Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Nnyere M Aka Ịkwụsị Ime Ihere

E Nnyere M Aka Ịkwụsị Ime Ihere

Akụkọ Ndụ

E Nnyere M Aka Ịkwụsị Ime Ihere

DỊ KA RUTH L. ULRICH SI KỌỌ

Apụghị m ijide onwe m, m wee bee ákwá kpọmkwem n’ọnụ ụzọ onye ụkọchukwu ahụ. Ọ ka bosịrị nnọọ Charles T. Russell, bụ́ onye jere ozi dị ka onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society, ọtụtụ ebubo ụgha. Ka m kọwaa otú mụ onwe m, bụ́ nwata nwanyị, si na-akpọtụrụ ndị mmadụ otú ahụ.

A MỤRỤ m n’ezinụlọ ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu nke bi n’otu ugbo dị na Nebraska, U.S.A., na 1910. Ezinụlọ anyị na-agụkọ Bible ọnụ kwa ụtụtụ na anyasị mgbe anyị risịrị nri. Nna m bụ onye nlekọta Sunday school nke chọọchị Metọdist dị n’obodo nta bụ́ Winside, ihe dị ka kilomita isii site n’ugbo anyị. Anyị nwere otu ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ bụ́ nke nwere ákwà mgbochi na windo ya nile, nke na n’agbanyeghị otú ihu igwe si dị, anyị pụrụ ịga chọọchị n’ụtụtụ Sunday.

Mgbe m gbara ihe dị ka afọ asatọ, nwanne m nwoke nke obere dara ọrịa polio, nne m kpọkwaara ya gaa n’otu ụlọ ọgwụ dị na Iowa maka ọgwụgwọ. N’agbanyeghị nlekọta nne m ji obi ya nile nye ya, nwanne m nwoke nwụrụ mgbe ha nọ n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ka ọ dịgodị, na Iowa ebe ahụ, nne m zutere otu Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Ha kwurịtara ọtụtụ ihe, ọbụna nne m so nwanyị ahụ gaa nzukọ ụfọdụ nke Ndị Mmụta Bible.

Nne m ji mpịakọta dị iche iche nke Studies in the Scriptures, nke Watch Tower Society bipụtara, lọta n’ebe obibi anyị. N’oge na-adịghị anya, o kwenyere na Ndị Mmụta Bible ahụ na-akụzi eziokwu nakwa na ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na nke imekpa ndị ajọ omume ahụ ruo mgbe ebighị ebi, abụghị eziokwu.—Jenesis 2:7; Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4.

Otú ọ dị, iwe were nna m nke ukwuu, o megidekwara mgbalị ndị nne m mere iji gaa nzukọ nke Ndị Mmụta Bible. Ọ nọgidere na-akpọrọ mụ na nwanne m nwoke nke tọrọ m, bụ́ Clarence, na-aga chọọchị. Ma mgbe nna m na-anọghị n’ụlọ, nne m na-amụrụ anyị Bible. N’ihi ya, anyị bụ́ ụmụaka nwere ezi ohere iji ozizi Ndị Mmụta Bible tụnyere ndị nke chọọchị anyị.

Mụ na Clarence na-agachi Sunday school anya na chọọchị, Clarence na-ajụkwa onye nkụzi Sunday school ajụjụ ndị ọ na-apụghị ịza. Mgbe anyị lara n’ụlọ, anyị na-agwa nne anyị, nke a na-edugakwa ná nkwurịta okwu ndị dị ogologo n’isiokwu ndị a. N’ikpeazụ, akwụsịrị m ịga chọọchị ahụ ma malite iso nne m na-aga nzukọ nke Ndị Mmụta Bible, n’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, Clarence mekwara otu ihe ahụ.

Ịnagide Ime Ihere

Na September 1922, mụ na nne m gara mgbakọ ahụ kwesịrị ncheta nke Ndị Mmụta Bible na Cedar Point, Ohio. M ka pụrụ ịhụ ka nnukwu ákwà ahụ na-emeghe ka Joseph F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche Watch Tower Society n’oge ahụ, na-agba ihe karịrị mmadụ 18,000 bịaranụ ume n’okwu ndị e dere n’ákwà ahụ: “Kpọsaanụ Eze ahụ na Alaeze ya.” Enwere m mkpali miri emi, nweekwa mmetụta banyere ịdị ngwa nke ịgwa ndị ọzọ banyere ozi ọma Alaeze Chineke.—Matiu 6:9, 10; 24:14.

