Ekliziastis 4:1-16
4 M chebakwaara mmegbu niile a na-emegbu ndị mmadụ n’ụwa* echiche. M hụrụ ka anya mmiri na-agba ndị a na-emegbu emegbu, ma e nweghị onye na-akasi ha obi.+ Ọ bụkwa ndị nọ n’isi na-emegbu ha, ma e nweghị onye na-akasi ha obi.
2 M wee kwuo na ndị nwụrụ anwụ ka ndị dị ndụ mma.+
3 Ma onye ka ha abụọ mma bụ onye a na-amụbeghị amụ,+ onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa.*+
4 Ahụkwala m otú ndị mmadụ si na-agbasi mbọ ike ma jiri nkà na-arụ ọrụ ka ha wee gosi na ha ka ibe ha.+ Ihe a bụkwa ihe efu. Ọ bụ ịchụ ifufe.
5 Onye nzuzu na-anọ otu ebe kụkụwa aka ya, ndụ ya ana-ala n’iyi.*+
6 Mmadụ izurutụ ike dị mma karịa mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ifufe.+
7 M chebaara ihe ọzọ bụ́ ihe efu n’ụwa* echiche:
8 E nwere otu onye nọ naanị ya. E nweghị onye ya na ya nọ. O nweghị nwa ma ọ bụ nwanne. Ma ọ na-arụsi ọrụ ike mgbe niile. Akụnụba anaghị eju ya eju.+ Ma ọ̀ na-ajụ onwe ya, sị, ‘Ònye ka m na-arụrụ ọrụ a m na-arụsi ike ma ghara ịna-ekpori ndụ’?+ Ihe a bụkwa ihe efu, bụrụkwa ọrụ ahụhụ.+
9 Abụọ dị mma karịa otu+ n’ihi na a ga-akwụ ha ezigbo ụgwọ ọrụ maka ọrụ ha na-arụsi ike.
10 N’ihi na ọ bụrụ na otu onye n’ime ha adaa, onye nke ọzọ ga-enyere ya aka ka o bilie. Ma gịnị ga-eme ma otu onye daa mgbe a na-enweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilie?
11 Ọ bụrụkwa na mmadụ abụọ edinakọta ọnụ, ahụ́ ga-ekporo ha ọkụ. Ma, olee otú ahụ́ ga-esi kporo naanị otu onye ọkụ?
12 Otu onye nwere ike imeri onye nọ naanị ya, ma mmadụ abụọ gbakọrọ aka nwere ike imeri onye ahụ. Ụdọ e ji eriri atọ tụọ, a gaghị adọbili ya ngwa ngwa.
13 Nwata nke ma ihe ma bụrụ ogbenye ka eze nke mere agadi ma dị iberiibe mma,+ bụ́ onye na-anaghị anabata aka ná ntị a na-adọ ya maka na o nweghịzi uche.+
14 N’ihi na o* si n’ụlọ mkpọrọ pụta ghọọ eze,+ n’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye mgbe a mụrụ ya n’oge eze ahụ nke mere agadi na-achị.+
15 M chebaara ndị niile dị ndụ echiche, bụ́ ndị na-ejegharị n’ụwa,* chebakwara otú ihe si agara nwata ahụ nke nọchiri eze ahụ echiche.
16 Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ndị na-akwado ya, e mechaa, ihe ya agaghị amasị ndị mmadụ.+ Ihe a bụkwa ihe efu. Ọ bụ ịchụ ifufe.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
^ Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
^ Na Hibru, “na-eri anụ onwe ya.”
^ Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
^ O nwere ike ịbụ nwata ahụ ma ihe ka a na-ekwu.
^ Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”