Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova—Onye Nwere Ume n’Ike

Jehova—Onye Nwere Ume n’Ike

 Jehova—Onye Nwere Ume n’Ike

“Site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.”—AỊSAỊA 40:26.

1, 2. (a) Olee isi iyi nke ike nkịtị nke anyị nile na-adabere na ya? (b) Kọwaa ihe mere Jehova ji bụrụ Isi Iyi kasịnụ nke ike nile.

IKE bụ ihe ọtụtụ n’ime anyị na-adịghị eji akpọrọ oké ihe. Dị ka ihe atụ, anyị adịghị echebachara ike eletrik nke na-enye anyị ìhè na okpomọkụ ma ọ bụ ịdị mfe nke ịkwụnye ngwá ọrụ eletrik ọ bụla anyị pụrụ inwe n’ọkụ, echiche. Ọ bụ nanị mgbe e weere ọkụ na mberede ka anyị na-aghọta na e wezụga ike eletrik, obodo dị iche iche nke ụmụ mmadụ ga-afọ nke nta ka ha kwụsị ịrụ ọrụ. Ihe ka ọtụtụ n’eletrik ndị anyị na-adabere na ha sitere kpọmkwem n’isi iyi nke ike ọkụ eletrik nke ụwa a kasị adabere na ya—anyanwụ—abịa n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè. * Kwa sekọnd, anyanwụ na-amịkọrọ nde tọn ise nke mmanụ nuklia, na-enye ụwa ike na-akwagide ndụ.

2 Olee ebe ike anyanwụ a nile si abịa? Ònye rụrụ ihe a na-emepụta ike nke dị na mbara igwe? Ọ bụ Jehova Chineke. N’izo aka n’ebe ọ nọ, Abụ Ọma 74:16 na-ekwu, sị: “Gị onwe gị edoziwo ihe na-enye ìhè na anyanwụ.” Ee, Jehova bụ Isi Iyi kasịnụ nke ike nile, dị nnọọ ka o si bụrụ Isi Iyi nke ndụ nile. (Abụ Ọma 36:9) Anyị ekwesịghị iji ike ya gwurie egwu mgbe ọ bụla. Site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma, Jehova na-echetara anyị ka anyị lelie anya elu hụ ihe ndị dị na mbara igwe, dị ka anyanwụ na kpakpando, ma tụgharịa uche n’otú ha si bịa dịrị. “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.”—Aịsaịa 40:26; Jeremaịa 32:17.

3. Olee otú anyị si erite uru site ná ngosipụta dị iche iche nke ike Jehova?

 3 Ebe ọ bụ na Jehova nwere ume n’ike, anyị pụrụ inwe obi ike na anyanwụ ga-anọgide na-enye anyị ìhè na okpomọkụ bụ́ ndị ndụ anyị dabeere na ha. Otú ọ dị, anyị na-adabere n’ike Chineke maka ihe karịrị nnọọ mkpa anụ ahụ anyị ndị bụ́ isi. Mgbapụta anyị pụọ ná mmehie na ọnwụ, olileanya anyị maka ọdịnihu, na ntụkwasị obi anyị n’ebe Jehova nọ, nwechara njikọ n’ụzọ a na-apụghị ịtọsa atọsa n’otú o si eji ike ya eme ihe. (Abụ Ọma 28:6-9; Aịsaịa 50:2) Ihe atụ ndị na-agba akaebe banyere ike Jehova nwere ikepụta ihe na ịnapụta anapụta, ịzọpụta ndị ya na ibibi ndị iro ya, jupụtara n’ime Bible.

Ike Chineke Pụtara Ìhè n’Okike

4. (a) Olee otú ikiri mbara igwe n’abalị si metụta Devid? (b) Gịnị ka ihe ndị dị na mbara igwe na-ekpughe banyere ike Chineke?

