Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ—Dị Ka E Buru n’Amụma

Ime Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ—Dị Ka E Buru n’Amụma

 Ime Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ—Dị Ka E Buru n’Amụma

“Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, . . . Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”—MKPUGHE 21:5.

1, 2. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji egbutụ oge n’ụzọ ziri ezi ịtụle ihe ọdịnihu ga-abụ?

Ị̀ SỊWO ma ọ bụ chee, ‘Ònye ma echi?’ Ị pụrụ ịghọta ihe mere ndị mmadụ ji egbutụ oge ịkọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ma ọ bụ ịtụkwasị ndị pụrụ ịzọrọ ngwa ngwa na ha na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu, obi. Ụmụ mmadụ enweghị nnọọ ikike ikwu n’ụzọ ziri ezi ihe ga-eme n’ọnwa ma ọ bụ n’afọ ndị na-abịanụ.

2 Magazin bụ́ Forbes ASAP, dere banyere oge n’otu mbipụta ya. N’ime ya, otu onye na-eme ntụle na-enye ihe ọmụma na TV bụ́ Robert Cringely, dere, sị: “Oge na-emesị menye anyị nile ihere, ma ọ dịghị onye oge na-emeru ihe ọ na-eme ndị na-akọ ọdịnihu. Ịnwa ịkọ ihe ga-eme n’ọdịnihu bụ ihe omume anyị na-ada na ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile. . . . Ma, ndị a sị na ha bụ ndị ọkachamara ka nọ na-ebu amụma.”

3, 4. (a) Nchekwube dị aṅaa ka ụfọdụ nwere banyere narị afọ iri ọhụrụ? (b) Atụmanya dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka ndị ọzọ nwere banyere ọdịnihu?

3 Ị pụrụ ịchọpụtawo na ebe ọ bụ na e lekwasịrị anya nke ukwuu na narị afọ iri ọhụrụ, ọ pụrụ iyi ka ihe ka ukwuu ná ndị mmadụ hà na-eche banyere ọdịnihu. Ná mmalite afọ gara  aga, magazin bụ́ Maclean’s kwuru, sị: “Afọ 2000 pụrụ ịbụ nanị afọ ọzọ dị na kalenda nye ihe ka ọtụtụ ná ndị Canada, ma ya na mmalite ọnọdụ ọhụrụ n’ezie pụrụ ịdabakọta.” Prọfesọ Chris Dewdney nke Mahadum York kwuru ihe a mere e ji enwe nchekwube, sị: “Narị afọ iri ahụ pụtara na anyị pụrụ inwere onwe anyị pụọ na narị afọ nke dị nnọọ njọ.”

4 Nke ahụ ọ̀ na-ada ka nrọ efu? Na Canada, ọ bụ nanị pasent 22 n’ime ndị zaghachiri n’otu njụta echiche e mere “kwetara na 2000 ga-ewetara ụwa mmalite ọhụrụ.” N’ezie, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara “na-atụ anya ọgụ ọzọ zuru ụwa ọnụ”—agha ụwa—n’ime afọ 50. N’ụzọ doro anya, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-achọpụta na narị afọ iri ọhụrụ apụghị ime ka nsogbu anyị gwụsịa, na-eme ka ihe nile dị ọhụrụ. Maazị Michael Atiyah, onye bụburu president nke Royal Society nke Britain, dere, sị: “Otú mgbanwe si abịa ọkụ ọkụ . . . pụtara na narị afọ nke iri abụọ na otu ga-ewetara nkà mmepeanya anyị dum ihe ịma aka ndị dị ịrịba ama. Anyị amalitelarị ịhụ nsogbu nke mmụba ọnụ ọgụgụ mmadụ, mbelata nke ebe ndị e si enweta ihe, mmetọ nke gburugburu ebe obibi, na ịda ogbenye zuru ebe nile, a ghaghịkwa ime ihe ngwa ngwa banyere ha.”

