Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Na-aza Ekpere

Chineke Na-aza Ekpere

Chineke Na-aza Ekpere

Kọniliọs bụ nwoke chọrọ ihu ọma Chineke site n’ekpere ndị si n’obi o kpere ugboro ugboro. Ọzọkwa, o ji ọkwá ya dị ka onyeisi usuu ndị agha mee ezi ihe. Dị ka Bible si kwuo, ‘ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebere’ n’ebe ndị nọ ná mkpa nọ.—Ọrụ10:1, 2.

N’OGE ahụ, ọ bụ ndị Juu, ndị na-eso ụzọ ndị Juu, na ndị Sameria kwere ekwe mejupụtara ọgbakọ ndị Kraịst. Kọniliọs bụ onye Jentaịl a na-ebighị úgwù, ọ nọghịkwa n’ọgbakọ ndị Kraịst. Nke ahụ ọ̀ pụtara na ekpere ya bụ na nkịtị? Ee e. Jehova Chineke rịbara Kọniliọs na ọrụ ndị o ji ekpere na-arụ ama.—Ọrụ 10:4.

Site ná nduzi mmụọ ozi, e mere ka Kọniliọs na ọgbakọ ndị Kraịst nwee mmekọrịta. (Ọrụ 10:30-33) N’ihi ya, ya na ezinụlọ ya nwere ihe ùgwù nke ịghọ ndị Jentaịl mbụ a na-ebighị úgwù a nabatara n’ọgbakọ ndị Kraịst. Jehova Chineke lere ahụmahụ Kọniliọs anya dị ka nke kwesịrị ka e tinye ya n’ihe ndekọ Bible. Obi abụọ adịghị ya na o mere ọtụtụ mgbanwe iji mee ka ndụ ya kwekọọ kpam kpam n’ụkpụrụ Chineke. (Aịsaịa 2:2-4; Jọn 17:16) Ahụmahụ Kọniliọs kwesịrị ịbụ ihe agbamume dị ukwuu nye ndị nke mba nile bụ́ ndị na-achọ ihu ọma Chineke taa. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Ihe Atụ Ndị nke Oge A

Otu nwa agbọghọ nọ n’India nwere mkpa dị ukwuu maka nkasi obi. N’ịbụ onye lụrụ di mgbe ọ dị afọ 21, ọ mụrụ ụmụ abụọ. Ma n’oge na-adịghị anya ọ mụsịrị nwa nke abụọ ya, di ya nwụrụ. Na mberede, n’oge ọ dị afọ 24, ọ ghọrọ nwanyị di ya nwụrụ nke nwere nwa nwanyị dị ọnwa 2 na nwa nwoke dị ọnwa 22. Ka a sịkwa ihe mere nkasi obi ji dị ya mkpa! Olee ebe ọ ga-eche ihu? N’otu abalị, ka ọ nọ n’oké obi erughị ala, o kpere ekpere, na-asị, “Nna nke eluigwe, biko kasie m obi site n’Okwu gị.”

N’ụtụtụ echi ya, o nwetara onye ọbịa. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’ụbọchị ahụ, ozi ụlọ n’ụlọ nke nwoke ahụ abụwo nke tara akpụ n’ihi na ọ bụ mmadụ ole na ole nabatara ya. N’ịbụ onye ike gwụrụ na onye nwere nkụda mmụọ, ọ chọrọ ịla, ma n’ụzọ ụfọdụ o nwere mkpali iletakwu nanị otu ụlọ. Ọ bụ ebe ahụ ka o zutere nwa agbọghọ ahụ di ya nwụrụ. Ọ gwara ya ka ọ bata n’ụlọ, ọ natakwara otu akwụkwọ nke kọwara Bible. Nwanyị ahụ nwetara nkasi obi dị ukwuu site n’ịgụ akwụkwọ ahụ nakwa site ná nkwurịta okwu ya na Onyeàmà ahụ. Ọ matara banyere nkwa Chineke kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-eme ka ụwa bụrụ Paradaịs n’isi nso. Nke kasị mkpa, ọ bịara mara ma hụ otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, bụ́ onye zaworo ekpere ya, n’anya.

Nora, bụ́ onye bi n’obodo George, South Africa, wepụtara otu ọnwa iji kere òkè n’izisa ozi ọma oge nile. Tupu ọ malite, o kpekusiri Jehova ekpere ike inyere ya aka ịchọta onye nwere ezi mmasị n’ịmụ Bible. Ókèala e kenyere ya ịrụ ọrụ na ya gụnyere ebe obibi nke otu onye kpasoworo Nora àgwà obi ọjọọ n’oge ndị o letaburu ya. Nora ji obi ike gaa n’ebe obibi ahụ ọzọ. N’ịbụ ihe ijuanya nye ya, ọ hụrụ na onye ọzọ, nke aha ya bụ Noleen, ebichiela ebe ahụ. Ọzọkwa, Noleen na nne ya anọwo na-ekpeku Chineke ekpere ka o nyere ha aka ịghọta Bible. “Mgbe m tụrụ aro ka mụ na ha na-amụ Bible,” ka Nora na-akọwa, “ha nwere obi ụtọ.” Noleen na nne ya nwere ọganihu n’ụzọ dị ngwa. Ka oge na-aga, ha abụọ malitere isoro Nora na-ekere òkè n’ọrụ ọgwụgwọ ime mmụọ ahụ.

