ha: “Geenụ ntị ma ghọta ihe okwu a pụtara:+ 11  Ọ bụghị ihe na-abanye n’ọnụ mmadụ na-emerụ ya, kama ọ bụ ihe na-esi n’ọnụ mmadụ apụta na-emerụ ya.”+ 12  Ndị na-eso ụzọ ya bịara wee sị ya: “Ị̀ ma na iwe were ndị Farisii mgbe ha nụrụ ihe ahụ i kwuru?”+ 13  Ọ gwara ha, sị: “A ga-efopụ ihe ọ bụla Nna m nke eluigwe na-akụghị. 14  Hapụnụ ha. Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ọ bụrụkwa na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”+ 15  Pita asị ya: “Mee ka ihe atụ a doo anyị anya.” 16  O wee sị: “Ọ̀ bụ na ununwa kwa aghọtaghị?+ 17  Ọ̀ bụ na unu amaghị na ihe ọ bụla nke na-abanye n’ọnụ na-agafe banye n’afọ, e mechaa, a nyụpụ ya? 18  Ma, ihe ọ bụla si n’ọnụ pụta si n’obi, ọ bụkwa ihe ndị ahụ na-emerụ mmadụ.+ 19  Dị ka ihe atụ, echiche ọjọọ nke na-akpata igbu mmadụ,* ịkwa iko,* izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, na-esicha n’obi apụta.+ 20  Ọ bụ ihe ndị a na-emerụ mmadụ, ma iji aka a na-akwọghị akwọ* eri nri anaghị emerụ mmadụ.” 21  Mgbe Jizọs si ebe ahụ pụọ, ọ gawara Taya na Saịdọn.+ 22  Ma, otu nwaanyị Finishia nke si n’ógbè ahụ bịakwutere ya wee tie mkpu, sị: “Meere m ebere, Onyenwe anyị, Nwa Devid. Mmụọ ọjọọ ji nwa m nwaanyị aka ọjọọ.”+ 23  Ma ọ tụpụrụghị nwaanyị ahụ ọnụ. N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara malite ịgwa ya, sị: “Sị ya lawa, n’ihi na ọ na-ebe ákwá na-esogharị anyị.” 24  O wee, sị: “E zitere m maka atụrụ furu efu, bụ́ mba Izrel, ọ bụghị maka ndị ọ bụla ọzọ.”+ 25  Ma nwaanyị ahụ bịara, kpọọrọ ya isiala, sị: “Onyenwe anyị, nyere m aka.” 26  Ya asị ya: “E kwesịghị iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.” 27  O wee sị: “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị. Ma, ụmụ nkịta na-eri iberibe ihe si na tebụl nna ha ukwu na-adapụsị.”+ 28  Jizọs gwaziri ya, sị: “Nwaanyị, i nwere ezigbo okwukwe. Ka e meere gị ihe ị rịọrọ.” E wee gwọọ nwa ya nwaanyị n’oge ahụ. 29  Mgbe Jizọs si ebe ahụ pụọ, ọ gara ebe dị nso n’Oké Osimiri Galili.+ Mgbe ọ gbagoro n’elu ugwu, ọ nọdụrụ ala n’ebe ahụ. 30  Oké ìgwè mmadụ wee kpọta ndị ngwọrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, ndị ogbi, na ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ndị ọzọ, tọgbọ ha n’ụkwụ ya, o wee gwọọ ha.+ 31  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu na ndị ngwọrọ ka ha na-eje ije na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ nakwa ka ahụ́ dị ndị nwere nkwarụ mma, o juru ha anya, ha wee too Chineke Izrel.+ 32  Ma Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya. O wee sị: “Ana m emetere ìgwè mmadụ a ebere+ n’ihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri. Achọghịkwa m ka ha buru ọnụ lawa. Ha nwere ike ịtụbọ n’ụzọ.”+ 33  Ma, ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “N’ebe a ndị mmadụ na-anaghị anọkarị, ebee ka anyị ga-enweta achịcha ga-eju ìgwè mmadụ há otú a afọ?”+ 34  Jizọs wee sị ha: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya: “Asaa, na obere azụ̀ ole na ole.” 35  N’ihi ya, mgbe ọ gwachara ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala, 36  o buuru ogbe achịcha asaa ahụ na azụ̀ ndị ahụ. Mgbe o kelechara Chineke, ọ nyawara ha wee malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya enyezie ha ìgwè mmadụ ahụ.+ 37  Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nkata asaa.+ 38  Ndị riri ya dị puku ụmụ nwoke anọ (4,000), ma e wezụga ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị. 39  N’ikpeazụ, mgbe ọ sịrị ìgwè mmadụ ahụ lawa, ọ banyere n’ụgbọ mmiri wee bata Magadan.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ịkwọ aka otú ọdịnala ndị Juu si kwuo.
Ma ọ bụ “onye kparịrị nne ya ma ọ bụ nna ya.”
Ma ọ bụ “igbu ọchụ.”
Grik, por·nei′a. Di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko sokwa na ya. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, akwọghị aka otú ọdịnala ndị Juu si kwuo.