5. Olee ebe anyị pụrụ ịchọta ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya banyere ọdịnihu?

5 Ị pụrụ iche, sị, ‘Ebe ụmụ mmadụ na-apụghị ikwu ihe ọdịnihu ga-apụtara anyị, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị nnọọ ichefu banyere ọdịnihu?’ Azịza ya bụ ee e! N’eziokwu, ụmụ mmadụ apụghị ikwu n’ụzọ ziri ezi ihe ga-eme n’ọdịnihu, ma anyị ekwesịghị iche na ọ dịghị onye pụrụ ikwu ya. Ònye pụrụ, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji nwee nchekwube banyere ọdịnihu? Ị pụrụ inweta azịza ndị na-eju afọ n’amụma anọ ndị a kpọrọ okwu aha na ha. E dekọrọ ha n’ime akwụkwọ a kasị nwee n’ụwa, nke a kasịkwa agụ, nke bụkwa nke a na-aghọtahie n’ụzọ sara mbara na nke a kasị eleghara anya—Bible. Ihe ọ masịkwara gị na-eche banyere Bible, n’agbanyeghịkwa otú ị pụrụ ịmaru ya nke ọma, ọ ga-abara gị uru ịtụle akụkụ akwụkwọ nsọ anọ a bụ́ isi. Ha na-ebu amụma n’ezie banyere ọdịnihu dị nnọọ mma. Ọzọkwa, amụma anọ a bụ́ isi na-akọwapụta ihe ọdịnihu gị na nke ndị ị hụrụ n’anya pụrụ ịbụ.

6, 7. Olee mgbe Aịsaịa buru amụma, oleekwa otú amụma ndị o buru si mezuo n’ụzọ na-eju anya?

6 A na-achọta nke mbụ n’Aịsaịa isi nke 65. Tupu anyị ana-agụ ya, buru ọnọdụ a nọ buo ya n’uche—mgbe e dere ihe a na ọnọdụ e dere banyere ya. Onye amụma Chineke bụ́ Aịsaịa, bụ́ onye deturu okwu ndị a, dịrị ndụ ihe karịrị otu narị afọ tupu alaeze Juda adaa. Nke ahụ mere mgbe Jehova kwụsịrị ichebe ndị Juu ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi, wee kwere ka ndị Babilọn bibie Jerusalem ma kpọrọ ndị bi na ya gaa n’ala ọzọ. Nke ahụ mere ihe karịrị otu narị afọ mgbe Aịsaịa busịrị ya n’amụma.—2 Ihe E Mere 36:15-21.

7 Banyere ebe ihe ndị ahụ nọ mezuo, cheta na site ná nduzi Chineke, Aịsaịa buru n’amụma aha onye Peasia ahụ a na-amụbeghị mgbe ahụ, bụ́ Saịrọs, onye mesịrị merie Babilọn. (Aịsaịa 45:1) Saịrọs doziri ụzọ maka ndị Juu ịlaghachi n’ala nna ha na 537 T.O.A. N’ụzọ na-eju anya, Aịsaịa buru amụma banyere mweghachi ahụ, dị ka anyị na-agụ n’isi nke 65. O lekwasịrị anya n’ọnọdụ nke ndị Israel ga-anọ na ya mgbe ha laghachiri n’ala nna ha.

8. Ọdịnihu obi ụtọ dị aṅaa ka Aịsaịa buru n’amụma, oleekwa okwu na-adọrọ mmasị karịsịa?

