Akwụkwọ Ozi E Degaara Taịtọs 1:1-16
1 Abụ m Pọl, ohu Chineke na onyeozi Jizọs Kraịst. Okwukwe m nwere na ozi m na-eje dabara n’ụdị okwukwe ndị Chineke họọrọ nwere, dabakwa n’ihe anyị ma nke ọma bụ́ eziokwu. Eziokwu a dabakwara n’ihe bụ́ ife Chineke otú ọ chọrọ.
2 Ihe ndị a hiwere isi n’olileanya ịdị ndụ ebighị ebi,+ nke Chineke, onye na-enweghị ike ịgha ụgha,+ kwere nkwa ya mgbe dị anya gara aga.
3 Ma mgbe oge ya ruru, o si n’ozi ọma ọ họpụtara m ka m zisaa+ nke dabara n’iwu Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mee ka a mata okwu ya.
4 Taịtọs, ezigbo nwa nke anyị na ya nwere otu okwukwe, m na-edetara gị akwụkwọ ozi:
Ka Chineke Nna na Kraịst Jizọs Onye Nzọpụta anyị meere gị amara, meekwa ka udo dịrị gị.
5 M hapụrụ gị na Krit ka i dozie ihe ndị e kwesịrị idozi edozi* nakwa ka ị họpụta ndị okenye n’obodo dị iche iche, otú m gwara gị:
6 okenye ọgbakọ kwesịrị ịbụ onye a na-anaghị ebo ebubo, di otu nwaanyị, onye nwere ụmụ kwere ekwe ndị a na-anaghị ekwu na ha na-ebi ndụ ọjọọ ma ọ bụ na-eme isi ike.+
7 Ebe ọ bu na onye nlekọta bụ onye na-ejere Chineke ozi, o kwesịghị ịbụ onye a na-ebo ebubo, ekwe ekwe,+ onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye aṅụrụma, onye na-eti mmadụ ihe, onye ji anyaukwu achọ ihe ga-abara naanị ya uru,
8 kama o kwesịrị ịbụ onye na-ele ọbịa,+ onye hụrụ ihe ọma n’anya, onye na-ele ihe anya otú dị mma,+ onye ezi omume, onye jisiri Chineke aka ike,+ onye na-ejide onwe ya,+
9 onye si n’otú o si akụzi ihe egosi na o jidesiri okwu nke eziokwu* aka ike,+ ka o nwee ike iji ihe dị mma* ọ na-akụzi na-agba ndị mmadụ ume,+ na-adọkwa ndị na-ekwugide nkụzi dị mma aka ná ntị.+
10 N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị nnupụisi, ndị na-ekwu ihe na-abaghị uru, na ndị na-aghọgbu ndị mmadụ, karịchaa, ndị na-esi ọnwụ na mmadụ ga-ebirịrị úgwù.+
11 E kwesịrị imechi ndị a ọnụ n’ihi na ha ji ihe ndị ha na-ekwesịghị ịkụzi na-emebi okwukwe ndị niile nọ n’ezinụlọ dị iche iche ka ha wee rite uru aghụghọ.
12 Otu onye n’ime ha, bụ́ onye amụma ha, sịrị: “Ndị Krit na-agha ụgha mgbe niile. Ha bụ ajọ anụ ọhịa. Ha bụ ndị na-eri oké nri n’enweghị ihe ha na-arụ.”
13 Àmà a bụ eziokwu. N’ihi ya, na-adọsi ha aka ná ntị ike ka ha kwụsie ike n’okwukwe,
14 ka ha ghara ịna-ege ntị n’akụkọ ifo ndị Juu, gharakwa ịna-ege ntị n’ihe ndị hapụrụ eziokwu nyere n’iwu.
15 Ihe niile dị ọcha n’ebe ndị dị ọcha nọ.+ Ma e nweghị ihe dị ọcha n’ebe ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe nọ, kama uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ.+
16 Ha na-ekwu n’ihu ọha na ha ma Chineke, ma ọrụ ha na-arụ na-egosi na ha agọnahụla ya,+ n’ihi na ha bụ ndị e kwesịrị ịsọ oyi, bụrụkwa ndị nnupụisi na ndị na-erughị eru ịrụ ọrụ ọma ọ bụla.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ihe ndị na-adịghị mma.”
^ Ma ọ bụ “ozi e kwesịrị ịtụkwasị obi.”
^ Ma ọ bụ “ihe bara uru.”