Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-eme Ka Ndị Ọzọ Mara Gị?

Ị̀ Na-eme Ka Ndị Ọzọ Mara Gị?

Ị̀ Na-eme Ka Ndị Ọzọ Mara Gị?

‘Achọghị m ịma ihe ndị ọzọ na-eche!’ Eleghị anya, i kwuwo okwu ịka anya a mgbe ị na-ewe iwe ma ọ bụ mgbe i nwere obi nkoropụ. Ma ozugbo anya doro gị, ị pụrụ inwe oké nchegbu. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe ka ọtụtụ n’ime anyị chọrọ n’ezie ịma ihe ndị ọzọ na-eche banyere anyị.

N’EZIE, anyị kwesịrị ichebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche. Karịsịa, anyị bụ́ ndị Kraịst, ndị ozi a họpụtara ahọpụta nke Jehova Chineke, aghaghị inwe nchegbu kwesịrị ekwesị banyere otú ndị ọzọ si ele anyị anya. E kwuwerị, anyị bụ “ihe nkiri nye ụwa.” (1 Ndị Kọrint 4:9) Ná 2 Ndị Kọrint 6:3, 4, anyị na-achọta ezi ndụmọdụ nke Pọl onyeozi bụ́: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla n’ihe ọ bụla, ka a ghara ịta ihe ozi anyị ụta; kama n’ihe nile anyị na-eme ka mmadụ mara anyị, dị ka ndị na-ejere Chineke ozi.”

Otú ọ dị, gịnị ka ọ pụtara bụ́ ime ka ndị ọzọ mara anyị? Ọ̀ pụtara ibuli onwe anyị elu ma ọ bụ itu ọnụ banyere onwe anyị na ikike anyị? Ee e. Ma ọ chọrọ itinye okwu ndị dị na 1 Pita 2:12 n’ọrụ: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto.” Ndị Kraịst na-eme ka a mara ha site n’ikwe ka àgwà ha na-agbara ha akaebe! N’ụzọ bụ́ isi, nke a na-ewetara Chineke otuto, ọ bụghị anyị. Ka o sina dị, anyị ime ka ndị ọzọ mara anyị pụkwara ịbara anyị onwe anyị uru. Ka anyị tụlee akụkụ atọ ebe nke a pụrụ ịbụ eziokwu nye gị.

Dị Ka Onye Gaje Ịbụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye

Were, dị ka ihe atụ, ihe metụtara alụmdi na nwunye. Ọ bụ onyinye sitere n’aka Jehova Chineke, bụ́ onye “e sitere na Ya gụọ eriri nna nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha.” (Ndị Efesọs 3:15) Ikekwe ọ bụ ọchịchọ gị ịlụ di ma ọ bụ nwunye otu ụbọchị. Ọ bụrụ otú ahụ, ruo ókè ha aṅaa ka ị na-eme ka a mara gị dị ka onye gaje ịbụ di ma ọ bụ nwunye? Ee, ụdị aha mmadụ dị aṅaa ka i mewooro onwe gị dị ka onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye?

N’ala ụfọdụ nke a bụ ihe oké nchegbu nye ezinụlọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, na Ghana, mgbe mmadụ abụọ na-achọ ịlụ onwe ha, ọ bụ omenala na ndị ahụ gaje ịbụ di na nwunye ga-agwa nne na nna ha. Nne na nna ha na-agwazi ndị ọzọ so n’ezinụlọ ha. Ezinụlọ nke nwoke na-amalitezi ịchọpụta aha mmadụ nwanyị ahụ bụ n’agbata obi ya. Mgbe nne na nna ahụ kwenyesiri ike na nwanyị ahụ kwesịrị ekwesị, ha ga-agwa ndị ezinụlọ nke nwanyị banyere ọchịchọ nwa ha nwoke nwere ịlụ nwa ha nwanyị. Ezinụlọ nke nwanyị na-achọpụtazi aha mmadụ nwoke ahụ bụ tupu ha ana-ekwenye n’alụmdi na nwunye ahụ. N’ihi ya, otu ilu Ghana na-asị, “Jụọ ndị kwesịrị ịma tupu ị banye n’alụmdi na nwunye.”