8 Anyị na-agụ n’Aịsaịa 65:17-19, sị: “Lee, M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke: n’ihi na, lee, M na-eke Jerusalem ịbụ ihe ntegharị egwú ọṅụ, ndị ya kwa, ịbụ ihe obi ụtọ. M ga-etegharịkwa egwú ọṅụ n’ahụ Jerusalem, obi ga-atọkwa m ụtọ n’ahụ ndị m: a gaghị anụkwa olu ịkwa ákwá n’ime ya ọzọ, ma ọ bụ olu iti mkpu.” N’ezie, Aịsaịa kọwara ọnọdụ ndị ka ọnọdụ ndị Juu ahụ biri na ha na Babilọn mma. O buru amụma banyere ite egwú ọṅụ na ịṅụrị ọṅụ. Ugbu a lee anya n’okwu bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” Nke a bụ ebe mbụ n’ime ebe anọ nkebi ahịrịokwu ahụ pụtara n’ime Bible, amaokwu anọ a pụkwara imetụta ọdịnihu anyị kpọmkwem, ọbụna kwuo ihe ọ ga-abụ.

9. Olee otú mmezu nke Aịsaịa 65:17-19 si metụta ndị Juu oge ochie?

 9 Mmezu mbụ nke Aịsaịa 65:17-19 metụtara ndị Juu oge ochie bụ́ ndị, dị ka Aịsaịa buru n’amụma n’ụzọ ziri ezi, laghachiri n’ala nna ha, bụ́ ebe ha guzobeghachiri ofufe dị ọcha. (Ezra 1:1-4; 3:1-4) Otú ọ dị, ị manụ na ha laghachiri n’ala nna ha nke dị n’otu mbara ụwa ahụ, ọ bụghị ebe ọzọ na mbara igwe. Ịghọta nke ahụ ga-enyere anyị aka ịhụ ihe Aịsaịa bu n’uche mgbe ọ sịrị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị anyị mkpa ịkọwa nkọ, dị ka ụfọdụ na-eme, banyere amụma ndị na-edoghị anya ndị Nostradamus ma ọ bụ ndị ọzọ na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu buru. Bible n’onwe ya na-eme ka ihe Aịsaịa bu n’uche doo anya.

10. Olee otú anyị ga-esi aghọta “ụwa” ọhụrụ ahụ Aịsaịa buru n’amụma?

10 N’ime Bible, “ụwa” adịghị ezo aka mgbe nile na mbara ụwa anyị. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 96:1 na-ekwu n’ụzọ nkịtị, sị: ‘Bụkuonụ Jehova abụ, unu ụwa nile.’ Anyị maara na mbara ụwa anyị—ala nkịtị na oké osimiri—apụghị ịbụ abụ. Ọ bụ ndị mmadụ na-abụ abụ. Ee, Abụ Ọma 96:1 na-ezo aka n’ebe ndị bi n’ụwa nọ. * Ma Aịsaịa 65:17 kwukwara banyere “eluigwe ọhụrụ.” Ọ bụrụ na “ụwa” na-anọchite anya òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ nọ n’ala nna ndị Juu, gịnị bụ “eluigwe ọhụrụ” ahụ?

11. Olee ihe nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “eluigwe ọhụrụ” na-ezo aka na ya?

11 Akwụkwọ bụ́ Cyclopædia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature nke M’Clintock na Strong dere, na-ekwu, sị: “Mgbe ọ bụla e kwuru banyere eluigwe n’ọhụụ amụma, ọ na-apụta . . . mkpọkọta nke ndị nile na-achị achị . . . ndị dị elu karịa ma na-achị ndị nọ n’okpuru ha, dị ka eluigwe nkịtị si dị elu karịa ma na-achị ụwa.” Banyere nkebi ahịrịokwu ahụ e jikọtara ọnụ bụ́ “eluigwe na ụwa,” Cyclopædia ahụ na-akọwa na ‘n’okwu amụma, nkebi ahịrịokwu ahụ pụtara ọnọdụ ọkwá ọchịchị nke ndị nọ n’ọkwá dị iche iche. Eluigwe bụ ọbụbụeze; ụwa bụ ndị a na-achị, bụ́ ndị mmadụ ndị dị elu karịa ha na-achị.’