4 Pọl onyeozi kọwara na ‘a pụrụ ịghọta ike ebighị ebi nke Onye Okike anyị nke ọma site n’ihe nile o kere eke.’ (Ndị Rom 1:20) Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, onye, dị ka onye ọzụzụ atụrụ na-aghaghị ilewo anya ugboro ugboro na mbara igwe n’abalị, hụrụ ịdị ebube nke eluigwe na ala na ike nke Onye Mere ya. O dere, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ, na Ị na-echeta ya; na nwa nke mmadụ, na Ị na-eleta ya?” (Abụ Ọma 8:3, 4) N’agbanyeghị ihe ọmụma dị nta Devid nwere banyere ihe ndị dị na mbara igwe, ọ ghọtara na ọ dịghị ihe ya pụtara ma e were ya tụnyere Onye Okike nke eluigwe na ala anyị sara mbara. Taa, ndị na-enyocha mbara igwe maara ihe dị nnọọ ukwuu banyere ịdị ukwuu nke eluigwe na ala na ike nke na-akwagide ya. Dị ka ihe atụ, ha na-agwa anyị na kwa sekọnd, anyanwụ anyị na-emepụta ike ya na mgbawa nke 100,000 nde megatọn nke TNT, hà nhata. * Ọ bụ akụkụ dị nnọọ nta nke ike ahụ na-erute n’ụwa; ma nke ahụ zuru iji kwado ndụ nile nọ na mbara ụwa anyị. Ma, anyanwụ anyị abụtụghị kpakpando  kasị ike na mbara igwe. Ụfọdụ kpakpando na-eji nanị otu sekọnd egbukepụ ìhè anyanwụ na-eji otu ụbọchị dum egbukepụ. Chezienụ banyere ike nke Onye kere ihe ndị dị otú ahụ dị na mbara igwe nwere! Elaịhu tipụrụ mkpu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Onye pụrụ ime ihe nile, anyị achọpụtaghị Ya; Ọ dị ukwuu n’ike.”—Job 37:23.

5. Ihe àmà dị aṅaa nke ike Jehova ka anyị na-ahụ n’ọrụ ya?

5 Ọ bụrụ na anyị ‘achọpụta ọrụ nile nke Chineke’ dị ka Devid mere, anyị ga-ahụ ihe àmà nke ike ya n’ebe nile—n’ikuku nakwa n’ebili mmiri, n’égbè eluigwe nakwa n’àmụ̀mà, n’oké osimiri nakwa n’oké ugwu. (Abụ Ọma 111:2; Job 26:12-14) Ọzọkwa, dị ka Jehova chetaara Job, ụmụ anụmanụ na-agba akaebe banyere ike Ya. Otu n’ime ha bụ Òtòbò, ma ọ bụ enyí mmiri. Jehova gwara Job, sị: “Ike ya dị n’úkwù ya . . . Ọgịrịga ya dị ka mkpọrọ ígwè.” (Job 40:15-18) A makwaara ike na-eyi egwu nke atụ́ nke ọma n’oge Bible, Devid kpekwara ekpere ka a napụta ya ‘n’ọnụ ọdụm nakwa na mpi atụ́.’—Abụ Ọma 22:21; Job 39:9-11.

6. Gịnị ka ehi na-anọchite anya ya n’Akwụkwọ Nsọ, n’ihi gịnịkwa? (Lee nkọwa ala ala peji.)

6 N’ihi ike ya, e ji ehi mee ihe n’ime Bible iji  nọchite anya ike Jehova. * Ọhụụ Jọn onyeozi nke ocheeze Jehova na-egosipụta ihe anọ dị ndụ, nke otu n’ime ha nwere ihu dị ka nke ehi. (Mkpughe 4:6, 7) Ihe àmà na-egosi na otu n’ime àgwà anọ bụ́ isi nke Jehova, nke ndị cherub a sere onyinyo ya, bụ ike. Ndị ọzọ bụ ịhụnanya, amamihe, na ikpe ziri ezi. Ebe ọ bụ na ike bụ akụkụ dị nnọọ mkpa nke àgwà Chineke, inwe nghọta doro anya nke ike ya na otú o si eji ya eme ihe ga-adọtakwu anyị nso n’ebe ọ nọ ma nyere anyị aka iṅomi ihe nlereanya ya site n’iji ike ọ bụla anyị nwere na-eme ihe n’ụzọ dị mma.—Ndị Efesọs 5:1.

“Jehova nke Usuu Nile nke Ndị Agha, Bụ́ Onye Dị Ike”

7. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ezi ihe ga-emeri ihe ọjọọ?