Gịnị banyere ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, bụ́ ebe a na-enye ndị mmadụ ohere ịhọrọ onye ha ga-alụ? Ọbụna n’ebe ahụ, onye Kraịst bụ́ nwoke ma ọ bụ nwanyị tozuru okè ga-abụ onye nwere amamihe ịchọ nkọwa bụ eziokwu site n’aka ndị maara onye ọ na-achọ ịlụ nke ọma, dị ka nne na nna ya ma ọ bụ ndị enyi tozuru okè. Dị ka akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, si kwuo, nwa agbọghọ pụrụ ịjụ, sị: “‘Aha dị aṅaa ka nwoke a nwere? Olee ndị bụ ndị enyi ya? Ọ̀ na-egosipụta njide onwe onye? Olee ụzọ o si emeso ndị agadi? N’ụdị ezinụlọ dị aṅaa ka o siri pụta? Olee ụzọ ya na ha si emekọrịta ihe? Gịnị bụ omume ya n’ebe ego dị? Ọ̀ na-aṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè? Ọ̀ na-ewe iwe ọsọ ọsọ, ọbụna na-eme ihe ike? Ibu ọrụ ọgbakọ ndị dị aṅaa ka o nwere, oleekwa ụzọ o si arụzu ha? Àpụrụ m ịkwanyere ya ùgwù n’ụzọ dị omimi?’—Levitikọs 19:32; Ilu 22:29; 31:23; Ndị Efesọs 5:3-5, 33; 1 Timoti 5:8; 6:10; Taịtọs 2:6, 7.” *

N’otu aka ahụ, nwoke ga-achọ ịjụ banyere nwanyị ọ bụla bụ́ onye Kraịst nke ọ na-achọ ịlụ. Dị ka Bible si kwuo, Boaz nwere mmasị dị otú ahụ n’ebe Rut, bụ́ nwanyị o mechara lụọ, nọ. Mgbe Rut jụrụ ya, sị: “Gịnị mere m hụtaworo amara n’ihu gị, i wee mata m, ebe mụ onwe m bụ ọbịa?” Boaz kwuru, sị: “E gosiwo m nke ọma ihe nile i meworo.” (Rut 2:10–12) Ee, ọ bụghị nanị na Boaz chọpụtara n’onwe ya na Rut bụ nwanyị na-eguzosi ike n’ihe, raara onwe ya nye, ma na-arụsi ọrụ ike kama ọ nụkwara okwu ọma banyere ya site n’ọnụ ndị ọzọ.

N’otu aka ahụ, àgwà gị ga-egosi ma ndị ọzọ ha na-ele gị anya dị ka onye kwesịrị ekwesị ịbụ di ma ọ bụ nwunye ha. Olee kpọmkwem otú i si eme ka ndị ọzọ mara gị n’akụkụ a?

Dị Ka Onye E Were n’Ọrụ

Ebe ọrụ bụ ebe ọzọ ịnọgide na-akpa àgwà dị mma pụrụ ịbara gị uru. Asọmpi maka ọrụ pụrụ ịkpụ ọkụ n’ọnụ. A na-achụkarị ndị e were n’ọrụ bụ́ ndị e ji nnupụisi, ịbịakarị n’azụ oge, na emeghị ihe n’eziokwu mara. Ụlọ ọrụ dị iche iche pụrụ ịkwụsị iwere ndị ọrụ nwere ahụmahụ n’ọrụ iji belata mmefu. Mgbe ndị na-enweghị ọrụ na-achọ ọrụ ọzọ, ha pụrụ ịchọpụta na ụlọ ọrụ dị iche iche ga-ajụ ndị mbụ were ha n’ọrụ iji chọpụta otú ha si arụ ọrụ, àgwà ha, na ahụmahụ ha. Ọtụtụ ndị Kraịst enwewo ihe ịga nke ọma n’ime ka ndị were ha n’ọrụ mara ha site n’àgwà nkwanye ùgwù, ejiji kwesịrị ekwesị, mmekọrịta dị mma, na àgwà ndị Kraịst ha pụtara ìhè.

Ime ihe n’eziokwu bụ àgwà dị otú ahụ—ihe mbụ ọtụtụ ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-elekwasị anya. Dị ka Pọl onyeozi, anyị na-achọ “ibi obi nke ọma n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) A kọrọ na a na-eme aka ntụtụ n’otu ụlọ ọrụ na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala na Ghana. Otu Onyeàmà bụ́ onye nlekọta ná ngalaba na-anụcha ígwè, jigidere ọrụ ya ebe a chụrụ ndị ọzọ. N’ihi gịnị? Ndị isi nke ụlọ ọrụ ahụ chọpụtara ime ihe n’eziokwu ya ruo ọtụtụ afọ. A makwaara nke ọma banyere ịrụsi ọrụ ike na nkwanye ùgwù ya n’ebe ndị isi nọ. Ee, àgwà ya ziri ezi chebere ọrụ ya!