12. Olee otú ndị Juu oge ochie si nwee “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ”?

12 Mgbe ndị Juu ahụ laghachiri n’ala nna ha, ha nwetara ihe a pụrụ ịkpọ usoro ihe ọhụrụ. Ha nwere ndị ọchịchị ọhụrụ. Zerubabel, bụ́ onye sitere n’eriri Eze Devid, bụ onye ọchịchị, Joshua bụkwa onyeisi nchụàjà. (Hagaị 1:1, 12; 2:21; Zekaraịa 6:11) Ọ bụ ndị a mejupụtara “eluigwe  ọhụrụ.” Nke dị elu karịa gịnị? “Eluigwe ọhụrụ” ahụ dị elu karịa “ụwa ọhụrụ” ahụ, bụ́ ọha mmadụ e mere ka ha dị ọcha ndị laghachiri n’ala nna ha iji wughachi Jerusalem na ụlọ nsọ ya maka ife Jehova ofufe. N’ihi ya, n’echiche a ziri ezi, e nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ná mmezu ahụ metụtara ndị Juu n’oge ahụ.

13, 14. (a) Ebe ọzọ dị aṅaa nke nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” pụtara ka anyị kwesịrị ịtụle? (b) N’ihi gịnị ka amụma Pita ji adọrọ mmasị karịsịa n’oge a?

13 Lezie anya ka ị ghara ịghọtahie ihe a na-ekwu. Nke a abụghị ịgbalị ịkọwa Bible n’ụzọ nkà mmụta agụmakwụkwọ ma ọ bụkwanụ nanị ilenyetụ anya n’akụkọ ihe mere eme oge ochie. Ị pụrụ ịhụ nke a site n’ịgafe n’ebe ọzọ nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” pụtara. Na 2 Pita isi nke 3, ị ga-ahụ ebe nke a pụtara, ma hụ na o metụtara ọdịnihu anyị.

14 Pita onyeozi dere akwụkwọ ozi ya ihe karịrị afọ 500 mgbe ndị Juu laghachisịrị n’ala nna ha. Ebe ọ bụ otu n’ime ndị ozi Jisọs, Pita na-edegara ụmụazụ Kraịst, bụ́ “Onyenwe anyị” ahụ e hotara na 2 Pita 3:2, akwụkwọ. N’amaokwu nke 4, Pita kwuru banyere “nkwa nke [ọnụnọ, NW]” Jisọs bụ́ nke na-eme ka amụma ahụ bụrụ nke dabara nnọọ adaba taa. Ihe àmà juru eju na-egosi na eri Agha Ụwa Mbụ, Jisọs anọrọwo n’echiche nke inwe ikike dị ka Onye Ọchịchị n’Alaeze eluigwe nke Chineke. (Mkpughe 6:1-8; 11:15, 18) Nke a na-enwe ihe pụrụ iche ọ pụtara n’ihi ihe ọzọ Pita buru n’amụma n’isiakwụkwọ a.

15. Olee otú amụma Pita banyere “eluigwe ọhụrụ” si emezu?

15 Anyị na-agụ na 2 Pita 3:13, sị: “Dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” Ị pụrụ ịmaworị na Jisọs, bụ́ onye nọ n’eluigwe bụ Onye Ọchịchị bụ́ isi ‘n’eluigwe ọhụrụ’ ahụ. (Luk 1:32, 33) Ma, akụkụ Bible ndị ọzọ na-egosi na ọ dịghị achị nanị ya. Jisọs kwere nkwa na ndị ozi na ndị ọzọ yiri ha ga-enwe ọnọdụ n’eluigwe. N’akwụkwọ Ndị Hibru, Pọl onyeozi kọwara ndị dị otú ahụ dị ka “ndị nketa nke ọkpụkpọ nke eluigwe.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Jisọs kwukwara na ndị so n’ìgwè a ga-eso ya nọkwasị n’ocheeze n’eluigwe. (Ndị Hibru 3:1; Matiu 19:28; Luk 22:28-30; Jọn 14:2, 3) Isi ihe a na-ekwu ugbu a bụ na ndị ọzọ ga-eso Jisọs chịa dị ka akụkụ nke eluigwe ọhụrụ ahụ. Mgbe ahụ gịnị ka Pita bu n’uche mgbe ọ sịrị “ụwa ọhụrụ”?