Ihe atụ ọzọ na-egosi ikike nke ekpere bụ nke otu di na nwunye bi n’obodo Johannesburg nke dị na South Africa. N’otu abalị Saturday na 1996, alụmdi na nwunye Dennis na Carol chọrọ itisa. N’amaghị ihe ọzọ ha ga-eme, ha kpebiri ikpe ekpere maka enyemaka, bụ́ nke ha mere ugboro ugboro ruo n’ime ime abalị. N’echi ya, n’elekere anya 11 nke ụtụtụ, mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ha. Dennis meghere ụzọ ma gwa ha ka ha chere ruo mgbe ọ kpọrọ nwunye ya. Dennis dọziri nwunye ya aka ná ntị na ọ bụrụ na ọ nabata Ndịàmà ahụ, ọ pụrụ isi ike ime ka ha laa. Carol chetaara Dennis na ha anọwo na-ekpe ekpere maka enyemaka ma kwuo na nke a pụrụ ịbụ azịza Chineke nye ekpere ha. Ya mere ha kpọbatara Ndịàmà ahụ, ha malitekwara ọmụmụ Bible n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Dennis na Carol nwere mkpali n’ihe ha mụtara. N’otu ehihie ahụ, ha gara nzukọ mbụ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ. Site n’itinye ihe ha mụtaworo site na Bible n’ọrụ, Dennis na Carol chọtara ihe ngwọta nye nsogbu alụmdi na nwunye ha. Ha bụzi ndị nwere obi ụtọ na-eto Jehova, na-esokwa ndị agbata obi ha mgbe nile ekerịta ihe ndị ha kweere bụ́ ndị dabeere na Bible.

Gịnị Ma I Chee na I Rughị Eru Ikpe Ekpere?

Ụfọdụ ndị obi ha ziri ezi pụrụ iche na ha erughị eru ikpe ekpere n’ihi ụzọ ndụ ọjọọ ha. Jisọs Kraịst kọrọ akụkọ banyere nwoke dị otú ahụ, onye ọna ụtụ a na-eleda anya. Ka ọ na-abanye n’ogige ụlọ nsọ ahụ, nwoke a chere na ya erughị eru ịbịa n’ebe a na-abịakarị maka ekpere. ‘N’iguzoro n’ebe dị anya, ọ na-eti aka n’obi ya, na-asị, Chineke, ka obi Gị jụrụ n’ebe mụ, bụ́ onye mmehie, nọ.’ (Luk 18:13) Dị ka Jisọs si kwuo, a nụrụ arịrịọ nwoke a. Nke a na-egosi na n’ezie Jehova Chineke na-eme amara ma na-achọ inyere ndị mmehie nwere ezi nchegharị aka.

Tụlee banyere otu nwoke bụ́ onye South Africa nke aha ya bụ Paul. N’oge ọ bụ nwata, Paul sooro nne ya na-aga nzukọ ndị Krịast. Ma n’oge ọ dị afọ iri na ụma, ọ malitere iso ndị na-eto eto bụ́ ndị na-adịghị agbaso ụzọ Chineke, na-akpakọrịta. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, o jere ozi n’usuu ndị agha nke ọchịchị ịkpa ókè agbụrụ chịburu South Africa. E mesịa, n’ụzọ ọ na-atụghị anya ya, enyi ya nwanyị kwụsịrị mmekọrịta ha. Ụzọ ndụ a na-adịghị eweta afọ ojuju mere ka Paul nwee nnọọ nkụda mmụọ. “N’otu anyasị,” ka ọ na-echeta, “ekpekuru m Jehova ekpere ma rịọ maka enyemaka ya, ọ bụ ezie na ejibeghị m ezi obi jekwuru Chineke ruo ọtụtụ afọ.”

N’oge na-adịghị anya mgbe Paul kpesịrị ekpere a, nne ya kpọrọ ya òkù ije Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst bụ́ nke a na-eme kwa afọ. (Luk 22:19) Ọ tụrụ Paul n’anya na nne ya mere nke a, ebe ọ bụ na ọ nọwo na-enupụ isi, gosikwa mmasị dị nta n’ebe Bible dị. “Elere m ọkpụkpọ òkù a anya dị ka azịza Jehova nye ekpere m ma chee na mụ onwe m aghaghịkwa ime òkè m.” Site n’oge ahụ gaa n’ihu, Paul malitere ije nzukọ nile nke ndị Kraịst. Mgbe ọnwa anọ nke ọmụmụ Bible gasịrị, o ruru eru maka baptism. Ọzọkwa, ọ kwụsịrị ihe ọmụmụ injinịa ya ma họrọ ọrụ nke ikere òkè n’izisa ozi ọma oge nile. Taa, Paul bụ nwoke nwere obi ụtọ, ọ dịghịzi enwe nkụda mmụọ banyere ụzọ ndụ ya gara aga. Kemgbe afọ 11 gara aga, o jewo ozi n’alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society dị na South Africa.

N’ezie, Jehova Chineke na-eji amara aza ekpere, “ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) N’isi nso, oké ụbọchị ahụ nke Jehova ga-abịa ma weta ajọ omume nile ná njedebe. Ka ọ dịgodị, Jehova na-aza ekpere nke ndị ya na-ekpe maka ume na nduzi, ka ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ ahụ dị mkpa nke ịgba àmà. N’ihi ya, a na-eme ka ọtụtụ nde mmadụ si ná mba nile soro ọgbakọ ndị Kraịst na-enwe mmekọrịta, a na-ejikwa ihe ọmụma Bible nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi agọzi ha.—Jọn 17:3.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ekpere si n’obi Kọniliọs kpere dugara na ya ịbụ onye Pita onyeozi letara

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ekpere enyeworo ọtụtụ ndị aka n’oge nsogbu

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ọ dị mma ikpe ekpere maka enyemaka iji ghọta Bible

Di na nwunye pụrụ ikpe ekpere maka enyemaka iji mee ka alụmdi na nwunye ha sikwuo ike