Ná mgbakọ ndị e nwere site na 1922 ruo 1928, a nakweere ọtụtụ mkpebi, e debakwara ha n’ime traktị ndị Ndị Mmụta Bible kesaara ndị mmadụ gburugburu ụwa, ọtụtụ iri nde n’ime ha. Adị m gịrịgịrị ma too ogologo—ha na-akpọ m nkịta greyhound—ana m agakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ekesa ozi ndị a e biri ebi. Anụrụ m ụtọ ọrụ a n’ezie. Ma, ikwu okwu n’ọnụ ụzọ, ịgwa ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke n’onwe m, bụ okwu ọzọ.

Leenụ, ana m eme nnọọ ihere nke na ọbụna ana m atụ oké egwu mgbe nne m na-akpọ ìgwè buru ibu nke ndị ikwu anyị òkù kwa afọ. Ana m abakpu n’ọnụ ụlọ ihi ụra m ma nọrọ n’ebe ahụ. N’otu oge, nne m chọrọ ka ezinụlọ anyị dum see foto, ọ gwakwara m ka m pụta. N’achọghị isonyere ha, etiri m mkpu ka ọ na-adọkpụpụta m n’ime ụlọ m.

Otú ọ dị, otu ụbọchị, ejisiri m nnọọ ike tinye akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Bible n’akpa. Ugboro ugboro, ekwuru m sị, “Apụghị m ime ya,” ma n’oge nke ọzọ agwara m onwe m, sị, “aghaghị m ime ya.” N’ikpeazụ, agara m mee nkwusa. Mgbe nke ahụ gasịrị, enwere m nnọọ obi ụtọ na m nwere obi ike ịga. Ọṅụ m kasịnụ bụ na arụchara m ọrụ ahụ ọ bụghị n’ịrụ ya arụ n’ezie. Ọ bụ n’ihe dị ka n’oge ahụ ka m zutere onye ụkọchukwu ahụ m kpọtụrụ aha na mbụ ma si n’ebe ahụ bere ákwá pụọ. Ka oge na-aga, site n’enyemaka Jehova, enwere m ike ịgwa ndị mmadụ okwu n’ọnụ ụzọ ha, ọṅụ m rịkwara elu. E mesịa, na 1925, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri.

Ịmalite Ozi Oge Nile

Mgbe m gbara afọ 18, eji m ego m ketara site n’aka nwanne nne m nke nwanyị zụọ ụgbọala ma malite ịsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ozi oge nile. Afọ abụọ mgbe e mesịrị, na 1930, mụ na onye mụ na ya na-asụkọ ụzọ nakweere ebe e kenyere anyị ịga mee nkwusa. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, Clarence amalitewokwa ịsụ ụzọ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọ nakweere ọkpụkpọ òkù ije ozi na Betel, isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York.

N’ihe dị ka n’oge ahụ, nne na nna anyị kewara, ya mere mụ na nne m rụrụ otu ụlọ ụgbọala na-adọkpụ ma malite ịsụkọ ụzọ ọnụ. Ọ bụ n’oge ahụ ka e nwere Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba na United States. Ịnọgide n’ọrụ ịsụ ụzọ ghọrọ nnọọ ihe ịma aka, ma anyị kpebisiri ike na anyị agaghị akwụsị. Anyị ji akwụkwọ ndị e ji amụ Bible na-agbanwere ọkụkọ, àkwá, na ihe ndị a na-enweta n’ubi, nakwa ihe ndị dị ka batịrị ochie na aluminum a tụfuru atụfu. Anyị na-ere batịrị ochie na aluminum ndị a iji zụta mmanụ ụgbọala maka ụgbọala anyị na iji hụ maka mmefu ndị ọzọ. Amụtakwara m ịtụ ụgbọala ahụ mmanụ na ịgbanwe mmanụ ya iji belata mmefu. Anyị hụrụ ka Jehova, n’ikwekọ ná nkwa ya, na-emeghe ụzọ inyere anyị aka imeri ihe mgbochi.—Matiu 6:33.