16. Olee “ụwa ọhụrụ” nke dịworịị adị?

16 Dị ka ọ dị ná mmezu ya n’oge ochie—nlaghachi nke ndị Juu n’ala nna ha—mmezu nke 2 Pita 3:13 ugbu a na-agụnye ndị mmadụ na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi nke eluigwe ọhụrụ ahụ. Ị pụrụ ịhụ ọtụtụ nde mmadụ taa ndị ji ọṅụ na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi dị otú ahụ. Ha na-erite uru site n’usoro izi ihe ya, na-agbalịsikwa ike ịgbaso iwu ya ndị dị n’ime Bible. (Aịsaịa 54:13) Ọ bụ ndị a bụ ntọala nke “ụwa ọhụrụ” ahụ n’echiche bụ́ na ha na-aghọ òtù ụmụ mmadụ zuru ụwa ọnụ ndị sitere ná mba, asụsụ, na agbụrụ dị iche iche, ha na-arụkọkwa ọrụ ọnụ n’ido onwe ha n’okpuru Eze ahụ na-achị achị, bụ́ Jisọs Kraịst. Otu eziokwu dị ịrịba ama bụ na ị pụrụ iso na nke a!—Maịka 4:1-4.

17, 18. N’ihi gịnị ka okwu ndị dị na 2 Pita 3:13 ji enye anyị ihe mere anyị ga-eji na-atụ anya ọdịnihu?

17 Echela na ọ bụ ebe a ka okwu gwụrụ, na a kọwaghịrị anyị n’ụzọ sara mbara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. N’ezie, ka ị na-enyocha ihe ndị gbara 2 Pita isi nke 3 gburugburu, ị ga-ahụ ihe àmà ndị na-egosi oké mgbanwe nke ga-ewere ọnọdụ n’ọdịnihu. N’amaokwu nke 5 na nke 6, Pita na-ede banyere Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, Iju Mmiri nke bibiri ajọ ụwa dị n’oge ahụ. N’amaokwu nke 7, Pita kwuru na e debere “eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa,” nke bụ́ ma ndị na-achị achị ma ọha ndị a na-achị, nye “ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Nke a na-anwapụta na nkebi ahịrịokwu bụ́ “eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa” na-ezo aka, ọ bụghị n’ebe eluigwe na ala nkịtị dị, kama n’ebe ụmụ mmadụ na ndị na-achị ha nọ.

18 Mgbe nke ahụ gasịrị, Pita na-akọwa na ụbọchị Jehova nke na-abịanụ ga-eme ka e nwee oké mkpocha, na-edozi ụzọ maka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ e hotara n’amaokwu nke 13. Rịba akụkụ ikpeazụ nke amaokwu ahụ ama—“nke ezi omume bi n’ime ha.” Nke ahụ ọ́ dịghị enye echiche na oké mgbanwe ndị ga-eme  ka ọnọdụ ka mma aghaghị iwere ọnọdụ? Ọ̀ bụ na ọ dịghị akpali atụmanya maka ihe ndị ọhụrụ n’ezie, mgbe ụmụ mmadụ ga-enwe ọṅụ ka ukwuu n’ịdị ndụ karịa ka ha na-enwe taa? Ọ bụrụ na ị pụrụ ịhụ nke ahụ, mgbe ahụ ị ghọtawo ihe Bible na-ebu n’amụma, bụ́ nghọta nke ọ bụ nnọọ mmadụ ole na ole nwere.

19. Ọ̀ bụ n’ọnọdụ dị aṅaa ka akwụkwọ Mkpughe na-ekwu banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ahụ na-abịabeghị abịa?