7 N’Akwụkwọ Nsọ, a kpọrọ Jehova, “Chineke Nke pụrụ ime ihe nile,” bụ́ utu aha nke na-echetara anyị na anyị ekwesịghị ileda ike ya anya mgbe ọ bụla ma ọ bụ nwee obi abụọ banyere ikike o nwere imeri ndị iro ya. (Jenesis 17:1; Ọpụpụ 6:3) Ajọ usoro ihe Setan pụrụ iyi ihe gbanyesiri mkpọrọgwụ ike, ma n’anya Jehova, “a gụwo mba nile n’otu ntụ mmiri na-atụpụ n’ite mmiri, na n’uzuzu nke ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” (Aịsaịa 40:15) N’ihi ike dị otú ahụ nke Chineke nwere, obi abụọ adịghị ya na ezi ihe ga-emeri ihe ọjọọ. N’oge ajọ omume jupụtara ebe nile, anyị pụrụ inweta nkasi obi n’ịmara na “Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Onye dị ike nke Israel” ga-eme ka ihe ọjọọ kwụsị ruo mgbe ebighị ebi.—Aịsaịa 1:24; Abụ Ọma 37:9, 10.

8. Olee usuu ndị agha nke eluigwe nke Jehova na-achịkwa, ihe àmà dịkwa aṅaa nke ike ha ka anyị nwere?

8 Okwu ahụ bụ́ “Jehova nke usuu nile nke ndị agha,” nke pụtara ugboro 285 n’ime Bible, bụ ihe ncheta ọzọ banyere ike Chineke. “Usuu nile nke ndị agha” a na-ekwu okwu ha n’ebe a na-ezo aka n’ebe imerime ndị mmụọ e kere eke bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi nọ. (Abụ Ọma 103:20, 21; 148:2) N’otu abalị, nanị otu n’ime ndị mmụọ ozi a gburu ndị agha Asiria dị 185,000 bụ́ ndị nọ na-eyi Jerusalem egwu. (2 Ndị Eze 19:35) Ọ bụrụ na anyị amata ike usuu ndị agha eluigwe nke Jehova nwere, anyị agaghị abụ ndị ndị mmegide ga-amaja n’ụzọ dị mfe. Elaịsha onye amụma echegbughị onwe ya mgbe usuu ndị agha dum bụ́ ndị na-achọ ya gbara ya gburugburu n’ihi na, n’adịghị ka ohu ya, ọ pụrụ iji anya nke okwukwe hụ usuu ndị agha nke eluigwe ka ha na-akwado ya.—2 Ndị Eze 6:15-17.

9. Dị ka Jisọs, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-enwe obi ike ná nchebe Chineke?

9 N’otu aka ahụ, Jisọs maara na ndị mmụọ ozi na-akwado ya mgbe o chere ìgwè mmadụ chị mma agha na osisi ihu n’ogige Getsemane. Mgbe ọ gwasịrị Pita ka ọ mịghachi mma agha ya n’ọnọdụ ya, Jisọs gwara ya na, ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ya pụrụ ịrịọ Nna ya ka o nye ya “[ihe karịrị] legion iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi.” (Matiu 26:47, 52, 53) Ọ bụrụ na anyị nwere nghọta yiri nke ahụ banyere usuu ndị agha nke eluigwe nke Chineke na-achịkwa, anyị ga-enwekwa ntụkwasị obi siri ike ná nkwado Chineke. Pọl onyeozi dere, sị: “Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu n’ile ihe ndị a anya? Ọ bụrụ na Chineke dịịrị anyị, ònye na-emegide anyị?”—Ndị Rom 8:31.