Agaa M Ebe Ndị E Kenyere M Ozi Ala Ọzọ

Na 1946, akpọrọ m ịga klas nke asaa nke Watchtower Bible School of Gilead, nke dị na South Lansing, New York. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, mụ na nne m asụkọwo ụzọ ọnụ ruo ihe karịrị afọ 15, ma ọ chọghị igbochi ohere m nwere inweta ọzụzụ maka ọrụ ozi ala ọzọ. Ya mere ọ gbara m ume ịnakwere ihe ùgwù ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ, mụ na Martha Hess bụ́ onye si Peoria, Illinois, ghọrọ ndị na-asụkọ ụzọ ọnụ. E kenyere anyị na mmadụ abụọ ọzọ ọrụ na Cleveland, Ohio, ruo otu afọ ka anyị na-echere maka ebe a ga-ekenye anyị ọrụ n’ofesi.

E kenyere anyị ọrụ ahụ na 1947. E kenyere mụ na Martha ọrụ na Hawaii. Ebe ọ dị mfe ịbanye n’àgwàetiti ndị a, nne m bịara bidewe anyị nso n’obodo Honolulu. Ahụ ike ya nọ na-adịwanye njọ, ya mere, anọ m na-enyere nne m aka ma na-arụkwa ọrụ ozi ala ọzọ m. Elekọtara m ya ruo mgbe ọ nwụrụ na Hawaii na 1956, mgbe ọ dị afọ 77. Mgbe anyị bịaruru Hawaii, e nwere ihe dị ka Ndịàmà 130 nọ n’ebe ahụ, ma ka ọ na-erule oge nne m nwụrụ, e nwere ihe karịrị otu puku Ndịàmà, ndị ozi ala ọzọ adịghịzikwa mkpa.

E mesịa, mụ na Martha nwetara akwụkwọ ozi si n’aka Watch Tower Society bụ́ nke nyere anyị ọrụ na Japan. Nchegbu mbụ anyị bụ ma ànyị pụrụ ịmụta asụsụ Japanese n’afọ ndụ anyị. Adị m afọ 48 n’oge ahụ, ejikwa m nanị afọ anọ tọọ Martha. Ma anyị hapụrụ okwu ahụ n’aka Jehova ma nakwere ọrụ ahụ.

Ozugbo mgbakọ mba nile ahụ e nwere na 1958 n’Ámá Egwuregwu Yankee na Polo Grounds nke New York City gasịrị, anyị ji ụgbọ mmiri gaa Tokyo. Oké ifufe fere anyị ka anyị na-erute ọdụ ụgbọ mmiri dị na Yokohama, bụ́ ebe anyị zutere Don na Mabel Haslett, Lloyd na Melba Barry, na ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ. N’oge ahụ, e nwere nanị Ndịàmà 1,124 na Japan.

Anyị malitere ịmụ asụsụ Japanese ozugbo na ikere òkè n’ozi site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. N’iji mkpụrụ okwu Bekee eme ihe, anyị depụtara ihe ndị anyị ga-ekwu na Japanese, bụ́ ndị anyị ga-agụ agụ. Ná nzaghachi, ndị nwe ụlọ ga-ekwu, sị, “Yoroshii desu” ma ọ bụ, “Kekko desu,” bụ́ nke anyị nụrụ na ọ pụtara, “Ọ dị mma.” Ma ọ bụghị mgbe nile ka anyị na-ama ma onye nwe ụlọ ò nwere mmasị ma ọ bụ na o nweghị, ebe ọ bụ na a na-ejikwa okwu ndị ahụ eme ihe n’ịgosipụta ọjụjụ. Ihe ọ pụtara na-adabere n’ụda olu e ji kwuo ya ma ọ bụ n’ọdịdị ihu nke onye ahụ. O were anyị oge ịmụta ịkọwa ha.

Ahụmahụ Ndị Mere M Obi Ụtọ

Ka mụ na asụsụ ahụ ka na-alụ, agara m n’otu ebe obibi ndị ọrụ Ụlọ Ọrụ Mitsubishi otu ụbọchị ma hụ otu nwa agbọghọ dị afọ 20. O nwere ezi ọganihu n’ihe ọmụma Bible, e mekwara ya baptism na 1966. Otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, ọ malitere ịsụ ụzọ, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, a họpụtara ya dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche kemgbe ahụ. Ọ bụ ihe na-akpali akpali mgbe nile nye m ịhụ otú o siworo jiri oge na ume ọrụ ya mee ihe n’ozi oge nile site n’oge ọ bụ nwa agbọghọbịa gawa.

