Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Nwere Mkpa Dị Ukwuu Maka Nkasi Obi!

E Nwere Mkpa Dị Ukwuu Maka Nkasi Obi!

E Nwere Mkpa Dị Ukwuu Maka Nkasi Obi!

“Lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.”—EKLISIASTIS 4:1.

Ị̀ NA-ACHỌ nkasi obi? Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ka otu ụzarị ìhè nke ngụgụ obi si n’etiti urukpuru gbara ọchịchịrị nke obi nkoropụ nwufete? Ị̀ na-achọsi ike ka a gụgụtụ gị obi iji mee ka ndụ gị nke oké nhụjuanya na ahụmahụ ndị dị mwute bibiworo dịtụ mma?

Site n’oge ruo n’oge, nkasi obi na agbamume na-adị anyị nile oké mkpa. Nke a bụ n’ihi na e nwere nnọọ ọtụtụ ihe na-eweta obi ilu ná ndụ. Ọ dị anyị nile mkpa ịbụ ndị e chebere, ndị e gosiri ịhụnanya, na ndị a nabatara. Ụfọdụ n’ime anyị akawo nká, nke ahụ adịghịkwa enye ha obi ụtọ. Ndị ọzọ nwere oké ndakpọ olileanya na ndụ agazighị dị ka ha tụrụ anya ya. Ma, akụkọ e nwetara n’ụlọ nnyocha ọrịa emewo ka ndị ọzọ maa jijiji.

Ọzọkwa, ọ bụ mmadụ ole na ole ga-arụ ụka na ihe ndị na-eme n’oge anyị emewo ka e nwee mkpa dị ukwuu maka nkasi obi na olileanya. Na narị afọ gara aga nanị, ihe karịrị otu narị nde mmadụ nwụrụ n’agha. * Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile hapụrụ ndị òtù ezinụlọ na-eru újú—ndị nne na nna, ụmụnne nwanyị na ụmụnne nwoke, ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei—ndị ngụgụ obi dị mkpa nke ukwuu. Taa, ihe karịrị otu ijeri mmadụ bụ ogbenye ọnụ ntụ. Ọkara nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa adịghị enweta ọgwụgwọ na ọgwụ ndị ahụ ha chọrọ, mgbe nile. Ọtụtụ nde ụmụaka a gbahapụrụ agbahapụ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe ma na-agba akwụna, na-akpagharị n’okporo ámá ndị dị ná nnukwu obodo ndị e metọrọ emetọ. Ọtụtụ nde ndị gbara ọsọ ndụ na-ahụsi anya n’ogige ndị jọgburu onwe ha.

Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ—n’agbanyeghị otú ha pụrụ isi bụrụ ihe chọrọ ka e lebara ha anya—adịghị egosipụta n’otu n’otu, ihe mgbu na mkpagbu nke ụfọdụ ndị na-enwe ná ndụ ha. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Svetlana, bụ́ nwa agbọghọ si ógbè Balkan bụ́ onye a mụnyere n’ogbenye ọnụ ntụ. * “Iji nweta ego,” ka ọ na-ekwu, “ndị mụrụ m na-ezipụ m ịrịọ arịrịọ ma ọ bụ izu ohi. Ndụ ezinụlọ anyị dakpọrọ ruo n’ókè nke na onye ikwu m dinara m. Achọtara m ọrụ dị ka onye na-eke nri, nne m kwa, bụ́ onye a na-akwụ ego m na-akpata, kwuru na ya ga-egbu onwe ya ma a nwaa anwaa chụọ m n’ọrụ. Ihe a nile dubara m ná ndụ ịgba akwụna. Adị m nanị afọ 13. Ka oge na-aga, ebutere m ime ma sikwopụ ya. Mgbe m dị afọ 15, eyiri m onye dị afọ 30.”

Laimonis, bụ́ nwa okorobịa si Latvia, na-akọ banyere mkpa nkasi obi dị ya nakwa banyere ihe ndị dị mwute ọ na-echeta bụ́ ndị mere ka ihu ya gbarụọ. Mgbe ọ dị afọ 29, o nwere ihe mberede ụgbọala bụ́ nke mere ka ahụ ya kpọnwụọ site n’úkwù gbadaa. O chere na ya enweghịzi olileanya ma tinye isi n’ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Afọ ise mgbe e mesịrị, ọ ghọrọ onye ahụ gwụrụ—onye aṅụrụma ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nke na-enweghị olileanya ọ bụla. Ebee ka ọ pụrụ isi nweta nkasi obi?