10. Ole ndị ka Jehova ji ike ya emere ihe?

10 Mgbe ahụ, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji atụkwasị obi ná nchebe Jehova. Ọ na-eji ike ya eme ihe mgbe nile n’ụzọ dị mma nakwa n’ụzọ kwekọrọ n’àgwà ya ndị ọzọ—ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya. (Job 37:23; Jeremaịa 10:12) Ọ bụ ezie na mmadụ ndị dị ike na-emekpa ndị ogbenye na ndị dị obi umeala ahụ ugboro ugboro n’ihi uru ọdịmma onwe onye nanị, Jehova “na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie” ma “dị ike ịzọpụta.” (Abụ Ọma 113:5-7; Aịsaịa 63:1) Dị ka Meri, bụ́ nne Jisọs nke dị obi umeala ma ghara ịdị mpako, si ghọta ya, “Onye dị ike” na-eji ike ya emere ndị na-atụ egwu ya ihe n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị, na-eweda ndị  mpako ala ma na-ebuli ndị dị umeala n’obi elu.—Luk 1:46-53.

Jehova Na-ekpughere Ndị Ohu Ya Ike Ya

11. Ihe dị aṅaa na-agba akaebe banyere ike Chineke ka ụmụ Israel hụrụ n’afọ 1513 T.O.A.?

11 N’oge dị iche iche, Jehova gosiri ndị ohu ya ike ya. Otu n’ime oge ndị dị otú ahụ bụ n’Ugwu Saịnaị na 1513 T.O.A. N’afọ ahụ, ụmụ Israel ahụlarị ihe àmà siri ike nke ike Chineke. Ihe otiti iri ndị mebiri ihe ekpughewo aka dị ike nke Jehova na adịghị ike nke chi dị iche iche nke Ijipt. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ngafe a gafere Osimiri Uhie n’ụzọ ọrụ ebube na mbibi e bibiri usuu ndị agha Fero, gbakwuru akaebe banyere ike Chineke. Ọnwa atọ mgbe nke a gasịrị, n’ala ala Ugwu Saịnaị, Jehova kpọrọ ụmụ Israel ka ha ghọọ ‘ihe nke aka ya karịa ndị nile.’ N’aka nke ha, ha kwere nkwa, sị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.” (Ọpụpụ 19:5, 8) Jehova gosipụtaziri ike ya n’ụzọ doro anya. Ka égbè eluigwe na àmụ̀mà na olu opi ike dara oké ụda nọ na-akpọtụ, Ugwu Saịnaị kwụrụ anwụrụ, maakwa jijiji. Ụjọ jidere ndị ahụ, bụ́ ndị guzo n’ebe dị anya. Ma Mosis gwara ha na ahụmahụ a kwesịrị ịkụziri ha ịtụ egwu Chineke, egwu nke ga-akwali ha irubere ezi Chineke ha kasị ike, bụ́ Jehova, isi.—Ọpụpụ 19:16-19; 20:18-20.

12, 13. Olee ọnọdụ ndị mere ka Elaịja hapụ ọrụ e nyere ya, ma olee otú Jehova si wusie ya ike?

12 Ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, n’oge Elaịja, Ugwu Saịnaị hụrụ ngosipụta ọzọ nke ike Chineke. Onye amụma ahụ ahụlarị ka ike Chineke nọ n’ọrụ. Ruo afọ atọ na ọkara, Chineke ‘gbochiri eluigwe’ n’ihi ndapụ n’ezi ofufe nke mba Israel. (2 Ihe E Mere 7:13) N’oge ụkọ mmiri ozuzo si na ya pụta, ugoloọma nyere Elaịja nri ná mmiri iyi Kerit, e mesịakwa, e ji ụzọ ọrụ ebube mụbaa obere ụtụ ọka na mmanụ nke otu nwanyị di ya nwụrụ iji nye Elaịja nri. Ọbụna Jehova nyere Elaịja ike ịkpọlite nwa nwoke nke nwanyị a di ya nwụrụ, n’ọnwụ. N’ikpeazụ, ná nnwale dị ịrịba ama e mere iji mara chi nke bụ Chineke bụ́ nke e mere n’Ugwu Kamel, ọkụ si n’eluigwe bịa ripịa àjà Elaịja. (1 Ndị Eze 17:4-24; 18:36-40) Otú o sina dị, n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Elaịja tụrụ egwu ma nwee nkụda mmụọ mgbe Jezebel yiri egwu igbu ya. (1 Ndị Eze 19:1-4) O si ná mba ahụ gbapụ, na-eche na ọrụ ya dị ka onye amụma agwụla. Iji mesighachi ya obi ike ma wusie ya ike, Jehova n’onwe ya ji obiọma gosipụtara ya ike Ya.