Ịkwụrụ maka eziokwu Bible bụ ihe ịma aka dị ukwuu karịsịa nye ndị bi n’ógbè na-abụghị nke ndị Kraịst. Ma, ọtụtụ puku mmadụ anagidewo ihe ịma aka a, gụnyere ọtụtụ ndị m mụụrụ Bible. Ha ekpofuwo ọlta ndị Buddha na shelf ndị Shinto ha ndị dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị a na-ahụkarị n’ebe obibi ndị Japan. Ebe ọ bụ na mgbe ụfọdụ ndị ikwu na-aghọtahie omume ndị dị otú ahụ dị ka enweghị nkwanye ùgwù n’ebe ndị nna nna nwụrụ anwụ nọ, ọ na-ewe obi ike n’ebe ndị ọhụrụ nọ ime ihe a. Omume obi ike ha na-echetara anyị obi ike nke ndị Kraịst oge mbụ bụ́ ndị kpofuru ihe ndị ha na ofufe ụgha nwere njikọ.—Ọrụ 19:18-20.

Echetara m otu odozi akụ̀ m mụụrụ Bible, bụ́ onye nọ na-eme atụmatụ ya na ezinụlọ ya isi Tokyo kwapụ. Ọ chọrọ ịkwaga n’ebe obibi ọhụrụ bụ́ ebe ihe ndị ha na ikpere arụsị nwere njikọ, na-adịghị. Ya mere ọ gwara di ya ọchịchọ ya, di ya jikwa ọchịchọ obi kwenyere ya. O ji ọṅụ gwa m banyere ya, mgbe ahụ o chetara na ọ kwanyekọrọ otu ọkwá okooko osisi e ji marble mee nke dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke ọ zụtara n’ihi na a sịrị na ọ na-eme ka e nwee obi ụtọ n’ebe obibi. Ebe ọ bụ na ọ na-enyo ya enyo na o nwere njikọ n’ebe ofufe ụgha dị, o ji hama kụwaa ọkwá okooko osisi ahụ ma tụfuo ya.

Ịhụ nwanyị a na ndị ọzọ ka ha ji ọchịchọ obi tụfuo ihe ndị dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị ha na ofufe ụgha nwere njikọ ma jiri obi ike malite ndụ ọhụrụ nke ijere Jehova ozi abụworo m ahụmahụ kasị enye ụgwọ ọrụ na afọ ojuju. Ana m ekele Jehova mgbe nile na enwewo m ike ịnụ ụtọ ihe karịrị afọ 40 nke ije ozi ala ọzọ na Japan.

“Ọrụ Ebube” Ndị nke Oge A

Mgbe m leghachiri anya azụ n’ihe karịrị afọ 70 m n’ozi oge nile, ana m enwe ihe ijuanya n’ihe na-eyi m ka ọ bụ ọrụ ebube ndị nke oge a. Dị ka nwa agbọghọbịa nke ihere na-emegbu, ọ dịghị mgbe ọ bụla m gaara echetụ n’echiche na m pụrụ iji ndụ m nile mee ihe n’ibute ụzọ n’ịgwa ndị mmadụ banyere Alaeze nke ihe ka ọtụtụ na-adịghị achọ ịnụ ihe ọ bụla banyere ya. Ma, ọ bụghị nanị na enwewo m ike ime nke ahụ kama ahụwo m ọtụtụ narị, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọtụtụ puku, ndị ọzọ ka ha na-eme otu ihe ahụ. Ha emewokwa ya n’ụzọ dị nnọọ irè nke na ihe ji ntakịrị karịa otu puku Ndịàmà nọ na Japan mgbe m bịarutere na 1958 amụbawo ruo ihe karịrị 222,000 taa!

Mgbe mụ na Martha bịarutere na Japan na nke mbụ anyị, e nyere anyị ụlọ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Tokyo. Na 1963, e wuru ụlọ elu ọhụrụ dị okpukpu isii n’ebe ahụ, anyị ebiwokwa n’ebe ahụ kemgbe ahụ. Na November 1963 anyị so n’ime mmadụ 163 nọ ya maka okwu nraranye nke onye nlekọta alaka anyị, bụ́ Lloyd Barry, kwuru. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, anyị eruwo Ndịàmà 3,000 na Japan.

