Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nweta Nkasi Obi n’Ike Jehova

Nweta Nkasi Obi n’Ike Jehova

Nweta Nkasi Obi n’Ike Jehova

“Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi Gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.”—ABỤ ỌMA 94:19.

BIBLE nwere okwu nkasi obi nye ndị nile na-achọsi ngụgụ obi ike. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia ji sị na “ndị mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ echigharịkwuruwo Bible maka nkasi obi, olileanya, na nduzi n’oge ha nwere nsogbu nakwa n’oge ha na-amaghị ihe ha ga-eme.” N’ihi gịnị?

N’ihi na Bible sitere n’ike Onye Okike anyị na-ahụ n’anya, bụ́ “Chineke nke nkasi obi nile,” Onye “na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile.” (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Ọ bụ ‘Chineke nke nkasi obi.’ (Ndị Rom 15:5) Jehova esetịpụwo ihe nlereanya n’idokwa maka ụzọ anyị nile ga-esi nwee ahụ efe. O zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ụwa, bụ́ Kraịst Jisọs, inye anyị olileanya na ịgụgụ anyị obi. Jisọs kụziri, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Bible na-akọwa Jehova dị ka onye ‘na-eburu anyị ibu kwa ụbọchị, bụ́ Chineke Nke nzọpụta anyị.’ (Abụ Ọma 68:19) Mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke pụrụ iji obi ike kwuo, sị: “Edowo m Jehova n’ihu m mgbe nile: n’ihi na Ọ nọ n’aka nri m, a gaghị ewezụga m n’ọnọdụ m.”—Abụ Ọma 16:8.

Akụkụ Bible ndị dị otú ahụ na-egosi ịhụnanya miri emi Jehova Chineke nwere n’ebe anyị bụ́ ụmụ mmadụ nọ. Ọ na-edo anya na o nwere ọchịchọ sitere n’obi—nakwa ikike—inye anyị nkasi obi hiri nne na ibelata ihe mgbu anyị na-enwe n’oge anyị na-ata ahụhụ. “Ọ bụ Onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba.” (Aịsaịa 40:29) Oleezi otú anyị pụrụ isi nweta nkasi obi n’ike Jehova?

Mmetụta Na-adajụ Obi nke Nlekọta Jehova

Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Ee, Jehova Chineke nwere mmasị n’ebe ezinụlọ mmadụ nọ. Pita onyeozi mesighachiri ndị Kraịst narị afọ mbụ obi ike, sị: “Ihe nile banyere unu na-emetụ Ya [Chineke] n’obi.” (1 Pita 5:7) Jisọs Kraịst mesiri ókè Chineke jiruru ụmụ mmadụ kpọrọ ihe ike, site n’ịsị: “Á dịghị ere egwele ise na penny abụọ? ma a dịghị echezọ otu n’ime ha n’ihu Chineke. Ma ọbụna agịrị isi nile nke isi unu ka a gụworo. Unu atụla egwu: ọnụ ahịa unu karịrị nke ọtụtụ egwele.” (Luk 12:6, 7) Anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke nke na ọ na-arịba ọbụna ihe ndị dịkarịsịrị nta banyere anyị ama. Ọ maara ihe ndị anyị onwe anyị na-amaghị n’ihi na o nwere mmasị miri emi n’ebe onye nke ọ bụla n’ime anyị nọ.

Ịmara banyere mmasị onwe onye a Jehova nwere ghọọrọ nnọọ Svetlana ihe nkasi obi, bụ́ onye akwụna ahụ na-eto eto nke a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ. Ọ nọ na-achọ igbu onwe ya mgbe o zutere Ndịàmà Jehova. Mgbe ahụ ọ nakweere ọmụmụ Bible, bụ́ nke nyeere ya aka ịmara Jehova dị ka onye dị adị n’ezie bụ́ onye nwere mmasị n’ọdịmma ya. Nke a metụrụ ya n’obi, na-akwali ya ịgbanwe ụzọ ndụ ya na ịrara onwe ya nye Chineke. O nyekwara Svetlana ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke ùgwù onwe onye bụ́ nke dị ya mkpa iji nọgide na-aga n’ihu n’agbanyeghị nsogbu ndị o nwere na iji na-enwe nchekwube ná ndụ. “Ekwenyesiri m ike,” ka ọ na-ekwu ugbu a, “na ọ dịghị mgbe Jehova ga-ahapụ m. Achọpụtawo m na ihe e dere na 1 Pita 5:7 bụ eziokwu. Ọ na-ekwu, sị: ‘Na-atụkwasịnụ [Jehova] nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi.’”