19 Ma ka anyị gakwuo n’ihu. Anyị elebawo anya n’ebe nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” pụtara n’Aịsaịa isi nke 65 na ebe ọzọkwa na 2 Pita isi nke 3. Ugbu a sapeta Mkpughe isi nke 21, bụ́ otu ebe ọzọ okwu a pụtara n’ime Bible. Ọzọkwa, ịghọta ọnọdụ a nọ kwuo ya ga-enye aka. N’isiakwụkwọ abụọ bu nke a ụzọ, ná Mkpughe isi nke 19, anyị na-ahụ agha nke e ji okwu ihe atụ ndị doro anya kọwaa—ma ọ bụghị agha dị n’etiti mba ndị na-eserịta okwu. “Okwu Chineke” nọ n’otu akụkụ. Ma eleghị anya ị maara nke ahụ dị ka utu aha Jisọs Kraịst. (Jọn 1:1, 14) Ọ nọ n’eluigwe, ọhụụ a na-egosikwa ebe ya na usuu ndị agha ya nke eluigwe nọ. Ònye ka ha na-ebuso agha? Isiakwụkwọ ahụ hotara “ndị eze,” “ndị ọchịagha,” na ndị nọ n’ọkwá dị iche iche, ma “ndị nta ma ndị ukwu.” Agha a metụtara ụbọchị Jehova nke na-abịanụ, bụ́ mbibi nke ajọ omume. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10) N’ịga n’ihu, Mkpughe isi nke 20 ji ịkọwa mwepụ nke “agwọ ochie ahụ, onye bụ́ Ekwensu na Setan,” malite. Nke a na-eduga n’ịtụle Mkpughe isi nke 21.

20. Mgbanwe dị aṅaa ka Mkpughe 21:1 na-egosi na ọ ga-eme n’ihu?

20 Jọn onyeozi ji okwu ndị na-akpali akpali malite: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị; oké osimiri adịghịkwa ọzọ.” Dabere n’ihe anyị hụworo n’Aịsaịa isi nke 65 na 2 Pita isi nke 3, anyị pụrụ ijide n’aka na nke a apụtaghị idochi eluigwe nkịtị na mbara ala anyị, na oké osimiri ya. Dị ka isiakwụkwọ ndị bu ụzọ gosiri, a ga-ewepụ ndị ajọ mmadụ na ịchịisi ha, gụnyere onye ọchịchị ahụ a na-adịghị ahụ anya, bụ́ Setan. Ee, nkwa e kwere n’ebe a bụ usoro ihe ọhụrụ nke na-agụnye ndị mmadụ nọ n’elu ala.

21, 22. Ngọzi ndị dị aṅaa ka Jọn na-emesi anyị obi ike banyere ha, gịnịkwa ka ihichapụ anya mmiri pụtara?

21 E mesiri anyị obi ike banyere nke a ka anyị na-abanye n’amụma a magburu onwe ya. Ngwụsị nke amaokwu nke 3 na-ekwu banyere oge mgbe Chineke ga-anọnyere ihe a kpọrọ mmadụ, na-eche ihu ya n’ụzọ bara uru n’ebe ndị na-eme uche ya nọ. (Ezikiel 43:7) Jọn gara n’ihu ikwu n’amaokwu nke 4, 5, sị: “Ọ [Jehova] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo. Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” Lee amụma na-ewuli elu ọ bụ!

22 Cheretụ nụrụ ụtọ ihe Bible na-ebu n’amụma. ‘Chineke ga-ehichapụ anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.’ Nke ahụ apụghị ịdị na-ezo aka n’anya mmiri dị mma bụ́ nke na-asacha anya anyị dị peke peke, ọ pụghịkwa ịdị na-ezo aka n’anya mmiri ọṅụ. Ee e, anya mmiri Chineke ga-ehichapụ bụ anya mmiri ndị ọ bụ ahụhụ, iru újú, ndakpọ olileanya, mmegbu, na oké ihe mgbu, kpatara. Olee otú anyị pụrụ isi jide nke a n’aka? Nkwa a dị ịrịba ama nke Chineke kwere na-ejikọta ihichapụ anya mmiri nile ọ bụla na ‘ọnwụ, iru újú, ịkwa ákwá, na ahụ ụfụ ịbụ ihe na-agaghị adịkwa ọzọ.’—Jọn 11:35.