13 Ka Elaịja zoro n’ọgbà, ọ hụrụ ngosipụta na-atụ ụjọ nke ike atọ n’ime ike ndị Jehova na-achịkwa: ifufe dị ike, ala ọma jijiji, nakwa n’ikpeazụ, ọkụ. Otú ọ dị, mgbe Jehova gwara Elaịja okwu, o ji “olu nta nke dị ezi nwayọọ” mee otú ahụ. O nyekwuru ya ọrụ ọ ga-arụ ma gwa ya na a ka nwere mmadụ 7,000 ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova n’ala ahụ. (1 Ndị Eze 19:9-18) Ọ bụrụ na, dị ka Elaịja, anyị enwee nkụda mmụọ n’ihi arụpụtaghị ihe n’ozi anyị, anyị pụrụ ịrịọ Jehova maka “ọkịka nke ike”—ike nke pụrụ iwusi anyị ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ n’adaghị mbà.—2 Ndị Kọrint 4:7.

Ike Jehova Na-eme Ka E Jide n’Aka na Ọ Ga-emezu Nkwa Ya

14. Gịnị ka aha aka Jehova na-ekpughe, oleekwa otú ike ya si nwee njikọ n’ebe aha ya dị?

14 Ike Jehova nwekwara njikọ chiri anya n’ebe aha ya na mmezu nke uche ya dị. Aha ahụ pụrụ iche bụ́ Jehova, nke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ,” na-ekpughe na ọ na-eme onwe ya ka ọ ghọọ Onye Mmezu nke nkwa. Ọ dịghị ihe ma ọ bụ onye ọ bụla nke pụrụ igbochi Chineke imezu nzube ya, n’agbanyeghị otú ndị nkatọ pụrụ isi were ha dị ka ihe na-apụghị ikwe omume. Dị ka Jisọs gwara ụmụazụ ya n’otu oge, sị, “a pụrụ ime ihe nile n’ebe Chineke nọ.”—Matiu 19:26.

15. Olee otú e si chetara Abraham na Sera na ọ dịghị ihe karịrị Jehova ime?

15 Iji maa atụ, Jehova kwere Abraham na Sera nkwa n’otu oge na ọ ga-eme ka ụmụ ha ghọọ mba ukwu. Otú ọ dị, ha nọgidere n’amụtaghị nwa ruo ọtụtụ afọ. Ha abụọ emeela nnọọ agadi mgbe Jehova gwara ha na a gawala imezu nkwa ahụ ma Sera chịrị ọchị. Ná nzaghachi, mmụọ ozi ahụ sịrị: “Ọ̀ dị ihe karịrị Jehova ime?” (Jenesis 12:1-3; 17:4-8; 18:10-14) Narị afọ anọ mgbe nke ahụ gasịrị, bụ́ mgbe Mosis mesịrị kpọkọta ụmụ Abraham—ndị bụ́ mba ukwu ugbu a—n’ọzara Moab, o chetaara ha na Chineke  emezuwo nkwa ya. Mosis kwuru, sị: “N’ihi na [Jehova] hụrụ nna gị hà n’anya, O wee họpụta mkpụrụ ha nọchiri ha, O wee were ike ukwu Ya mee ka i si n’Ijipt pụta n’ihu Ya; ka O wee napụ mba ukwu dịkwa ike karịa gị ala ha n’ihu gị, ime ka ị baa, ka O wee nye gị ala ha ịbụ ihe nketa, otú ọ dị taa.”—Deuterọnọmi 4:37, 38.

16. N’ihi gịnị ka ndị Sadusii ji daba n’ihie ụzọ nke ịgọnahụ mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ?

16 Ọtụtụ narị afọ mgbe nke a gasịrị, Jisọs katọrọ ndị Sadusii, bụ́ ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. N’ihi gịnị ka ha ji jụ ikwere ná nkwa Chineke kwere na ya ga-eweghachi ndị nwụrụ anwụ? Jisọs gwara ha, sị: “Unu amataghị ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ ike Chineke.” (Matiu 22:29) Akwụkwọ Nsọ na-emesi anyị obi ike na ‘ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Nwa nke mmadụ, ha ga-apụtakwa.’ (Jọn 5:27-29) Ọ bụrụ na anyị maara ihe Bible na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ, obi ike anyị nwere n’ike Chineke ga-eme ka anyị kwenye na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Chineke “[ga-eloda] ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; . . . n’ihi na Jehova ekwuwo ya.”—Aịsaịa 25:8.