Olileanya Dabeere na Bible Na-akasi Obi

Otu ụzọ kpọmkwem nke Chineke si enye nkasi obi bụ site n’Okwu ya e dere ede, bụ́ nke bu olileanya dị ebube maka ọdịnihu. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Pọl mere ka njikọ dị n’etiti ezi olileanya na nkasi obi doo anya mgbe o dere, sị: “Ka . . . Chineke, bụ́ Nna anyị, Onye hụrụ anyị n’anya nyekwa anyị nkasi obi ebighị ebi na ezi olileanya n’ime amara, ka Ọ kasie obi unu, meekwa ka ha guzosie ike n’ezi ọrụ na eziokwu nile ọ bụla.” (2 Ndị Tesalọnaịka 2:16, 17) “Ezi olileanya” a na-agụnye atụmanya nke ndụ zuru okè, nke obi ụtọ, nke na-agaghịkwa agwụ agwụ n’elu ala paradaịs.—2 Pita 3:13.

Olileanya ọma dị otú ahụ e ji n’aka gbara Laimonis ume, bụ́ onye aṅụrụma ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nke a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ. Mgbe ọ gụrụ akwụkwọ dabeere na Bible nke Ndịàmà Jehova bipụtara, ọ ṅụrịrị ọṅụ ịmụta banyere ụwa ọhụrụ ahụ nke Alaeze Chineke ga-achị, bụ́ ebe a pụrụ ime ka o nweghachi ahụ ike n’ụzọ zuru ezu. N’ime Bible, ọ gụrụ nkwa ọma a na-esonụ banyere ọgwụgwọ ọrụ ebube: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:5, 6) Iji ruo eruo ibi na Paradaịs ahụ, Laimonis mere mgbanwe dị ukwuu. Ọ kwụsịrị aṅụrụma, ndị agbata obi ya na ndị maara ya hụkwara mgbanwe o mere. Ọ na-eduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible ugbu a, na-eso ndị ọzọ ekerịta nkasi obi nke olileanya dabeere na Bible na-enye.

Òkè Ekpere Na-ekere

Mgbe obi anyị nọ n’ihe mgbu n’ihi ihe ụfọdụ, anyị pụrụ ịchọta nkasi obi site n’ikpeku Jehova ekpere. Nke ahụ pụrụ izitu anyị ibu ahụ. N’oge anyị na-ekpe ekpere, anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’icheta ihe ndị e kwuru n’Okwu Chineke. Abụ ọma nke kasị ogologo n’ime Bible dị ka ọmarịcha ekpere. Onye dere ya bụrụ, sị: “Echetawo m ikpe Gị nile site na mgbe ebighị ebi, Jehova, wee kasie onwe m obi.” (Abụ Ọma 119:52) N’ọnọdụ ndị tara oké akpụ, karịsịa ọnọdụ ndị metụtara nsogbu ahụ ike, a dịghị enwekarị otu ihe ngwọta nye ha nile. N’ịdabere n’onwe anyị, anyị nwere ike ghara ịma kpọmkwem ebe anyị ga-eche ihu. Ọtụtụ ndị achọpụtawo na mgbe ha mesịrị ihe nile mmadụ pụrụ ime, ichigharịkwuru Chineke n’ekpere wetaara ha nkasi obi hiri nne na, mgbe ụfọdụ, ihe ngwọta ndị ha na-atụghị anya ha.—1 Ndị Kọrint 10:13.

Pat, bụ́ onye e ji ọsọ buba n’ọnụ ụlọ ndị chọrọ nlebara anya ozugbo nke ụlọ ọgwụ, nwetara mmetụta a na-akasi obi nke ekpere. Mgbe ọ gbakesịrị, o kwuru, sị: “Ekpekuru m Jehova ekpere ma mara n’ezie na aghaghị m ịhapụ ndụ m n’aka ya, na-atụkwasị ya obi ime ihe ọ bụla bụ uche ya. N’oge ahụ nile, enwere m obi iru ala; enwere m udo nke Chineke nke a kpọtụrụ aha ná Ndị Filipaị 4:6, 7.” Lee ka amaokwu ndị a pụrụ isi bụrụ ihe nkasi obi nye anyị nile! N’ebe ahụ, Pọl na-adụ anyị ọdụ, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”

Mmụọ Nsọ Dị Ka Onye Nkasi Obi

N’abalị ahụ tupu ọnwụ ya, Jisọs mere ka o doo ndị ozi ya anya na ọ gaje ịhapụ ha n’oge na-adịghị anya. Nke a nyere ha nsogbu n’obi ma wute ha. (Jọn 13:33, 36; 14:27–31) N’ịghọta mkpa ọ dị ha ịbụ ndị a nọgidere na-akasi obi, Jisọs kwere nkwa, sị: “Mụ onwe m ga-ekpekwara Nna m, Ọ ga-enyekwa unu Onye nkasi obi ọzọ, ka Ọ nọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi.” (Jọn 14:16) N’ebe a Jisọs na-ezo aka n’ebe mmụọ nsọ Chineke dị. Tinyere ihe ndị ọzọ, mmụọ Chineke kasiri ndị ozi ahụ obi n’oge ha nọ n’ọnwụnwa ma wusie ha ike ịnọgide na-eme uche Chineke.—Ọrụ 4:31.