Olee ihe ndị ọzọ onye Kraịst pụrụ ime iji mee ka a mara ya n’ụlọ ọrụ? Mụta itinye nkà n’ọrụ ọ bụla e nyere gị. (Ilu 22:29) Jiri ịdị uchu na nlezianya na-arụ ọrụ. (Ilu 10:4; 13:4) Jiri nkwanye ùgwù na-emeso onye were gị n’ọrụ na onye na-elekọta ọrụ gị, ihe. (Ndị Efesọs 6:5) Ịbịa n’oge, ime ihe n’eziokwu, ịdị nkà, na ịrụsi ọrụ ike bụcha àgwà ndị isi ọrụ ji akpọrọ ihe nke ukwuu, àgwà ndị ahụ pụkwara inyere gị aka ịchọta ọrụ ọbụna mgbe ọrụ dị ụkọ.

Ihe Ùgwù Ọgbakọ

Ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ, a chọrọ ndị ikom tozuru okè idu ndú n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’ihi gịnị? Aịsaịa buru amụma, sị: “Mee ka ebe ụlọikwuu gị saa mbara, ka ha setịakwa ákwà nkwụba nile nke ebe obibi gị nile.” (Aịsaịa 54:2) N’imezu amụma a, ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Jehova anọgidewo na-eto eto.

Ya mere, ọ bụrụ na ị bụ nwoke onye Kraịst, olee otú ị pụrụ isi mee ka a mara gị dị ka onye ruru eru ije ozi dị ka onye a họpụtara ahọpụta? Tụlee ihe atụ nke nwa okorobịa ahụ bụ́ Timoti. Luk na-akọ na “ụmụnna n’ime Kraịst ndị bi na Listra na Aịkọnịọm gbaara [Timoti] ezi àmà.” Ee, site n’ezi àgwà ya, nwa okorobịa a mere ka ndị ọzọ mara ya n’obodo abụọ. N’ihi ya, Pọl kpọrọ Timoti ka o sonyere ya n’ozi njegharị.—Ọrụ 16:1–4.

Olee otú nwoke pụrụ isi ‘gbasoo ọrụ nke onye nlekọta’ taa n’ụzọ dị mma nakwa nke na-enye Chineke nsọpụrụ? N’ezie ọ bụghị site n’ịrịọ ka a họpụta ya kama site n’ịzụlite àgwà ime mmụọ ndị dị mkpa maka ibu ọrụ dị otú ahụ. (1 Timoti 3:1–10, 12, 13; Taịtọs 1:5–9) Ọ pụkwara igosi na “agụụ ọrụ ọma na-agụ ya” site n’ikerezu òkè n’ọrụ nkwusa na nke ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ndị mere ka a mara ha dị ka ndị ikom bụ́ ndị Kraịst a pụrụ ịtụkwasị obi na-enwe ezi mmasị n’ọdịmma nke ụmụnna ime mmụọ ha. Ha na-agbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi bụ́: “N’akụkụ ihe na-akpa ndị nsọ, na-enwekọnụ ihe; na-agbasonụ ọrụ ile ọbịa anya nke ọma.” (Ndị Rom 12:13) Site n’ime ihe ndị dị otú ahụ, nwoke bụ́ onye Kraịst pụrụ n’ezie ime ‘ka mmadụ mara ya, dị ka onye na-ejere Chineke ozi.’

N’oge Nile

Ime ka ndị ọzọ mara anyị apụtaghị igosi onwe anyị dị ka anyị bụ ihe anyị na-abụghị ma ọ bụ ịghọ “ndị na-eme otú ọ ga-atọ mmadụ ụtọ.” (Ndị Efesọs 6:6) N’ụzọ bụ́ isi, ọ pụtara ime ka Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, mara anyị, site n’ịgbasozi iwu na ụkpụrụ ya. Ọ bụrụ na i wulite ọnọdụ ime mmụọ gị ma mee ka mmekọrịta gị na Jehova Chineke sikwuo ike, ndị ọzọ ga-ahụ ọganihu i nwere n’otú i si emeso ndị òtù ezinụlọ gị, ndị ọrụ, na ndị Kraịst ibe gị, ihe. Ha ga-ahụkwa nkwụsi ike na nguzozi gị, ikike i nwere ime mkpebi dị mma, ikike i nwere ibu ibu ọrụ, na ịdị umeala n’obi gị. Nke a ga-eme ka ha nwee ịhụnanya na nkwanye ùgwù n’ebe ị nọ, ma nke kasị mkpa, ọ ga-eme ka i nwee nnwapụta Jehova Chineke n’ihi na i mere ka ndị ọzọ mara gị!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 19]

Ọtụtụ ndị nne na nna na-eji amamihe achọpụta aha mmadụ onye nwa ha chọrọ ịlụ bụ

[Foto dị na peeji nke 20]

Nwanna nwoke na-eme ka a mara ya maka ihe ùgwù ije ozi site n’ịbụ onye na-echebara ndị ọzọ echiche