17. N’ụbọchị dị aṅaa dị n’ihu ka ịtụkwasị Jehova obi ga-adị oké mkpa n’ụzọ pụrụ iche?

17 N’ọdịnihu dị nso, a ga-enwe oge ọ ga-adị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa ịtụkwasị obi n’ụzọ pụrụ iche n’ike nzọpụta nke Chineke. Setan bụ́ Ekwensu ga-awakpo ndị Chineke, bụ́ ndị ga-eyi ndị na-anọghị ná nchebe. (Ezikiel 38:14-16) Mgbe ahụ, Chineke ga-egosipụta ike ukwu ya n’ihi anyị, mmadụ nile ga-amarakwa na ya onwe ya bụ Jehova. (Ezikiel 38:21-23) Ugbu a bụ oge iwulite okwukwe na obi ike anyị nwere n’ebe Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile nọ ka anyị wee guzosie ike n’oge ahụ dị oké mkpa.

18. (a) Abamuru ndị dị aṅaa ka anyị na-enweta site n’ịtụgharị uche n’ike Jehova? (b) Olee ajụjụ a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Obi abụọ adịghị ya na e nwere ọtụtụ ihe mere a ga-eji na-atụgharị uche n’ike Jehova. Ka anyị na-atụgharị uche n’ọrụ ya dị iche iche, a na-akwali anyị n’obi umeala inye Onye Okike Ukwu anyị otuto ma nye ya ekele na ọ na-eji ike ya eme ihe n’ụzọ amamihe nakwa n’ụzọ ịhụnanya dị otú ahụ. A gaghị amaja anyị ma ọlị ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova nke usuu nile nke ndị agha obi. Olileanya anyị nwere ná nkwa ya ga-abụ nke siri ike. Otú ọ dị, cheta na e kere anyị n’onyinyo Chineke. N’ihi ya, anyị nwekwara ike—ọ bụ ezie na ọ bụ n’ụzọ a kpara ókè. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Onye Okike anyị n’ụzọ anyị si eji ike anyị eme ihe? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 E kweere n’ebe nile na ihe ndị na-enwu ọkụ bụ́ ndị e si n’ime ala enweta dị ka mmanụ na coal—ebe ndị bụ́ isi e si enweta ike maka ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ike eletrik—si n’anyanwụ enweta ike ha.

^ par. 4 N’ụzọ dị iche, bọmbụ nuklia kasị ike a nwaletụworo nwere ike mgbawa nke ya na megatọn 57 nke TNT hà nhata.

^ par. 6 O yikarịrị ka atụ́ e zoro aka na ya n’ime Bible ọ̀ bụ aurochs (nke bụ́ n’asụsụ Latin, urus). Puku afọ abụọ gara aga, a hụrụ anụmanụ ndị a na Gaul (nke bụ́ France ugbu a), Julius Caesar dekwara nkọwa a na-esonụ banyere ha, sị: “Ọ dịghị ihe enyí ji ka uri ndị a ibu, ma n’àgwà, ụcha, na ọdịdị ahụ ha, ha bụ ehi. Ha dị ike nke ukwuu, ha na-agbakwa oké ọsọ: ha adịghị ahapụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ ozugbo ha hụrụ ha.”

Ị̀ Pụrụ Ịza Ajụjụ Ndị A?

Olee otú okike si agba akaebe banyere ike Jehova?

Olee usuu ndị agha nke Jehova pụrụ iji mee ihe iji kwado ndị ya?

Olee oge ụfọdụ Jehova gosipụtara ike ya?

Ihe mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị nwere na Jehova ga-emezu nkwa ya dị iche iche?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

“Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a?”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto nke Malin sere, © IAC/RGO 1991

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ịtụgharị uche ná ngosipụta dị iche iche nke ike Jehova na-ewulite okwukwe ná nkwa ya dị iche iche