Angie, bụ́ onye di ya ruru n’ọnụ ọnwụ mgbe o nwesịrị oké ihe mberede, nagidere obi erughị ala na ihe mgbu nile nke ọnọdụ ya n’ụzọ gara nke ọma. Gịnị nyeere ya aka? Ọ na-ekwu, sị: “E wezụga nkwado nke mmụọ nsọ Jehova, anyị apụghị ịgabigawo ahụmahụ anyị nweworo ma nọgide na-eguzosi ike. N’ezie, e mewo ka ike Jehova pụta ìhè site n’adịghị ike anyị, o gosipụtawokwa na ọ bụụrụ anyị ebe e wusiri ike n’oge anyị nọ ná nsogbu.”

Òtù Ụmụnna Na-akasi Obi

Ihe ọ sọrọ ọnọdụ mmadụ ná ndụ ya bụrụ, n’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị mwute pụrụ ibilite, o kwesịrị ịchọtali nkasi obi n’òtù ụmụnna dị n’ọgbakọ Jehova. Òtù ụmụnna a na-enye ndị so na ya nkwado na enyemaka ime mmụọ. N’ime ya, mmadụ pụrụ ịchọta ìgwè ndị enyi na-ahụ n’anya, na-eche banyere ndị ọzọ, na-akasikwa obi, bụ́ ndị dị njikere ma nwee ọchịchọ inyere ndị ọzọ aka na ịgụgụ ha obi n’oge nsogbu.—2 Ndị Kọrint 7:5–7.

A na-akụziri ndị so n’ọgbakọ ndị Kraịst “ka [ha] na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka [ha] na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe [ha] nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Nkụzi Bible ha na-enweta na-akpali ha igosipụta ịhụnanya ụmụnna na obi ọmịiko n’ebe ibe ha nọ. (Ndị Rom 12:10; 1 Pita 3:8) A na-akpali ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ nọ n’ọgbakọ ịbụ ndị dị obiọma, ndị na-akasi obi, na ndị nwere ọmịiko.—Ndị Efesọs 4:32.

Joe na Rebecca, bụ́ ndị nwa ha nwoke nwụnahụrụ n’ụzọ dị mwute, nwetara nkwado dị otú ahụ na-akasi obi site n’aka ndị so n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ha na-ekwu, sị: “Jehova na ọgbakọ ya na-ahụ n’anya enyeworo anyị aka n’oge anyị nọ n’ọnọdụ tara akpụ. Anyị nwetara ọtụtụ narị kaadị, akwụkwọ ozi, na òkù telifon. Nke a na-eme ka anyị ghọta otú òtù ụmụnna anyị dịruru n’oké ọnụ ahịa. Ka anyị nọ n’amaghị ihe anyị ga-eme eme n’ihi ọdachi ahụ, ọtụtụ ọgbakọ ndị dị n’ógbè anyị bịara nyere anyị aka, na-enye anyị nri, na-ehichasịkwa ụlọ anyị.”

Nwee Nkasi Obi!

Mgbe oké ifufe nke ahụhụ malitere ife, oké mmiri ozuzo na akụ́ mmiri igwe nke nsogbu anọgidekwa na-ezo, Chineke na-adị njikere inye nchebe na-adajụ obi. Otú a ka otu abụ ọma si kọwaa ya dị ka onye na-enye nchebe na-akasi obi: “Nku Ya ka Ọ ga-eji kpuchie gị, ọ bụkwa n’okpuru nku Ya abụọ ka ị ga-agbaba.” (Abụ Ọma 91:4) N’ebe a, ọ pụrụ ịbụ ugo ka a na-eme ihe atụ ya. Ọ bụ otu ihe atụ nke nnụnụ na-enwe mmetụta na ihe ize ndụ na-abịa ma gbasazie nku ya n’elu ụmụ ya n’ụzọ nchebe. N’echiche dị ukwuu ọbụna karị, Jehova na-aghọ ezi Onye Nchebe nye ndị nile na-agbaba n’ime ya.—Abụ Ọma 7:1.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu ihe banyere Chineke, àgwà ya, nzube ya, na ikike o nwere inye nkasi obi, a na-agba gị ume ịmụ Okwu ya. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka na nke ahụ. Ee, gị onwe gị pụkwara inweta nkasi obi n’ike Jehova!

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Olileanya dabeere na Bible maka ọdịnihu pụrụ inye nkasi obi