Ilu 12:1-28
12 Onye ji aka ná ntị a na-adọ ya kpọrọ ihe ji ihe ọ na-amụta kpọrọ ihe,+Ma onye na-ejighị mba a na-abara ya kpọrọ ihe enweghị uche.+
2 Ihe ezigbo mmadụ na-eme na-eme Jehova obi ụtọ,Ma ọ na-ama onye na-akpa nkata ọjọọ ikpe.+
3 Mmadụ ime ihe ọjọọ enweghị ike ime ka ihe gaziere ya+Ma onye ezi omume ga-adị ka osisi a na-enweghị ike ifopụ efopụ.
4 Ezigbo nwaanyị bụ okpueze di ya,+Ma nwaanyị nke na-emechu di ya ihu dị ka ọrịa nke na-eme ka ọkpụkpụ di ya rewe ure.+
5 Ndị ezi omume na-eche ihe dị mma n’echiche,Ma ndị ajọ omume na-aghọgbu ndị ha na-edu.
6 Ihe ndị ajọ omume na-ekwu dị ka isiri mmadụ ọnyà ọjọọ,*+Ma ihe ndị ezi omume na-ekwu na-anapụta mmadụ.+
7 E bibie ndị ajọ omume, ha anaghịzi anọ,Ma ụlọ ndị ezi omume ga na-adị mgbe niile.+
8 A na-aja mmadụ mma maka na ihe ọ na-ekwu na-egosi na ọ ma ihe,+Ma a ga-emechu onye aghụghọ* ihu.+
9 Ọ ka mma na e jighị mmadụ kpọrọ ihe ma ya enwee onye na-ejere ya ozi,Kama mmadụ ịna-etu ọnụ ma ya abụrụ na o nweghị nri* ọ bụla.+
10 Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,+Ma onye ajọ omume na-eche na ya na-eme ebere, ma n’eziokwu, obi tara ya mmiri.
11 Onye na-akọ ubi ya ga-eriju nri afọ,+Ma onye na-achụ ihe na-abaghị uru enweghị uche.
12 Onye ajọ omume na-enwere ndị ọjọọ ibe ya anyaụfụ maka ihe ha nwetara,Ma ndị ezi omume dị ka osisi na-amị mkpụrụ nke gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ala.
13 Ihe ọjọọ onye ajọ omume na-ekwu na-eme ka ọ ma n’ọnyà,+Ma onye ezi omume na-esi ná nsogbu apụta.
14 Ihe mmadụ na-ekwu na-eme ka ihe gaara ya nke ọma,+Ihe o jikwa aka ya eme ga-abara ya uru.
15 Ihe onye nzuzu na-eme dị mma n’anya ya,+Ma onye ma ihe na-anabata ndụmọdụ.+
16 Onye nzuzu na-egosi ozugbo* na iwe ji ya,+Ma onye ma ihe na-eleghara mkparị anya.*
17 Onye akaebe a tụkwasịrị obi ga-ekwu eziokwu,Ma ihe juru onye akaebe ụgha ọnụ bụ ụgha.*
18 Okwu mmadụ kwuru n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ,Ma okwu ndị ma ihe* na-agwọ mmadụ.+
19 Onye na-ekwu eziokwu ga-anọru mgbe ebighị ebi,+Ma onye na-agha ụgha ga-anọ naanị obere oge.+
20 Ihe dị n’obi ndị na-akpa nkata ọjọọ bụ aghụghọ,Ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.+
21 E nweghị ihe ọjọọ ga-eme onye ezi omume,+Ma ọdachi ga-ezu ndị ajọ omume ahụ́.+
22 Jehova kpọrọ ndị na-agha ụgha asị,+Ma ndị na-eme ihe dị mma na-eme ya obi ụtọ.
23 Onye ma ihe anaghị ekwu ihe niile ọ ma.
Ma ihe onye nzuzu na-ekwu na-egosi na ọ dị nzuzu.+
24 Ndị na-arụsi ọrụ ike ga na-achị,+Ma a ga-amanye ndị umengwụ ka ha gbawa ohu.+
25 Nchegbu na-eme ka ike gwụ mmadụ,+Ma okwu ọma na-eme ka obi dị ya ụtọ.+
26 Onye ezi omume na-achọta ebe anụ ya ga-ata ahịhịa,Ma ụzọ ndị ajọ omume na-eso na-edufu ha.
27 Ndị umengwụ anaghị achụ nta anụ ha ga-eri,+Ma ịrụsi ọrụ ike dị ka akụ̀ bara ezigbo uru mmadụ nwere.
28 Ụzọ ezi omume na-eduga mmadụ ná ndụ.+
Ụzọ ya enweghị ike iduga mmadụ n’ọnwụ.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “dị ka onye chechiri mmadụ ka o gbuo ya.”
^ Ma ọ bụ “onye obi ya gbagọrọ agbagọ.”
^ Na Hibru, “achịcha.”
^ Ma ọ bụ “n’otu ụbọchị ahụ.”
^ Na Hibru, “na-ekpuchi mkparị.”
^ Ma ọ bụ “aghụghọ.”
^ Na Hibru, “ire ndị ma ihe.”