Ma ọ bụ chee banyere Angie. A wara di ya ahụ ugboro atọ n’ụbụrụ bụ́ nke meworo ka akụkụ ahụ ya ụfọdụ kpọnwụọ ná mmalite. E mesịa, afọ ise mgbe a wasịrị ya ahụ nke ikpeazụ, o nwere oké ihe ọghọm, bụ́ nke pụrụ igbuwo ya. Ka nwunye ya banyere n’ọnụ ụlọ ndị chọrọ nlebara anya ozugbo ma hụ ka di ya nọ n’amaghị onwe ya n’ihi nnukwu ahụ o merụrụ n’isi, ọ maara na ọdachi na-abịa. Ọdịnihu ya na ezinụlọ ya gaje ịdị njọ. Olee otú ọ pụrụ isi chọta nkwado na agbamume?

Nye Pat, otu ụbọchị n’oge oyi nke afọ ole na ole gara aga yiri ka ọ malitere n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ọ maghị ihe mere n’ime ụbọchị atọ sochirinụ. Di ya gwara ya na mgbe o nwesịrị oké obi mgbu, obi ya kụchiri kpam kpam. Obi ya malitere nnọọ ịkụ ọkụ ọkụ nakwa n’ụzọ na-adịghị n’usoro, e mesịakwa, ọ kwụsịrị ịkụ akụ kpam kpam. Ọ kwụsịrị iku ume. “N’ezie ndị ụlọ ọgwụ kwuru na mụ anwụwo,” ka Pat na-ekwu. Ma n’ụzọ ụfọdụ, ọ nwụghị. O kwuru banyere ogologo oge ọ nọrọ n’ụlọ ọgwụ, sị: “Ọtụtụ n’ime nnyocha ndị e mere yiri m egwu, karịsịa mgbe ha gbalịrị ime ka obi m na-akụ n’ụzọ na-adịghị n’usoro ma kwụsị ịrụ ọrụ, dị ka o meworo na mbụ.” Gịnị pụrụ inye ya ngụgụ obi na ahụ efe dị ya mkpa n’oge a dị oké egwu?

Nwa Joe na Rebecca nke nwoke, onye dị afọ 19 nwụnahụrụ ha n’ihe mberede ụgbọala. “Anyị enwetụbeghị ahụmahụ dị njọ otú ahụ,” ka ha na-ekwu. “Ọ bụ ezie na n’oge ndị gara aga, anyị esorowo ndị ọzọ ruo újú maka ihe ndị funahụrụ ha, anyị adịghị enwe oké ihe mgbu nke obi n’ezie dị ka anyị nwere ugbu a.” Gịnị ma eleghị anya pụrụ ibelata “oké ihe mgbu nke obi” dị otú ahụ—oké ihe mgbu nke ịbụ onye onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu nwụnahụrụ?

N’ezie, mmadụ ndị a, na ọtụtụ nde ndị ọzọ, achọtawo isi iyi kasịnụ nke nkasi obi na ngụgụ obi. Iji hụ otú gị onwe gị kwa pụrụ isi rite uru site n’isi iyi ahụ, biko gụrụ gawa.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A maghị kpọmkwem ọnụ ọgụgụ ndị agha na ndị nkịtị nwụworonụ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ ahụ e bipụtara na 1998 bụ́ Facts About the American Wars na-ekwu banyere Agha Ụwa nke Abụọ nanị, sị: “Ọtụtụ akwụkwọ na-ekwu na ngụkọta nke ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’ihi Agha Ụwa nke Abụọ (ndị agha na ndị nkịtị) dị nde 50 ma ọtụtụ ndị tụleworo isiokwu ahụ nke ọma kweere na ọnụ ọgụgụ ka zie ezie dị elu karị—ihe ruru okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ahụ.”

^ par. 6 A gbanwewo aha ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

UNITED NATIONS/PHOTO NKE J. K. ISAAC, SERE

UN PHOTO 146150 NKE O. MONSEN, SERE