23. Ngwụsị nke ọnọdụ ndị dị aṅaa ka amụma Jọn na-emesi obi ike banyere ha?

 23 Nke a ọ́ dịghị egosi na a ga-ekpochapụworị ọrịa cancer, strok, nkụchi obi, na ọbụna ọnwụ? Ònye n’ime anyị ka ọrịa, ihe ọghọm, ma ọ bụ ọdachi na-egbutụbeghị onye ọ hụrụ n’anya? Chineke na-ekwe nkwa n’ebe a na ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ, bụ́ nke na-egosi na ụmụaka a pụrụ ịmụ n’oge ahụ agaghị na-atụ anya itolite wee kaa nká—ọnwụ ewee gbuzie ha. Amụma a pụtakwara na ọrịa Alzheimer, ọrịa ọkpụkpụ bụ́ osteoporosis, ehie afọ, ọrịa anya bụ́ glaucoma, ma ọ bụ ọbụna ọrịa anya mkpụrụ ego—nke ndị agadi na-arịakarị—agaghị adịkwa.

24. Olee otú “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ahụ ga-esi ghọọ ngọzi, gịnịkwa ka anyị ka ga-atụle?

24 Obi abụọ adịghị ya na ị ga-ekweta na iru újú na ịkwa ákwá ga-ebelata ma e wepụ ọnwụ, ịka nká, na ọrịa. Ma, olee banyere ịda ogbenye ọnụ ntụ, mmetọ ụmụaka, na ịkpa ókè mmegbu n’ihi ọnọdụ mmadụ ná ndụ ma ọ bụ ụcha akpụkpọ ahụ? Ọ bụrụ na ihe ndị dị otú ahụ—ndị jupụtara ebe nile taa—anọgide na-adị, a gaghị ewepụrụ anyị iru újú na ịkwa ákwá. Ya mere, ndụ ga-adị n’okpuru “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” agaghị abụ nke ihe ndị a na-akpata mwute taa ga-emebi. Lee mgbanwe nke a bụ! Otú ọ dị, anyị atụlewo nanị atọ n’ime ebe anọ ahịrịokwu ahụ bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” pụtara n’ime Bible. E nwekwuru otu nke kwekọrọ n’ihe anyị nyochaworo, nke ahụ na-emesikwa ike ihe mere anyị ga-eji na-atụ anya mgbe Chineke ga-emezu nkwa ya ‘ime ihe nile ka ha dị ọhụrụ,’ na otú ọ ga-esi eme ya. Isiokwu na-esonụ na-atụle amụma ahụ na otú ọ pụrụ isi wetara anyị obi ụtọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 The New English Bible na-asụgharị Abụ Ọma 96:1 ịbụ: “Bụkuonụ ONYENWE ANYabụ, mmadụ nile nọ n’ụwa.” The Contemporary English Version na-agụ, sị: “Onye ọ bụla nọ n’ụwa a, bụkuo ONYENWE ANYabụ otuto.” Nke a kwekọrọ ná nghọta bụ́ na site n’ikwu “ụwa ọhụrụ” Aịsaịa na-ezo aka n’ebe ndị Chineke nọ, bụ́ ndị laghachiworo n’ala ha.

Gịnị Ka Ị̀ Na-echeta?

• Olee ebe atọ Bible na-ebu amụma banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ”?

• Olee otú mmezu nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” si metụta ndị Juu oge ochie?

• Gịnị ka a ghọtara ịbụ mmezu nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” dị ka Pita kwuru?

• Olee otú Mkpughe isi nke 21 si eme ka anyị lepụ anya n’ọdịnihu dị mma?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Dị nnọọ ka Jehova buworo n’amụma, Saịrọs doziri ụzọ maka nlaghachi ndị Juu n’ala nna ha na 537 T.O.A.