Ọ bụwo ihe na-enye obi ụtọ ịhụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ka ọ na-eto n’ụzọ dị egwu, na-eru ihe karịrị 14,000 na 1972 bụ́ mgbe a rụchara otu alaka ọhụrụ ka buo ibu n’obodo Numazu. Ma ka ọ na-erule 1982, e nwere ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 68,000 na Japan, e wukwara alaka ụlọ ọrụ ka nnọọ ukwuu n’obodo Ebina, ihe dị ka kilomita 80 site na Tokyo.

Ka ọ dịgodị, a rụzigharịrị ụlọ ahụ e jibu mere alaka bụ́ nke dị n’etiti Tokyo. Ka oge na-aga, e jiri ya mee ihe dị ka ebe obibi ndị ozi ala ọzọ maka ihe karịrị ndị ozi ala ọzọ 20 bụ́ ndị jeworo ozi na Japan ruo afọ 40 ma ọ bụ 50 ma ọ bụ karịa, gụnyere mụ na onye mụ na ya sụkọworo ụzọ eri oge, bụ́ Martha Hess. Otu dọkịta na nwunye ya, onye bụ́ nọọsụ, bikwa n’ebe obibi anyị. Ha na-elekọta anyị anya, na-eji ịhụnanya elekọta mkpa ahụ ike anyị. Na nso nso a, e tinyekwuru onye nọọsụ ọzọ ná ndị ọrụ ahụ, ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Kraịst na-abịakwa dị ka ndị nọọsụ inyeaka n’oge ehihie. Mmadụ abụọ so n’ezinụlọ Betel nke dị n’Ebina na-abịa n’usoro nke onye bịa taa ibe ya abịa echi, na-esiri anyị nri ma na-ehichakwa ebe obibi anyị. N’ezie, Jehova adịwo mma nye anyị.—Abụ Ọma 34:8, 10.

Ihe pụtara ìhè ná ndụ ozi ala ọzọ m mere na November gara aga, bụ́ afọ 36 mgbe a rarasịịrị ihe owuwu ahụ bụ́ nke ọtụtụ n’ime anyị bụ́ ndị nọteworo aka n’ozi ala ọzọ bi na ya ugbu a, nye. Na November 13, 1999, eso m n’ime ihe karịrị mmadụ 4,486, gụnyere ọtụtụ narị Ndịàmà nọteworo aka si ná mba 37, bụ́ ndị bịara nraranye nke ihe owuwu ahụ a gbasawanyere agbasawanye n’alaka Japan nke Watch Tower Bible and Tract Society dị n’Ebina. Ka ọ dị ugbu a, e nwere ihe dị ka mmadụ 650 n’ezinụlọ alaka ahụ.

N’ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 80 kemgbe m ji egwu malite ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ekwusa ozi Bible, Jehova enyewo aka n’iwusi m ike. O nyeworo m aka ịkwụsị ime ihere. Ekwenyesiri m ike na Jehova pụrụ iji onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi mee ihe, ọbụna ndị na-emebiga ihere ókè dị ka m. Leekwa ndụ na-enye afọ ojuju m biworo n’ịgwa ndị m na-amabughị banyere Chineke anyị, bụ́ Jehova!

[Foto dị na peeji nke 21]

Mụ na nne m na Clarence, bụ́ onye si Betel bịa ileta anyị

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị klas anyị ebe anyị na-amụ ihe n’ala ahịhịa dị n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead nke dị South Lansing, New York nso

[Foto dị na peeji nke 23]

N’aka ekpe: Mụ, Martha Hess, na nne m, na Hawaii

[Foto dị na peeji nke 24]

N’aka nri: Ndị bi n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ anyị dị na Tokyo

[Foto dị na peeji nke 24]

N’okpuru: Mụ na onye mụ na ya sụkọworo ụzọ eri oge, bụ́ Martha Hess

[Foto dị na peeji nke 25]

A raara ihe owuwu alaka anyị a gbasawanyere agbasawanye dị n’Ebina nye na November gara aga